Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

ISI NKE ASATỌ

Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

Gịnị ka Bible na-agwa anyị banyere Alaeze Chineke?

Gịnị ka Alaeze Chineke ga-eme?

Olee mgbe Alaeze ahụ ga-emezu uche Chineke n’ụwa?

ỌTỤTỤ nde mmadụ n’ụwa nile maara ekpere ahụ ọtụtụ ndị na-akpọ Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe, ma ọ bụ Ekpere Onyenwe Anyị. Okwu abụọ ndị a na-ezo aka n’otu ekpere a ma ama nke Jizọs Kraịst n’onwe ya kụziri dị ka ihe nlereanya. Ọ bụ ekpere pụtara ihe dị ukwuu, ịtụlekwa arịrịọ atọ mbụ ndị dị na ya ga-enyere gị aka ịmatakwu ihe Bible na-akụzi n’ezie.

2 Ná mmalite nke ekpere ihe nlereanya a, Jizọs kụziiri ndị na-ege ya ntị, sị: “Ya mere, kpeenụ ekpere otú a: ‘Nna anyị nke nọ n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.’ ” (Matiu 6:9-13) Gịnị ka arịrịọ atọ ndị ahụ pụtara?

3 Anyị amụtaworị ọtụtụ ihe banyere aha Chineke, bụ́ Jehova. Anyị atụlewokwa uche Chineke ruo n’ókè ụfọdụ—ihe o mewooro ihe a kpọrọ mmadụ na ihe ndị ọ ka ga-emere ha. Otú ọ dị, gịnị ka Jizọs na-ezo aka na ya mgbe ọ gwara anyị ka anyị na-ekpe ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa”? Gịnị bụ Alaeze Chineke? Olee otú ọbịbịa ya ga-esi doo aha Chineke nsọ? Oleekwa ihe jikọrọ ọbịbịa nke Alaeze ahụ na ime uche Chineke?

IHE ALAEZE CHINEKE BỤ

4 Alaeze Chineke bụ ọchịchị nke Jehova Chineke guzobere, bụ́ nke nwere Eze nke Chineke họpụtara. Ònye bụ Eze nke Alaeze Chineke? Ọ bụ Jizọs Kraịst. Dị ka Eze, Jizọs ka ndị ọchịchị nile bụ́ mmadụ ukwuu, a na-akpọkwa ya “Eze nke ndị na-achị achị dị ka ndị eze na Onyenwenụ nke ndị na-achị achị dị ka ndị nwenụ.” (1 Timoti 6:15) O nwere ikike nke ime ihe dị mma karịa onye ọchịchị ọ bụla bụ́ mmadụ, ọbụna onye nke kasị mma n’ime ha.

5 Ebee ka Alaeze Chineke ga-esi na-achị? Ọ dị mma, ebee ka Jizọs nọ? Ọ̀ kwa i chetara na e gburu ya n’elu osisi ịta ahụhụ, e mesịakwa kpọlite ya n’ọnwụ. Nwa obere oge ka nke ahụ gasịrị, ọ rịgooro n’eluigwe. (Ọrụ 2:33) N’ihi ya, ọ bụ ebe ahụ ka Alaeze Chineke dị—n’eluigwe. Ọ bụ ya mere Bible ji akpọ ya “alaeze eluigwe.” (2 Timoti 4:18) Ọ bụ ezie na Alaeze Chineke dị n’eluigwe, ọ ga na-achị ụwa.—Mkpughe 11:15.

6 Gịnị mere Jizọs ji bụrụ Eze pụrụ iche? Otu ihe mere o ji bụrụ Eze pụrụ iche bụ na ọ gaghị anwụ anwụ. N’iji Jizọs tụnyere ndị eze bụ́ mmadụ, Bible na-akpọ ya “onye nanị ya nwere anwụghị anwụ, onye bi n’ìhè a na-apụghị iru nso.” (1 Timoti 6:16) Nke ahụ pụtara na ihe ọma nile Jizọs na-eme ga-adịgide adịgide. Ọ ga-emekwa ọtụtụ ihe ọma.

7 Tụlee amụma a Bible buru banyere Jizọs: “Mmụọ nke Jehova ga-enwekwa ọnọdụ Ya n’ahụ́ ya, bụ́ Mmụọ nke amamihe na nghọta, Mmụọ nke ndụmọdụ na ịdị ike, Mmụọ nke ihe ọmụma na egwu Jehova; ọzọ, ihe na-atọ ya ụtọ bụ egwu Jehova: ọ bụghịkwa dị ka anya ya abụọ si ahụ ka ọ ga-ekpe ikpe, ọ bụghịkwa dị ka ntị ya abụọ si anụ ka ọ ga-aba mba: kama ọ ga-eji ezi omume kpee ndị na-enweghị ike ikpe, ọ ga-ejikwa izi ezi baa mba banyere ndị dị umeala n’obi n’ụwa.” (Aịsaịa 11:2-4) Nke a na-egosi na Jizọs gaje ịbụ Eze ezi omume nke nwere ọmịiko, bụ́ onye ga-achị ndị nọ n’ụwa. Ị̀ ga-achọ inwe onye ọchịchị dị otú ahụ?

8 Ọ dị ihe ọzọ bụ́ eziokwu banyere Alaeze Chineke: Jizọs agaghị achị nanị ya. Ọ dị ndị ha na ya ga-achị. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi gwara Timoti, sị: “Ọ bụrụ na anyị anọgide na-atachi obi, anyị ga-achịkọkwa achị dị ka ndị eze.” (2 Timoti 2:12) Ee, Pọl, Timoti, na ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị Chineke họpụtara, ga-eso Jizọs chịa n’Alaeze eluigwe. Mmadụ ole ga-enwe ihe ùgwù ahụ?

9 Dị ka a kọwara n’Isi nke 7 nke akwụkwọ a, n’ọhụụ, Jọn onyeozi hụrụ “nwa Atụrụ ahụ [Jizọs Kraịst] ka ọ na-eguzo n’elu Ugwu Zaịọn [ọnọdụ ya dị ka eze n’eluigwe], ya na narị puku na iri puku anọ na anọ, bụ́ ndị e dekwasịrị aha ya na aha Nna ya n’egedege ihu ha.” Ole ndị bụ 144,000 ahụ? Jọn n’onwe ya na-agwa anyị, sị: “Ndị a bụ ndị nọgidere na-eso Nwa Atụrụ ahụ n’agbanyeghị ebe ọ na-eje. E si n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ zụta ndị a dị ka mkpụrụ mbụ nye Chineke nakwa nye Nwa Atụrụ ahụ.” (Mkpughe 14:1, 4) Ee, ha bụ ụmụazụ kwesịrị ntụkwasị obi nke Jizọs Kraịst, bụ́ ndị a họpụtara n’ụzọ pụrụ iche iso ya chịa n’eluigwe. Mgbe a kpọlitesịrị ha n’ọnwụ gaa ná ndụ eluigwe, ha ga-esoro Jizọs ‘chịa ụwa dị ka ndị eze.’ (Mkpughe 5:10) Kemgbe oge ndịozi, Chineke anọwo na-ahọpụta Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi iji mee ka ọnụ ọgụgụ ahụ zuo 144,000.

10 Ime ndokwa ka Jizọs na 144,000 chịa ihe a kpọrọ mmadụ bụ ihe na-egosipụta nnọọ ịhụnanya. Otu ihe mere o ji dị otú ahụ bụ na Jizọs abụtụwo mmadụ, taakwa ahụhụ. Pọl kwuru na Jizọs ‘abụghị onye na-apụghị imetara anyị ebere n’adịghị ike anyị, kama ọ bụ onye a nwaleworo n’ụzọ nile dị ka anyị onwe anyị, ma o nweghị mmehie.’ (Ndị Hibru 4:15; 5:8) Ndị ha na ya ga-eso achị atawokwa ahụhụ ma tachie obi n’oge ha bụ mmadụ. Tụkwasị na nke ahụ, ha alụsowokwa ezughị okè ọgụ ma nagide ụdị ọrịa dị iche iche. N’ezie, ha ga-aghọta nsogbu ndị ụmụ mmadụ na-eche ihu!

GỊNỊ KA ALAEZE CHINEKE GA-EME?

11 Mgbe Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ikpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa, o kwukwara na ha kwesịrị ikpe ekpere ‘ka e mee uche Chineke n’ụwa, dị ka a na-eme n’eluigwe.’ Chineke nọ n’eluigwe, ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi anọwokwa na-eme uche ya n’ebe ahụ. Otú ọ dị, n’Isi nke 3 nke akwụkwọ a, anyị mụtara na otu ajọ mmụọ ozi kwụsịrị ime uche Chineke ma mee ka Adam na Iv mehie. N’Isi nke 10, anyị ga-amụkwu ihe Bible na-akụzi banyere ajọ mmụọ ozi ahụ, bụ́ onye anyị maara dị ka Setan bụ́ Ekwensu. A hapụrụ Setan na ndị mmụọ ozi e kere eke bụ́ ndị kpebiri iso ya—ndị a na-akpọ ndị mmụọ ọjọọ—ka ha nọtụ n’eluigwe. N’ihi ya, ọ bụghị ndị nile nọ n’eluigwe mgbe ahụ na-eme uche Chineke. Nke ahụ gbanwere mgbe Alaeze Chineke malitere ịchị. Onye ahụ e chiri eze ọhụrụ, bụ́ Jizọs Kraịst, busoro Setan agha.—Mkpughe 12:7-9.

12 Okwu amụma ndị na-esonụ na-akọwa ihe merenụ: “M wee nụ oké olu n’eluigwe ka ọ na-asị: ‘Nzọpụta na ike na alaeze nke Chineke anyị na ikike nke Kraịst ya aghọwo ihe weere ọnọdụ ugbu a, n’ihi na a chụdawo onye ahụ nke na-ebo ụmụnna anyị ebubo [Setan], bụ́ onye na-ebo ha ebubo ehihie na abalị n’ihu Chineke anyị!’ ” (Mkpughe 12:10) Ị̀ hụrụ ihe abụọ ndị dị nnọọ mkpa a kọwara n’amaokwu Bible ahụ? Nke mbụ, Alaeze Chineke nke dị n’aka Jizọs Kraịst malitere ịchị. Nke abụọ, e si n’eluigwe chụdata Setan n’ụwa.

13 Gịnị siworo n’ihe abụọ ndị ahụ merenụ pụta? Banyere ihe mere n’eluigwe, anyị na-agụ, sị: “N’ihi nke a na-aṅụrịnụ ọṅụ, unu eluigwe nile na unu ndị bi n’ime ha!” Ee, ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị nọ n’eluigwe, na-aṅụrị ọnụ n’ihi na, ebe ọ bụ na Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya anọghịzi ebe ahụ, ndị nile nọ n’eluigwe na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova Chineke. N’ebe ahụ, e nwere udo na ịdị n’otu zuru ezu, nke na-adịgide adịgide. A na-emezi uche Chineke n’eluigwe.

14 Otú ọ dị, gịnị banyere ụwa? Bible na-ekwu, sị: “Ahụhụ ga-adịrị ụwa, dịkwara oké osimiri, n’ihi na Ekwensu arịdakwuruwo unu, na-ewe oké iwe, ebe ọ maara na o nwere oge dị mkpirikpi.” (Mkpughe 12:12) Iwe ji Setan n’ihi nchụpụ a chụpụrụ ya n’eluigwe nakwa n’ihi oge dị mkpirikpi o nwere. N’iwe, ọ na-akpata nhụjuanya, ma ọ bụ “ahụhụ,” n’ụwa. Anyị ga-amụkwu banyere “ahụhụ” ahụ n’isiakwụkwọ na-esonụ. Ma, n’ihi ọnọdụ a e nwere, anyị pụrụ ịjụ, sị, Olee otú Alaeze ahụ ga-esi mezuo uche Chineke n’ụwa?

15 Ọ dị mma, cheta ihe bụ́ nzube Chineke maka ụwa. Ị gụrụ ya n’Isi nke 3 n’akwụkwọ a. N’Iden, Chineke gosiri na nzube ya bụ ka ụwa a bụrụ paradaịs nke agbụrụ ụmụ mmadụ bụ́ ndị ezi omume, ndị na-agaghị anwụ anwụ, jupụtara. Setan mere ka Adam na Iv mehie, nke ahụ mere ka nzube Chineke maka ụwa ghara imezu ozugbo ma o meghị ka ọ gbanwee. Nzube Jehova ka bụ na “ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29) Alaeze Chineke ga-emezu nke ahụ. Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa?

Nchụpụ a chụpụrụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’eluigwe kpatara ahụhụ n’ụwa Nsogbu ndị dị otú ahụ ga-akwụsị n’oge na-adịghị anya

Agha, ime ihe ike na ụkọ nri

16 Tụlee amụma dị na Daniel 2:44. N’ebe ahụ, anyị na-agụ, sị: “N’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a, ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.” Gịnị ka nke a na-agwa anyị banyere Alaeze Chineke?

17 Nke mbụ, ọ na-agwa anyị na a gaje iguzobe Alaeze Chineke “n’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a,” ma ọ bụ mgbe alaeze ndị ọzọ ka na-achị. Nke abụọ, ọ na-agwa anyị na Alaeze ahụ ga-adịru mgbe ebighị ebi. Ọ dịghị ọchịchị ọzọ ga-emeri ma ọ bụ nọchie ya. Nke atọ, anyị hụrụ na Alaeze Chineke na alaeze ndị dị n’ụwa a ga-alụ agha. Alaeze Chineke ga-emeri ha. N’ikpeazụ, ọ ga-abụ nanị ọchịchị ga-achị ihe a kpọrọ mmadụ. Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-anụ ụtọ ọchịchị kasị mma.

18 Bible nwere ọtụtụ ihe ikwu banyere agha ikpeazụ ahụ Alaeze Chineke na ọchịchị dị iche iche nke ụwa a ga-alụ. Dị ka ihe atụ, ọ na-akụzi na ka ọgwụgwụ na-eru nso, ndị ajọ mmụọ ga-agbasa ụgha iji duhie “ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi.” Maka nzube dị aṅaa? “Ịchịkọta ha [ndị eze ahụ] ọnụ gaa n’agha nke oké ụbọchị nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile.” A ga-achịkọta ndị eze nke elu ụwa a ọnụ “n’ebe a na-akpọ Ha-Magedọn n’asụsụ Hibru.” (Mkpughe 16:14, 16) N’ihi ihe e kwuru n’amaokwu abụọ ndị ahụ, a na-akpọ agha ikpeazụ ọchịchị ụmụ mmadụ na Alaeze Chineke ga-alụ agha Ha-Magedọn, ma ọ bụ Amagedọn.

19 Gịnị ka Alaeze Chineke ga-arụzu site n’Amagedọn? Cheedị ọzọ ihe bụ́ nzube Chineke maka ụwa. Jehova Chineke zubere ka agbụrụ ụmụ mmadụ zuru okè, bụ́ ndị ezi omume, ndị na-ejere ya ozi na Paradaịs, jupụta ụwa. Gịnị mere na nke ahụ emezubeghị ugbu a? Nke mbụ, anyị na-eme mmehie, na-ada ọrịa, na-anwụkwa anwụ. Otú ọ dị, anyị mụrụ n’Isi nke 5 n’akwụkwọ a na Jizọs nwụrụ n’ihi anyị ka anyị wee dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ma eleghị anya, ị na-echeta ihe e dere n’Oziọma Jọn: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16.

20 Nsogbu ọzọ e nwere bụ na ọtụtụ ndị na-eme ihe ọjọọ. Ha na-agha ụgha, na-egwu wayo, na-emekwa omume rụrụ arụ. Ha achọghị ime uche Chineke. A ga-ebibi ndị na-eme ihe ọjọọ n’agha Chineke bụ́ Amagedọn. (Abụ Ọma 37:10) Ihe ọzọkwa mere na a dịghị eme uche Chineke n’ụwa bụ na gọọmentị dị iche iche adịghị akpali ndị mmadụ ime ya. Ọtụtụ gọọmentị abụwo ndị na-adịghị ike, ndị na-emekpọ ndị mmadụ ọnụ, ma ọ bụ ndị na-adịghị akwụwa aka ọtọ. Bible na-ekwu, hoo haa, sị: “Mmadụ nwere ike n’ahụ́ mmadụ ibe ya imejọ ya.”—Eklisiastis 8:9.

21 Amagedọn gasịa, ihe a kpọrọ mmadụ ga-anọ n’okpuru nanị otu ọchịchị, Alaeze Chineke. Alaeze ahụ ga-emezu uche Chineke, ọ ga-ewetakwa ngọzi ndị magburu onwe ha. Dị ka ihe atụ, ọ ga-ewepụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya. (Mkpughe 20:1-3) A ga-eji uru nke àjà Jizọs mee ihe iji mee ka ụmụ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi gharazie ịdị na-arịa ọrịa na ịdị na-anwụ anwụ. Kama nke ahụ, n’okpuru ọchịchị Alaeze ahụ, ha ga-enwe ike ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. (Mkpughe 22:1-3) A ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs. N’ihi ya, Alaeze ahụ ga-emezu uche Chineke n’ụwa, ọ ga-edokwa aha Chineke nsọ. Gịnị ka nke a pụtara? Ọ pụtara na n’ikpeazụ, mgbe Alaeze Chineke bịara, onye ọ bụla nọ ndụ ga-eto aha Jehova.

OLEE MGBE ALAEZE CHINEKE GA-EME IHE?

22 Mgbe Jizọs gwara ụmụazụ ya ka ha kpee ekpere, sị, “Ka alaeze gị bịa,” o doro anya na Alaeze ahụ abịabeghị mgbe ahụ. Ọ̀ bịara mgbe Jizọs rịgooro n’eluigwe? Ee e, n’ihi na ma Pita ma Pọl kwuchara na mgbe a kpọlitesịrị Jizọs n’ọnwụ, amụma ahụ dị n’Abụ Ọma 110:1 mezuru n’ebe ọ nọ: “Ihe nke si n’ọnụ Jehova pụta na-asị onyenwe m, Nọdụ ala n’aka nri m, ruo mgbe M ga-edo ndị iro gị ka ihe mgbakwasị dịrị ụkwụ gị abụọ.” (Ọrụ 2:32-34; Ndị Hibru 10:12, 13) E nwere oge nchere.

N’okpuru ọchịchị Alaeze ahụ, a ga-eme uche Chineke n’ụwa dịkwa ka n’eluigwe

Ọdịda Anyanwu na oké osimiri

23 Ọ̀ hà aṅaa n’ogologo? Na narị afọ nke 19, ndị ji ezi obi na-amụ Bible gụkọtara oge ma kwubie na oge nchere ahụ ga-ejedebe n’afọ 1914. (Banyere afọ a, lee Ihe Odide Ntụkwasị.) Ihe ndị malitere ime n’ụwa n’afọ 1914 gosiri na ngụkọta oge nke ndị ahụ ji ezi obi na-amụ Bible mere ziri ezi. Mmezu nke amụma Bible na-egosi na n’afọ 1914, Kraịst ghọrọ Eze, Alaeze eluigwe nke Chineke malitekwara ịchị. N’ihi ya, anyị na-ebi n’oge ahụ “dị mkpirikpi” nke fọdụụrụ Setan. (Mkpughe 12:12; Abụ Ọma 110:2) Anyị pụkwara ikwu hoo haa na n’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke ga-eme ihe iji mezuo uche Chineke n’ụwa. Ị̀ hụrụ nke a dị ka akụkọ dị mma? Ì kwere na nke ahụ bụ eziokwu? Isiakwụkwọ na-esonụ ga-enyere gị aka ịhụ na Bible na-akụzi ihe ndị a n’ezie.

IHE BIBLE NA-AKỤZI

  • Alaeze Chineke bụ ọchịchị eluigwe nke Jizọs Kraịst ga-achị na ya dị ka Eze, e sikwa n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ họta 144,000 iso ya chịa.—Mkpughe 14:1, 4.
  • Alaeze ahụ malitere ịchị na 1914, ọ bụkwa mgbe ahụ ka e si n’eluigwe chụdata Setan n’ụwa.—Mkpughe 12:9.
  • N’oge na-adịghị anya Alaeze Chineke ga-ebibi ọchịchị ụmụ mmadụ, ụwa ga-aghọkwa paradaịs.—Mkpughe 16:14, 16.

Ajụjụ nke Paragraf Ndị A Na-Amụ Amụ

1. Ekpere dị aṅaa, nke a ma ama, ka a ga-atụle ugbu a?

2. Gịnị bụ atọ n’ime ihe ndị Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere maka ha?

3. Olee ihe ọ dị mkpa ka anyị mata banyere Alaeze Chineke?

4. Gịnị bụ Alaeze Chineke, ònyekwa bụ Eze ya?

5. Ebee ka Alaeze Chineke ga-esi na-achị, ebeekwa ka ọ ga na-achị?

6, 7. Gịnị mere Jizọs ji bụrụ Eze pụrụ iche?

8. Ole ndị ga-eso Jizọs chịa?

9. Mmadụ ole ga-eso Jizọs chịa, oleekwa mgbe Chineke malitere ịhọpụta ha?

10. N’ihi gịnị ka ime ndokwa ka Jizọs na 144,000 chịa ihe a kpọrọ mmadụ ji bụrụ ndokwa ịhụnanya?

11. Gịnị ka Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ikpe ekpere maka ya n’ihe banyere uche Chineke?

12. Ihe abụọ ndị dị aṅaa, dị mkpa, ka a kọwara ná Mkpughe 12:10?

13. Gịnị siworo ná nchụpụ a chụpụrụ Setan n’eluigwe pụta?

14. Gịnị ka nchụda a chụdatara Setan n’ụwa na-akpata?

15. Gịnị bụ nzube Chineke maka ụwa?

16, 17. Gịnị ka Daniel 2:44 na-agwa anyị banyere Alaeze Chineke?

18. Gịnị ka a na-akpọ agha ikpeazụ ahụ Alaeze Chineke na ọchịchị nke ụwa a ga-alụ?

19, 20. Gịnị mere na a dịghị eme uche Chineke n’ụwa ugbu a?

21. Olee otú Alaeze ahụ ga-esi mezuo uche Chineke n’ụwa?

22. Olee otú anyị si mara na Alaeze Chineke abịaghị mgbe Jizọs nọ n’ụwa ma ọ bụ ozugbo a kpọlitesịrị ya n’ọnwụ?

23. (a) Olee mgbe Alaeze Chineke malitere ịchị? (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiakwụkwọ na-esonụ?

GỤKWUO GBASARA YA

Gwa Anyị Ka Anyị na Gị Mụwa Baịbụl

Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị?

Baịbụl na-enyere ọtụtụ ndị aka ịmata azịza ajụjụ ndị dị ezigbo mkpa. Ị̀ ga-achọ ka Baịbụl nyere gị aka?