Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 31: Mozis na Erọn Ejee Ịhụ Fero

Akụkọ nke 31: Mozis na Erọn Ejee Ịhụ Fero

MGBE Mozis laghachiri Ijipt, ọ gwara nwanne ya bụ́ Erọn banyere ọrụ ebube ndị ahụ. Mgbe Mozis na Erọn gosiri ụmụ Izrel ọrụ ebube ndị ahụ, ha niile kweere na Jehova nọnyeere ha.

Mgbe ahụ, Mozis na Erọn wee jee ịhụ Fero. Ha gwara ya, sị: ‘Jehova Chineke nke Izrel sịrị, “Hapụ ndị m ka ha mee njem ụbọchị atọ iji wee fee m ofufe n’ime ọzara.”’ Ma Fero zara, sị: ‘Ekweghị na Jehova. M gaghị ekwe ka Izrel jee.’

Fero were iwe n’ihi na ha chọrọ ka e nye ha oge ịhapụ ọrụ ha ije fee Jehova ofufe. Ọ manyere ha ịrụsi ọrụ ike karị. Ụmụ Izrel tara Mozis ụta n’ihi mmeso ọjọọ a na-emesozi ha, o wee wute Mozis. Ma Jehova gwara Mozis ka ọ ghara ichegbu onwe ya. ‘M ga-eme ka Fero hapụ ndị m ka ha laa,’ ka Jehova kwuru.

Mgbe Mozis na Erọn gara ịhụ Fero

Mozis na Erọn jere ịhụ Fero ọzọ. Na nke ugbu a, ha rụrụ ọrụ ebube. Erọn tụpụrụ mkpanaka ya n’ala, o wee ghọọ nnukwu agwọ. Ndị amamihe Fero tụpụkwara mkpanaka ha, mkpanaka ha aghọọkwa agwọ. Ma lee! Agwọ Erọn na-elo agwọ nke ndị amamihe ahụ. Ma Fero ekweghị ahapụ ụmụ Izrel ka ha laa.

Oge wee ruo ka Jehova kụziere Fero ihe. Ị̀ ma ụzọ o si mee ya? Ọ bụ site n’iwetara ndị Ijipt ihe otiti iri, ma ọ bụ ajọ nsogbu.

Mgbe ha nwetasịrị ọtụtụ n’ime ihe otiti ndị ahụ, Fero ziri ozi ka a kpọọ Mozis. Mgbe Mozis bịara, ọ sịrị ya: ‘Kwụsị ihe otiti ndị a, m ga-ahapụkwa ụmụ Izrel ka ha laa.’ Ma mgbe a kwụsịrị ihe otiti ahụ, Fero gbanwere obi ya. O kweghị ka ụmụ Izrel laa. Ma n’ikpeazụ, mgbe ihe otiti nke iri gasịrị, Fero zipụrụ ụmụ Izrel ka ha laa.

Ị̀ ma ihe otiti iri ahụ n’otu n’otu? Ka anyị mụọ banyere ha.

Ọpụpụ 4:27-31; 5:1-23; 6:1-13, 26-30; 7:1-13.



Ajụjụ

  • Olee mmetụta ọrụ ebube Mozis na Erọn rụrụ nwere n’ahụ́ ụmụ Izrel?
  • Gịnị ka Mozis na Erọn gwara Fero, gịnịkwa ka Fero zara ha?
  • Dị ka e gosiri na foto a, gịnị mere mgbe Erọn tụsara mkpanaka ya n’ala?
  • Olee otú Jehova si kụziere Fero ihe, gịnịkwa ka Fero mere?
  • Gịnị mere mgbe ihe otiti nke iri ahụ gasịrị?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Ọpụpụ 4:27-31 na 5:1-23.

    Gịnị ka Fero bu n’uche mgbe ọ sịrị: “Amaghị m onye Jehova bụ ma ọlị”? (Ọpụ. 5:2; 1 Sam. 2:12; Rom 1:21)

  • Gụọ Ọpụpụ 6:1-13, 26-30.

    Olee otú o si bụrụ na Jehova emeghị ka Ebreham, Aịzik, na Jekọb mara ya? (Ọpụ. 3:13, 14; 6:3; Jen. 12:8)

    Olee mmetụta ịmara na Jehova ji Mozis rụọ ọrụ n’agbanyeghị na Mozis chere na ya erughị eru ịrụ ọrụ e nyere ya na-enwe n’ahụ́ anyị? (Ọpụ. 6:12, 30; Luk 21:13-15)

  • Gụọ Ọpụpụ 7:1-13.

    Mgbe Mozis na Erọn ji obi ike gwa Fero ikpe Jehova mara ya, ihe nlereanya dị aṅaa ka ha setịpụụrụ ndị ohu Chineke taa? (Ọpụ. 7:2, 3, 6; Ọrụ 4:29-31)

    Olee otú Jehova si gosi na ya karịrị chi niile nke Ijipt? (Ọpụ. 7:12; 1 Ihe 29:12)