Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 51: Rut na Neomi

Akụkọ nke 51: Rut na Neomi

N’IME Bible, ị ga-ahụ akwụkwọ a na-akpọ Rut. Ọ bụ akụkọ banyere otu ezinụlọ nke biri n’oge ụmụ Izrel nwere ndị ikpe. Rut bụ nwa agbọghọ si n’ala Moab; o sighị ná mba Izrel nke Chineke. Ma mgbe Rut mụtara banyere ezi Chineke ahụ bụ́ Jehova, ọ bịara hụ Chineke n’anya nke ukwuu. Neomi bụ agadi nwaanyị nke nyeere Rut aka ịmụta banyere Jehova.

Neomi bụ onye Izrel. Ya na di ya na ụmụ ha ndị ikom abụọ kwagara n’ala Moab n’oge ihe oriri kọrọ n’Izrel. Ma otu ụbọchị, di Neomi nwụrụ. E mesịa, ụmụ Neomi lụrụ ụmụ agbọghọ abụọ bụ́ ndị Moab aha ha bụ Rut na Ọpa. Ma mgbe ihe dị ka afọ iri gasịrị, ụmụ ndị ikom abụọ Neomi nwụrụ. Nke a wutere Neomi na ụmụ agbọghọ abụọ ahụ nke ukwuu! Gịnị ka Neomi ga-eme ugbu a?

Otu ụbọchị, Neomi kpebiri ime njem dị anya iji lakwuru ndị ya. Rut na Ọpa chọrọ ibinyere ya, ha wee sorokwa ya na-eje. Mgbe ha jeworo ije nke nta n’ụzọ, Neomi tụgharịrị wee sị ụmụ agbọghọ ahụ: ‘Lakwurunụ nne unu.’

Neomi wee sutu ha ọnụ ma sị ha laa nke ọma. Mgbe o mere otú a, ha malitere ịkwa ákwá, n’ihi na ha hụrụ Neomi n’anya nke ukwuu. Ha sịrị ya: ‘Ee e! Anyị ga-eso gị lakwuru ndị gị.’ Ma Neomi sịrị ha: ‘Laghachinụ, ụmụ m. Ụlọ unu ga-adịrị unu mma karị.’ Ọpa wee malite ịla. Ma Rut ekweghị ala.

Neomi wee lee ya anya, sị: ‘Ọpa alawala. Soro ya lawa!’ Rut wee zaa ya, sị: ‘Anwala ime ka m hapụ gị! Ka m soro gị jee. Ebe ị na-eje ka m ga-eje, ebe ị ga-ebi ka m ga-ebi. Ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m. Ebe ị nwụrụ ka m ga-anwụ, ebe ahụkwa ka a ga-eli m.’ Mgbe Rut kwuru nke a, Neomi anwaghị ọzọ ime ka ọ laa.

N’ikpeazụ, ndị inyom abụọ ahụ ruru Izrel. N’ebe ahụ ka ha biiri. Rut malitere ozugbo ịrụ ọrụ n’ubi, n’ihi na ọ bụ oge iwe ọka bali. Otu nwoke a na-akpọ Boaz kwere ka ọ na-achịkọtara ya ọka n’ubi. Ị̀ ma onye bụ nne Boaz? Ọ bụ Rehab onye obodo Jeriko ahụ.

Otu ụbọchị, Boaz sịrị Rut: ‘Anụwo m banyere gị, na otú i si nwee obiọma n’ebe Neomi nọ. Amatara m ụzọ i si hapụ nne na nna gị na ala gị, na otú i si bịa biri n’etiti ndị ị na-amaghị mbụ. Ka Jehova meere gị ihe ọma!’

Rut wee sị ya: ‘I nwere obiọma n’ahụ́ m, onyenwe m. I mewo ka afọ ju m site n’okwu ọma ndị a ị na-agwa m.’ Boaz hụrụ Rut n’anya nke ukwuu, oge na-adịghịkwa anya, o wee lụrụ ya ịbụ nwunye ya. Nke a mere ka Neomi nwee nnọọ obi ụtọ! Ma obi tọrọ Neomi ụtọ karị mgbe Rut na Boaz mụtara nwa mbụ ha bụ́ Obed. E mesịa, Obed ghọrọ nna nna Devid, onye anyị ga-amụ ọtụtụ ihe banyere ya ma e mesịa.

Rut na Neomi

Akwụkwọ Bible bụ́ Rut.



Ajụjụ

  • Olee ihe mere Neomi ji gaa biri n’ala Moab?
  • Rut na Ọpa hà bụ ole ndị?
  • Olee otú Rut na Ọpa sicha meghachi omume mgbe Neomi gwara ha ka ha laghachikwuru ndị mụrụ ha?
  • Ònye bụ Boaz, oleekwa otú o si nyere Rut na Neomi aka?
  • Gịnị bụ aha nwa Rut na Boaz mụtara, oleekwa ihe mere anyị ji kwesị icheta ya?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Rut 1:1-17.

    Olee ihe Rut kwuru nke na-egosi na o nwere ịhụnanya na-adịghị ada ada n’ebe Neomi nọ? (Rut 1:16, 17)

    Olee otú àgwà Rut si yie nnọọ àgwà “atụrụ ọzọ” ahụ nwere n’ebe ndị e tere mmanụ nọ n’ụwa taa nọ? (Jọn 10:16; Zek. 8:23)

  • Gụọ Rut 2:1-23.

    Olee otú Rut si bụrụ ezi ihe nlereanya nye ụmụ agbọghọ taa? (Rut 2:17, 18; Ilu 23:22; 31:15)

  • Gụọ Rut 3:5-13.

    Olee otú Boaz si lee nkwere Rut kweere ịlụ ya kama ịlụ nwa okorobịa, anya?

    Gịnị ka àgwà Rut na-akụziri anyị banyere ịhụnanya na-adịghị ada ada? (Rut 3:10; 1 Kọr. 13:4, 5)

  • Gụọ Rut 4:7-17.

    Olee otú ndị ikom bụ́ Ndị Kraịst taa pụrụ isi mee ka Boaz? (Rut 4:9, 10; 1 Tim. 3:1, 12, 13; 5:8)

GỤKWUO GBASARA YA

Rut Bụ Ezigbo Enyi

Ọ bụ eziokwu na Rut abụghị onye Izrel, Jehova gọziri ya n’ihi otú o si hụ Neomi n’anya.