Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

ISI NKE ASA

Ezigbo Olileanya nke Dịịrị Ndị Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ

Ezigbo Olileanya nke Dịịrị Ndị Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ

Olee otú anyị si mara na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ n’ezie?

Olee otú ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ na-adị Jehova?

Ole ndị ka a ga-akpọlite n’ọnwụ?

KA E were ya na ajọ onye iro na-achụ gị ọsọ. Ọ ka gị nnọọ ike, na-efekwa ọsọ karịa gị. Ị ma na ọ naghị emere mmadụ ebere n’ihi na ị hụwo ka o gburu ụfọdụ ndị enyi gị. N’agbanyeghị otú i si na-agbalị ịgbanahụ ya, ọ na-achụkwute gị. O yiri ka olileanya ọ bụla adịghị. Otú ọ dị, na mberede, otu onye abịa ịnapụta gị. Ọ ka onye iro gị ahụ ike okpukpu okpukpu, ya ekweekwa gị nkwa na ya ga-enyere gị aka. Lee ka nke ahụ na-aghaghị isiwo mee ka i kuda ume!

2 Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, onye iro dị otú ahụ na-achụ gị ọsọ. Ọ na-achụkwa anyị nile ọsọ. Dị ka anyị hụrụ n’isiakwụkwọ bu nke a ụzọ, Bible kpọrọ ọnwụ onye iro. Ọ dịghị onye n’ime anyị pụrụ ịgbanahụ ma ọ bụ zere ya. Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị ahụwo ka onye iro a gburu ndị anyị hụrụ n’anya. Ma Jehova ka ọnwụ ike okpukpu okpukpu. Ọ bụ ya bụ Onye Nnapụta ahụ nke gosiwororịị na ya pụrụ imeri onye iro a. O kwewokwa nkwa ibibi onye iro a, bụ́ ọnwụ, kpamkpam. Bible na-akụzi, sị: “Dị ka onye iro ikpeazụ, a gaje ime ka ọnwụ ghara ịdị irè.” (1 Ndị Kọrint 15:26) Nke ahụ bụ akụkọ ọma!

3 Ka anyị tụletụ mmetụta anyị na-enwe mgbe onye iro a gburu onye anyị maara. Nke ahụ ga-enyere anyị aka ịghọta otu ihe ga-eme ka anyị nwee obi ụtọ. Leenụ, Jehova na-ekwe nkwa na ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ. (Aịsaịa 26:19) A ga-akpọlite ha n’ọnwụ. Nke ahụ bụ olileanya mbilite n’ọnwụ.

MGBE ONYE Ị HỤRỤ N’ANYA NWỤRỤ

4 Ò nwewo onye ị hụrụ n’anya nwụnahụrụ gị? Ihe mgbu, iru újú, na nkụda mmụọ ọ na-akpata pụrụ iyi ihe a na-apụghị ịnagide anagide. N’oge ndị dị otú a, ọ ga-adị anyị mkpa inweta nkasi obi n’Okwu Chineke. (2 Ndị Kọrint 1:3, 4) Bible na-enyere anyị aka ịghọta otú ọnwụ mmadụ na-adị Jehova na Jizọs. Jizọs, bụ́ onye yiri nnọọ Nna ya, enwetụwo ihe mgbu nke ịbụ onye mmadụ nwụnahụrụ. (Jọn 14:9) Mgbe Jizọs nọ na Jeruselem, ọ na-adị aga na nke Lazarọs na ụmụnne ya ndị nwanyị, bụ́ Meri na Mata, bụ́ ndị bi n’obodo dị nso, bụ́ Betani. Ha na ya ghọrọ ezi ndị enyi. Bible na-ekwu, sị: “Jizọs hụrụ Mata na nwanne ya nwanyị na Lazarọs n’anya.” (Jọn 11:5) Otú ọ dị, dị ka anyị gụrụ n’isiakwụkwọ bu nke a ụzọ, Lazarọs nwụrụ.

5 Olee otú ọ dị Jizọs mgbe enyi ya nwụrụ? Ihe ndekọ ahụ na-agwa anyị na Jizọs bịakwutere ndị ikwu na ndị enyi Lazarọs ka ha na-eru újú ọnwụ Lazarọs. Mgbe Jizọs hụrụ ha, o metụrụ ya n’ahụ́ nke ukwuu. Ọ “sụrụ ude n’ime mmụọ ya, o nyekwara ya nsogbu.” Mgbe ahụ, ihe ndekọ ahụ na-ekwu, sị, “Anya mmiri gbara Jizọs.” (Jọn 11:33, 35) Újú ahụ Jizọs ruru ò gosiri na o nweghị olileanya? Ọ dịghị ma ọlị. N’eziokwu, Jizọs maara na ihe dị ebube na-aga ime. (Jọn 11:3, 4) N’agbanyeghị nke ahụ, o nwere ihe mgbu na mwute nke ọnwụ na-akpata.

6 N’ụzọ ụfọdụ, újú ahụ Jizọs ruru bụụrụ anyị ihe agbamume. Ọ na-akụziri anyị na Jizọs na Nna ya, bụ́ Jehova, kpọrọ ọnwụ asị. Ma Jehova Chineke pụrụ ịlụso onye iro ahụ ọgụ, meriekwa ya! Ka anyị hụ ihe Chineke mere ka Jizọs nwee ike ime.

“LAZARỌS, PỤTA!”

7 E liworị Lazarọs n’ime ọgba, Jizọs kwukwara ka e bupụ nkume e ji buchie ọnụ ili ahụ. Mata jụrụ na a gaghị ebupụ ya n’ihi na o ruola abalị anọ Lazarọs nwụrụ, ọ ghaghị ịbụ na ozu ya amalitela isi ísì. (Jọn 11:39) A bịa n’otú mmadụ si ele ihe anya, olileanya ọ bụla adịghị.

8 E bupụrụ nkume ahụ, Jizọs jikwa olu dara ụda kwuo, sị: “Lazarọs, pụta!” Gịnị meziri? “Nwoke ahụ nwụworo anwụ pụtara.” (Jọn 11:43, 44) Chegodị ụdị ọṅụ ndị nọ n’ebe ahụ na-aghaghị inwewo? Ma Lazarọs ọ̀ bụ nwanne ha, onye ikwu ha, enyi ha, ma ọ bụ onye agbata obi ha, ha maara na ọ nwụwo. Ma, lee ya—otu nwoke ahụ ha hụrụ n’anya—ka o guzo n’etiti ha ọzọ. Nke ahụ aghaghị iyiwo ihe na-apụghị ime eme. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọtụtụ ndị ji obi ụtọ makụọ Lazarọs. E wee si otú ahụ merie ọnwụ!

Mkpọlite a kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ kpatara oké ọṅụ—Jọn 11:38-44

Ebe Jizọs na-akpọlite Lazarọs n’ọnwụ

9 Jizọs ekwughị na ya rụrụ ọrụ ebube a dị ịtụnanya n’ike nke onwe ya. Mgbe ọ na-ekpe ekpere tupu ya akpọọ Lazarọs òkù, o mere ka o doo anya na ọ bụ Jehova ga-eme ka a kpọlite Lazarọs n’ọnwụ. (Jọn 11:41, 42) Ọ bụghị nanị n’oge ahụ ka Jehova jiri ike ya mee ihe n’ụzọ dị otú a. Mkpọlite a kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ bụ nnọọ otu n’ime mbilite n’ọnwụ itoolu e dekọrọ n’Okwu Chineke.* Ịgụ na ịmụ banyere akụkọ ndị a na-enye obi ụtọ. Ha na-akụziri anyị na Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, n’ihi na ndị a kpọlitere n’ọnwụ gụnyere ụmụntakịrị na ndị okenye, ndị ikom na ndị inyom, ụmụ Izrel na ndị na-abụghị ụmụ Izrel. Ị̀ hụkwara ụdị ọṅụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ kọwapụtara? Dị ka ihe atụ, mgbe Jizọs kpọlitere otu nwatakịrị nwanyị n’ọnwụ, ndị mụrụ ya ‘jupụtara n’oké obi ụtọ.’ (Mak 5:42) Ee, Jehova emewo ihe nyere ha obi ụtọ, bụ́ nke ha na-agaghị echefu echefu.

10 N’ezie, ndị ahụ Jizọs mere ka ha si n’ọnwụ bilie mesịkwara nwụọ. Nke a ọ̀ na-egosi na mkpọlite a kpọlitere ha n’ọnwụ enweghị isi? Ọ dịghị ma ọlị. Akụkọ ndị a e dekọrọ na Bible na-akwado eziokwu ndị dị mkpa ma na-eme ka anyị nwee olileanya.

ỊMỤTA IHE N’AKỤKỌ BANYERE MBILITE N’ỌNWỤ

Ịlaịja, nwanyị di ya nwụrụ na nwa ya nwoke a kpọlitere n’ọnwụ

Ịlaịja kpọlitere nwa nwoke nke otu nwanyị di ya nwụrụ —1 Ndị Eze 17:17-24

11 Bible na-akụzi na ndị nwụrụ anwụ “adịghị ama ihe ọ bụla.” Ha adịghị ndụ n’ebe ọ bụla. Akụkọ banyere Lazarọs na-akwado eziokwu a. Mgbe Lazarọs bilitere n’ọnwụ, ọ̀ kọọrọ ndị mmadụ akụkọ ndị dị ụtọ banyere eluigwe ma ọ bụ kọọrọ ha ihe ndị na-emenye egwu banyere ọkụ ala mmụọ? Ee e. Bible ekwughị na Lazarọs kọrọ akụkọ ndị dị otú ahụ. N’ime ụbọchị anọ ahụ ọ nwụrụ anwụ, ọ ‘maghị ihe ọ bụla.’ (Eklisiastis 9:5) Ọ bụ nanị ụra ọnwụ ka Lazarọs nọ na-ehi.—Jọn 11:11.

12 Akụkọ banyere Lazarọs na-akụzikwara anyị na a kpọlitere ya n’ọnwụ n’ezie, ọ bụghị akụkọ ifo. Jizọs kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ n’ihu ìgwè mmadụ. Ọbụna ndị ndú okpukpe, bụ́ ndị kpọrọ Jizọs asị, ekwughị na ọ rụghị ọrụ ebube a. Kama nke ahụ, ha kwuru, sị: “Gịnị ka anyị ga-eme, n’ihi na nwoke a [Jizọs] na-eme ọtụtụ ihe ịrịba ama?” (Jọn 11:47) Ọtụtụ ndị gara ịhụ nwoke ahụ a kpọlitere n’ọnwụ. N’ihi ya, ọbụna ụfọdụ n’ime ha bịara nwee okwukwe n’ebe Jizọs nọ. Ha ghọtara na Lazarọs bụ ihe àmà a na-ahụ anya na-egosi na ọ bụ Chineke zitere Jizọs. Ihe àmà a gbara nnọọ ọkpụrụkpụ nke na ụfọdụ ndị ndú okpukpe ndị Juu obi tara mmiri gbara izu igbu ma Jizọs ma Lazarọs.—Jọn 11:53; 12:9-11.

Ebe Pita na-akpọlite Dọkas n’ọnwụ

Pita onyeozi kpọlitere nwanyị bụ́ Onye Kraịst, nke aha ya bụ Dọkas, n’ọnwụ—Ọrụ 9:36-42

13 Ọ̀ bụ ihe ezi uche na-adịghị na ya ikwere na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ezie? Ee e, n’ihi na Jizọs kụziri na otu ụbọchị, a ga-akpọlite “ndị nile nọ n’ili ncheta.” (Jọn 5:28) Ọ bụ Jehova kere ihe nile dị ndụ. Ò kwesịrị ịbụ ihe siri ike ikwere na ọ pụrụ ime ka mmadụ dịghachi ndụ? N’ezie, ọ ga-adabere n’ụzọ ka ukwuu n’ikike ncheta Jehova. Ọ̀ pụrụ icheta ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ? Ọtụtụ puku ijeri kpakpando jupụtara na mbara igwe, ma Chineke na-akpọ nke ọ bụla n’aha! (Aịsaịa 40:26) Ya mere, Jehova Chineke pụrụ icheta ihe nile banyere ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ, ọ dịkwa njikere ime ka ha dịghachi ndụ.

14 Otú ọ dị, olee otú ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ na-adị Jehova? Bible na-akụzi na ọ na-anụ ya ọkụ n’obi ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. Nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi jụrụ, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ ga-adị ndụ ọzọ?” Job nọ na-ekwu banyere ịnọ n’ili chere ruo mgbe Chineke ga-echeta ya. Ọ gwara Jehova, sị: “Ị ga-akpọ òkù, mụ onwe m ga-azakwa Gị: agụụ ọrụ aka Gị ga-agụ Gị.”—Job 14:13-15.

15 Chegodị echiche! Ọ na-agụsi Jehova agụụ ike n’ezie ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. Ọ́ bụghị ihe obi ụtọ ịmara na ọ na-adị Jehova otú ahụ? Ma, gịnị banyere mbilite n’ọnwụ a a ga-enwe n’ọdịnihu? Ole ndị ka a ga-akpọlite n’ọnwụ, n’ole ebe kwa?

“NDỊ NILE NỌ N’ILI NCHETA”

16 Akụkọ banyere mbilite n’ọnwụ ndị e dekọrọ na Bible na-akụziri anyị ihe dị ukwuu banyere mbilite n’ọnwụ ahụ a ga-enwe n’ọdịnihu. Ndị a kpọlitere n’ọnwụ n’ụwa ebe a soroghachiri ndị ha hụrụ n’anya na-emekọ ihe. Mbilite n’ọnwụ a ga-enwe n’ọdịnihu ga-adị ka ya—ma ọ ga-aka ya nnọọ mma. Dị ka anyị mụrụ n’Isi nke 3 nke akwụkwọ a, nzube Chineke bụ ka e mee ka ụwa nile ghọọ paradaịs. N’ihi ya, a gaghị akpọlite ndị nwụrụ anwụ ịdị ndụ n’ụwa nke agha, ime mpụ, na ọrịa jupụtara. Ha ga-enwe ohere nke ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ụwa a n’udo nakwa n’obi ụtọ.

17 Ole ndị ka a ga-akpọlite n’ọnwụ? Jizọs kwuru na “ndị nile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu [Jizọs] wee pụta.” (Jọn 5:28, 29) N’otu aka ahụ, Mkpughe 20:13 na-ekwu, sị: “Oké osimiri hapụkwara ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ya, ọnwụ na Hedis hapụkwara ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ha.” “Hedis” na-ezo aka n’ili nke ihe a kpọrọ mmadụ. (Lee Ihe Odide Ntụkwasị.) Ili a nke ihe a kpọrọ mmadụ ga-atọgbọrọ chakoo. Ijeri mmadụ ahụ nile na-ezu ike n’ebe ahụ ga-adị ndụ ọzọ. Pọl onyeozi kwuru, sị: “A gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” (Ọrụ 24:15) Gịnị ka nke ahụ pụtara?

18 “Ndị ezi omume” na-agụnye ọtụtụ ndị anyị na-agụ banyere ha n’ime Bible bụ́ ndị dịrị ndụ tupu Jizọs abịa n’ụwa. Ndị dị ka Noa, Ebreham, Sera, Mozis, Rut, Esta, na ọtụtụ ndị ọzọ pụrụ ịgbata gị n’uche. Ná Ndị Hibru isi 11, e kwuru okwu banyere ụfọdụ n’ime ndị ikom na ndị inyom ndị a nwere okwukwe siri ike. Ma “ndị ezi omume” na-agụnyekwa ndị ohu Jehova, bụ́ ndị nwụrụ n’oge anyị a. N’ihi olileanya nke mbilite n’ọnwụ, anyị pụrụ ịkwụsị ịtụ ụjọ ọnwụ.—Ndị Hibru 2:15.

Na Paradaịs, a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, ha ga-esoroghachikwa ndị ha hụrụ n’anya na-emekọ ihe

Ndị a kpọlitere n’ọnwụ na Paradaịs

19 Gịnị banyere ndị nile na-ejereghị Jehova ozi ma ọ bụ rubere ya isi n’ihi na ha anụghị banyere ya? A gaghị echezọ ọtụtụ ijeri “ndị ajọ omume” a. A ga-akpọlitekwa ha n’ọnwụ ma nye ha ohere ịmụta banyere ezi Chineke ahụ na ijere ya ozi. N’ime otu puku afọ, a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, nyekwa ha ohere isoro ụmụ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi n’ụwa na-ejere Jehova ozi. Oge ahụ ga-amagbu onwe ya. Bible na-akpọ oge ahụ Ụbọchị Ikpe.#

20 Nke a ọ̀ pụtara na a ga-akpọlite ndị nile nwụrụ anwụ? Ee e. Bible na-ekwu na ụfọdụ n’ime ndị nwụrụ anwụ nọ na “Gehena.” (Luk 12:5) E nwetara aha ahụ bụ́ Gehena site n’aha nke ebe a na-ekpofu ihe, nke dị n’azụ mgbidi Jeruselem oge ochie. Ọ bụ n’ebe ahụ ka a na-akpọ ozu na ihe mkpofu ọkụ. Ndị Juu weere ndị a tụnyere ozu ha n’ebe ahụ dị ka ndị a na-ekwesịghị ili eli nakwa ndị a na-ekwesịghị ịkpọlite n’ọnwụ. N’ihi ya, Gehena bụ ihe atụ kwesịrị ekwesị nke mbibi ebighị ebi. Ọ bụ ezie na Jizọs ga-ekere òkè n’ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe, ọ bụ Jehova bụ O kpechaa o bie. (Ọrụ 10:42) Ọ dịghị mgbe ọ ga-akpọlite ndị ọ mara ikpe na ndị na-achọghị ịgbanwe.

“MBILITE N’ỌNWỤ MBỤ”

21 Bible na-akọwakwa ụdị mbilite n’ọnwụ ọzọ, bụ́ nke a na-akpọ “mbilite n’ọnwụ mbụ.” (Mkpughe 20:6) Ọ bụ nanị otu ihe atụ nke ụdị mbilite n’ọnwụ a ka e dekọrọ na Bible, nke Jizọs Kraịst.

22 Mgbe e gbusịrị Jizọs n’oge ọ bụ mmadụ, Jehova ahapụghị Ọkpara Ya kwesịrị ntụkwasị obi ka ọ nọgide n’ili. (Abụ Ọma 16:10; Ọrụ 13:34, 35) Chineke kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, ma ọ bụghị dị ka mmadụ. Pita onyeozi kọwara na ‘e mere ka Kraịst nwụọ n’anụ ahụ́, e mekwara ka ọ dị ndụ na mmụọ.’ (1 Pita 3:18) Nke ahụ bụ n’ezie nnukwute ọrụ ebube. Jizọs dịghachiri ndụ dị ka mmụọ dị ike! (1 Ndị Kọrint 15:3-6) Jizọs bụ onye mbụ e si n’ụzọ dị ebube otú a kpọlite n’ọnwụ. (Jọn 3:13) Ma, ọ gaghị abụ onye ikpeazụ a ga-akpọlite n’ọnwụ otú ahụ.

23 Ebe ọ maara na n’oge na-adịghị anya na ya ga-alaghachi eluigwe, Jizọs gwara ụmụazụ ya kwesịrị ntụkwasị obi na ya ‘ga-akwadebere ha ebe.’ (Jọn 14:2) Jizọs kpọrọ ndị ga-aga eluigwe “ìgwè atụrụ nta.” (Luk 12:32) Mmadụ ole ga-emejupụta ìgwè a dị nta nke Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi? Dị ka Mkpughe 14:1 na-egosi, Jọn onyeozi na-ekwu, sị: “M wee hụ, ma, lee! Nwa Atụrụ ahụ ka ọ na-eguzo n’elu Ugwu Zaịọn, ya na narị puku na iri puku anọ na anọ, bụ́ ndị e dekwasịrị aha ya na aha Nna ya n’egedege ihu ha.”

24 A na-akpọlite Ndị Kraịst ndị a dị 144,000, nke gụnyekwara ndịozi kwesịrị ntụkwasị obi nke Jizọs, gaa ná ndụ nke eluigwe. Olee mgbe a ga-akpọlite ha n’ọnwụ? Pọl onyeozi dere na ọ bụ n’oge ọnụnọ Kraịst. (1 Ndị Kọrint 15:23) Dị ka ị ga-ahụ n’Isi nke 9 nke akwụkwọ a, anyị na-ebi n’oge ahụ ugbu a. N’ihi ya, a na-akpọlite mmadụ ole na ole ahụ fọdụrụ n’ime 144,000, bụ́ ndị na-anwụ n’oge anyị a, gaa ná ndụ nke eluigwe. (1 Ndị Kọrint 15:51-55) Otú ọ dị, imerime mmadụ nwere atụmanya nke ịbụ ndị a kpọlitere n’ọnwụ n’ọdịnihu ibi na Paradaịs n’elu ala.

25 N’ezie, Jehova ga-emeri onye iro anyị bụ́ ọnwụ, ọ gaghịkwa adị ọzọ ruo mgbe ebighị ebi! (Aịsaịa 25:8) Ma, ị pụrụ ịjụ, sị, ‘Gịnị ka ndị ahụ a kpọlitere gaa ná ndụ eluigwe ga-eme ebe ahụ?’ Ha ga-eso chịa n’ọchịchị Alaeze dị ebube n’eluigwe. Anyị ga-amụkwu banyere ọchịchị ahụ n’isiakwụkwọ na-esonụ.

IHE BIBLE NA-AKỤZI

  • Akụkọ banyere mbilite n’ọnwụ nke e dekọrọ na Bible na-eme ka anyị nwee olileanya e ji n’aka.—Jọn 11:39-44.
  • Ọ na-agụsi Jehova agụụ ike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ.—Job 14:13-15.
  • A ga-akpọlite ndị nile nọ n’ili nke ihe a kpọrọ mmadụ.—Jọn 5:28, 29.

*  Akụkọ ndị ọzọ dị ná 1 Ndị Eze 17:17-24; 2 Ndị Eze 4:32-37; 13:20, 21; Matiu 28:5-7; Luk 7:11-17; 8:40-56; Ọrụ 9:36-42; na 20:7-12.

#  Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere Ụbọchị Ikpe nakwa ihe a ga-adabere na ya kpee ikpe ahụ, biko lee Ihe Odide Ntụkwasị.


Ajụjụ nke Paragraf Ndị A Na-Amụ Amụ

1-3. Olee onye iro na-achụ anyị nile ọsọ, n’ihi gịnịkwa ka ịtụle ihe Bible na-akụzi ji akasi anyị obi?

4. (a) Gịnị ka mmetụta Jizọs nwere mgbe onye ọ hụrụ n’anya nwụrụ na-akụziri anyị banyere mmetụta Jehova na-enwe? (b) Ọbụbụenyi dị aṅaa pụrụ iche ka Jizọs zụlitere?

5, 6. (a) Olee otú Jizọs si meghachi omume mgbe ọ bịakwutere ndị ezinụlọ na ndị enyi Lazarọs, bụ́ ndị nọ na-eru újú? (b) N’ihi gịnị ka újú Jizọs ruru ji bụụrụ anyị ihe na-agba ume?

7, 8. N’ihi gịnị ka ọnọdụ Lazarọs pụrụ ijiwo yie ihe olileanya na-adịghị na ya n’anya ndị na-ekiri ihe na-emenụ, ma gịnị ka Jizọs mere?

9, 10. (a) Olee otú Jizọs si mee ka a mara Onye nyere ya ike o ji kpọlite Lazarọs n’ọnwụ? (b) Olee ụfọdụ uru ndị a na-enweta site n’ịgụ akụkọ banyere mbilite n’ọnwụ ndị e dekọrọ na Bible?

11. Olee otú akụkọ banyere mbilite n’ọnwụ Lazarọs si enye aka n’ịkwado eziokwu ahụ e dekọrọ n’Eklisiastis 9:5?

12. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji jide n’aka na a kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ n’ezie?

13. Ihe ndabere dị aṅaa ka anyị nwere maka ikwere na Jehova pụrụ n’ezie ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ?

14, 15. Dị ka ihe Job kwuru na-egosi, olee otú ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ na-adị Jehova?

16. N’ụdị ọnọdụ ndị dị aṅaa ka a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ ibi na ha?

17. Oleecha ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ?

18. Ole ndị so ná “ndị ezi omume” ahụ a ga-akpọlite n’ọnwụ, oleekwa otú olileanya a pụrụ isi metụta gị onwe gị?

19. Ole ndị bụ “ndị ajọ omume,” gịnịkwa ka Jehova ji obiọma na-enye ha ohere ime?

20. Gịnị bụ Gehena, ole ndị kwa na-aga na ya?

21, 22. (a) Gịnị bụ “mbilite n’ọnwụ mbụ”? (b) Ònye bụ Onye mbụ a kpọlitere n’ọnwụ dị ka mmụọ?

23, 24. Ole ndị mejupụtara “ìgwè atụrụ nta” Jizọs, ole kwa ka ha dị?

25. Gịnị ka a ga-atụle n’isiakwụkwọ na-esonụ?