Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 1: Chineke Amalite Ike Ihe

Akụkọ nke 1: Chineke Amalite Ike Ihe

EZI ihe niile anyị nwere sitere n’aka Chineke. O kere anyanwụ inye anyị ìhè n’ehihie, keekwa ọnwa na kpakpando inye anyị ìhè n’abalị. Chineke kekwara ụwa ka anyị biri n’ime ya.

Ma, anyanwụ, ọnwa, kpakpando, na ụwa abụghị ihe mbụ Chineke kere. Ị̀ ma ihe mbụ o kere? Chineke bu ụzọ kee ndị dị ka ya. Anyị apụghị ịhụ ha anya, dị nnọọ ka anyị na-apụghị ịhụ Chineke. N’ime Bible, a kpọrọ ha ndị mmụọ ozi. Chineke kere ndị mmụọ ozi iso ya biri n’eluigwe.

Mmụọ ozi mbụ Chineke kere pụrụ iche. Ọ bụ Ọkpara Chineke, o sokwa Nna ya rụọ ọrụ. O nyeere Chineke aka ike ihe niile ọzọ. O nyeere Chineke aka ike anyanwụ, ọnwa, kpakpando, nakwa ụwa anyị.

Olee otú ụwa dị mgbe ahụ? Na mbụ, mmadụ enweghị ike ibi n’ụwa. Ọ dịghị ihe ọ bụla dị na ya ma ọ́ bụghị otu oké osimiri zuru ebe niile. Ma Chineke chọrọ ka ụmụ mmadụ biri n’ụwa. N’ihi ya, ọ malitere idoziri anyị ya. Gịnị ka o mere?

Nke mbụ, elu ala chọrọ ìhè. N’ihi ya, Chineke kere anyanwụ inye ìhè n’ụwa. O kere ya otú ga-eme ka e nwee ehihie na abalị. E mesịa, Chineke mere ka ala nkịtị nupụta n’elu mmiri nke oké osimiri ahụ.

Na mbụ, ọ dịghị ihe dị n’elu ala. O yiri foto nke ị na-ahụ n’ebe a. Okooko osisi ma ọ bụ nnukwu osisi ọ bụla ma ọ bụ anụmanụ adịghị. Ọbụnadị azụ̀ adịghị n’ime osimiri. Chineke ka nwere ọrụ dị ukwuu ọ ga-arụ iji mee ka ụwa dịrị mmadụ na anụmanụ ezi mma ibi na ya.

Jeremaịa 10:12; Ndị Kọlọsi 1:15-17; Jenesis 1:1-10.

Ala ihe na-adịghị


Ajụjụ

  • Ebee ka ezi ihe niile sitere, ị̀ pụrụ ịkpọtụ otu n’ime ha aha?
  • Gịnị bụ ihe mbụ Chineke kere?
  • N’ihi gịnị ka mmụọ ozi mbụ ji bụrụ onye pụrụ iche?
  • Kọwaa otú ụwa dị ná mmalite (Lee foto.)
  • Olee otú Chineke si malite ịkwadebe ụwa maka anụmanụ na mmadụ?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Jeremaịa 10:12.

    Olee àgwà Chineke ndị na-apụta ìhè n’ihe ndị o kere? (Aịsa. 40:26; Rom 11:33)

  • Gụọ Ndị Kọlọsi 1:15-17.

    Òkè dị aṅaa ka Jizọs keere n’ike ihe, oleekwa otú nke a kwesịrị isi metụta otú anyị si ele Jizọs anya? (Kọl. 1:15-17)

  • Gụọ Jenesis 1:1-10.

    Olee otú ụwa si malite? (Jen. 1:1)

    Gịnị mere n’ụbọchị mbụ nke okike? (Jen. 1:3-5)

    Kọwaa ihe mere n’ụbọchị nke abụọ nke okike. (Jen. 1:7, 8)