Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 72: Chineke Enyere Eze Hezekaya Aka

Akụkọ nke 72: Chineke Enyere Eze Hezekaya Aka

Ị̀ MA ihe mere nwoke a ji ekpegara Jehova ekpere? Gịnị mere o ji chịsa akwụkwọ ozi ndị a n’ihu ebe a na-achụrụ Jehova àjà? Nwoke ahụ bụ Hezekaya. Ọ bụ eze nke ebo abụọ nke Izrel nke dị n’ebe ndịda. Ma, ọ nọ ná nnukwu nsogbu. N’ihi gịnị?

Mgbe Eze Hezekaya na-ekpe ekpere

Ọ bụ n’ihi na ụsụụ ndị agha Asiria ebibiworị ebo iri nke dị n’ebe ugwu. Jehova kwere ka nke a mee n’ihi na ndị ahụ jọrọ njọ. Ma ugbu a, ụsụụ ndị agha Asiria abịawo ibuso alaeze ebo abụọ ahụ agha.

Eze Asiria ziteere Eze Hezekaya akwụkwọ ozi. Ọ bụ akwụkwọ ozi ndị ahụ ka Hezekaya chịsara n’ebe a n’ihu Chineke. N’akwụkwọ ozi ndị ahụ, e ji Jehova mee ihe ọchị ma gwa Hezekaya ka ọ chịlie aka elu. Ọ bụ nke a mere Hezekaya ji na-ekpe ekpere, sị: ‘Biko, Jehova, zọpụta anyị n’aka eze Asiria. Mgbe ahụ ka mba niile ga-amara na naanị gị bụ Chineke.’ Jehova ọ̀ ga-aza ekpere Hezekaya?

Hezekaya bụ eze ọma. Ọ dịghị ka ajọ ndị eze ebo iri nke Izrel, ma ọ bụ dị ka ajọ Eze Ehaz bụ́ nna ya. Hezekaya kpachapụrụ anya iji hụ na o gere ntị n’iwu Jehova niile. Ma mgbe Hezekaya kpesịrị ekpere, Aịzaya onye amụma ziri ya ozi nke a sitere n’aka Jehova: ‘Eze Asiria agaghị abata Jeruselem. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ndị agha ya ga-abịaru ya nso. Ha agaghị agba otu akụ́ ọ bụla n’obodo a.’

Lee foto dị na peeji a. Ị̀ ma ndị agha ndị a nwụrụ anwụ? Ha bụ ndị Asiria. Jehova zipụrụ otu mmụọ ozi ya, n’ime otu abalịkwa, mmụọ ozi ahụ gburu ndị agha Asiria dị otu narị puku na puku iri asatọ na ise. N’ihi ya, ike gwụrụ eze Asiria, o wee laa n’ebe obibi ya.

Ozu ndị agha Asiria

A zọpụtara alaeze ebo abụọ ahụ, ndị ya wee nwee udo ruo oge ụfọdụ. Ma mgbe Hezekaya nwụrụ, Manase nwa ya wee bụrụ eze. Ma Manase ma nwa ya, bụ́ Emọn, nke nọchiri ya, bụcha ajọ ndị eze. Mmebi iwu na ihe ike jupụtara n’ala ahụ ọzọ. Mgbe ndị ohu Eze Emọn gburu ya, e chiri Josaya nwa ya eze ịchị alaeze ebo abụọ ahụ.

2 Ndị Eze 18:1-36; 19:1-37; 21:1-25.



Ajụjụ

  • Ònye bụ nwoke a nọ na foto a, n’ihi gịnịkwa ka o ji nọrọ ná nnukwu nsogbu?
  • Gịnị dị n’akwụkwọ ozi ndị a Hezekaya wụsara n’ihu Chineke, gịnịkwa ka Hezekaya na-ekpe n’ekpere?
  • Ụdị eze dị aṅaa ka Hezekaya bụ, oleekwa ozi Jehova zigaara ya site n’ọnụ Aịzaya onye amụma?
  • Gịnị ka mmụọ ozi Jehova mere ndị Asiria dị ka e gosiri na foto a?
  • Ọ bụ ezie na alaeze ebo abụọ ahụ nwere udo ruo oge ụfọdụ, gịnị mere mgbe Hezekaya nwụrụ?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ 2 Ndị Eze 18:1-36.

    Olee otú ọnụ na-ekwuchitere ndị Asiria bụ́ Rabshake si nwaa ime ka okwukwe ụmụ Izrel daa? (2 Eze 18:19, 21; Ọpụ. 5:2; Ọma 64:3)

    Mgbe a na-emegide Ndịàmà Jehova, olee otú ha si agbaso ihe nlereanya Hezekaya? (2 Eze 18:36; Ọma 39:1; Ilu 26:4; 2 Tim. 2:24)

  • Gụọ 2 Ndị Eze 19:1-37.

    Olee otú ndị Jehova taa si agbaso ihe nlereanya Hezekaya n’oge nsogbu? (2 Eze 19:1, 2; Ilu 3:5, 6; Hib. 10:24, 25; Jems 5:14, 15)

    Olee mmeri atọ e meriri Eze Senakerib, ònyekwa ka Senakerib na-ese onyinyo ya? (2 Eze 19:32, 35, 37; Mkpu. 20:2, 3)

  • Gụọ 2 Ndị Eze 21:1-6, 16.

    N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Manase bụ eze kasị obi ọjọọ n’ime ndị eze niile chịrị na Jeruselem? (2 Ihe 33:4-6, 9)