Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 94: Jizọs Hụrụ Ụmụntakịrị n’Anya

Akụkọ nke 94: Jizọs Hụrụ Ụmụntakịrị n’Anya

LEE Jizọs ka ọ makụrụ nwata ahụ. Nke ahụ na-egosi na ọ hụrụ ụmụntakịrị n’anya n’ezie. Ndị ikom ahụ na-ele ya bụ ndịozi ya. Gịnị ka Jizọs na-agwa ha? Ka anyị chọpụta.

Jizọs na ndịozi ya ka si njem dị anya lọta. Ndịozi ya rụrịtara ụka n’ụzọ. Mgbe ha lọtara, Jizọs jụrụ ha, sị: ‘Gịnị ka unu nọ na-arụrịta banyere ya n’ụzọ?’ N’ezie, Jizọs maara ihe ha na-arụrịta banyere ya. Ma, ọ jụrụ ajụjụ ahụ iji mara ma ndịozi ya hà ga-agwa ya.

Jizọs na nwatakịrị

Ha azaghị ya, n’ihi na ha nọ na-arụrịta ụka onye kasị ukwuu n’ime ha. Ụfọdụ ndịozi ya chọrọ ịdị ukwuu karị ibe ha. Olee ụzọ Jizọs ga-esi gwa ha na o zighị ezi mmadụ ịchọ ịbụ onye kasị ukwuu?

Ọ kpọtara nwata ahụ wee mee ka o guzoro n’ihu ha niile. O wee sị ha: ‘M chọrọ ka unu mara nke a n’ezie, Ọ gwụla ma ùnu gbanwere wee dị ka ụmụntakịrị, unu agaghị aba n’alaeze Chineke. Onye ga-akasị ukwu n’alaeze ahụ bụ onye ga-adị ka nwata nke a.’ Ị̀ ma ihe mere Jizọs ji kwuo nke a?

Ụmụntakịrị adịghị echegbu onwe ha banyere ịdị ukwuu ma ọ bụ ịdị mkpa karịa ibe ha. N’ihi ya, ndịozi ahụ kwesịrị ịmụta ịdị ka ụmụntakịrị n’ụzọ dị otú a, ọ bụghị ịdị na-ese okwu banyere onye ka ibe ya ukwuu ma ọ bụ onye dị mkpa karịa ibe ya.

E nwekwara oge ndị ọzọ Jizọs gosipụtara ókè ọ hụruru ụmụntakịrị n’anya. Mgbe ọnwa ole na ole gasịrị, ụfọdụ ndị kutere ụmụ ha ka ha hụ Jizọs. Ndịozi ya nwara igbochi ha. Ma Jizọs sịrị ndịozi ya: ‘Kwenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m, unu egbochila ha, n’ihi na alaeze Chineke bụ nke ndị dị ka ha.’ O wee kuru ụmụntakịrị ahụ n’aka ya, wee gọzie ha. Ọ̀ bụ na ọ bụghị ihe dị mma ịmara na Jizọs hụrụ ụmụntakịrị n’anya?

Matiu 18:1-4; 19:13-15; Mak 9:33-37; 10:13-16.



Ajụjụ

  • Gịnị ka ndịozi ahụ na-arụ ụka banyere ya mgbe ha si otu ebe dị anya na-alọta?
  • N’ihi gịnị ka Jizọs ji kpọta obere nwa ma mee ka o guzoro n’etiti ndịozi ya?
  • Olee otú ndịozi ahụ kwesịrị isi mụta ịdị ka ụmụntakịrị?
  • Mgbe ọnwa ole na ole gasịrị, olee otú Jizọs si gosi na ya hụrụ ụmụntakịrị n’anya?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Matiu 18:1-4.

    N’ihi gịnị ka Jizọs ji eji ihe atụ ezi ihe? (Mat. 13:34, 36; Mak 4:33, 34)

  • Gụọ Matiu 19:13-15.

    Olee àgwà ụmụaka ndị anyị na-aghaghị iṅomi ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta ngọzi nke Alaeze ahụ? (Ọma 25:9; 138:6; 1 Kọr. 14:20)

  • Gụọ Mak 9:33-37.

    Gịnị ka Jizọs kụziiri ndịozi ya banyere ịchọ ọkwá? (Mak 9:35; Mat. 20:25, 26; Gal. 6:3; Fil. 2:5-8)

  • Gụọ Mak 10:13-16.

    Ruo ókè hà aṅaa ka ọ dị mfe ijekwuru Jizọs, gịnịkwa ka ndị okenye ọgbakọ pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya ya? (Mak 6:30-34; Fil. 2:1-4; 1 Tim. 4:12)

GỤKWUO GBASARA YA

JIZỌS BỤ ỤZỌ, EZIOKWU, NA NDỤ

Jizọs Akụzie Gbasara Ịgba Alụkwaghịm na Ịhụ Ụmụntakịrị n’Anya

Otú Jizọs si were ụmụntakịrị dị nnọọ iche n’otú ndị na-eso ụzọ ya si were ha. Gịnị kpatara ya?