Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 7: Nwoke nke Nwere Obi Ike

Akụkọ nke 7: Nwoke nke Nwere Obi Ike
Inọk

KA ỌNỤ ọgụgụ ndị mmadụ na-aba ụba n’ụwa, ihe ka ọtụtụ n’ime ha mere ihe ọjọọ dị ka Ken. Ma ọ dị otu nwoke pụrụ iche. Ọ bụ nwoke nke a a na-akpọ Inọk. Inọk bụ nwoke nke nwere obi ike. Ndị nọ ya gburugburu nọ na-eme ihe ndị jọrọ nnọọ njọ, ma Inọk nọgidere na-efe Chineke.

Ị̀ ma ihe mere ndị oge ahụ ji mee ọtụtụ ihe ọjọọ? Chee echiche banyere nke a: Ònye mere ka Adam na Iv nupụrụ Chineke isi wee rie mkpụrụ osisi Chineke sịrị ha erila? Ọ bụ otu ajọ mmụọ ozi. Bible na-akpọ ya Setan. Ọ chọkwara ime ka mmadụ niile bụrụ ndị ọjọọ.

Ebe e zuru mmadụ ohi gbuokwa mmadụ

Otu ụbọchị, Jehova Chineke mere ka Inọk gwa ụmụ mmadụ ihe ha na-achọghị ịnụ. Lee ihe ọ gwara ha: ‘Otu ụbọchị, Chineke ga-ebibi ndị ọjọọ niile.’ Eleghị anya, ha were oké iwe mgbe ha nụrụ nke a. Ọ pụrụ ọbụna ịbụ na ha nwara igbu Inọk. N’ihi ya, ọ dị Inọk mkpa inwe obi ike iji gwa ha ihe Chineke gaje ime.

Chineke ekweghị ka Inọk dị ogologo ndụ n’etiti ndị ọjọọ ahụ. Inọk dịrị ndụ nanị narị afọ atọ na iri afọ isii na ise. Gịnị mere anyị ji sị “nanị narị afọ atọ na iri afọ isii na ise”? Ọ bụ n’ihi na ndị oge ahụ dị ike karịa ndị oge a, ha dịkwara ogologo ndụ karịa ndị oge a. Leenụ, Metusela nwa Inọk dịrị ndụ ruo narị afọ itoolu, iri afọ isii na itoolu!

Ndị na-eme ihe ọjọọ

Mgbe Inọk nwụrụ, ụmụ mmadụ jọrọ njọ gabiga ókè. Bible na-ekwu na ‘ihe niile nke ha na-eche n’echiche bụ nanị ihe ọjọọ mgbe niile,’ nakwa na ‘ụwa jupụtara n’ime ihe ike.’

Ị̀ ma otu n’ime ihe ndị mere nnukwu nsogbu ji jupụta n’ụwa n’oge ahụ? Ọ bụ n’ihi na Setan nwere ụzọ ọhụrụ o si eme ka ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ. Anyị ga-amụ banyere nke a n’akụkọ na-esonụ.

Jenesis 5:21-24, 27; 6:5; Ndị Hibru 11:5; Jud 14, 15.



Ajụjụ

  • Olee otú Inọk si bụrụ onye dị iche?
  • N’ihi gịnị ka ndị dịrị ndụ n’oge Inọk ji mee nnọọ ọtụtụ ihe ọjọọ?
  • Ihe ọjọọ ndị dị aṅaa ka ndị mmadụ na-eme mgbe ahụ? (Lee foto.)
  • N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka Inọk nwee obi ike?
  • Ogologo oge hà aṅaa ka ndị mmadụ na-adịru ndụ n’oge ahụ, ma afọ ole ka Inọk dịrị ndụ?
  • Gịnị mere mgbe Inọk nwụsịrị?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Jenesis 5:21-24, 27.

    Ụdị mmekọrịta dị aṅaa ka Inọk na Jehova nwere? (Jen. 5:24)

    Dị ka Bible si kwuo, ònye bụ nwoke kasị dị ogologo ndụ n’ụwa, ọ̀ dị afọ ole mgbe ọ nwụrụ? (Jen. 5:27)

  • Gụọ Jenesis 6:5.

    Olee otú ọnọdụ ụwa jọruru ná njọ mgbe Inọk nwụsịrị, oleekwa otú oge anyị si yie ya? (2 Tim. 3:13)

  • Gụọ Ndị Hibru 11:5.

    Olee àgwà Inọk nke “dị Chineke ezi mma,” gịnịkwa ka ọ rụpụtaara ya? (Jen. 5:22)

  • Gụọ Jud 14, 15.

    Olee otú Ndị Kraịst taa pụrụ isi ṅomie obi ike Inọk mgbe ha na-adọ ndị mmadụ aka ná ntị banyere agha Amagedọn nke na-abịanụ? (2 Tim. 4:2; Hib. 13:6)