Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 49: Anyanwụ Akwụrụ Otu Ebe

Akụkọ nke 49: Anyanwụ Akwụrụ Otu Ebe

LEE Jọshụa. Ọ na-asị: ‘Anyanwụ, kwụrụ otu ebe!’ Anyanwụ ahụ wee kwụrụ otu ebe. Ọ kwụụrụ n’ebe ahụ n’etiti mbara igwe ruo otu ụbọchị zuru ezu. Ọ bụ Jehova mere ka anyanwụ kwụrụ otu ebe! Ma ka anyị hụ ihe mere Jọshụa ji chọọ ka anyanwụ ahụ nọgide na-acha.

Anyanwụ

Mgbe ajọ ndị eze ise nke Kenan malitere ibuso ndị Gibiọn agha, ndị Gibiọn zipụrụ mmadụ ịrịọ Jọshụa ka ọ bịa nyere ha aka. O wee sị ya: ‘Bịakwute anyị ọsọ ọsọ! Zọpụta anyị! Ndị eze niile nke mba ndị dị n’ugwu abịawo ibuso ndị ohu gị agha.’

Ngwa ngwa, Jọshụa na ndị agha ya niile wee jee. Ha jere ije ogologo abalị ahụ niile. Mgbe ha jeruru Gibiọn, ndị agha nke ndị eze ise ahụ tụrụ egwu, wee malite ịgba ọsọ. Jehova wee mee ka oké àkụ́ mmiri igwe si n’eluigwe daa, akụ̀ mmiri igwe ahụ gburu ọtụtụ ndị agha karịa nke ndị agha Jọshụa gburu.

Jọshua

Jọshụa hụrụ na anyanwụ ga-ada n’oge na-adịghị anya. Ọchịchịrị ga-agba, ọtụtụ n’ime ndị agha nke ajọ ndị eze ise ahụ ga-agbalagakwa. Nke a mere Jọshụa ji kpegara Jehova ekpere, wee sị: ‘Anyanwụ, kwụrụ otu ebe!’ Mgbe anyanwụ ahụ nọgidere na-acha, ndị Izrel bịara nwee ike imeri n’agha ahụ.

E nwere ọtụtụ ndị eze ọjọọ ọzọ na Kenan bụ́ ndị kpọrọ ndị Chineke asị. O were Jọshụa na ndị agha ya ihe dị ka afọ isii imeri ndị eze iri atọ na otu nke ala ahụ. Mgbe ha nwesịrị mmeri ndị a, Jọshụa si n’ala Kenan ahụ wepụta ala o kenyere ebo Izrel ndị ka chọrọ ala.

Mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, Jọshụa nwụrụ mgbe ọ dị otu narị afọ na afọ iri. N’oge niile ahụ ya na ndị enyi ya nọ ndụ, ndị Izrel rubeere Jehova isi. Ma mgbe ndị ezi mmadụ a nwụsịrị, ndị Izrel malitere ime ihe ọjọọ na inwe nsogbu. Nke a bụ oge enyemaka Chineke dị ha mkpa n’ezie.

Joshua 10:6-15; 12:7-24; 14:1-5; Ndị Ikpe 2:8-13.



Ajụjụ

  • Na foto a, gịnị ka Jọshụa na-ekwu, n’ihi gịnịkwa?
  • Olee otú Jehova si nyere Jọshụa na ndị agha ya aka?
  • Ndị eze ole bụ́ ndị iro Izrel ka Jọshụa meriri, ogologo oge hakwa aṅaa ka o were ya?
  • N’ihi gịnị ka Jọshụa ji kewaa ala Kenan?
  • Afọ ole ka Jọshụa gbara tupu ya anwụọ, gịnịkwa mere ndị Izrel mgbe ọ nwụsịrị?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Joshua 10:6-15.

    Obi ike dị aṅaa ka ịmara na Jehova mere ka anyanwụ na ọnwa kwụrụ otu ebe maka ndị Izrel na-eme ka anyị nwee taa? (Josh. 10:8, 10, 12, 13; Ọma 18:3; Ilu 18:10)

  • Gụọ Joshua 12:7-24.

    Ònye n’ezie meriri ndị eze iri atọ na otu na-achị n’ala Kenan, oleekwa ihe mere nke a ji dị anyị mkpa taa? (Josh. 12:7; 24:11-13; Deut. 31:8; Luk 21:9, 25-28)

  • Gụọ Joshua 14:1-5.

    Olee otú e si keere agbụrụ ndị dị n’Izrel ala ahụ, oleekwa ihe nke a na-egosi banyere ihe nketa na Paradaịs? (Josh. 14:2; Aịsa. 65:21; Ezik. 47:21-23; 1 Kọr. 14:33)

  • Gụọ Ndị Ikpe 2:8-13.

    Dị ka Jọshua mere n’Izrel, ole ndị na-egbochi ndị mmadụ taa isi n’ezi ofufe dapụ? (Ikpe 2:8, 10, 11; Mat. 24:45-47; 2 Tesa. 2:3-6; Taị. 1:7-9; Mkpu. 1:1; 2:1, 2)