Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 61: E Chie Devid Eze

Akụkọ nke 61: E Chie Devid Eze

SỌL nwara ọzọ ijide Devid. Ọ kpọọrọ puku ndị agha ya atọ kasị ike jee na-achọgharị Devid. Mgbe Devid nụrụ ya, o zipụrụ ndị nledo ka ha gaa chọpụta ebe Sọl na ndị ya nọ n’abalị ahụ. Devid ewee jụọ abụọ n’ime ndị ha na ya so, sị: ‘Ònye n’ime unu ga-eso m jee n’ebe Sọl na ndị agha ya nọ?’

Mgbe Devid na-akpọ Eze Sọl òkù

Abishaị zara ya, sị: ‘M ga-eso gị.’ Abishaị bụ nwa Zeruya, bụ́ nwanne Devid nke nwaanyị. Mgbe Sọl na ndị ha na ya so nọ n’ụra, Devid na Abishaị gbebatara n’ebe ahụ. Ha weere ube Sọl na ite mmiri nke dị n’akụkụ isi ya. Ọ dịghị onye hụrụ ha ma ọ bụ nụ olu ha, n’ihi na ha niile nọ n’oké ụra.

Lee Devid na Abishaị ugbu a. Ha apụwo wee nọrọ n’elu ugwu n’enweghị ihe mere ha. Devid wee kpọọ onyeisi agha Izrel òkù, sị: ‘Abna, gịnị mere i chebeghị nna gị ukwu, bụ́ eze? Ngwa! Olee ube ya na ite mmiri ya?’

Sọl wee teta. Ọ matara olu Devid wee jụọ, sị: ‘Ọ̀ bụ gị Devid?’ Ị̀ na-ahụ Sọl na Abna n’ala ala ebe ahụ?

Devid zara Sọl, sị: ‘Ọ bụ m onyenwe m na eze m.’ Devid jụziri ya, sị: ‘Gịnị mere i ji na-achọ ijide m? Olee ihe ọjọọ m mere gị? Lee ube gị, eze. Gwa otu n’ime ndị ikom gị ka ọ bịa were ya.’

Ebe Eze Sọl na Abna guzo

Sọl wee sị: ‘Emewo m ihe ọjọọ. Emewo m omume nzuzu.’ Mgbe Sọl kwusịrị nke a, Devid gawaara onwe ya, Sọl wee laa n’ụlọ ya. Ma Devid kwuru n’obi ya, sị: ‘Otu ụbọchị, Sọl ga-egbu m. Ka m gbaga n’ala ndị Filistia.’ Nke ahụ bụkwa ihe o mere. Devid wee megharịa ndị Filistia anya ma mee ka ha chee na ọ kwụ n’akụkụ ha.

E mesịa, ndị Filistia rịgooro iji busoo Izrel agha. E gburu ma Sọl ma Jonatan n’agha ahụ. Nke a mere ka Devid ruo oké újú, o wee dee abụ nke mara mma nke ọ nọ bụọ, sị: ‘Ana m eruru gị újú, nwanne m Jonatan. Ị bụ nnọọ ezigbo onye m hụrụ n’anya!’

Mgbe nke a gasịrị, Devid laghachiri Izrel ruo obodo Hibrọn. Agha wee daa n’etiti ndị họọrọ Ishboshet nwa Sọl ịbụ eze na ndị chọrọ ka Devid bụrụ eze. Ndị nke Devid wee merie n’ikpeazụ. Devid dị afọ iri atọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị n’ime Hibrọn afọ asaa na ọkara. Ụfọdụ ụmụ ọ mụrụ n’ebe ahụ bụ Amnọn, Absalọm na Adọnaịja.

Oge ruru mgbe Devid na ndị ha na ya so jere dọta obodo ọma bụ Jeruselem n’agha. Joab, nwa ọzọ nke Zeruya, nwanne Devid nke nwaanyị, duru ha n’agha ahụ. Devid kwụrụ Joab ụgwọ ọrụ site n’ime ya onyeisi ndị agha ya. Devid wee malite ịchị n’obodo Jeruselem.

1 Samuel 26:1-25; 27:1-7; 31:1-6; 2 Samuel 1:26; 3:1-21; 5:1-10; 1 Ihe E Mere 11:1-9.



Ajụjụ

  • Gịnị ka Devid na Abishaị mere mgbe Sọl na-ehi ụra n’ụlọ ntu ya?
  • Olee ajụjụ Devid jụrụ Sọl?
  • Ebee ka Devid gara mgbe ọ hapụsịrị Sọl?
  • Gịnị mere Devid ji nwee mwute dị ukwuu bụ́ nke mere ka o dee ọmarịcha abụ?
  • Devid ọ̀ dị afọ ole mgbe e chiri ya eze na Hibrọn, gịnịkwa bụ aha ụfọdụ n’ime ụmụ ya?
  • Ebee ka Devid mesịrị chịa dị ka eze?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ 1 Samuel 26:1-25.

    Ihe Devid kwuru na 1 Samuel 26:11 ọ̀ na-egosi na Devid nwere ụdị àgwà dị aṅaa banyere ndokwa e mere ná nzukọ Chineke? (Ọma 37:7; Rom 13:2)

    Ọ bụrụ na anyị agbalịsie ike igosi mmadụ obiọma na ịhụnanya, ma onye ahụ emeghị ka ọ̀ hụrụ ihe anyị mere, olee otú okwu Devid nke a na-achọta na 1 Samuel 26:23 pụrụ isi nyere anyị aka inwe echiche ziri ezi? (1 Eze 8:32; Ọma 18:20)

  • Gụọ 2 Samuel 1:26.

    Olee otú Ndị Kraịst taa pụrụ isi zụlite ‘ịhụnanya siri ike maka ibe ha’ bụ́ ụdị ahụ dịrị n’etiti Devid na Jonatan? (1 Pita 4:8; Kọl. 3:14; 1 Jọn 4:12)

  • Gụọ 2 Samuel 5:1-10.

    Afọ ole ka Devid chịrị dị ka eze, oleekwa ebe ndị ọ chịgasịrị n’ime afọ ndị a? (2 Sam. 5:4, 5)

    Gịnị mere ka Devid ghọọ onye ukwu, oleekwa ihe nke a na-echetara anyị taa? (2 Sam. 5:10; 1 Sam. 16:13; 1 Kọr. 1:31; Fil. 4:13)