Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 91: Mgbe Jizọs Na-ezi Ihe n’Elu Ugwu

Akụkọ nke 91: Mgbe Jizọs Na-ezi Ihe n’Elu Ugwu

LEE Jizọs ka ọ nọdụrụ ala ebe a. Ọ na-ezi ndị a niile ihe n’elu ugwu Galili. Ndị ahụ kasị nọrọ ya nso bụ ndị na-eso ụzọ ya. Ọ họpụtara ha iri na abụọ ịbụ ndịozi. Ndịozi bụ ndị pụrụ iche na-eso ụzọ Jizọs. Ị̀ ma aha ha?

Ebe Jizọs na-ezi ihe

E nwere Saịmọn Pita na Andru nwanne ya nwoke. E nwekwara Jems na Jọn, ndị bụ́kwa ụmụnne. A na-akpọ onyeozi ọzọ Jems, na-akpọkwa onye ọzọ Saịmọn. E nwere ndịozi abụọ aha ha bụ Judas. Otu bụ Judas Iskarịọt, a na-akpọkwa Judas nke ọzọ Tadiọs. Ndị ọzọ bụ Filip na Nataniel (onye a na-akpọkwa Batọlọmiu), na Matiu na Tọmọs.

Mgbe Jizọs si Sameria lọta, ọ malitere ikwusa na nke mbụ ya, sị: ‘Alaeze eluigwe dị nso.’ Ị̀ ma ihe alaeze ahụ bụ? Ọ bụ ọchịchị Chineke. Jizọs bụ eze ya. Ọ ga-esi n’eluigwe na-achị, wee weta udo n’ụwa. Alaeze Chineke ga-eme ka ụwa niile ghọọ paradaịs mara mma.

Jizọs na-ezi ndị a ihe banyere alaeze ahụ. ‘Lee otú unu ga-esi na-ekpe ekpere,’ ka ọ na-agwa ha. ‘Nna anyị nke nọ n’eluigwe, ka a sọpụrụ aha gị. Ka alaeze gị bịa. Ka e mee uche gị n’ụwa, dị ka a na-eme ya n’eluigwe.’ Ọtụtụ ndị na-akpọ nke a ‘Ekpere Onyenwe anyị.’ Ndị ọzọ na-akpọ ya ‘Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe.’ Ị̀ ga-ekpeli ekpere ahụ n’isi?

Jizọs na-ezikwa ha ụzọ ha ga-esi na-emeso ibe ha. Ọ na-asị: ‘Na-emerenụ ndị ọzọ ihe unu na-achọ ka ha na-emere unu.’ Ọ́ dịghị amasị gị mgbe ndị ọzọ mesoro gị omume n’obiọma? N’ihi ya, Jizọs na-asị, anyị kwesịrị ịdị na-emeso ndị ọzọ omume n’obiọma. Ọ́ gaghị abụ ihe magburu onwe ya n’ụwa paradaịs, mgbe mmadụ niile ga na-eme nke a?

Matiu isi 5 ruo isi 7; 10:1-4.



Ajụjụ

  • Na foto a, ole ebe bụ ebe ahụ Jizọs nọ na-ezi ihe, ole ndị bụ ndị ahụ kasị nọrọ ya nso?
  • Gịnị bụ aha ndịozi iri na abụọ Jizọs?
  • Gịnị bụ Alaeze ahụ Jizọs na-ekwusa banyere ya?
  • Gịnị ka Jizọs kụziiri ndị mmadụ ikpe ekpere maka ya?
  • Gịnị ka Jizọs kwuru banyere otú ndị mmadụ kwesịrị isi na-emeso ibe ha?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Matiu 5:1-12.

    N’ụzọ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ isi gosi na anyị maara mkpa ime mmụọ anyị? (Mat. 5:3; Rom 10:13-15; 1 Tim. 4:13, 15, 16)

  • Gụọ Matiu 5:21-26.

    Olee otú Matiu 5:23, 24 si mee ka ọ pụta ìhè na ụdị mmekọrịta anyị na ụmụnna anyị na-enwe ga-egosi ụdị mmekọrịta anyị na Jehova ga-enwe? (Mat. 6:14, 15; Ọma 133:1; Kọl. 3:13; 1 Jọn 4:20)

  • Gụọ Matiu 6:1-8.

    Olee omume na-egosi mmadụ ịbụ onye ezi omume n’anya onwe ya bụ́ nke Ndị Kraịst kwesịrị izere? (Luk 18:11, 12; 1 Kọr. 4:6, 7; 2 Kọr. 9:7)

  • Gụọ Matiu 6:25-34.

    Gịnị ka Jizọs kụziri banyere mkpa ọ dị inwe obi ike na Jehova ga-enye anyị ihe ndị na-akpa anyị n’ụzọ anụ ahụ́? (Ọpụ. 16:4; Ọma 37:25; Fil. 4:6)

  • Gụọ Matiu 7:1-11.

    Gịnị ka ihe atụ ahụ doro anya nke dị na Matiu 7:5 na-akụziri anyị? (Ilu 26:12; Rom 2:1; 14:10; Jems 4:11, 12)