Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 21: Ụmụnne Josef Akpọ Ya Asị

Akụkọ nke 21: Ụmụnne Josef Akpọ Ya Asị

LEGODỊ otú nwa okoro a si nọrọ nnọọ ná mwute ma yie onye na-enweghị olileanya. Onye a bụ Josef. Ụmụnne ya eresịla ya ndị ikom ndị a na-eje Ijipt. Josef gaje ịbụ ohu n’ebe ahụ. Gịnị mere ụmụnne ya ji mee ihe ọjọọ nke a? Ọ bụ n’ihi na ha na-emere Josef anyaụfụ.

Mgbe ụmụnne Josef na-ere Josef

Nna ha Jekọb hụrụ Josef n’anya nke ukwuu. O gosipụtara ịhụnanya ya site n’imere ya ogologo uwe mara mma. Mgbe ụmụnne ya iri, ndị tọrọ ya, hụrụ otú Jekọb si hụ Josef n’anya, ha malitere imere Josef anyaụfụ na ịkpọ ya asị. Ma ọ dịkwa ihe ọzọ mere ha ji kpọọ ya asị.

Josef rọrọ nrọ abụọ. N’ime nrọ abụọ ahụ, ụmụnne ya kpọrọ isiala nye ya. Mgbe Josef kọọrọ ụmụnne ya nrọ ndị a, ha kpọrọ ya asị ọbụna karị.

Otu ụbọchị, mgbe ụmụnne ya ndị okenye na-elekọta atụrụ nna ha, Jekọb gwara Josef ka o jee lee otú ha na-eme. Mgbe ụmụnne Josef hụrụ ya ka ọ na-abịa, ụfọdụ n’ime ha wee sị: ‘Ka anyị gbuo ya!’ Ma Ruben, bụ́ nwanne ya nke kasị okenye, sịrị: ‘Mba, unu emela otú ahụ!’ Kama nke ahụ, ha jidere Josef wee tụba ya n’ime otu olulu nke mmiri na-adịghị. Ha wee nọdụ ala iji kpebie ihe a ga-eme ya.

N’oge ahụ, e nwere ụfọdụ ndị Ishmel na-agafe. Juda wee sị ụmụnne ya: ‘Ka anyị resị ya ndị Ishmel ndị a.’ Otú ahụkwa ka ha mere. Ha rere Josef iri mkpụrụ ego ọlaọcha abụọ. Lee obi ọjọọ na arụrụala nke ahụ bụ!

Gịnị ka ụmụnne ya ga-agwa nna ha? Ha gburu ewu wee sụnye uwe Josef nke mara mma n’ime ọbara ewu ahụ ọtụtụ ugboro. Ha wegaara nna ha Jekọb uwe ahụ n’ụlọ wee sị ya: ‘Anyị chọtara uwe a. Lee ya anya, mara ma ọ̀ bụ uwe Josef.’

Jekọb hụrụ na ọ bụ ya. O wee kwaa ákwá, sị: ‘Anụ ọjọọ egbuwo Josef.’ Nke ahụ bụ nnọọ ihe ụmụnne Josef chọrọ ka nna ha chee. O wutere Jekọb nke ukwuu. O bere ákwá ọtụtụ ụbọchị. Ma ọ dịghị ọnwụ Josef nwụrụ. Ka anyị hụ ihe mere ya n’ebe ahụ e duuru ya jee.

Jenesis 37:1-35.



Ajụjụ

  • N’ihi gịnị ka ụmụnne Josef ji meere ya anyaụfụ, gịnịkwa ka ha mere?
  • Gịnị ka ụmụnne Josef chọrọ ime ya, ma gịnị ka Ruben kwuru?
  • Gịnị mere mgbe ndị ahịa bụ́ ndị Ishmel gafewere?
  • Gịnị ka ụmụnne Josef mere iji mee ka nna ha chee na Josef anwụọla?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Jenesis 37:1-35.

    Olee otú Ndị Kraịst pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya Josef site n’ịkọrọ ndị okenye ihe ọjọọ e mere n’ọgbakọ? (Jen. 37:2; Lev. 5:1; 1 Kọr. 1:11)

    Gịnị mere ụmụnne Josef ji mesoo ya omume ọjọọ? (Jen. 37:11, 18; Ilu 27:4; Jems 3:14-16)

    Olee ihe Jekọb mere mgbe ọ na-eru újú, nke bụ́ ihe ndị mmadụ na-emekarị? (Jen. 37:35)

GỤKWUO GBASARA YA

FOTO E JI AKỤZI IHE

E Rere Josef Ka Ọ Bụrụ Ohu

Danloduonụ foto a ma tee ya kreyọn. Leenụ ma ùnu ga-ahụ ihe abụọ e sere na foto a a na-ekwesịghị ise na ya.

KATUUN NDỊ E SERE ESE E JI AKỤZI BAỊBỤL

Mgbe Josef Nọ n’Ijipt

Olee otú ị ga-esi eme ihe dị Chineke mma ọ bụrụgodị na e nweghị onye na-ele gị? Gụọ akụkọ Baịbụl a ma mụta ihe n’ihe Josef mere.