Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 17: Ụmụ Ejima Ndị Na-eyighị

Akụkọ nke 17: Ụmụ Ejima Ndị Na-eyighị
Ịsọ

ỤMỤNTAKỊRỊ nwoke abụọ ndị a eyighị, ọ́ bụghị ya? Ị̀ ma aha ha? Nke na-achụ nta bụ Ịsọ, ebe nke na-azụ atụrụ bụ Jekọb.

Ịsọ na Jekọb bụ ụmụ ejima ndị Aịzik na Ribeka mụtara. Nna ha, bụ́ Aịzik, hụrụ Ịsọ n’anya nke ukwuu n’ihi na ọ bụ ezigbo ọchụnta, na-ewelatara ezinụlọ ha ihe oriri. Ma Ribeka hụrụ Jekọb n’anya karịsịa n’ihi na ọ bụ nwata dị nwayọọ, na-emekwa udo.

Nna nna ha bụ́ Ebreham ka nọ ndụ, ọ ga-abụkwa na Jekọb na-enwe mmasị ige ya ntị mgbe ọ na-agwa ha banyere Jehova. Ebreham mesịrị nwụọ mgbe ọ gbara otu narị afọ na afọ iri asaa na ise, bụ́ mgbe ụmụ ejima ahụ gbara afọ iri na ise.

Mgbe Ịsọ gbara afọ iri anọ, ọ lụụrụ ndị inyom abụọ n’ala Kenan. Nke a wutere Aịzik na Ribeka nke ukwuu n’ihi na ndị inyom ahụ adịghị efe Jehova.

Otu ụbọchị, otu ihe mere, nke mere ka Ịsọ wesa Jekọb nwanne ya ezigbo iwe. Oge ruru mgbe Aịzik chọrọ inye diọkpara ya ngọzi. Ebe ọ bụ Ịsọ tọrọ Jekọb, Ịsọ tụrụ anya inweta ngọzi ahụ. Ma Ịsọ ebuwo ụzọ resị Jekọb ikike nke inweta ngọzi ahụ. Mgbe a mụkwara ụmụntakịrị abụọ ahụ, Chineke kwuru na ọ bụ Jekọb ga-enweta ngọzi ahụ. Nke ahụkwa bụ ihe merenụ. Aịzik nyere nwa ya Jekọb ngọzi ahụ.

Jekọb

Mgbe Ịsọ mesịrị nụ ihe merenụ, o wesara Jekọb iwe. O were iwe dị ukwuu nke na ọ sịrị na ya ga-egbu Jekọb. Mgbe Ribeka nụrụ nke a, o nyere ya nnọọ nsogbu n’obi. N’ihi ya, ọ gwara di ya bụ́ Aịzik, sị: ‘Ọ ga-ajọgbu onwe ya ma Jekọb lụrụkwa otu n’ime ndị inyom Kenan.’

Ya mere, Aịzik kpọrọ Jekọb nwa ya, sị ya: ‘Alụla nwaanyị na Kenan. Kama jee n’ụlọ nna mama gị bụ́ Betuel nke bi na Heran. Lụrụ otu n’ime ụmụ Leban bụ́ nwa Betuel.’

Jekọb gere nna ya ntị, wee malite ogologo njem gawa n’ebe ndị ikwu ya bi na Heran.

Jenesis 25:5-11, 20-34; 26:34, 35; 27:1-46; 28:1-5; Ndị Hibru 12:16, 17.



Ajụjụ

  • Ole ndị bụ Ịsọ na Jekọb, oleekwa otú o si bụrụ na ha eyighị?
  • Afọ ole ka Ịsọ na Jekọb dị mgbe nna nna ha bụ́ Ebreham nwụrụ?
  • Gịnị ka Ịsọ mere bụ́ nke wutere nne na nna ya nke ukwuu?
  • N’ihi gịnị ka Ịsọ ji wesoo nwanne ya, bụ́ Jekọb, iwe ọkụ?
  • Gịnị ka Aịzik gwara nwa ya bụ́ Jekọb ka o mee?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Jenesis 25:5-11, 20-34.

    Gịnị ka Jehova buru n’amụma banyere ụmụ ejima Ribeka? (Jen. 25:23)

    Olee ọdịiche dị n’otú Jekọb na Ịsọ si lee ọnọdụ dịọkpara anya? (Jen. 25:31-34)

  • Gụọ Jenesis 26:34, 35; 27:1-46; na 28:1-5.

    Olee otú o si pụta ìhè na Ịsọ ejighị ihe ime mmụọ kpọrọ ihe? (Jen. 26:34, 35; 27:46)

    Gịnị ka Aịzik gwara Jekọb ka o mee ma ọ bụrụ na ọ chọrọ inweta ngọzi Chineke?

  • Gụọ Ndị Hibru 12:16, 17.

    Gịnị ka ihe mere Ịsọ na-egosi banyere ihe ga-eme ndị na-elelị ihe ndị dị nsọ anya?

GỤKWUO GBASARA YA

Jekọb, Isọ, na Ofe

Gụọ gbasara Jekọb na Isọ. Danloduo foto a, bipụta ya, teekwa ya kreyọn.