Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 44: Rehab Ezobe Ndị Nledo

Akụkọ nke 44: Rehab Ezobe Ndị Nledo

NDỊ ikom ndị a nọ ná nsogbu. Ha aghaghị ịgbapụ, ma ọ bụghị ya, a ga-egbu ha. Ha bụ ndị Izrel bịara nledo. Nwaanyị a nke na-enyere ha aka bụ Rehab. Rehab bi n’ebe a n’ụlọ dị ná mgbidi obodo Jeriko. Ka anyị chọpụta ihe mere ndị ikom ndị a ji nọrọ ná nsogbu.

Ụmụ Izrel ejikerewo ịgabiga Osimiri Jọdan iji baa n’ala Kenan. Tupu ha abaa, Jọshụa zipụrụ ndị nledo abụọ ahụ. Ọ sịrị ha: ‘Gaanụ lee ala ahụ na obodo Jeriko.’

Rehab na ndị Izrel abụọ bịara iledo Jeriko

Mgbe ndị nledo ahụ ruru Jeriko, ha jere n’ụlọ Rehab. Ma otu onye gwara eze Jeriko, sị: ‘Ndị ikom abụọ bụ́ ndị Izrel batara ebe a n’abalị a iledo ala anyị.’ Mgbe ọ nụrụ nke a, eze zigara ndị ikom ijekwuru Rehab, ha ji olu ike gwa ya, sị: ‘Kpọpụta ndị ikom ahụ nọ n’ụlọ gị!’ Ma Rehab zoro ha n’uko ụlọ ya. O wee sị ha: ‘E nwere ndị ikom bịara n’ụlọ m, ma amaghị m ebe ha si bịa. Ha lara mgbe chi na-eji, tupu e mechie ọnụ ụzọ ámá. Ọ bụrụ na unu emee ọsọ ọsọ, unu pụrụ ịnwụde ha!’ Ha wee malite ịchụ ha.

Mgbe ha pụwara, Rehab wee were ọsọ gbaga n’uko ụlọ ahụ. O wee sị ndị nledo ahụ: ‘Ama m na Jehova ga-enye unu ala nke a. Anyị nụrụ otú o si mee ka Osimiri Uhie takọọ mgbe unu na-ahapụ Ijipt, na otú unu si gbuo eze Saịhọn na eze Ọg. Egosiri m unu obiọma, n’ihi ya, kwenụ m nkwa na unu ga-emere m ebere. Zọpụtanụ nne m na nna m na ụmụnne m ndị ikom na ndị inyom.’

Ndị nledo ahụ kwere nkwa na ha ga-eme otú ahụ, ma Rehab aghaghị ime otu ihe. Ha sịrị ya: ‘Were eriri uhie nke a, kee ya na windo gị, gị na ndị gị niile nọkọtakwa n’ime ụlọ gị. Mgbe anyị dum bịaghachiri iweghara Jeriko, anyị ga-ahụ eriri a na windo gị, anyị agaghịkwa egbu mmadụ n’ụlọ gị.’ Mgbe ndị nledo ahụ laghachikwuuru Jọshụa, ha kọọrọ ya ihe niile merenụ.

Joshua 2:1-24; Ndị Hibru 11:31.



Ajụjụ

  • Ebee ka Rehab bi?
  • Ole ndị bụ ndị ikom abụọ a nọ na foto a, gịnịkwa ka ha gara ime na Jeriko?
  • Gịnị ka eze Jeriko nyere Rehab iwu ka o mee, gịnịkwa ka Rehab zara ya?
  • Olee otú Rehab si nyere ndị ikom abụọ ahụ aka, gịnịkwa ka ọ rịọrọ ha ka ha meere ya?
  • Gịnị ka ndị nledo abụọ ahụ kwere Rehab ná nkwa?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Joshua 2:1-24.

    Olee otú nkwa Jehova nke e dekọrọ n’Ọpụpụ 23:28 si mezuo mgbe ndị Izrel bịara ibuso Jeriko agha? (Josh. 2:9-11)

  • Gụọ Ndị Hibru 11:31

    Olee otú akụkọ banyere Rehab si egosi mkpa ọ dị inwe okwukwe? (Rom 1:17; Hib. 10:39; Jems 2:25)