Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 86: Ndị Ikom Otu Kpakpando Duziri

Akụkọ nke 86: Ndị Ikom Otu Kpakpando Duziri
Ndị na-akọ banyere kpakpando

Ị̀ NA-AHỤ kpakpando ahụ na-egbuke egbuke nke otu n’ime ndị ikom a na-atụ aka? Ọ bụ mgbe ha hapụrụ Jeruselem ka kpakpando a pụtara. Ndị ikom a si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ. Ha na-amụ banyere kpakpando. Ha kweere na kpakpando ọhụrụ nke a na-eduga ha n’ebe otu onye dị mkpa nọ.

Mgbe ndị ikom ahụ ruru Jeruselem, ha jụrụ, sị: ‘Olee ebe nwata ahụ nke ga-abụ eze ndị Juu nọ? “Ndị Juu” bụ aha ọzọ nke ndị Izrel. ‘Anyị hụrụ kpakpando nke nwata ahụ na nke mbụ ya n’oge anyị nọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ,’ ka ndị ikom ahụ sịrị, ‘anyị abịawokwa ịkpọrọ ya isi ala.’

Mgbe Herọd, bụ́ eze Jeruselem, nụrụ ya, obi ezughị ya ike. Ọ chọghị ka eze ọzọ weghara ọkwá ya. N’ihi ya, Herọd kpọrọ ndị isi nchụàjà wee jụọ ha, sị: ‘Olee ebe a ga-amụ eze ahụ e kwere ná nkwa?’ Ha zara ya, sị: ‘Bible sịrị na ọ bụ na Betlehem.’

Herọd wee kpọọ ndị ikom ahụ si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ, sị ha: ‘Gaanụ chọpụta nwa ọhụrụ ahụ. Ọ bụrụ na unu ahụ ya, meenụ ka m mara. M chọrọ ijekwa kpọọrọ ya isi ala.’ Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na Herọd chọrọ ịhụ nwata ahụ ma gbuo ya!

Mgbe ahụ, kpakpando ahụ jere n’ihu ha ruo Betlehem, kwụsị n’ebe nwata ahụ nọ. Mgbe ndị ikom ahụ bara n’ime ụlọ ahụ, ha hụrụ Meri na obere Jizọs. Ha nyere Jizọs onyinye dị iche iche. Ma mgbe e mesịrị, Jehova dọrọ ndị ikom ahụ aka ná ntị ná nrọ ka ha ghara ịlaghachikwuru Herọd. Ya mere, ha si ụzọ ọzọ laghachi n’ala ha.

Mgbe Herọd nụrụ na ndị ikom ahụ si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ alawo, ezigbo iwe were ya. O wee nye iwu ka e gbusịa ụmụntakịrị nwoke niile nọ na Betlehem, site ná ndị gbara afọ abụọ gbadata. Ma Jehova ebuwo ụzọ dọọ Josef aka ná ntị ná nrọ, ya na ezinụlọ ya wee gbalaa Ijipt. E mesịa, mgbe Josef nụrụ na Herọd anwụwo, o duuru Meri na Jizọs laghachi Nazaret. Ọ bụ n’ebe ahụ ka Jizọs nọ tolite.

Ònye ka i chere na ọ bụ ya mere ka kpakpando ọhụrụ ahụ pụta? Cheta na ndị ikom ahụ bu ụzọ jee Jeruselem mgbe ha hụrụ kpakpando ahụ. Setan bụ́ Ekwensu chọrọ igbu Ọkpara Chineke, ọ makwaara na Eze Herọd nke Jeruselem ga-anwa igbu ya. N’ihi ya, ọ ghaghị ịbụ Setan mere ka kpakpando ahụ pụta.

Matiu 2:1-23; Maịka 5:2.



Ajụjụ

  • Ole ndị bụ ndị ikom a nọ na foto a, n’ihi gịnịkwa ka otu n’ime ha ji na-atụ otu kpakpando na-egbuke egbuke aka?
  • N’ihi gịnị ka obi ji gharazie iru Eze Herọd ala, gịnịkwa ka o mere?
  • Ebee ka kpakpando ahụ na-egbuke egbuke dugara ndị ikom a, gịnị meziri ha ji si n’ụzọ ọzọ laghachi ná mba ha?
  • Olee iwu Herọd nyere, ọ bụkwa n’ihi gịnị?
  • Gịnị ka Jehova gwara Josef ka o mee?
  • Ònye mere ka kpakpando ọhụrụ ahụ nwuo, ọ bụkwa n’ihi gịnị?

Ajụjụ ọzọ

  • Gụọ Matiu 2:1-23.

    Afọ ole ka Jizọs dị mgbe ndị ahụ na-akọ banyere kpakpando bịara ileta ya, oleekwa ebe o bi mgbe ahụ? (Mat. 2:1, 11, 16)

GỤKWUO GBASARA YA

JIZỌS BỤ ỤZỌ, EZIOKWU, NA NDỤ

Ndị Na-agụ Kpakpando Abịa Leta Jizọs

Gịnị mere kpakpando ahụ ha hụrụ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ ji bu ụzọ duru ha gaa na nke Eze Herọd chọrọ igbu Jizọs, kama iduga ha ozugbo n’ebe Jizọs nọ?