Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 56: Sọl—Eze Mbụ nke Izrel

Akụkọ nke 56: Sọl—Eze Mbụ nke Izrel
Mgbe Samuel na-ete Sọl mmanụ ka ọ bụrụ eze

LEE Samuel ka ọ na-awụsa mmanụ n’isi nwoke a. Nke a bụ ihe ha na-eme mmadụ iji gosi na a họpụtawo ya ịbụ eze. Jehova gwara Samuel ka ọ wụsa mmanụ n’isi Sọl. Ọ bụ mmanụ pụrụ iche nke na-esi ísì ụtọ.

Sọl echeghị na ya ruru eru ịbụ eze. Ọ gwara Samuel, sị: ‘Abụ m onye ebo Benjamin nke kachasị nta n’Izrel. N’ihi gịnị ka i ji asị na m ga-abụ eze?’ Jehova nwere mmasị n’ebe Sọl nọ n’ihi na o meghị ka à ga-asị na ọ bụ onye ukwu na onye dị mkpa. Ọ bụ ya mere Jehova ji họpụta ya ịbụ eze.

Ma Sọl abụghị ogbenye ma ọ bụ obere mmadụ. O si n’ezinụlọ bara ọgaranya, ọ bụkwa nwoke mara nnọọ mma ma topụ etopụ. O tokarịrị nnọọ onye ọ bụla nọ n’Izrel ogologo! Sọl nwekwara ụkwụ ọsọ ma dị ike. Ndị Izrel nwere obi ụtọ na Jehova họpụtara Sọl ịbụ eze. Ha niile malitere iti mkpu, sị: ‘Ka eze dị ogologo ndụ!’

Ndị iro Izrel ka dịkwa ike. Ha ka na-enye ụmụ Izrel nnukwu nsogbu. Ngwa ngwa e chiri Sọl eze, ụmụ Amọn gbagotara ibuso ha agha. Ma Sọl kpọkọtara ọtụtụ ndị agha wee merie ndị Amọn. Obi tọrọ ndị Izrel ụtọ na Sọl bụ eze ha.

Mgbe afọ ụfọdụ gasịrị, Sọl duziri ụmụ Izrel inwe ọtụtụ mmeri n’ebe ndị iro ha nọ. Sọl nwekwara otu nwa nwoke bụ́ dike a na-akpọ Jonatan. Jonatan nyekwaara Izrel aka inwe mmeri n’ọtụtụ agha. Ndị Filistia ka bụkwa ndị iro kasịnụ Izrel nwere. Otu ụbọchị, ọtụtụ puku ndị Filistia bịara ibuso Izrel agha.

Samuel gwara Sọl ka o chere ruo mgbe ya ga-abịa chụọrọ Jehova àjà ma ọ bụ nye ya onyinye. Ma Samuel abịaghị n’oge. Sọl tụrụ egwu na ndị Filistia ga-amalite ibu agha, o wee malite ịchụ àjà ahụ n’onwe ya. Mgbe Samuel mesịrị bịa, ọ gwara Sọl na o nupụwo isi. Samuel wee sị ya: ‘Jehova ga-ahọpụta onye ọzọ ịbụ eze Izrel.’

Mgbe e mesịrị, Sọl nupụrụ isi ọzọ. Samuel wee sị ya: ‘Ọ dị mma irubere Jehova isi karịa inye ya atụrụ kachasị mma. Ebe ọ bụ na i rubeghịrị Jehova isi, Jehova agaghị ekwe ka ị nọgide na-abụ eze Izrel.’

Anyị pụrụ ịmụta ezigbo ihe na nke a. Ọ na-egosi anyị mkpa ọ dị irubere Jehova isi mgbe niile. Ọ na-egosikwa na ezi mmadụ, dị ka Sọl bụbu, pụrụ ịgbanwe ghọọ ajọ mmadụ. Anyị achọghị ịbụ ndị ọjọọ, ka ànyị chọrọ?

1 Samuel isi 9 ruo 11; 13:5-14; 14:47-52; 15:1-35; 2 Samuel 1:23.



Ajụjụ

  • Na foto a, gịnị ka Samuel na-eme, n’ihi gịnịkwa ka o ji na-eme nke a?
  • N’ihi gịnị ka Jehova ji nwee mmasị n’ebe Sọl nọ, ụdị mmadụ dịkwa aṅaa ka ọ bụ?
  • Gịnị bụ aha nwa Sọl, gịnịkwa ka nwa ya ahụ mere?
  • N’ihi gịnị ka Sọl ji chụọ àjà kama ichere ka Samuel bịa mee ya?
  • Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’akụkọ banyere Sọl?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ 1 Samuel 9:15-21 na 10:17-27.

    Olee otú umeala n’obi Sọl dị si gbochie ya iji iwe mee ihe mgbe ndị ụfọdụ gwara ya okwu mkparị? (1 Sam. 9:21; 10:21, 22, 27; Ilu 17:27)

  • Gụọ 1 Samuel 13:5-14.

    Olee mmehie Sọl mere na Gilgal? (1 Sam. 10:8; 13:8, 9, 13)

  • Gụọ 1 Samuel 15:1-35.

    Olee mmehie dị oké njọ nke Sọl mere n’ihe banyere Egag, bụ́ eze Amalek? (1 Sam. 15:2, 3, 8, 9, 22)

    Olee otú Sọl si gbalịa igosi na ihe o mere ziri ezi, ma taa ndị ọzọ ụta? (1 Sam. 15:24)

    Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka anyị kwesịrị ịṅa ntị na ya taa mgbe e nyere anyị ndụmọdụ? (1 Sam. 15:19-21; Ọma 141:5; Ilu 9:8, 9; 11:2)