Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 108: N’Ụzọ Damaskọs

Akụkọ nke 108: N’Ụzọ Damaskọs

Ị̀ MA onye a nọ n’ala? Ọ bụ Sọl. Cheta na ọ bụ ya ledoro uwe elu nke ndị ahụ tụgburu Stivin. Lee ìhè ahụ na-enwu zaa. Gịnị na-eme?

Mgbe e gbusịrị Stivin, Sọl butere ụzọ n’ịchọgharị ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha mekpaa ha ahụ́. Ọ na-eje n’ụlọ n’ụlọ na-adọkpụrụ ha atụba n’ụlọ mkpọrọ. Ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs gbagara n’obodo ndị ọzọ, wee malite izi “ozi ọma” n’ebe ahụ. Ma Sọl jere n’obodo ndị ọzọ ịchọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ugbu a, ọ na-eje Damaskọs. Ma mgbe ọ na-aga n’ụzọ, nke a bụ ihe ịtụnanya merenụ:

Na mberede, ìhè nke si n’eluigwe nwuru gburugburu ebe Sọl nọ. Ọ daa n’ala, dị ka anyị na-ahụ n’ebe a. Otu olu wee sị ya: ‘Sọl, Sọl! Gịnị mere i ji na-esogbu m?’ Ndị so Sọl hụrụ ìhè ahụ, nụkwa olu ahụ, ma ha apụghị ịghọta ihe olu ahụ na-ekwu.

Mgbe ìhè chakpọrọ Sọl anya

‘Ị̀ bụ onye, Onyenwe m?’ ka Sọl jụrụ.

‘Abụ m Jizọs, onye ị na-esogbu,’ ka olu ahụ sịrị. Jizọs kwuru nke a n’ihi na mgbe Sọl na-esogbu ụmụazụ Jizọs, ọ na-adị Jizọs ka ọ̀ bụ ya onwe ya ka a na-esogbu.

Sọl wee jụọ, sị: ‘Gịnị ka m ga-eme, Onyenwe m?’

Jizọs wee sị ya: ‘Bilie, jee Damaskọs. N’ebe ahụ, a ga-agwa gị ihe ị na-aghaghị ime.’ Mgbe Sọl biliri meghee anya ya, ọ hụghị ihe ọ bụla. O kpuwo ìsì! N’ihi ya, ndị ha na ya so wee jide ya n’aka, duru ya ruo Damaskọs.

Jizọs wee gwa otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya nọ na Damaskọs, sị: ‘Bilie, Ananayas. Jee n’okporo ámá a na-akpọ Nke Kwụ Ọtọ. N’ụlọ Judas, jụọ ajụjụ nwoke a na-akpọ Sọl. Ahọpụtawo m ya ịbụrụ m ohu pụrụ iche.’

Ananayas wee jee. Mgbe ọ hụrụ Sọl, o bikwasịrị ya aka n’isi, wee sị ya: ‘Onyenwe anyị ezitewo m ime ka ị hụ ụzọ ma jupụta na mmụọ nsọ.’ Ngwa ngwa, ihe yiri akpịrịkpa wee si n’anya Sọl dapụ, o wee malite ịhụ ụzọ ọzọ.

E ji Sọl mee ihe n’ụzọ dị ukwuu n’izi ndị si n’ọtụtụ mba ozi ọma. A bịara mara ya dị ka Pọl onyeozi, bụ́ onye anyị ga-amụ ọtụtụ ihe banyere ya. Ma ka anyị buru ụzọ lee ihe Chineke zigara Pita ime.

Ọrụ 8:1-4; 9:1-20; 22:6-16; 26:8-20.



Ajụjụ

  • Gịnị ka Sọl mere mgbe e gbusịrị Stivin?
  • Mgbe Sọl na-aga Damaskọs, olee ihe dị ịtụnanya merenụ?
  • Gịnị ka Jizọs gwara Sọl ka o mee?
  • Olee ntụziaka Jizọs nyere Ananayas, oleekwa otú Sọl si malite ịhụ ụzọ ọzọ?
  • Olee aha e jizi mara Sọl, oleekwa otú e si jiri Sọl rụọ ọrụ?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Ọrụ Ndịozi 8:1-4.

    Olee otú mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ e megidere ọgbakọ Ndị Kraịst e guzobere ọhụrụ si mee ka nkwenkwe Ndị Kraịst gbasaa, oleekwa ihe yiri ya nke meworo n’oge a? (Ọrụ 8:4; Aịsa. 54:17)

  • Gụọ Ọrụ Ndịozi 9:1-20.

    Olee ọrụ nwere akụkụ atọ nke Jizọs kwuru na ya chọrọ ka Sọl rụọ? (Ọrụ 9:15; 13:5; 26:1; 27:24; Rom 11:13)

  • Gụọ Ọrụ Ndịozi 22:6-16.

    Olee otú anyị pụrụ isi dị ka Ananayas, oleekwa ihe mere o ji dị mkpa ka anyị mee otú ahụ? (Ọrụ 22:12; 1 Tim. 3:7; 1 Pita 1:14-16; 2:12)

  • Gụọ Ọrụ Ndịozi 26:8-20.

    Olee otú ntọghata a tọghatara Sọl bata n’Iso Ụzọ Kraịst si bụrụ ihe agbamume nye ndị di ma ọ bụ nwunye ha na-ekweghị ekwe? (Ọrụ 26:11; 1 Tim 1:14-16; 2 Tim. 4:2; 1 Pita 3:1-3)