Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 10: Oké Iju Mmiri Ahụ

Akụkọ nke 10: Oké Iju Mmiri Ahụ

NDỊ na-anọghị n’ime ụgbọ ahụ nọ na-eme ihe ndị dịịrị ha n’ụbọchị. Ha ekwebeghị na Iju Mmiri ahụ ga-abịa. Ọ ghaghị ịbụ na ha chịịrị ọchị gaa n’ihu, ọbụna karịa otú ha na-achịbu. N’oge na-adịghịkwa anya, ọchị gwụrụ ha n’ezé.

Ndị mmadụ ụjọji na ụmụ anụmanụ ndị mmiri na-achọ iri

Na mberede, mmiri malitere izo. O si na mbara igwe na-ezo, dị ka mgbe ị na-awụpụ mmiri na bọket. Noa kwuru eziokwu! Ma oge agaala onye ọ bụla ọzọ ịbanye n’ụgbọ ahụ. Jehova emechisiwo ọnụ ụzọ ya ike.

Ọ dịghị anya, mmiri wee kpuchie ndagwurugwu niile. Mmiri ahụ wee yie oké osimiri. Ọ kwaturu osisi, nupụsịa oké nkume, meekwa oké mkpọtụ. Egwu tụrụ ndị mmadụ. Ha wee rịgoro n’elu ugwu. Ewoo, ọ ga-adịzi ha ka ya bụrụ na ha ṅara Noa ntị wee bata n’ụgbọ ahụ mgbe ọnụ ụzọ ka gheere ha oghe! Ma ugbu a, oge agaala.

Mmiri ahụ nọkwa na-eto n’ike n’ike. Mmiri ahụ zoro ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị. O kpuchiri akụkụ nnukwu ugwu niile, ọ dịghịkwa anya, ya erikpuo ugwu ndị kasị elu. Dị ka Chineke kwuru, ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ niile na-anọghị n’ime ụgbọ ahụ nwụrụ. Ma ọ dịghị ihe mere ndị nọ n’ime ụgbọ ahụ.

Noa na ụmụ ya rụrụ ezigbo ọrụ n’iwu ụgbọ ahụ. Mmiri ahụ buliri ya elu, o wee na-ese n’elu mmiri. Otu ụbọchị, mgbe mmiri ozuzo ahụ kwụsịrị, anwụ malitere ịcha. Nke ahụ dị nnọọ mma nkiri. Ihe e nwere bụ naanị otu oké osimiri nke zuru ebe niile. Naanị ihe ọzọ a pụrụ ịhụ bụ ụgbọ ahụ nke na-ese n’elu ya.

Ụgbọ na-ese n’elu mmiri

Ndị dike ahụ anọghịzikwa. Ha agaghị anọkwa ọzọ imerụ ụmụ mmadụ ahụ́. Ma ha ma nne ha ma ndị niile ọzọ mere ihe ọjọọ, nwụrụ. Ma gịnị mere ndị bụ́ nna ha?

Ndị bụ́ nna ndị dike ahụ abụghị ụmụ mmadụ ndị dị ka anyị. Ha bụ ndị mmụọ ozi ndị rịdatara ibi dị ka mmadụ n’ụwa. Ya mere, mgbe Iju Mmiri ahụ bịara, ha esoghị ndị niile ọzọ nwụọ. Ha yipụrụ ahụ́ mmadụ ahụ ndị ha mere, wee laghachi n’eluigwe dị ka ndị mmụọ ozi. Ma e kweghịzi ka ha soro n’ezinụlọ Chineke nke ndị mmụọ ozi mejupụtara. Ha ghọrọ ndị mmụọ ozi Setan. A kpọrọ ha ndị mmụọ ọjọọ n’ime Bible.

Chineke wee mee ka ifufe fee, mmiri ahụ wee malite ịta. Ọnwa ise ka e mesịrị, ụgbọ ahụ wee dọrọ n’elu ugwu. Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị, ndị nọ n’ụgbọ ahụ lepụrụ anya ma hụ elu ugwu dị iche iche. Mmiri ahụ nọgidere nnọọ na-atalata.

Mgbe ahụ, Noa si n’ụgbọ ahụ zipụ nnụnụ ojii a na-akpọ ugoloọma. O fegharịrị ruo nwa oge wee laghachi, n’ihi na ọ hụghị ebe dị mma ọ ga-ebekwasị. O wee na-apụ, na-alọtakwa. Mgbe ọ bụla ọ lọtara, ọ na-ezu ike n’elu ụgbọ ahụ.

Nduru

Noa chọrọ ịhụ ma mmiri ahụ niile ọ̀ tawo n’elu ala, o wee si n’ụgbọ ahụ zipụ nduru ọzọ. Nduru ahụ lọghachikwara n’ihi na ọ hụghị ebe ọ ga-ebe. Noa zipụrụ ya nke ugboro abụọ, o wee welata otu akwụkwọ oliv nke ọ kpụ n’ọnụ ya. Noa wee mara na mmiri ahụ atalatawo. Noa zipụrụ nduru ahụ nke ugboro atọ, o wee hụ ebe kọrọ akọ ọ ga-ebi.

Chineke gwara Noa okwu. Ọ sịrị ya: ‘Si n’ụgbọ ahụ pụta. Duru ezinụlọ gị na anụmanụ niile.’ Ha anọwo n’ime ụgbọ ahụ ihe karịrị otu afọ. Anyị pụrụ iche n’echiche otú obi si dị ha ụtọ ịpụta ọzọ n’elu ala, wee dịrị ndụ!

Jenesis 7:10-24; 8:1-17; 1 Pita 3:19, 20.



Ajụjụ

  • Gịnị mere na ọ dịghị onye nwere ike ịbanye n’ụgbọ ahụ ozugbo mmiri malitere izo?
  • Abalị ole ka Jehova mere ka mmiri zoo, oleekwa ókè mmiri ahụ toruru?
  • Gịnị mere ụgbọ ahụ mgbe mmiri malitere irikpu ụwa?
  • Ndị dike ahụ hà lanarịrị Iju Mmiri ahụ, gịnịkwa mere ndị nna nke ndị dike ahụ?
  • Gịnị mere ụgbọ ahụ mgbe ọnwa ise gasịrị?
  • Gịnị mere Noa ji zipụ nduru site n’ụgbọ ahụ?
  • Olee otú Noa si mara na mmiri ahụ rikpuru ụwa ataala?
  • Gịnị ka Chineke gwara Noa mgbe ya na ezinụlọ ya nọsịrị ihe karịrị otu afọ n’ụgbọ ahụ?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Jenesis 7:10-24.

    Olee ókè e bibiruru ihe ndị dị ndụ n’ụwa? (Jen. 7:23)

    Ogologo oge hà aṅaa gafere tupu mmiri nke Iju Mmiri ahụ ataa? (Jen. 7:24)

  • Gụọ Jenesis 8:1-17.

    Olee otú Jenesis 8:17 si gosi na nzube mbụ nke Jehova banyere ụwa agbanweghị? (Jen. 1:22)

  • Gụọ 1 Pita 3:19, 20.

    Mgbe ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi laghachiri n’eluigwe, olee ikpe a mara ha? (Jud 6)

    Olee otú akụkọ banyere Noa na ezinụlọ ya si eme ka obi sikwuo anyị ike na Jehova nwere ikike nke ịnapụta ndị ya? (2 Pita 2:9)

GỤKWUO GBASARA YA

FOTO E JI AKỤZI IHE

Gịnị Ka Anyị Nwere Ike Ịmụta n’Aka Noa?

Danloduo foto a e ji amụ ihe, ma ọ bụ gị ebipụta ya ka ị mata otú i ga-esi nwee okwukwe ka Noa, na-erubekwa isi ka ya.

ṄOMIE OKWUKWE HA

Noa “So Ezi Chineke Jee Ije”

Gịnị mere na ọ dịrịghị Noa na nwunye ya mfe mgbe ha na-azụlite ụmụ ha? Olee otú ụgbọ ahụ ha wuru si gosi na ha nwere okwukwe?