Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 28: Ụzọ E Si Zọpụta Nwa Ọhụrụ Bụ́ Mozis

Akụkọ nke 28: Ụzọ E Si Zọpụta Nwa Ọhụrụ Bụ́ Mozis

LEE nwa ọhụrụ nke a na-ebe ákwá, na-ejide mkpịsị aka nwaanyị ahụ. Ọ bụ Mozis. Ị̀ ma onye ọmarịcha nwaanyị a bụ? Ọ bụ adaeze Ijipt, ada Fero.

Mgbe ada Fero hụrụ Mozis

Nne Mozis zobere nwa ya ruo mgbe ọ dị ọnwa atọ, n’ihi na ọ chọghị ka ndị Ijipt gbuo ya. Ma, ọ matara na a pụrụ ịhụ Mozis, n’ihi ya, lee ihe o mere iji zọpụta ya.

O weere otu nkata ma dozie ya ka mmiri ghara ịba n’ime ya. O wee nyiwe Mozis n’ime ya, debe nkata ahụ n’ebe e nwere ahịhịa ndị tochara ogologo n’akụkụ Osimiri Naịl. Ọ gwara Miriam, bụ́ nwanne nwaanyị Mozis, ka o guzoro n’ebe dị nso iji hụ ihe ga-eme.

Ọ dịghị anya ada Fero abịa n’Osimiri Naịl ịsa ahụ́. Na mberede, ọ hụrụ nkata ahụ dị n’ebe ahụ e nwere ahịhịa ndị toro ogologo. Ọ kpọọ otu n’ime ndị ohu ya nwaanyị, sị: ‘Jee butara m nkata ahụ.’ Mgbe adaeze meghere nkata ahụ, ọ hụrụ otu nwa ọhụrụ mara mma! Nwa ọhụrụ ahụ bụ́ Mozis nọ na-ebe ákwá, ma adaeze nwere ọmịiko n’ahụ́ ya. Ọ chọghị ka e gbuo ya.

Mgbe ahụ, Miriam bịara. Ị pụrụ ịhụ ya na foto a. Miriam jụrụ ada Fero, sị: ‘Ị̀ chọrọ ka m jee kpọọrọ gị nwaanyị Izrel ka ọ na-enyere gị nwa nke a ara?’

Adaeze sịrị ya: ‘Biko jee.’

Miriam gbapụrụ ọsọ jee kọọrọ nne ya. Mgbe nne Mozis bịakwutere adaeze ahụ, adaeze sịrị ya: ‘Kuru nwa a ma na-enyere m ya ara, m ga-akwụ gị ụgwọ ọrụ.’

Otú ahụ ka nne Mozis si lekọta nwa ya n’onwe ya. Ma mgbe Mozis tolitetụrụ, ọ kpọgaara ya ada Fero, bụ́ onye ji Mozis mere nwa ya nwoke. Nke a bụ ụzọ Mozis si tolite n’ezinụlọ Fero.

Ọpụpụ 2:1-10.



Ajụjụ

  • Ònye bụ nwa ọhụrụ nke nọ na foto a, ọ̀ bụkwa mkpụrụ aka onye ka ọ na-ejide?
  • Gịnị ka nne Mozis mere iji chebe nwa ya ka a ghara igbu ya?
  • Ònye bụ nwa agbọghọ nta ahụ nke nọ na foto a, gịnịkwa ka o mere?
  • Mgbe ada Fero hụrụ nwa ọhụrụ ahụ, olee aro Miriam tụụrụ ya?
  • Gịnị ka adaeze ahụ gwara nne Mozis?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Ọpụpụ 2:1-10.

    Olee ohere nne Mozis nwere iji zụọ Mozis ma kụziere ya ihe mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ, ihe nlereanya dịkwa aṅaa ka nke a bụụrụ ndị nne na nna taa? (Ọpụ. 2:9, 10; Deut. 6:6-9; Ilu 22:6; Efe. 6:4; 2 Tim. 3:15)