Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

ISI NKE IRI NA ASAA

Bịaruo Chineke Nso n’Ekpere

Bịaruo Chineke Nso n’Ekpere

N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịdị na-ekpegara Chineke ekpere?

Olee ihe anyị na-aghaghị ime ka Chineke wee nụ ekpere anyị?

Olee otú Chineke si aza ekpere anyị?

ỤWA pere nnọọ mpe ma e jiri ya tụnyere mbara igwe. N’eziokwu, n’anya Jehova, bụ́ “onye meworo eluigwe na ụwa,” mba nile dị ka otu ntụ mmiri na-atụpụ n’ite mmiri. (Abụ Ọma 115:15; Aịsaịa 40:15) N’agbanyeghị nke ahụ, Bible na-ekwu, sị: “Jehova dị nso ndị nile na-akpọku Ya, bụ́ ndị nile na-akpọku Ya n’eziokwu. Ihe dị ndị na-atụ egwu Ya ụtọ ka Ọ ga-eme; ọ bụkwa ntiku ha ka Ọ ga-anụ.” (Abụ Ọma 145:18, 19) Chegodị ihe nke ahụ pụtara! Onye Okike nke pụrụ ime ihe nile nọ anyị nso, ọ ga-anụkwa ekpere anyị ma ọ bụrụ na anyị ‘akpọkuo Ya n’eziokwu.’ Lee nnọọ ihe ùgwù anyị nwere ikpegara Chineke ekpere!

2 Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị achọọ ka Jehova nụ ekpere anyị, anyị aghaghị ikpegara ya ekpere n’ụzọ ọ na-anakwere. Anyị apụghị ime nke a ọ gwụla ma ànyị ghọtara ihe Bible na-akụzi banyere ekpere. Ọ dị mkpa ka anyị mara ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere nke a, ebe ọ bụ na ekpere na-enyere anyị aka ịbịarukwu Jehova nso.

N’IHI GỊNỊ KA A GA-EJI NA-EKPEGARA JEHOVA EKPERE?

3 Otu ihe dị mkpa mere anyị ji kwesị ịdị na-ekpegara Jehova ekpere bụ na ọ na-agba anyị ume ime otú ahụ. Okwu ya na-agba anyị ume, sị: “Unu enwela nchegbu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe nile site n’ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike ya na inye ekele, meenụ ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche nile ga-echekwa obi unu na ike iche echiche unu nche site na Kraịst Jizọs.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) N’ezie, anyị ekwesịghị ileghara ndokwa dị otú a anya, bụ́ nke Onye Ọchịchị Kasịnụ nke eluigwe na ala ji obiọma meere anyị!

Nwaanyị na-ekpe ekpere

“Onye Meworo eluigwe na ala” dị njikere ịnụ ekpere anyị

4 Ihe ọzọ mere anyị ji kwesị ịdị na-ekpe ekpere bụ na ikpegara Jehova ekpere mgbe nile bụ otu ụzọ nke isi na-ewusikwu mmekọrịta anyị na ya ike. Ezi ndị enyi adịghị ekwurịta okwu nanị mgbe ihe dị ha mkpa. Kama nke ahụ, ha na-enwe mmasị n’ebe ibe ha nọ, ọbụbụenyi ha na-esiwanyekwa ike ka ha na-agwarịta ibe ha ihe dị ha n’obi, nchegbu ha, na mmetụta ndị ha na-enwe, n’enweghị ihe mgbochi. N’ụzọ ụfọdụ, e nwere ọnọdụ yiri nke ahụ ma a bịa ná mmekọrịta anyị na Jehova Chineke. Site n’akwụkwọ a, ị mụtawo ọtụtụ ihe banyere ihe ndị Bible na-akụzi banyere Jehova, àgwà ya, na nzube ya. Ị matawo ya dị ka onye dị adị. Ekpere na-eme ka i nwee ohere ịgwa Nna gị nke eluigwe ihe dị gị n’obi. Ka ị na-eme otú ahụ, ị ga-abịarukwu Jehova nso.—Jems 4:8.

OLEE IHE NDỊ ANYỊ NA-AGHAGHỊ IME?

5 Jehova ọ̀ na-anụ ekpere nile? Tụlee ihe ọ gwara ụmụ Izrel na-enupụ isi n’oge Aịzaịa onye amụma: “Ọbụna mgbe unu na-ekpe ọtụtụ ekpere, M gaghị adị na-anụ: aka unu jupụtara n’ọbara.” (Aịsaịa 1:15) Ya mere, omume ụfọdụ pụrụ ime ka Chineke ghara ịnụ ekpere anyị. N’ihi ya, ka Chineke wee za ekpere anyị, anyị aghaghị ime ihe ụfọdụ bụ́ isi ọ chọrọ anyị n’aka.

6 Ihe bụ́ isi ọ chọrọ anyị n’aka bụ inwe okwukwe. (Mak 11:24) Pọl onyeozi dere, sị: “Ma okwukwe adịghị ọ gaghị ekwe omume ime ihe dị [Chineke] ezi mma, n’ihi na onye na-abịaru Chineke nso aghaghị ikwere na ọ dị adị, nakwa na ọ bụ onye na-akwụghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Inwe ezi okwukwe abụghị nanị ịmata na Chineke dị nakwa na ọ na-anụ ma na-aza ekpere anyị. Omume anyị ga-egosi ma ànyị nwere okwukwe. Anyị aghaghị inye ihe àmà doro anya na anyị nwere okwukwe site n’ụzọ anyị si ebi ndụ kwa ụbọchị.—Jems 2:26.

7 Jehova chọkwara ka ndị na-ekpegara ya ekpere jiri obi umeala na obi ọcha na-eme otú ahụ. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịdị umeala n’obi mgbe anyị na-agwa Jehova okwu? Mgbe ndị mmadụ nwere ohere ịgwa eze ma ọ bụ onyeisi ala okwu, ha na-ejikarị nsọpụrụ eme otú ahụ, wee na-akwanyere ọkwá ya ùgwù. Ọ̀ bụzi Jehova ka anyị na-agaghị akwanyere ùgwù mgbe anyị na-ekpegara ya ekpere? (Abụ Ọma 138:6) E kwuwerịị, ọ bụ “Chineke Nke pụrụ ime ihe nile.” (Jenesis 17:1) Mgbe anyị na-ekpegara Chineke ekpere, otú anyị si eme ya kwesịrị igosi na anyị ji obi umeala ghọta na ọ ka anyị elu. Obi umeala dị otú ahụ kwesịrị ịkpali anyị iji obi anyị dum na-ekpe ekpere, na-ezere ikpe ekpere n’otu ụzọ, ma ọ bụ ikwughachi otu ihe ugboro ugboro.—Matiu 6:7, 8.

8 Ihe ọzọ a chọrọ n’aka anyị nke ga-eme ka Chineke nụ ekpere anyị bụ na anyị ga na-eme ihe kwekọrọ n’ekpere anyị. Jehova na-atụ anya ka anyị na-agbalịsi ike ịdị na-eme dị ka ekpere anyị si dị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị ekpee ekpere, sị: “Nye anyị nri taa maka ụbọchị taa,” anyị aghaghị ịgbasi mbọ ike n’ọrụ ọ bụla anyị na-arụ. (Matiu 6:11; 2 Ndị Tesalọnaịka 3:10) Ọ bụrụ na anyị arịọ maka enyemaka iji merie otu adịghị ike anụ ahụ́, anyị aghaghị ịkpachapụ anya iji zere ọnọdụ ndị pụrụ iduba anyị n’ọnwụnwa. (Ndị Kọlọsi 3:5) Tụkwasị n’ihe ndị a bụ́ isi a chọrọ, e nwekwara ajụjụ ndị a na-ajụ banyere ekpere bụ́ ndị ọ dị anyị mkpa ka a zaa.

ỊZA AJỤJỤ ỤFỌDỤ BANYERE EKPERE

9Ònye ka anyị kwesịrị ikpegara ekpere? Jizọs kụziiri ụmụazụ ya ikpegara “Nna anyị nke nọ n’eluigwe” ekpere. (Matiu 6:9) N’ihi ya, anyị kwesịrị ikpegara nanị Jehova Chineke ekpere. Otú ọ dị, Jehova na-achọ ka anyị kwanyere ọkwá nke Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, bụ́ Jizọs Kraịst, ùgwù. Dị ka anyị hụrụ n’Isi nke 5 nke akwụkwọ a, e zitere Jizọs n’ụwa dị ka onye mgbapụta iji gbapụta anyị ná mmehie na ọnwụ. (Jọn 3:16; Ndị Rom 5:12) Ọ bụ ya bụ Nnukwu Onye Nchụàjà na Onyeikpe a họpụtara ahọpụta. (Jọn 5:22; Ndị Hibru 6:20) N’ihi ya, Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị ka anyị na-ekpe ekpere site n’aha Jizọs. Jizọs n’onwe ya kwuru, sị: “Abụ m ụzọ na eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.” (Jọn 14:6) Ka e wee nụ ekpere anyị, anyị aghaghị ikpegara nanị Jehova ekpere site n’aha Ọkpara ya.

10Ọ̀ bụ iwu na a ga-enwe otú pụrụ iche anyị na-aghaghị isi nọrọ mgbe anyị na-ekpe ekpere? Ee e. Jehova ekwughị na ọ dị otu ụzọ anyị na-aghaghị isi nọrọ ma ọ bụ debe aka. Bible na-akụzi na e nwere ụzọ ndị kwesịrị ekwesị a pụrụ isi nọrọ kpee ekpere. Ha na-agụnye ịnọdụ ala, ihulata isi, igbu ikpere n’ala, na iguzo ọtọ. (1 Ihe E Mere 17:16; Nehemaịa 8:6; Daniel 6:10; Mak 11:25) Ihe dị mkpa n’ezie abụghị otú pụrụ iche a pụrụ isi nọrọ bụ́ nke ndị ọzọ pụrụ ịhụ anya, kama ọ bụ ọnọdụ obi ziri ezi. N’ezie, mgbe anyị na-eme ihe ndị anyị na-eme kwa ụbọchị ma ọ bụ chee ọnọdụ chọrọ ime ihe ngwa ngwa ihu, anyị pụrụ ịnọ ebe ọ bụla anyị nọ kpee ekpere n’obi anyị. Jehova na-anụ ekpere ndị dị otú ahụ n’agbanyeghị na e nwere ike ndị ọzọ nọ anyị nso agatụdịghị ama na anyị kpere ekpere.—Nehemaịa 2:1-6.

11Olee ihe ndị anyị pụrụ ikpe ekpere maka ha? Bible na-akọwa, sị: “N’agbanyeghị ihe ọ bụ nke anyị na-arịọ dị ka uche ya si dị, ọ [Jehova] na-anụ olu anyị.” (1 Jọn 5:14) N’ihi ya, anyị pụrụ ikpe ekpere maka ihe ọ bụla kwekọrọ n’uche Chineke. Ọ̀ bụ uche ya ka anyị na-ekpe ekpere banyere ihe ndị na-enye anyị nsogbu n’obi? Eenụ! Ikpegara Jehova ekpere dị nnọọ ka ịgwa ezi enyi okwu. Anyị pụrụ ịgwa Chineke obi anyị, ‘na-awụsị obi anyị n’ihu Ya dị ka mmiri.’ (Abụ Ọma 62:8) Anyị kwesịrị ịrịọ maka mmụọ nsọ, n’ihi na ọ ga-enyere anyị aka ime ihe ziri ezi. (Luk 11:13) Anyị pụkwara ịrịọ maka nduzi n’ime mkpebi ndị ezi uche dị na ha nakwa maka ume iji nagide ihe isi ike. (Jems 1:5) Ọ bụrụ na anyị emee mmehie, anyị kwesịrị ịrịọ maka mgbaghara mmehie dabere n’àjà mgbapụta Kraịst. (Ndị Efesọs 1:3, 7) N’ezie, ọ bụghị nanị ihe ndị metụtara anyị ka anyị kwesịrị itinye n’ekpere. Anyị kwesịrị itinye ndị ọzọ n’ekpere anyị—ndị òtù ezinụlọ anyị nakwa ndị anyị na ha na-efekọ ofufe.—Ọrụ 12:5; Ndị Kọlọsi 4:12.

Ndị na-ekpe ekpere n’oge dị iche iche

A pụrụ ịnụ ekpere gị n’oge ọ bụla

12 Anyị kwesịrị ibute ihe ndị metụtara Jehova Chineke ụzọ n’ekpere anyị. N’ezie, anyị nwere ihe mere anyị ga-eji na-enye ya otuto na ekele sitere n’obi maka ịdị mma ya nile. (1 Ihe E Mere 29:10-13) Jizọs kụziri ekpere nlereanya ahụ, nke e dekọrọ na Matiu 6:9-13, bụ́ nke o ji zi anyị ikpe ekpere ka e doo aha Chineke nsọ. Ihe ọzọ o kwukwara bụ ka Alaeze Chineke bịa nakwa ka e mee uche ya n’ụwa dị ka a na-eme ya n’eluigwe. Ọ bụ mgbe Jizọs kwusịrị ihe ndị a dị mkpa metụtara Jehova ka o kwuru okwu banyere ihe ndị na-akpa anyị. N’otu aka ahụkwa, mgbe anyị butere Chineke ụzọ n’ekpere anyị, anyị na-egosi na anyị adịghị achọ nanị ọdịmma onwe anyị.

13Olee otú ekpere anyị kwesịrị itoru ogologo? Bible ekwughị otú ekpere mmadụ na-ekpe nanị ya ma ọ bụ n’ihu ọha kwesịrị itoru ogologo. Ha pụrụ ịbụ ekpere dị mkpirikpi e kpere tupu e riwe nri ma ọ bụ ogologo ekpere onwe onye anyị nke anyị nọ na ya awụsịrị Jehova obi anyị. (1 Samuel 1:12, 15) Otú ọ dị, Jizọs katọrọ ndị bụ́ ndị ezi omume n’anya onwe ha, bụ́ ndị na-ekpe ogologo ekpere ma na-ekpe ya n’ụzọ ga-adọta mmasị ndị ọzọ. (Luk 20:46, 47) Ekpere ndị dị otú ahụ adịghị amasị Jehova. Ihe dị mkpa bụ ka anyị jiri obi anyị dum kpee ekpere. N’ihi ya, otú ekpere a na-anakwere kwesịrị itoru ogologo pụrụ ịdịgasị iche dị ka mkpa na ọnọdụ e nwere si dị.

14Ugboro ole ka anyị kwesịrị ịdị na-ekpe ekpere n’ụbọchị? Bible na-agba anyị ume ‘ikpe ekpere mgbe nile,’ ‘ịnọgidesi ike n’ekpere,’ na ‘ikpe ekpere n’akwụsịghị akwụsị.’ (Matiu 26:41; Ndị Rom 12:12; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:17) Otú ọ dị, okwu ndị a apụtaghị na anyị ga-anọrịrị na-ekpegara Jehova ekpere n’oge ọ bụla n’ụbọchị. Kama nke ahụ, Bible na-agba anyị ume ikpe ekpere mgbe mgbe, ịnọgide na-ekele Jehova maka ihe ọma ndị ọ na-emere anyị nakwa ilegara ya anya maka nduzi, nkasi obi, na ume. Ọ́ bụghị ihe na-akasi obi ịmara na Jehova ekwughị otú ekpere anyị ga-etoru ogologo ma ọ bụ ugboro ole anyị pụrụ ịgwa ya okwu n’ekpere n’ụbọchị? Ọ bụrụ n’ezie na anyị nwere ekele maka ihe ùgwù nke ikpe ekpere, anyị agaghị achọ ohere ikpegara Nna anyị nke eluigwe ekpere achọ.

15N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịsị ‘Amen’ mgbe e kpesịrị ekpere? Okwu bụ́ “amen” pụtara “ka ọ dị otú ahụ.” Ihe atụ ndị e nwere n’Akwụkwọ Nsọ na-egosi na o kwesịrị ekwesị mmadụ ịsị “Amen” mgbe o kpesịrị ekpere onwe onye ma ọ bụ mgbe e kpesịrị ekpere n’ihu ọha. (1 Ihe E Mere 16:36; Abụ Ọma 41:13) Site n’ịsị “Amen” ná ngwụsị nke ekpere anyị, anyị na-egosi na ihe ndị anyị kwuru si anyị n’obi. Mgbe anyị kwuru “Amen”—n’ime obi anyị ma ọ bụ n’olu dara ụda—ka mmadụ kpesịrị ekpere ihu ọha, anyị na-egosi na anyị kwenyere n’ihe o kwuru.—1 Ndị Kọrint 14:16.

ỤZỌ NDỊ CHINEKE SI AZA EKPERE ANYỊ

16 Jehova ọ̀ na-aza ekpere n’ezie? Eenụ! Anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji nwee obi ike na “Onye na-anụ ekpere” na-aza ekpere ọtụtụ nde mmadụ ji ezi obi na-ekpe. (Abụ Ọma 65:2) Ụzọ Jehova si aza ekpere anyị pụrụ ịdịgasị iche iche.

17 Jehova na-eji ndị mmụọ ozi ya na ndị ohu ya nọ n’ụwa aza ekpere. (Ndị Hibru 1:13, 14) E nwewo ahụmahụ nke ọtụtụ ndị rịọrọ Chineke n’ekpere maka enyemaka iji ghọta Bible, n’oge na-adịghịkwa anya ha kpesịrị ya, ha abụrụ ndị otu n’ime ndị ohu Jehova letara. Ahụmahụ ndị dị otú ahụ na-agba akaebe na ọ bụ ndị mmụọ ozi na-eduzi ọrụ nkwusa Alaeze ahụ. (Mkpughe 14:6) Iji zaa ekpere ndị anyị kpere n’oge anyị nọ nnọọ ná mkpa, Jehova pụrụ ịkpali Onye Kraịst ịgbatara anyị ọsọ enyemaka.—Ilu 12:25; Jems 2:16.

18 Jehova Chineke na-ejikwa mmụọ nsọ ya na Okwu ya, bụ́ Bible, aza ekpere ndị ohu ya. Ọ pụrụ ịza ekpere anyị na-ekpe maka enyemaka iji nagide ọnwụnwa site n’isi na mmụọ nsọ ya na-enye anyị nduzi na ume. (2 Ndị Kọrint 4:7) Ọtụtụ mgbe, anyị na-achọta azịza nke ekpere anyị na-ekpe maka enyemaka n’ime Bible, bụ́ ebe Jehova na-enyere anyị aka ime mkpebi ndị amamihe dị na ha. Anyị pụrụ ịhụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-enye aka mgbe anyị na-enwe ọmụmụ Bible onwe onye nakwa ka anyị na-agụ akwụkwọ Ndị Kraịst ndị dị ka akwụkwọ a. Ihe e kwuru ná nzukọ Ndị Kraịst ma ọ bụ ihe okenye nke ọnọdụ anyị metụrụ n’ahụ́ kwuru pụrụ ichetara anyị isi ihe ụfọdụ sitere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị dị mkpa ka anyị tụlee.—Ndị Galeshia 6:1.

Di na nwunye na-enyere enyi ha mere agadi aka

Iji zaa ekpere anyị, Jehova pụrụ ịkpali Onye Kraịst ịgbatara anyị ọsọ enyemaka

19 Ọ bụrụ na o yie ka Jehova ọ̀ na-egbu oge n’ịza ekpere anyị, ọ bụtụghị n’ihi na ọ gaghị azali ha. Kama nke ahụ, anyị aghaghị icheta na Jehova na-aza ekpere dị ka uche ya si dị nakwa n’oge nke ya. Ọ maara ihe ndị na-akpa anyị nakwa otú a ga-esi gboo ha karịa ka anyị maara. Ọtụtụ mgbe, ọ na-ahapụ anyị ka anyị ‘nọgide na-arịọ, nọgide na-achọ, ma nọgide na-akụ.’ (Luk 11:5-10) Nnọgidesi ike dị otú ahụ na-egosi Chineke na ọchịchọ anyị siri ike nakwa na okwukwe anyị bụ ezigbo ya. Ọzọkwa, Jehova pụrụ ịza ekpere anyị n’ụzọ anyị na-apụghị ịhụ anya. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịza ekpere anyị na-ekpe banyere otu ọnwụnwa, ọ bụghị site n’iwepụ ihe isi ike ahụ, kama site n’inye anyị ume iji tachie obi na ya.—Ndị Filipaị 4:13.

20 Lee nnọọ ka anyị kwesịrị isi nwee ekele na Onye Okike nke eluigwe na ala a sara mbara nọ ndị nile na-akpọku ya n’ekpere n’ụzọ kwesịrị ekwesị, nso! (Abụ Ọma 145:18) Ka anyị jiri ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa anyị nwere ikpe ekpere na-eme ihe n’ụzọ zuru ezu. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị ga-enwe ohere na-enye obi ụtọ nke ịbịaru nnọọ Jehova, bụ́ Onye na-anụ ekpere, nso.

IHE BIBLE NA-AKỤZI

  • Ikpegara Jehova ekpere mgbe nile na-enyere anyị aka ịbịaru ya nso.—Jems 4:8.
  • Ka ekpere anyị wee bụrụ nke Chineke ga-anụ, anyị aghaghị iji okwukwe na ịdị umeala n’obi na ezi obi na-ekpe ya.—Mak 11:24.
  • Anyị aghaghị ikpegara nanị Jehova ekpere site n’aha Ọkpara ya.—Matiu 6:9; Jọn 14:6.
  • Jehova, bụ́ “Onye na-anụ ekpere,” na-eji ndị mmụọ ozi ya, ndị ohu ya nọ n’ụwa, mmụọ nsọ ya, na Okwu ya aza ekpere.—Abụ Ọma 65:2.

Ajụjụ nke Paragraf Ndị A Na-Amụ Amụ

1, 2. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ile ekpere anya dị ka nnukwu ihe ùgwù, n’ihi gịnịkwa ka o ji dị mkpa ka anyị mata ihe Bible na-akụzi banyere ya?

3. Gịnị bụ otu ihe dị mkpa mere anyị ji kwesị ịdị na-ekpegara Jehova ekpere?

4. Olee otú ikpegara Jehova ekpere mgbe nile si eme ka mmekọrịta anyị na ya sikwuo ike?

5. Gịnị na-egosi na Jehova adịghị anụ ekpere nile?

6. Ka Chineke wee nụ ekpere anyị, olee ihe bụ́ isi a chọrọ anyị n’aka, oleekwa otú anyị pụrụ isi mee ya?

7. (a) N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị igosi nkwanye ùgwù mgbe anyị na-agwa Jehova okwu n’ekpere? (b) Mgbe anyị na-ekpegara Chineke ekpere, olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị dị umeala n’obi nakwa na ihe anyị na-ekwu si anyị n’obi?

8. Olee otú anyị pụrụ isi mee ihe kwekọrọ n’ekpere anyị?

9. Ònye ka anyị kwesịrị ikpegara ekpere, ọ̀ bụkwa site n’aha ònye?

10. N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị bụrụ iwu na a ga-enwe otu ụzọ anyị na-aghaghị isi nọrọ mgbe anyị na-ekpe ekpere?

11. Olee mkpa anyị ụfọdụ bụ́ ndị anyị kwesịrị itinye n’ekpere?

12. Olee otú anyị pụrụ isi bute ihe ndị metụtara Nna anyị nke eluigwe ụzọ n’ekpere anyị?

13. Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ na-egosi banyere otú ekpere a na-anakwere ga-etoru ogologo?

14. Gịnị ka Bible na-ekwu mgbe ọ na-agba anyị ume ‘ikpe ekpere mgbe nile,’ oleekwa otú nke a si bụrụ ihe na-akasi obi?

15. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịsị “Amen” mgbe anyị kpesịrị ekpere onwe onye ma ọ bụ mgbe e kpesịrị ekpere ihu ọha?

16. Obi ike dị aṅaa ka anyị pụrụ inwe banyere ekpere?

17. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Chineke na-eji ndị mmụọ ozi ya na ndị ohu ya nọ n’ụwa aza ekpere?

18. Olee otú Jehova si eji mmụọ nsọ ya na Okwu ya aza ekpere ndị ohu ya?

19. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’uche ma ọ bụrụ na o yie ka a zaghị ekpere anyị mgbe ụfọdụ?

20. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị iji ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa nke ikpe ekpere na-eme ihe n’ụzọ zuru ezu?