Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 76: E Bibie Jeruselem

Akụkọ nke 76: E Bibie Jeruselem

Ọ KARỊWO afọ iri kemgbe eze Nebukadneza dọọrọ ndị Izrel niile kasị mara akwụkwọ laa Babilọn. Ma ugbu a, lee ihe na-emenụ! A na-agba Jeruselem ọkụ. A kpọkọrọla ụmụ Izrel ndị nke a na-egbughị egbu gawa Babilọn dị ka ndị mkpọrọ.

Cheta na nke a bụ ihe ndị amụma Jehova kwuru ga-emenụ ma ọ bụrụ na ụmụ Izrel agbanweghị omume ọjọọ ha. Ma ụmụ Izrel aṅaghị ndị amụma ahụ ntị. Ha nọgidere na-efe chi ụgha dị iche iche kama ife Jehova. N’ihi ya, e kwesịrị inye ha ahụhụ. Anyị maara nke a n’ihi na Izikiel onye amụma Chineke na-akọrọ anyị ihe ọjọọ ndị Izrel nọ na-eme.

Ị̀ ma onye Izikiel bụ? O so n’ụmụ okorobịa ahụ Eze Nebukadneza dọọrọ n’agha laa Babilọn ihe karịrị afọ iri tupu oké mbibi nke a dakwasịrị Jeruselem. A dọkwaara Daniel na ndị enyi ya atọ, bụ́ Shedrak, Mishak, na Abednego n’agha laa Babilọn n’otu oge ahụ.

Mgbe Izikiel ka nọ na Babilọn, Jehova gosiri ya ihe ọjọọ niile a na-eme na Jeruselem n’ụlọ nsọ Chineke. Jehova mere nke a n’ụzọ ọrụ ebube. N’ezie, Izikiel ka nọ na Babilọn, ma Jehova mere ka ọ hụ ihe niile na-eme n’ụlọ nsọ ahụ. Ihe Izikiel hụrụ na-awụ akpata oyi n’ahụ́!

Jehova gwara Izikiel, sị: ‘Lee ihe arụ niile ndị a na-eme n’ebe a n’ụlọ nsọ m. Lee ka e sekasịchara agwọ na ụmụ anụmanụ ndị ọzọ ná mgbidi ụlọ nsọ m. Leekwa ka ụmụ Izrel na-efe ha ofufe!’ Izikiel hụrụ ihe ndị a, o wee dee ihe niile ahụ na-emenụ n’akwụkwọ.

Mgbe ndị mkpọrọ si na Jeruselem na-apụ

‘Ị̀ na-ahụ ihe ndị ndú Izrel na-eme na nzuzo?’ ka Jehova jụrụ Izikiel. Ee, ọ hụkwara nke ahụ. Ha dị ndị ikom iri asaa, ha niile na-efekwa chi ụgha dị iche iche. Ha na-asị: ‘Jehova anaghị ahụ anyị. Ọ hapụwo ala a.’

Mgbe ahụ, Jehova gosiri Izikiel ndị inyom ụfọdụ nọ n’ọnụ ụzọ ámá nke dị n’akụkụ ebe ugwu nke ụlọ nsọ ahụ. Ha nọdụrụ ala n’ebe ahụ na-akpọ isi ala enye chi ụgha bụ́ Tamuz. Leekwa ndị ikom ahụ nọ n’ọnụ ụzọ mbata nke ụlọ nsọ Jehova! Ha dị ihe dị ka ndị ikom iri abụọ na ise. Izikiel hụrụ ha. Ha chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ wee na-akpọ isi ala, na-efe anyanwụ!

Jehova wee sị: ‘Ha adịghị asọpụrụ m. Ọ bụghị naanị na ha na-eme ihe ọjọọ, kama ha batara n’ụlọ nsọ m na-eme ha!’ N’ihi nke a, ọ sịrị: ‘Iwe m ga-eru ha ahụ́. M gaghị emere ha ebere mgbe a ga-ebibi ha.’

Ọ bụ naanị ihe dị ka afọ atọ mgbe Jehova gosichara Izikiel ihe ndị a ka ụmụ Izrel nupụụrụ Eze Nebukadneza isi. O wee jee busoo ha agha. Mgbe otu afọ na ọkara gasịrị, ndị Babilọn tipuru mgbidi Jeruselem, wee gbaa obodo ahụ ọkụ. E gburu ihe ka ukwuu n’ime ha ma kpọkọrọ ọtụtụ ndị ọzọ laa Babilọn dị ka ndị mkpọrọ.

N’ihi gịnị ka Jehova ji kwe ka mbibi nke a jọgburu onwe ya bịakwasị ụmụ Izrel? N’ezie, ọ bụ n’ihi na ha egeghị Jehova ntị, ha edebeghịkwa iwu ya. Nke a na-egosi na ọ dị mkpa ka anyị na-eme ihe Chineke kwuru mgbe niile.

Na mbụ, a hapụrụ mmadụ ole na ole ịnọ n’ala Izrel. Eze Nebukadneza mere onye Juu a na-akpọ Gedalaya onyeisi ha. Ma ndị Izrel ụfọdụ gburu Gedalaya. Ha wee tụọ ụjọ na ndị Babilọn ga-abịa ibibi ha n’ihi ihe ọjọọ nke a ha mere. N’ihi ya, ha manyere Jeremaya ka o soro ha pụọ, ha wee gbalaga Ijipt.

Nke a mere ka a ghara inwe mmadụ ọ bụla nọ n’ala Izrel. Ọ dịghị onye biri n’ala Izrel ruo afọ iri asaa. Ọ tọgbọrọ nnọọ nkịtị. Ma Jehova kwere nkwa na ya ga-akpọghachi ndị ya n’ala ahụ mgbe afọ iri asaa gasịrị. Ugbu a, gịnị na-eme ndị Chineke n’ala Babilọn, bụ́ ebe a dọọrọ ha n’agha laa? Ka anyị lee.

2 Ndị Eze 25:1-26; Jeremaịa 29:10; Ezikiel 1:1-3; 8:1-18.



Ajụjụ

  • Gịnị na-eme Jeruselem na ụmụ Izrel ndị e gosiri na foto a?
  • Ònye bụ Izikiel, olee ihe ndị na-awụ akpata oyi Jehova gosiri ya?
  • Ebe ọ bụ na ụmụ Izrel adịghị akwanyere Jehova ùgwù, gịnị ka o kwere ha ná nkwa?
  • Gịnị ka Eze Nebukadneza mere mgbe ụmụ Izrel nupụụrụ ya isi?
  • N’ihi gịnị ka Jehova ji kwe ka ajọ mbibi nke a bịakwasị ụmụ Izrel?
  • Olee otú e si mee ka ala Izrel tọgbọrọ chakoo n’enweghị ndị bi ya, afọ ole kwa ka ọ tọgbọrọ chakoo?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ 2 Ndị Eze 25:1-26.

    Ònye bụ Zedekaya, gịnị mere ya, oleekwa otú nke a si mezuo amụma Bible? (2 Eze 25:5-7; Ezik. 12:13-15)

    Ole ndị ka Jehova tara ụta maka omume ekwesịghị ntụkwasị obi niile nke ụmụ Izrel? (2 Eze 25:9, 11, 12, 18, 19; 2 Ihe 36:14, 17)

  • Gụọ Ezikiel 8:1-18.

    Olee otú Krisendọm siworo ṅomie ụmụ Izrel ahụ na-efe anyanwụ ofufe, bụ́ ndị si n’ezi ofufe dapụ? (Ezik. 8:16; Aịsa. 5:20, 21; Jọn 3:19-21; 2 Tim. 4:3)