Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible

Akụkọ nke 16: Aịzik Alụta Ezigbo Nwunye

Akụkọ nke 16: Aịzik Alụta Ezigbo Nwunye

Ị̀ MA onye nwaanyị a nke nọ na foto a bụ? Aha ya bụ Ribeka. Nwoke ahụ ọ na-ejekwuru bụ Aịzik. Ọ na-aga ịghọ nwunye ya. Olee otú nke a si mee?

Ebreham nna Aịzik chọrọ ịlụtara nwa ya ezigbo nwunye. Ọ chọghị ka Aịzik lụrụ otu n’ime ndị inyom Kenan, n’ihi na ndị ahụ na-efe chi ụgha. Ebreham wee kpọọ ohu ya sị ya: ‘M chọrọ ka i jee n’ebe ndị ikwu m bi na Heran, lụtara Aịzik nwa m nwunye.’

Ozugbo ahụ, ohu Ebreham chịịrị kamel iri ma malite njem ahụ dị anya. Mgbe o ruru nso n’ebe ndị ikwu Ebreham bi, ọ kwụsịrị n’akụkụ otu olulu mmiri. Ọ bụ n’oge mgbede, bụ́ mgbe ndị inyom obodo ahụ na-abịa esere mmiri n’olulu mmiri ahụ. Ohu Ebreham wee kpegara Jehova ekpere, sị: ‘Biko, ka nwaanyị nke ga-enye mụ na kamel ndị a niile mmiri bụrụ onye ị họpụtara ịbụ nwunye Aịzik.’

Mgbe Ribeka zutere Aịzik

Ọ dịghị anya, Ribeka abịa isere mmiri. Mgbe ohu ahụ rịọrọ ya mmiri, o nyere ya. O jekwara kute mmiri nke zuru kamel niile ahụ akpịrị na-akpọ nkụ. Ọ bụ ọrụ siri ike, n’ihi na kamel na-aṅụ mmiri nke ukwuu.

Mgbe Ribeka mesịrị nke a, ohu Ebreham ahụ jụrụ ya aha nna ya. Ọ jụkwara ya ma ya pụrụ ịrahụ n’ụlọ ha. Ọ sị ya: ‘Aha nna m bụ Betuel, e nwekwara ebe ị ga-arahụ n’ụlọ anyị.’ Ohu Ebreham maara na Betuel bụ nwa nwanne Ebreham, bụ́ Nehọ. O gbuo ikpere n’ala kelee Jehova maka idute ya na nke ndị ikwu Ebreham.

N’abalị ahụ, ohu Ebreham gwara Betuel na Leban nwanne Ribeka isi ije ya. Ha kwere na Ribeka ga-esoro ya jee ka Aịzik lụọ ya. Gịnị ka Ribeka kwuru mgbe a jụrụ ya? Ọ zara ‘Ee,’ na ya chọrọ ije. N’echi ya, ha nọkwasịrị n’elu kamel, wee malite ogologo njem ahụ ịlaghachi Kenan.

Mgbe ha ruru, ọ bụ n’oge anyasị. Ribeka wee hụ nwoke nke na-ejegharị n’ubi. Ọ bụ Aịzik. Obi tọrọ ya ụtọ ịhụ Ribeka. Sera nne ya anwụwo kemgbe afọ atọ gara aga, ọ nọkwa na-eru újú ya. Ma ugbu a, Aịzik bịara hụ Ribeka n’anya nke ukwuu, obi wee dị ya ụtọ ọzọ.

Jenesis 24:1-67.



Ajụjụ

  • Ole ndị bụ nwoke na nwaanyị a nọ na foto a?
  • Gịnị ka Ebreham mere iji lụtara nwa ya nwoke nwaanyị, n’ihi gịnịkwa ka o ji mee otú ahụ?
  • Olee otú e si zaa ekpere ohu Ebreham?
  • Gịnị ka Ribeka zara mgbe a jụrụ ya ma ọ chọrọ ịlụ Aịzik?
  • Gịnị mere ka Aịzik nwee obi ụtọ ọzọ?

Ajụjụ ndị ọzọ

  • Gụọ Jenesis 24:1-67.

    Àgwà ọma ndị dị aṅaa ka Ribeka kpara mgbe o zutere ohu Ebreham n’akụkụ olulu mmiri? (Jen. 24:17-20; Ilu 31:17, 31)

    Olee otú ndokwa Ebreham mere ka a lụtara Aịzik nwunye si bụrụ ezi ihe nlereanya nye Ndị Kraịst taa? (Jen. 24:37, 38; 1 Kọr. 7:39; 2 Kọr. 6:14)

    N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị iwepụta oge iji tụgharịa uche dị nnọọ ka Aịzik mere? (Jen. 24:63; Ọma 77:12; Fil. 4:8)