Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!

 ISI NKE 1

“Ka Alaeze Gị Bịa”

“Ka Alaeze Gị Bịa”

IHE ISIOKWU A NA-EKWU

Ihe Jizọs kụziiri anyị gbasara Alaeze Chineke

1, 2. Olee ihe Jehova gwara ndịozi Jizọs atọ mee? Oleekwa ihe ha mere?

Ọ BỤRỤ na Jehova Chineke agwa gị ihe ị ga-eme, ị̀ ga-eme ya? O doro anya na ị ga-achọ ime ihe ọ bụla ọ gwara gị mee.

2 Otu ụbọchị, mgbe e mechara Ememme Ngabiga nke afọ 32, Jehova gwara ndịozi Jizọs atọ, ya bụ, Pita, Jems, na Jọn ihe ha ga-emere ya. (Gụọ Matiu 17:1-5.) Ha na Jizọs guzo “n’ugwu dị oké elu.” Ha hụrụ otú Jizọs ga-esi dị ebube mgbe ọ ga-abụ Eze n’eluigwe. Ọ dị Pita ka ihe ahụ ọ̀ na-eme n’ìhè. Ọ bụ ya mere o ji gwawa Jizọs okwu. Mgbe Pita ka kpụ okwu n’ọnụ, ígwé ojii kpuchiri ha. Pita, Jems na Jọn nụrụ olu Jehova. Olu a ha nụrụ bụ ihe ọma meere ha n’ihi na ọ bụ naanị mmadụ ole na ole nụtụrụla olu Jehova. Jehova kwuru hoo haa na Jizọs bụ Ọkpara ya. O kwukwara, sị: “Geenụ ya ntị.” Ndịozi ahụ mere ihe a Jehova kwuru. Ha mere ihe Jizọs kụziiri ha. Ha gwakwara ndị ọzọ ka ha mee ihe Jizọs kụziri.—Ọrụ 3:19-23; 4:18-20.

Ihe Jizọs kacha kụziere ndị mmadụ bụ gbasara Alaeze Chineke

3. Gịnị mere Jehova ji sị anyị gee Ọkpara ya ntị? Olee ihe anyị ga-eleba anya na ya?

3 Jehova gwara ndịozi Jizọs ka ha ‘gee Jizọs ntị.’ E dere ihe a na Baịbụl ka anyịnwa nweekwa ike ime ihe Jizọs kụziri. (Rom 15:4) Gịnị mere anyị ga-eji gee Jizọs ntị? Ọ bụ n’ihi na Jizọs bụ ọnụ na-ekwuchitere Jehova. Ihe Jizọs na-akụziri ndị mmadụ mgbe ọ bụla bụ ihe Nna ya chọrọ ka ha mata. (Jọn 1:1, 14) Ihe Jizọs kacha kụziere ndị mmadụ bụ gbasara Alaeze Chineke. N’ihi ya, anyị kwesịrị ileba anya n’ihe a Jizọs kụziri. Alaeze Chineke a bụ ọchịchị dị n’eluigwe. Ọ bụ Jizọs Kraịst na otu narị puku na iri puku anọ na puku anọ ga-achị na ya. (Mkpu. 5:9, 10; 14:1-3; 20:6) Ma, ihe mbụ anyị ga-eleba anya bụ ihe mere Jizọs ji kụziere ndị mmadụ gbasara Alaeze Chineke karịa ihe ndị ọzọ ọ kụziri.

“Ọ Bụ Ihe Jupụtara Mmadụ n’Obi . . .”

4. Olee otú Jizọs si gosi na ya ji Alaeze Chineke kpọrọ ihe?

4 Jizọs ji Alaeze Chineke kpọrọ ihe. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na ihe anyị na-ekwu mgbe niile na-egosi ihe dị anyị ezigbo mkpa. Jizọs n’onwe ya kwuru, sị: “Ọ bụ ihe jupụtara mmadụ n’obi ka ọnụ ya na-ekwu.” (Mat. 12:34) Mgbe ọ bụla Jizọs na-akụziri ndị mmadụ ihe,  ọ na-ekwu gbasara Alaeze Chineke. N’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk na Jọn, a kpọrọ Alaeze Chineke aha ihe karịrị otu narị ugboro. Ọ bụ Jizọs kwuru ọtụtụ n’ime ha mgbe ọ na-akụziri ndị mmadụ ihe. Isiokwu ozi ọma ya bụ Alaeze Chineke. Ọ bụ ya mere Jizọs ji kwuo, sị: “Aghaghịkwa m izisara obodo ndị ọzọ ozi ọma alaeze Chineke, n’ihi na ọ bụ nke a mere e ji zite m.” (Luk 4:43) Mgbe a kpọlitechadịrị Jizọs n’ọnwụ, ọ nọgidere na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya gbasara Alaeze Chineke. (Ọrụ 1:3) O doro anya na obi na-atọ Jizọs ụtọ gbasara Alaeze Chineke. Ọ bụ ya mere o ji ekwu okwu ya mgbe niile.

5-7. (a) Olee otú anyị si mara na Jehova ji Alaeze ya kpọrọ ihe? Mee ihe atụ. (b) Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị ji Alaeze Chineke kpọrọ ihe?

5 Jehova jikwa Alaeze ya kpọrọ ihe. Olee otú anyị si mara? Chetakwa na ọ bụ Jehova zitere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya n’ụwa. Ihe niile Ọkpara ya kwuru bụ ihe ọ gwara ya kwuo. Ọ bụkwa ya kụziiri Ọkpara ya ihe niile ọ kụziri. (Jọn 7:16; 12:49, 50) Ọ bụ uche Jehova ka e dere n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn. Ọ bụ n’akwụkwọ ndị a ka e dere otú Jizọs si bie ndụ na otú o si jee ozi ya. Ị̀ ghọtara ihe ihe a niile pụtara?

Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị, ‘M̀ ji Alaeze Chineke kpọrọ ihe?’

6 Were ya na ị chọrọ itinye foto ndị ezinụlọ unu niile n’otu ọ́bọ́ foto, ma ha niile agaghị abacha n’ọ́bọ́ foto ahụ. Olee ihe ị ga-eme? Ị ga-ahọrọ ndị ị ga-etinye n’ọ́bọ́ foto ahụ. Akwụkwọ Matiu, Mak, Luk na Jọn, dị ka ọ́bọ́ foto ahụ. Ha gwara anyị ihe ndị ga-enyere anyị aka ịmata onye Jizọs bụ nke ọma. Jehova agwaghị ndị dere akwụkwọ ndị ahụ ka ha dee ihe niile Jizọs kwuru na ihe ndị o mere mgbe ọ bịara n’ụwa. (Jọn 20:30; 21:25) Kama, Jehova ji mmụọ nsọ ya mee ka ha dee naanị ihe ndị ga-enyere anyị aka ịghọta ihe mere Jizọs ji bịa n’ụwa nakwa ihe kacha Jehova mkpa. (2 Tim. 3:16, 17; 2 Pita 1:21) Ebe ọ bụ na ihe juru n’akwụkwọ Baịbụl anọ ndị ahụ bụ ihe ndị Jizọs kụziri banyere Alaeze Chineke, o doro anyị anya na Jehova ji Alaeze ya kpọrọ ihe. Ọ bụ ya mere Jehova ji chọọ ka anyị mata ihe niile banyere Alaeze ya.

7 Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị, ‘M̀ ji Alaeze Chineke kpọrọ ihe?’ Ọ bụrụ na anyị ji ya kpọrọ ihe, anyị ga-achọsi ike ịnụ ihe Jizọs kwuru na ihe ọ kụziri gbasara Alaeze Chineke. Anyị ga-achọ ịma ihe mere Alaeze Chineke ji kwesị ịbịa, otú ọ ga-esi bịa, nakwa mgbe ọ ga-abịa.

Olee Otú ‘Alaeze Chineke Ga-esi Bịa’?

8. Olee otú Jizọs si gosi na Alaeze Chineke dị ezigbo mkpa?

8 Chegodị gbasara ekpere ahụ Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya. Ihe ndị o kwuru n’ekpere ahụ dị mfe nghọta. Ọ gwara anyị ihe Alaeze Chineke ga-eme, nakwa otú o si dị ezigbo mkpa. E nwekwara ihe asaa Jizọs kwuru ka anyị na-arịọ Nna ya n’ekpere ahụ. Atọ ndị mbụ gbasara ihe ndị bụ́ nzube Jehova. Nke mbụ bụ ka e doo aha Chineke nsọ. Nke abụọ bụ ka Alaeze Chineke bịa. Nke atọ bụ ka uche Chineke mee n’ụwa dị ka ọ na-eme n’eluigwe. (Gụọ Matiu 6:9, 10.) E nwere ihe jikọ rọ ha atọ. Ọ bụ Alaeze Mesaya ka Jehova ga-eji doo aha ya nsọ, meekwa ka uche ya mee n’ụwa.

9, 10. (a) Gịnị ka Alaeze Chineke ga-eme ma ọ bịa? (b) Olee otu n’ime ihe ndị Chineke kwere anyị ná nkwa ị na-atụsi anya ya ike ka o mezuo?

9 Olee ihe anyị bu n’obi na-arịọ Chineke ka Alaeze ya bịa? Ihe anyị na-arịọ bụ ka Alaeze Chineke bịa mee ihe Chineke chọrọ n’ụwa. Alaeze ahụ bịa, ọ ga-achị ụwa niile. Ọ ga-ala ma ndị ọjọọ ma ọchịchị ụmụ mmadụ n’iyi. Ọ ga-emekwa ka ọ bụrụ naanị ndị ezi omume ga-ebi n’ụwa a. (Dan. 2:44; 2 Pita 3:13) Alaeze ahụ ga-emekwa ka ụwa niile bụrụ paradaịs. (Luk 23:43) Chineke ga-akpọlite ndị niile o bu n’obi ịkpọlite n’ọnwụ. Ya kpọlite ha, ha na ndị ikwu na ibe ha emekọrịtawakwa ihe. (Jọn 5:28, 29) A ga-eme ka ụmụ mmadụ ndị na-erubere Chineke isi zuo ókè, ha adịrịkwa ndụ ruo mgbe ebighị ebi. (Mkpu. 21:3-5) N’oge ahụ, a ga na-emezi uche Chineke n’ụwa otú e si eme ya n’eluigwe. Ọ́ naghị agụsi gị agụụ ike ịhụ mgbe ihe ndị a niile Baịbụl kwuru ga-eme? Echefula na mgbe ọ bụla ị na-arịọ Jehova ka Alaeze ya bịa, ihe ị na-arịọ ya bụ ka o meere anyị ihe ọma ndị ahụ o kwere anyị ná nkwa.

10 O doro anya na e mezubeghị ihe anyị bu n’obi na-arịọ ka Alaeze Chineke bịa. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ụmụ mmadụ ka na-achị ụwa a, ọ bụghịkwa naanị ndị ezi omume bi na ya taa. Ma, o nwere otu ihe ọma merenụ. Ihe ọma ahụ bụ na Alaeze Chineke amalitela ịchị n’eluigwe. Anyị ga-ekwu gbasara ya n’isiokwu na-esote isiokwu a. Ka anyị burugodị ụzọ leba anya n’ihe Jizọs kwuru gbasara mgbe Alaeze Chineke ga-amalite ịchị, nakwa mgbe ọ ga-abịa.

Ole Mgbe Alaeze Chineke Ga-amalite Ịchị?

11. Olee ihe Jizọs kwuru gbasara mgbe Alaeze Chineke ga-amalite ịchị?

11 Jizọs kwuru ihe gosiri na Alaeze Chineke agaghị amalite ịchị n’oge ndịozi ya, n’agbanyeghị na ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya n’oge ahụ chere na ọ bụ mgbe ahụ ka ọ ga-amalite ịchị. (Ọrụ 1:6) Ka anyị leba anya n’akụkọ abụọ Jizọs ji mee ihe atụ. Mgbe ọ kọchara otu, o rughị afọ abụọ, ya akọọ nke ọzọ.

12. Olee otú ihe atụ Jizọs ji ọka wit na ata mee si gosi na Alaeze Chineke amaliteghị ịchị n’oge ndịozi ya?

12 Ihe atụ Jizọs ji ọka wit na ata mee. (Gụọ Matiu 13:24-30.) O nwere ike ịbụ na o mere ihe atụ a n’oge opupu ihe ubi, n’afọ 31. Mgbe Jizọs mechara ihe atụ a, ọ kọwaara ya ndị na-eso ụzọ ya. (Mat. 13:36-43) Lekwa ihe ihe atụ ahụ o mere pụtara: Ndịozi Jizọs nwụchaa, Ekwensu ga-akụ ata n’etiti ọka wit. Ata ahụ bụ Ndị Kraịst adịgboroja. Ọka wit ahụ bụ “ụmụ nke alaeze” ma ọ bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ. A ga-ahapụ ma ata ahụ ma ọka wit ahụ ka ha tokọọ ruo n’oge owuwe ihe ubi. Oge owuwe ihe ubi bụ “ọgwụgwụ nke usoro ihe a.” Mgbe oge owuwe ihe ubi ahụ malitechara, a ga-achịkọta ata iche, chịkọtakwa ọka wit iche. N’ihi ya, ihe atụ a Jizọs mere na-egosi na Alaeze Chineke ga-amalite ịchị mgbe ihe ndị ahụ a kụrụ n’ubi tochara, ọ bụghị n’oge ndịozi. Ihe ndị mere eme gosiri na oge owuwe ihe ubi ahụ malitere n’afọ 1914.

13. Olee ihe atụ Jizọs mere iji gosi na a gaghị echi ya eze ozugbo ọ laghachiri n’eluigwe?

 13 Ihe atụ Jizọs ji maịna mee. (Gụọ Luk 19:11-13.) Jizọs meere ndị na-eso ụzọ ya ihe atụ a n’afọ 33 mgbe ọ na-aga Jeruselem. Nke a bụ nke ikpeazụ ọ gara Jeruselem. Ụfọdụ n’ime ndị ọ nọ na-agwa okwu chere na ọ na-aga ịmalite Alaeze ya ozugbo ha ruru Jeruselem. Jizọs mere ka o doo ha anya na oge Alaeze Chineke ga-amalite ịchị erubeghị, na ọ ka ga-ewetụ oge. O meere ha ihe atụ nyeere ha aka ịghọta ihe ọ na-ekwu. O ji onwe ya tụnyere “otu nwoke nke si n’ezinụlọ eze.” Nwoke a gara ‘n’ala dị anya ka o nweta ike ọchịchị.’ * N’ihe atụ a, ọ bụ Jizọs bụ nwoke ahụ gara ‘n’ala dị anya’ ka o nweta ike ọchịchị. ‘Ala ahụ dị anya ọ gara’ bụ eluigwe. Ọ gara ebe ahụ ka Nna ya nye ya ike ọchịchị. Ma, Jizọs ma na Nna ya agaghị echi ya Eze ozugbo ọ laghachiri n’eluigwe. Kama, ọ ga-anọdụ ala n’aka nri Chineke ruo mgbe oge a ga-echi ya Eze ruru. Ihe ndị mere eme gosiri na Jizọs cheere ruo ọtụtụ narị afọ tupu e chie ya Eze.—Ọma 110:1, 2; Mat. 22:43, 44; Hib. 10:12, 13.

Ole Mgbe Alaeze Chineke Ga-abịa?

14. (a) Gịnị ka Jizọs zara ndịozi ya anọ jụrụ ya ajụjụ? (b) Mgbe ihe ndị ahụ Jizọs kwuru malitere ime, gịnị ka ha na-akụziri anyị banyere ọnụnọ ya nakwa Alaeze Chineke?

14 Mgbe ọ fọrọ abalị ole na ole tupu e gbuo Jizọs, ndịozi ya anọ bịakwutere ya ma jụọ ya ajụjụ. Ha jụrụ ya, sị: ‘Gịnị ga-abụ ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị na nke ọgwụgwụ usoro ihe a?’ (Mat. 24:3; Mak 13:4) Jizọs zara ha ajụjụ a. Ọ gwara ha ọtụtụ ihe ndị ga-eme eme a ga-eji mara ọgwụgwụ usoro ihe a. E dere ihe ndị ahụ na Matiu isi iri abụọ na anọ na nke iri abụọ na ise. Ihe ndị ahụ Jizọs kwuru ga-emenụ ka a ga-eji  mara oge “ọnụnọ” ya. Mgbe ọnụnọ Jizọs ga-amalite ga-adaba n’oge Alaeze Chineke ga-amalite ịchị. Mgbe ọnụnọ ya ga-agwụ ga-adabakwa mgbe Alaeze Chineke ga-abịa. Ihe ndị na-eme n’ụwa kemgbe afọ 1914 na-egosi na ihe ndị ahụ Jizọs kwuru bidoro ime n’afọ ahụ. * N’ihi ya, ọ bụ n’afọ ahụ ka ọnụnọ Jizọs malitere, ọ bụkwa n’afọ ahụ ka Alaeze Chineke malitere ịchị n’eluigwe.

15, 16. Ole ndị bụ “ọgbọ a” Jizọs kwuru okwu ya?

15 Ma, olee mgbe Alaeze Chineke ga-emecha bịa? Jizọs agwaghị anyị hoo haa mgbe ọ ga-abịa. (Mat. 24:36) Ma, ọ gwara anyị ihe ndị ga-eme ka anyị mata na Alaeze Chineke dị ezigbo nso. Jizọs kwuru na Alaeze Chineke ga-abịa mgbe “ọgbọ a” o kwuru okwu ya ga-ahụ ihe ndị ahụ ga-eme n’ụwa a ga-eji mara ọgwụgwụ usoro ihe a. (Gụọ Matiu 24:32-34.) Ole ndị bụ “ọgbọ a”? Ka anyị lebakwuo anya n’ihe ahụ Jizọs kwuru.

16 “Ọgbọ a.” Ọ̀ bụ ndị na-ekweghị ekwe ka Jizọs kpọrọ ọgbọ a? Mbanụ. Ole ndị ka Jizọs gwara okwu a? Ọ bụ ndịozi ya ole na ole. Ndịozi ya ole na ole a “bịakwutere ya naanị ha.” (Mat. 24:3) A ga-eji mmụọ nsọ tee ndịozi ya mmanụ n’oge na-adịghị anya. Ihe ọzọ ga-enyekwara anyị aka ịghọta ndị Jizọs kpọrọ ọgbọ a bụ ihe ndị o kwuru tupu ya ekwuo gbasara ọgbọ a. Jizọs gwara ndịozi ya ahụ, sị: “Dị ka ihe atụ, sinụ n’osisi fig mụta isi ihe a: Ozugbo alaka ọhụrụ ya dịwara nro, o wee na-epupụta akwụkwọ, unu na-amara na oge okpomọkụ dị nso. Otú ahụkwa, mgbe unu na-ahụ ihe ndị a niile, maranụ na ọ nọ nso n’ọnụ ụzọ.” Ọ bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs e tere mmanụ ga-ahụ mgbe ihe ndị ahụ Jizọs kwuru na ọ ga-eme mewere. Ihe ndị ahụ mewe, ọ bụkwa ha ga-aghọta ihe ha pụtara, ya bụ, na Jizọs “nọ nso n’ọnụ ụzọ.” Ndị na-ekweghị ekwe agaghị aghọta ihe ihe ndị ahụ pụtara. N’ihi ya, ndị Jizọs bu n’obi mgbe ọ na-ekwu gbasara “ọgbọ a,” bụ ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ.

17. Gịnị ka okwu bụ́ “ọgbọ” pụtara? Gịnịkwa ka okwu bụ́ “ihe ndị a niile” pụtara?

17 “Ọgbọ a agaghị agabiga ma ọlị ruo mgbe ihe ndị a niile mere.” Olee otú ihe a Jizọs kwuru ga-esi mee? E nwere ihe abụọ anyị kwesịrị ibu ụzọ ghọta iji nwee ike ịma otú ọ ga-esi mee. Nke mbụ bụ ịghọta ihe okwu ahụ bụ́ “ọgbọ” pụtara. Nke abụọ bụ ịghọta ihe “ihe ndị a niile” pụtara. Okwu bụ́ “ọgbọ” na-apụtakarị ndị na-abụghị ebiri, ndị nọrọ ndụ n’otu oge. Otu ọgbọ anaghị eto oké ogologo. Ọ na-agwụkwa agwụ. (Ọpụ. 1:6) “Ihe ndị a niile” Jizọs kwuru gbasara ha bụ ihe niile o kwuru ga-eme n’oge ọnụnọ ya, malite n’afọ 1914 ruo mgbe ọnụnọ ya ga-agwụ, ya bụ, mgbe a ga-enwe “oké mkpagbu.”—Mat. 24:21.

18, 19. Olee ihe anyị ghọtara “ọgbọ a” Jizọs kwuru okwu ya pụtara? Gịnịkwa ka anyị nwere ike ikwu n’ihi ihe a anyị ghọtara?

18 Oleezi ihe anyị ghọtara Jizọs bu n’obi mgbe ọ na-ekwu gbasara “ọgbọ a”? Ọgbọ ọ na-ekwu okwu ya bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ ndụ n’otu oge. Ndị nke mbụ bụ ndị hụrụ mgbe ihe ịrịba ama Jizọs kwuru gbasara ya malitere imezu  n’afọ 1914. Ndị nke abụọ abụrụ ndị nke ha na ndị nke mbụ a dịkọrọ ndụ. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ndị nke abụọ ga-ahụ mgbe oké mkpagbu ahụ ga-amalite. Ndị nke mbụ ahụ na ndị nke abụọ a bụ otu ọgbọ n’ihi na ha dịkọrọ ndụ n’otu oge. *

19 Gịnị ka anyị na-ekwu? Anyị ma na ihe ndị na-eme n’ụwa ugbu a na-egosi na Jizọs anọrọla n’ocheeze na-achị n’eluigwe. Anyị makwa na ndị e tere mmanụ, bụ́ ndị so “n’ọgbọ a” Jizọs kwuru gbasara ya, akatawala ahụ́. O dokwara anyị anya na ha niile agaghị anwụcha tupu oké mkpagbu ukwuu amalite. N’ihi ya, ihe anyị na-ekwu bụ na Alaeze Chineke dị ezigbo nso. Oge Alaeze Chineke ga-abịa chịwa ụwa a eruola. Jizọs gwara anyị ka anyị na-arịọ Jehova ‘Ka Alaeze ya bịa.’ Cheedị otú obi ga-adị gị ma ị hụ mgbe Jehova ga-aza anyị ekpere a.

20. Olee ihe dị oké mkpa anyị ga-eleba anya na ya n’akwụkwọ a? Olee ihe anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu na-esonụ?

20 Anyị ekwesịghị ichefu ihe Jehova gwara anyị gbasara Nwa ya. O si n’eluigwe gwa anyị, sị: “Geenụ ya ntị.” Ezigbo Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ime ihe a Chineke gwara anyị mee. Anyị chọsiri ike ịma ihe niile Jizọs kwuru gbasara Alaeze Chineke. Anyị chọsikwara ike ịma ihe niile ọ kụziri gbasara ya. Otu ihe dị oké mkpa anyị ga-eleba anya na ya n’akwụkwọ a bụ ihe Alaeze Chineke merela. Ihe ọzọ dị oké mkpa anyị ga-elebakwa anya na ya bụ ihe Alaeze ahụ ka ga-eme. Isiokwu na-esonụ ga-akọrọ anyị ihe ndị na-eme obi ụtọ mere tupu Alaeze Chineke amalite ịchị n’eluigwe, nakwa ihe ndị mere mgbe ọ malitere ịchị.

^ para. 13 O nwere ike ịbụ na ihe atụ a Jizọs meere ndị ọ na-agwa okwu n’oge ahụ chetaara ha banyere otu nwa Herọd Onye Ukwu a na-akpọ Akeleyọs. Tupu Herọd anwụọ, o kwuru na ọ bụ Akeleyọs nwa ya ga-anọchi ya ma chịwa Judia na ebe ndị ọzọ. Ma, tupu Akeleyọs ebido ịchị, o si obodo ha gaa obodo dị ezigbo anya, ya bụ, Rom, ka ọ nata Ọgọstọs Siza ike ọchịchị.

^ para. 14 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu gbasara isiokwu a, gụọ isi itoolu nke akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

^ para. 18 Onye ọ bụla e tere mmanụ mgbe ndị nke mbụ ahụ nwụchara, ya bụ, ndị ahụ hụrụ “mmalite ihe ụfụ nke nhụjuanya” n’afọ 1914, esoghị ná ndị ahụ Jizọs kpọrọ “ọgbọ a.”—Mat. 24:8.