Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 25: Ezinụlọ Ahụ Akwaga Ijipt

Akụkọ nke 25: Ezinụlọ Ahụ Akwaga Ijipt

JOSEF apụghịzi ijide onwe ya ọzọ. Ọ gwara ndị ohu ya niile ka ha si n’ime ụlọ ya pụọ. Mgbe naanị Josef na ụmụnne ya nọ, ọ malitere ibe ákwá. Chegodị ụdị ihe ijuanya ụmụnne ya nwere, n’ihi na ha amaghị ihe mere o ji na-ebe ákwá. N’ikpeazụ, ọ sịrị ha: ‘Abụ m Josef. Nna m ọ̀ ka nọ ndụ?’

O juru ụmụnne ya anya nke na ha apụghị ikwu okwu. Egwu tụrụ ha. Ma Josef sịrị ha: ‘Biko bịanụ m nso.’ Mgbe ha bịara nso, ọ sị ha: ‘Abụ m Josef nwanne unu onye unu regara Ijipt.’

Josef wee gaa n’ihu na-agwa ha okwu n’obi ebere, sị: ‘Unu atala onwe unu ụta n’ihi na unu rere m bịa n’ebe a. Ọ bụ Chineke n’ezie zitere m n’Ijipt iji zọpụta ndụ ụmụ mmadụ. Fero emewo m onyeisi ala nke a niile. Ya mere, jekwurunụ nna m ọsọ ọsọ, kọọrọ ya banyere nke a. Gwanụ ya ka ọ bịa biri n’ebe a.’

Josef wee makụọ ụmụnne ya, sutukwa ha niile ọnụ. Mgbe Fero nụrụ na ụmụnne Josef bịara, ọ sịrị Josef: ‘Ka ha were ụgbọala jee duta nna ha na ezinụlọ ha ma bịaghachi ebe a. M ga-enye ha ala kasị mma n’Ijipt niile.’

Ha mere otú ahụ. Ị pụrụ ịhụ Josef n’ebe a ka ọ na-ezute nna ya mgbe ya na ezinụlọ ya dum bịara Ijipt.

Ezinụlọ Jekọb ebuola nnọọ ibu. Ha niile dị mmadụ iri asaa mgbe ha kwabatara n’Ijipt, ma a gụnyekọta Jekọb na ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya. Ndị nwunye ha nakwa ma eleghị anya, ọtụtụ ndị ohu ha, sokwa ha. Ha niile wee gaa biri n’Ijipt. A kpọrọ ha ụmụ Izrel, n’ihi na Chineke gbanwere aha Jekọb ịbụ Izrel. Ụmụ Izrel ghọrọ ndị pụrụ iche nke Chineke, dị ka anyị ga-ahụ ma e mesịa.

Jenesis 45:1-28; 46:1-27.

Josef na ndị ezinụlọ ya


Ajụjụ

  • Gịnị mere mgbe Josef gwara ụmụnne ya onye ọ bụ?
  • Gịnị ka Josef ji obiọma kọwaara ụmụnne ya?
  • Gịnị ka Fero kwuru mgbe ọ nụrụ banyere ụmụnne Josef?
  • Olee otú ezinụlọ Jekọb bururu n’ibu mgbe ha kwagara Ijipt?
  • Olee aha e ji gbanwee aha ezinụlọ Jekọb, n’ihi gịnịkwa?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Jenesis 45:1-28.

    Olee otú akụkọ Bible banyere Josef si gosi na Jehova pụrụ ịgbanwe atụmatụ e mere iji merụọ ndị ohu ya ahụ́ ịghọ nke ga-arụpụtazi ezi ihe? (Jen. 45:5-8; Aịsa. 8:10; Fil. 1:12-14)

  • Gụọ Jenesis 46:1-27.

    Olee otú Jehova si mesie Jekọb obi ike mgbe ọ na-aga Ijipt? (Jen. 46:1-4)