Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 99: N’Ime Ụlọ Dị n’Ụlọ Elu

Akụkọ nke 99: N’Ime Ụlọ Dị n’Ụlọ Elu

Ọ BỤ abalị Thursday ugbu a, ka ụbọchị abụọ gasịrịla. Jizọs na ndịozi iri na abụọ ya bara n’ime ụlọ elu ukwu a iri nri Ememe Ngabiga. Nwoke ahụ ị na-ahụ, nke na-apụ apụ, bụ Judas Iskarịọt. Ọ na-eje ịgwa ndị nchụàjà otú ha ga-esi jide Jizọs.

Nri anyasị nke Onyenwe anyị,

Ọ ka bụ nnọọ ụnyaahụ ya ka Judas jekwuuru ha wee jụọ ha, sị: ‘Gịnị ka unu ga-enye m ma m nyere unu aka jide Jizọs?’ Ha sịrị ya: ‘Mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ.’ N’ihi ya, Judas na-eje ịhụ ha ka o wee duru ha bịakwute Jizọs. Nke ahụ ọ́ bụghị ihe jọgburu onwe ya?

Ha erisịwo nri Ememe Ngabiga ahụ. Jizọs wee malite nri ọzọ pụrụ iche ugbu a. O nyere ndịozi ya ogbe achịcha, wee, sị: ‘Rienụ ya, n’ihi na nke a pụtara ahụ́ m nke a gaje inye n’ihi unu.’ O nyekwa ha iko mmanya, sị ha: ‘Ṅụọnụ ya, n’ihi na nke a pụtara ọbara m, nke a na-awụsị n’ihi unu.’ Bible na-akpọ nke a ‘nri anyasị nke Onyenwe anyị.’

Ụmụ Izrel riri nri Ememe Ngabiga iji chetara ha mgbe mmụọ ozi Chineke ‘gabigara’ ụlọ ha n’Ijipt, ma gbuo ụmụ e buru ụzọ mụọ n’ụlọ ndị Ijipt. Ma ugbu a, Jizọs chọrọ ka ụmụazụ ya na-echeta ya, na-echetakwa otú o si nye ndụ ya n’ihi ha. Ọ bụkwa ya mere o ji gwa ha ka ha na-eri nri a pụrụ iche kwa afọ.

Mgbe ha risịrị Nri Anyasị nke Onyenwe anyị, Jizọs gwara ndịozi ya ka ha nwee obi ike ma dịkwa ike n’okwukwe. N’ikpeazụ, ha bụkuru Chineke abụ, wee pụọ. Chi ejimiela mgbe ahụ. Ka anyị lee ebe ha gara.

Matiu 26:14-30; Luk 22:1-39; Jọn isi 13 ruo isi 17; 1 Ndị Kọrint 11:20.



Ajụjụ

  • Dị ka e gosiri na foto a, n’ihi gịnị ka Jizọs na ndịozi iri na abụọ ya ji nọrọ ná nnukwu ime ụlọ dị n’ụlọ elu?
  • Ònye bụ nwoke ahụ na-apụ apụ, gịnịkwa ka ọ na-aga ime?
  • Olee nri pụrụ iche nke Jizọs malitere mgbe ha risịrị nri Ememe Ngabiga?
  • Ihe omume dị aṅaa ka Ememe Ngabiga ahụ chetaara ndị Izrel, gịnịkwa ka nri a pụrụ iche na-echetara ụmụazụ Jizọs?
  • Mgbe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị gasịrị, gịnị ka Jizọs gwara ụmụazụ ya, gịnịkwa ka ha mere?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Matiu 26:14-30.

    Olee otú Matiu 26:15 si egosi na Judas kpachaara anya rara Jizọs nyefee n’aka ndị iro?

    Olee nzube abụọ ọbara Jizọs wụsịrị mezuru? (Mat. 26:27, 28; Jer. 31:31-33; Efe. 1:7; Hib. 9:19, 20)

  • Gụọ Luk 22:1-39.

    Gịnị ka ọ pụtara bụ́ na Setan banyere n’ime Judas? (Luk 22:3; Jọn 13:2; Ọrụ 1:24, 25)

  • Gụọ Jọn 13:1-20.

    N’iburu n’uche ihe e dekọrọ na Jọn 13:2, à pụrụ ịta Judas ụta maka ihe o mere, oleekwa ihe ndị ohu Chineke pụrụ ịmụta site na nke a? (Jen. 4:7; 2 Kọr. 2:11; Gal. 6:1; Jems 1:13, 14)

    Olee ihe mmụta gbara ọkpụrụkpụ nke Jizọs kụziri? (Jọn 13:15; Mat. 23:11; 1 Pita 2:21)

  • Gụọ Jọn 17:1-26.

    Gịnị ka ekpere Jizọs kpere ka ụmụazụ ya “bụrụ otu” pụtara? (Jọn 17:11, 21-23; Rom 13:8; 14:19; Kọl. 3:14)

GỤKWUO GBASARA YA

Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị

Jizọs malitere Ncheta Ọnwụ ya nke ndị na-eso ụzọ ya ga na-eme kwa afọ n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan.