Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 62: Nsogbu Adị n’Ụlọ Devid

Akụkọ nke 62: Nsogbu Adị n’Ụlọ Devid

MGBE Devid malitere ịchị n’ime Jeruselem, Jehova mere ka ndị agha ya merie ndị iro ha ọtụtụ ugboro. O kwewo nkwa inye ndị Izrel ala Kenan. Ma ugbu a, site n’enyemaka Jehova, ala niile ahụ o kwere ha ná nkwa emesịala ghọọ nke ha.

Devid bụ ezigbo onye ọchịchị. Ọ hụrụ Jehova n’anya. Otu n’ime ihe ndị o mere mgbe ọ dọọrọ Jeruselem n’agha bụ ibubata igbe ọgbụgba ndụ Jehova n’ebe ahụ. O wee chọọ iwu ụlọ nsọ ebe a ga-edebe ya.

Ka oge na-aga, Devid mere otu mmehie dị oké njọ. Devid maara na o zighị ezi iwere ihe bụ́ nke onye ọzọ. Mgbe ọ nọ n’elu obí ya n’otu uhuruchi, o ledara anya n’ala ma hụ otu nwaanyị mara ezigbo mma. Aha ya bụ Bat-shiba, di ya bụ Yuraya, bụ́ otu n’ime ndị agha Devid.

Devid bịara nwee mmasị gabigara ókè n’ebe Bat-shiba nọ nke na o mere ka e dute ya n’obí ya. Di ya jere agha. Devid wee soro ya nwee mmekọahụ. E mesịa, Bat-shiba chọpụtara na ya atụrụwo ime. Devid nwere oké nchegbu, o wee zie Joab onyeisi agha ya ka o debe Yuraya n’ihu agha ebe a ga-egbu ya. Mgbe Yuraya nwụrụ, Devid wee kpọrọ Bat-shiba lụwa.

Jehova wesara nnọọ Devid iwe. O wee ziga ohu ya bụ́ Netan ka ọ kọọrọ ya banyere mmehie ya. Ị pụrụ ịhụ Netan ebe a ka ọ na-agwa Devid okwu. Ihe Devid mere wutere Devid nke ukwuu, n’ihi ya, Jehova egbughị ya. Kama Jehova gwara ya, sị: ‘N’ihi ihe ọjọọ ndị a i mere, ị ga-enwe ọtụtụ nsogbu n’ezinụlọ gị.’ Devid nwekwara nnukwu nsogbu n’ezie!

Ebe Netan na-agwa Devid banyere mmehie ya

Nke mbụ, nwa Bat-shiba nwụrụ. E mesịa, Amnọn diọkpara Devid dinara nwanne ya nwaanyị n’ike, mgbe ha nọ naanị ha. Absalọm nwa Devid were iwe wee tigbuo Amnọn. E mesịa, Absalọm bịara mee ka ọtụtụ ndị nwee mmasị n’ebe ọ nọ, o wee mee onwe ya eze. N’ikpeazụ, Devid meriri Absalọm n’agha, e wee gbuo Absalọm. N’ezie, Devid nwere ọtụtụ nsogbu.

N’oge a niile, Bat-shiba mụrụ nwa a na-akpọ Solomọn. Mgbe Devid kara nká wee rịa ọrịa, Adọnaịja nwa ya nwara ime onwe ya eze. Devid wee mee ka Zedọk onyeisi nchụàjà wụsa mmanụ n’isi Solomọn, igosi na ọ ga-abụ eze. Ọ dịghị anya, Devid wee nwụọ mgbe ọ gbara afọ iri asaa. Ọ chịrị afọ iri anọ, Solomọn wee bụrụzie eze Izrel.

2 Samuel 11:1-27; 12:1-18; 1 Ndị Eze 1:1-48.



Ajụjụ

  • Site n’enyemaka Jehova, gịnị mesịrị mee ala Kenan?
  • Gịnị mere n’otu uhuruchi mgbe Devid nọ n’elu ụlọ nke obí eze ya?
  • N’ihi gịnị ka Jehova ji wesa Devid oké iwe?
  • Na foto a, ònye ka Jehova gwara ka ọ gaa gwa Devid banyere mmehie ya, gịnịkwa ka nwoke ahụ kwuru na ọ bụ ihe ga-eme Devid?
  • Nsogbu dị aṅaa ka Devid nwere?
  • Mgbe Devid nwụsịrị, ònye ghọrọ eze Izrel?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ 2 Samuel 11:1-27.

    Olee otú imikpu onwe anyị n’ijere Jehova ozi si bụrụ ihe nchebe?

    Olee otú Devid si daba ná mmehie, oleekwa otú nke a si bụrụ ihe ịdọ aka ná ntị nye ndị ohu Jehova taa? (2 Sam. 11:2; Mat. 5:27-29; 1 Kọr. 10:12; Jems 1:14, 15)

  • Gụọ 2 Samuel 12:1-18.

    Gịnị ka ndị okenye na ndị nne na nna pụrụ ịmụta site n’ụzọ Netan si gakwuru Devid iji nye ya ndụmọdụ? (2 Sam. 12:1-4; Ilu 12:18; Mat. 13:34)

    N’ihi gịnị ka Jehova ji meere Devid ebere? (2 Sam. 12:13; Ọma 32:5; 2 Kọr. 7:9, 10)