Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!

 ISI NKE 9

Uru Ozi Ọma A Na-ezi Bara—‘Ihe A Kụrụ n’Ubi Achaala Maka Owuwe Ihe Ubi’

Uru Ozi Ọma A Na-ezi Bara—‘Ihe A Kụrụ n’Ubi Achaala Maka Owuwe Ihe Ubi’

IHE ISIOKWU A NA-EKWU

Jehova emeela ka eziokwu banyere Alaeze ya na-agbasa

1, 2. (a) Olee ihe ndị na-eso ụzọ Jizọs na-aghọtachaghị? (b) Olee ụdị owuwe ihe ubi Jizọs kwuru okwu ya?

O NWERE ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya otu ụbọchị. Ha aghọtachaghị ihe ahụ ọ gwara ha. Ihe ahụ ọ gwara ha bụ: “Welienụ anya unu lee ubi, na ihe a kụrụ na ha achaala maka owuwe ihe ubi.” Mgbe ha lere anya n’ubi ndị dị ebe ahụ Jizọs tụrụ aka, ihe ha hụrụ bụ ọka bali na-epulite epulite. Ha nwere ike ịna-ajụ onwe ha, sị, ‘Oleekwanụ nke Jizọs na-ekwu okwu owuwe ihe ubi ugbu a, ebe ọ bụ na ọka ndị a ka na-epulite epulite?’—Jọn 4:35.

2 Ma, ihe Jizọs na-ekwu okwu ya n’ebe a abụghị owuwe ihe ubi nkịtị. Kama, Jizọs chọrọ ịkụziri ndị na-eso ụzọ ya ihe abụọ dị mkpa banyere ịchịkọta ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Gịnị bụ ihe abụọ ahụ ọ chọrọ ịkụziri ha? Ihe ga-enyere anyị aka ịmata ha bụ ilebakwu anya n’akụkọ ahụ Jizọs kọọrọ ndị na-eso ụzọ ya.

A Gwara Ha Ka Ha Na-ezi Ozi Ọma, Kwekwa Ha Nkwa na Ha Ga-aṅụrị Ọṅụ

3. (a) Gịnị ka ọ ga-abụ ya mere Jizọs ji kwuo, sị: ‘Ihe a kụrụ n’ubi achaala maka owuwe ihe ubi’? (b) Olee otú Jizọs si mee ka ihe o kwuru doo anya?

3 Ọ bụ ná ngwụcha afọ 30 ka Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ihe ahụ ha na-aghọtachaghị. Ọ bụ n’akụkụ otu olulu mmiri nke dị nso n’obodo ndị Sameria a na-akpọ Saịka ka Jizọs nọ gwa ha okwu ahụ. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya banyere n’ime obodo ahụ, Jizọs nọ ebe ahụ na-eche ha. Ọ nọkwa ebe ahụ zie otu nwaanyị ozi ọma. Nwaanyị a mụtara ezigbo ihe ozugbo Jizọs ziri ya ozi ọma. Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs lọghachiri, nwaanyị a hapụrụ Jizọs, gbara ọsọ banye n’ime obodo Saịka ka ọ gwa ndị obodo ha ihe ndị ahụ Jizọs kụziiri ya. Mgbe ọ kọchaara ha ihe ndị ahụ, obi tọrọ ọtụtụ n’ime ha ụtọ, ha esi n’obodo ahụ kworo n’ìgwè bịa n’akụkụ olulu mmiri ahụ ka ha hụ Jizọs. O nwere ike ịbụ mgbe ahụ ndị Sameria a nọ na-abịa ka Jizọs lepụrụ anya hụ ha ma gwa ndị na-eso ụzọ ya okwu a: “Welienụ anya unu lee ubi, na ihe a kụrụ na ha achaala maka owuwe ihe ubi.” Jizọs kwuziri ihe mere ka o doo ha anya na ihe ọ na-ekwu okwu ya abụghị owuwe ihe ubi nkịtị, kama ọ bụ ịchịkọta ndị ga-abụ ndị na-eso ụzọ ya. Jizọs sịrị: “Onye na-ewe ihe ubi . . . na-ekpokọta mkpụrụ maka ndụ ebighị ebi.”—Jọn 4:5-30, 36.

4. (a) Olee ihe abụọ dị mkpa Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya banyere ịchịkọta ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-eleba anya na ha?

4 Olee ihe abụọ dị mkpa Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya banyere ịchịkọta ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya? Nke mbụ bụ na e kwesịrị ịrụ ọrụ a ngwa ngwa. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na “ubi . . . achaala maka owuwe ihe ubi.” Ihe mere Jizọs ji gwa  ha ihe a bụ ka ha malite ọrụ ozugbo. Jizọs gwakwara ha ihe gosiri na ha kwesịrị iji ọrụ ahụ kpọrọ ihe. Ọ sịrị: “Onye na-ewe ihe ubi anatawalarị ụgwọ ọrụ.” O doro anya na owuwe ihe ubi amalitela, e kwesịghị igbu oge na ya. Ihe nke abụọ bụ na ndị na-ewe ihe ubi na-aṅụrị ọṅụ. Jizọs kwuru na ndị na-agha mkpụrụ na ndị na-ewe ihe ubi ‘ga-aṅụrịkọ ọṅụ.’ (Jọn 4:35b, 36) Ọ ga-abụrịrị na obi tọrọ Jizọs ụtọ mgbe ọ hụrụ na “ọtụtụ n’ime ndị Sameria . . . nwere okwukwe n’ebe ọ nọ.” Obi ga-atọkwa ndị na-eso ụzọ ya ụtọ ma ha jiri obi ha niile na-achịkọta ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Jọn 4:39-42) Ihe a Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya baara anyị uru taa n’ihi na ọ na-egosi ihe na-eme ugbu a a kacha achịkọta ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Olee mgbe a malitere ịchịkọta ndị mmadụ n’oge anyị a? Ole ndị na-achịkọta ha? Olee otú ihe e wetara n’ubi haruru?

Eze Anyị Na-edu Ndị Ya n’Owuwe Ihe Ubi Kachanụ E Wetụrụla

5. Ònye na-edu anyị n’owuwe ihe ubi anyị na-ewe n’ụwa niile? Olee otú ọhụụ Jọn hụrụ si gosi na e kwesịrị iwe ihe ubi a ngwa ngwa?

5 Jehova gosiri Jọn onyeozi otu ọhụụ. N’ọhụụ ahụ, o mere ka Jọn mata na ọ bụ Jizọs ka ya họpụtara ka ọ na-edu ndị ya n’owuwe ihe ubi ha na-ewe n’ụwa niile, ya bụ, ozi ọma ha na-ezi ndị mmadụ n’ụwa niile. (Gụọ Mkpughe 14:14-16.) E kwukwara n’ọhụụ ahụ na Jizọs kpu okpueze ma jiri mma owuwe ihe ubi n’aka. ‘Okpueze ọlaedo Jizọs kpu n’isi’ na-egosi na ọ bụ Eze na-achị achị. ‘Mma owuwe ihe ubi nke dị nkọ o ji n’aka’ na-egosikwa na ọ bụ Onye na-ewe ihe ubi. Jehova si n’ọnụ mmụọ ozi ya kwuo na “ihe ubi nke ụwa achawo nke ọma.” Gịnị mere Jehova ji kwuo ihe a? Ọ bụ n’ihi na ọ chọrọ ka o doo anyị anya na e kwesịrị ịrụ ọrụ a ngwa ngwa. O doro anya na oge ezuola ka a malite owuwe ihe ubi ahụ, e kwesịghị igbu oge na ya. Jehova gwakwara Jizọs ka o “tinye mma owuwe ihe ubi” ya. Jizọs mekwara ihe a Jehova gwara ya. O tinyere mma owuwe ihe ubi ya ma ghọrọ ndị bi n’ụwa otú e si aghọrọ mkpụrụ. Ihe ọhụụ a na-akụzikwara anyị bụ na ‘ihe a kụrụ n’ubi achaala maka owuwe ihe ubi.’ Ọhụụ a, ọ̀ ga-eme ka anyị mata mgbe a malitere owuwe ihe ubi a a na-ewe n’ụwa niile? Ee.

6. (a) Olee mgbe ‘oge owuwe ihe ubi’ malitere? (b) Olee mgbe nke bụ́ ‘owuwe ihe ubi nke ụwa’ malitere? Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

6 Ebe ọ bụ na n’akwụkwọ Mkpughe 14:14, Jọn hụrụ Jizọs, bụ́ Onye na-ewe ihe ubi, n’ọhụụ ebe o kpu okpueze, ọ pụtara na e gosiri Jọn ebe e chicharala Jizọs Eze n’afọ 1914. (Dan. 7:13, 14) Obere oge e chichara Jizọs Eze, Mkpughe 14:15 kwuru na Jehova gwara Jizọs ka o bido wewe ihe ubi. Ihe a e kwuru ebe a banyere owuwe ihe ubi ka Jizọs kwukwara n’ihe atụ o mere gbasara owuwe ihe ubi ọka wit. N’ihe atụ ahụ, Jizọs sịrị: “Owuwe ihe ubi ahụ bụ ọgwụgwụ nke usoro ihe a.” N’ihi ya, oge owuwe ihe ubi ahụ nakwa ọgwụgwụ ụwa ọjọọ a malitere otu oge, ya bụ, n’afọ 1914. Nke bụ́ owuwe ihe ubi malitere mgbe oge ụfọdụ gachara n’oge owuwe ihe ubi ahụ. (Mat. 13:30, 39) Mgbe anyị lebachara ihe ndị a anya, ọ bịara doo anyị anya na owuwe ihe ubi ahụ malitere mgbe afọ ole na ole gachara Jizọs malitere ịchị n’eluigwe. Malite n’afọ 1914 ruo ná mmalite afọ 1919, Jizọs mere ka ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ dịrị ọcha. (Mal. 3:1-3; 1 Pita 4:17) Ọ bụzi n’afọ 1919 ka ‘owuwe ihe ubi nke ụwa’ malitere. Ozugbo owuwe ihe ubi a malitere, Jizọs ji ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ọ họpụtara ọhụrụ nyere ụmụnna anyị  aka ịghọta na ha kwesịrị iji izisa ozi ọma kpọrọ ihe. Ka anyị leba anya n’ihe mere n’oge ahụ.

7. (a) Gịnị ka ụmụnna anyị lebachara anya na ya nke mere ka ha ghọta na e kwesịrị izi ozi ọma ngwa ngwa? (b) Gịnị ka a gwara ụmụnna anyị ka ha mee?

7 N’ọnwa Julaị afọ 1920, e kwuru n’Ụlọ Nche, sị: “Mgbe anyị lebachara anya nke ọma n’Akwụkwọ Nsọ, anyị chọpụtara na Chineke gwara anyị gaa zie ndị mmadụ ozi ọma banyere Alaeze ya. Ozi ọma a ọ gwara anyị zie bụ ihe ọma pụrụ iche o meere anyị.” Dị ka ihe atụ, amụma Aịzaya nyeere ụmụnna anyị n’oge ahụ aka ịghọta na ha ga-ezi ndị mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke n’ụwa niile. (Aịza. 49:6; 52:7; 61:1-3) Ha amaghị otú ha ga-esi ezi ozi ọma a n’ụwa niile. Ma, obi siri ha ike na Jehova ga-eme ka ha mata otú ha ga-esi ezi ya. (Gụọ Aịzaya 59:1.) Ebe ọ bụ na ụmụnna anyị aghọtakwuola na e kwesịrị izi ozi ọma a ngwa ngwa, a gwara ha ka ha jiri ya kpọrọkwuo ihe. Olee ihe ụmụnna anyị ndị a meziri?

8. N’afọ 1921, olee ihe abụọ ụmụnna anyị ghọtara gbasara izi ozi ọma?

8 N’ọnwa Disemba afọ 1921, e kwuru n’Ụlọ Nche, sị: “Afọ a amaka n’ihi na anyị ziri ọtụtụ ndị ozi ọma na ya karịa afọ ndị gara aga.” Ụlọ Nche ahụ kwukwara, sị: “A ka nwere ọtụtụ ndị anyị ga-ezi ozi ọma. . . . Ka anyị jiri ọṅụ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma.” Ị̀ chọpụtara na ụmụnna anyị ndị a ghọtara ihe abụọ ahụ dị mkpa Jizọs kụziiri ndịozi ya banyere ịchịkọta ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya? Nke mbụ bụ na e kwesịrị ịrụ ọrụ a ngwa ngwa. Nke abụọ abụrụ na ndị na-ewe ihe ubi ahụ na-aṅụrị ọṅụ.

9. (a) Olee ihe e kwuru n’Ụlọ Nche n’afọ 1954 banyere ozi ọma ụmụnna anyị kwusara? Gịnị mere e ji kwuo ihe ahụ? (b) Olee ihe gosiri na a na-enwekwu ndị nkwusa kemgbe afọ iri ise gara aga? (Lee chaatị isiokwu ya bụ, “ Otú Ndị Nkwusa n’Ebe Dị Iche Iche Si Na-ehi Nne.”)

9 N’agbata afọ 1931 na afọ 1939, ụmụnna anyị bịara jiri ozi ọma kpọrọkwuo ihe. Ihe mere ha ji mee otú ahụ bụ na ha ghọtara na oké ìgwè mmadụ ga-anabata ozi ọma Alaeze Chineke anyị na-ezi ha ma bata n’ọgbakọ. (Aịza. 55:5; Jọn 10:16; Mkpu. 7:9) Ò nwere uru ozi ọma a ha kwusara bara? À na-ajụkwa ajụ? Dị ka ihe atụ, ụmụnna anyị ndị kwusara ozi ọma Alaeze Chineke n’afọ 1934 dị puku iri anọ na otu puku. Ma n’afọ 1953, ha dịzi narị puku ise. Ọ bụ ya mere Ụlọ Nche Bekee nke December 1, 1954, ji kwuo, sị: “Ọ bụ mmụọ Jehova na ike Okwu ya na-akpa mere ọtụtụ mmadụ a ji bata n’ọgbakọ n’ụwa niile.” *Zek. 4:6.

 

OTÚ NDỊ NKWUSA N’EBE DỊ ICHE ICHE SI NA-EHI NNE

Mba

1962

1987

2013

Ọstrelia

15,927

46,170

66,023

Brazil

26,390

216,216

756,455

Frans

18,452

96,954

124,029

Ịtali

6,929

149,870

247,251

Japan

2,491

120,722

217,154

Meksiko

27,054

222,168

772,628

Naịjirịa

33,956

133,899

344,342

Filipinz

36,829

101,735

181,236

Amerịka

289,135

780,676

1,203,642

Zambia

30,129

67,144

162,370

 

OTÚ MMADỤ OLE A NA-AMỤRỤ BAỊBỤL SI NA-EHI NNE

1950

234,952

1960

646,108

1970

1,146,378

1980

1,371,584

1990

3,624,091

2000

4,766,631

2010

8,058,359

Jizọs Ji Ihe Atụ Kọwaa Otú Ihe A Ga-eweta n’Ubi Ga-aharu

10, 11. N’ihe atụ Jizọs ji mkpụrụ osisi mọstad mee, olee ihe ndị dị mkpa a kọrọ banyere otú mkpụrụ osisi ahụ si too?

10 N’ihe atụ ndị Jizọs mere gbasara Alaeze Chineke, o kwuru hoo haa otú ihe a ga-eweta n’owuwe ihe ubi ahụ ga-aharu. Ka anyị  leba anya n’ihe atụ o ji mkpụrụ osisi mọstad mee, nakwa nke o ji ihe iko achịcha mee. Ihe anyị ga-akacha eleba anya na ya bụ otú ha si mezuo n’oge ọgwụgwụ a.

11 Ihe atụ Jizọs ji mkpụrụ osisi mọstad mee. Jizọs kwuru na otu nwoke kụrụ mkpụrụ osisi mọstad n’ubi ya. Mgbe mkpụrụ osisi a pulitere, o toro ma ghọọ osisi. Ụmụ nnụnụ bịakwara biri n’alaka ya. (Gụọ Matiu 13:31, 32.) Olee ihe ndị dị mkpa a kọrọ n’ihe atụ a banyere otú mkpụrụ osisi ahụ si too? Nke mbụ bụ na otú mkpụrụ ahụ si too dị ịtụnanya. Mkpụrụ osisi mọstad bụ “mkpụrụ kasị nta n’ime mkpụrụ niile,” ma, o toro ghọọ osisi nwere “alaka ndị buru ibu.” (Mak 4:31, 32) Nke abụọ bụ na osisi ahụ ga-etorịrị. Mgbe “a kụrụ [mkpụrụ osisi a], ọ na-etolite.” Jizọs ekwughị na mkpụrụ osisi a “nwere ike itolite.” Kama, ọ sịrị na “ọ na-etolite.” O nweghị ihe ga-eme ka ọ ghara itolite. Ihe nke atọ bụ na mgbe osisi a na-eto, ụmụ nnụnụ bịakwara biri n’alaka ya. Jizọs sịrị na “ụmụ nnụnụ nke eluigwe na-enwe ike ịchọta ebe ha ga-ebi n’okpuru ndò ya.” Olee otú ihe atọ a e kwuru n’ihe atụ a si gbasa ozi ọma anyị na-ezi taa?

12. Olee otú ihe atụ Jizọs ji mkpụrụ osisi mọstad mee si gbasa ozi ọma anyị na-ezi taa? (Gụọ ihe e dere na chaatị isiokwu ya bụ “ Otú Mmadụ Ole A Na-Amụrụ Baịbụl Si Na-ehi Nne.”)

12 Nke mbụ bụ otú osisi ahụ si too: Otú mkpụrụ osisi a si too na-egosi otú ozi ọma Alaeze Chineke anyị na-ezi ndị mmadụ si agbasa nakwa otú ọgbakọ Ndị Kraịst si na-eto. Kemgbe afọ 1919, a kpọbatala ọtụtụ ndị n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ndị a ji obi ha niile na-ezi ozi ọma. N’oge ahụ, ụmụnna anyị ndị a dị ole na ole. Ma, ha mechara dịrị ọtụtụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na otú ọgbakọ Ndị Kraịst a si too malite n’ihe dị ka n’afọ 1914 ruo taa dị ịtụnanya. (Aịza. 60:22) Nke abụọ bụ na osisi ahụ ga-etorịrị: Ọgbakọ Ndị Kraịst na-eto n’ike n’ike, o nwebeghịkwa ihe nwere ike ime ka ọ ghara ịna-eto eto. N’agbanyeghị nsogbu niile ndị iro Chineke na-enye ọgbakọ Ndị Kraịst, ọ na-eto n’ike n’ike. (Aịza. 54:17) Nke atọ bụ na anụ ufe nke eluigwe bịara biri n’alaka ya: “Anụ ufe nke eluigwe” ndị ahụ bịara biri n’alaka osisi ahụ nọchiri anya ọtụtụ nde mmadụ ji obi ha niile nabata ozi ọma Alaeze Chineke e ziri ha ma batakwa n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ndị a nọ n’ihe dị ka narị mba abụọ na iri anọ. (Ezik. 17:23) Jehova na-akụziri ha ihe ma na-echebe ha. Ọ na-emekwa ka ahụ́ na-eru ha ala.—Aịza. 32:1, 2; 54:13.

Ihe atụ Jizọs ji mkpụrụ osisi mọstad mee na-egosi na Jehova na-akụziri ndị nọ n’ọgbakọ ya ihe ma na-echebe ha (A kọwara ya na paragraf nke 11 na nke 12))

13. Olee ihe ndị dị mkpa a kọrọ banyere otú ntụ ọka ahụ si koo?

13 Ihe atụ Jizọs ji ihe iko achịcha mee. Jizọs kwuru na mgbe otu nwaanyị tinyechara ihe iko achịcha n’ime ntụ ọka buru ibu, ntụ ọka niile ahụ koro. (Gụọ Matiu 13:33.) Olee ihe ndị dị mkpa a kọrọ n’ihe atụ a banyere otú ntụ ọka ahụ si koo? Ka anyị leba anya n’abụọ n’ime ha. Nke mbụ bụ na ihe iko achịcha ahụ mere ka ntụ ọka niile ahụ koo. Ihe iko achịcha nwaanyị ahụ tinyere ná ntụ ọka ahụ mere ka ọ malite kowa “ruo mgbe ntụ ọka ahụ dum koro eko.” Nke abụọ bụ na ihe iko achịcha a na-agbasa agbasa. Ihe iko achịcha ahụ malitere ịgbasa ruo mgbe o kochara “ntụ ọka juru arịa atọ buru ibu.” Olee otú ihe abụọ a e kwuru n’ihe atụ a si gbasa ozi ọma anyị na-ezi taa?

14. Olee otú ihe iko achịcha Jizọs ji mee ihe atụ si gbasa ozi ọma anyị na-ezi taa?

14 Nke mbụ bụ na ozi anyị na-eme ka ndị mmadụ gbanwee àgwà ha: Ihe iko achịcha ahụ nọchiri anya ozi ọma Alaeze Chineke anyị na-ekwusa. Ntụ ọka ahụ dum nọchikwaranụ anya ụmụ mmadụ. Mgbe a gwakọtara ihe iko achịcha ahụ na ntụ ọka, ntụ  ọka ahụ dum gbanwere. Otú ahụ ka ọ dịkwa ozi ọma Alaeze Chineke anyị na-ezi ndị mmadụ. Ọ bụrụ na ha anabata ya, ọ na-eme ka ha gbanwee obi ha. (Rom 12:2) Nke abụọ bụ na ozi anyị na-agbasa agbasa: Otú ihe iko achịcha ahụ si gbasaa nọchiri anya otú ozi ọma anyị na-ezi si na-agbasa. Ihe iko achịcha ahụ si n’otu akụkụ nke ntụ ọka ahụ gbasawa ruo ntụ ọka ahụ dum. Otú ahụ ka ọ dịkwa ozi ọma Alaeze Chineke anyị na-ezi ndị mmadụ. Ọ gbasaala ‘ruo n’ebe kasị anya n’ụwa.’ (Ọrụ 1:8) Ihe atụ a na-egosikwa na ozi ọma Alaeze Chineke anyị na-ezi ga-agbasadị ná mba ndị na-achọghị ka anyị zie ozi ọma na ha, ọ bụ eziokwu na e nwere ike ndị mmadụ agaghị ama na anyị na-ezi ozi ọma n’ebe ndị ahụ.

15. Olee otú ihe e kwuru n’Aịzaya 60:5, 22 si mezuo? (Gụọkwa ihe ndị e dere n’igbe ndị isiokwu ha bụ, “ Jehova Mere Ka O Kwe Omume,” nke dị na peeji nke 93, nakwa “ Otú ‘Onye Nta’ Si Ghọọ ‘Mba Dị Ike.’”)

15 Ihe dị ka narị afọ asatọ tupu Jizọs emee ihe atụ ndị ahụ, Jehova si n’aka Aịzaya onye amụma mee ka anyị mara ebe anyị ga-eziru ozi ọma nakwa ọṅụ anyị ga-enweta na ya. * Jehova kwuru na ndị mmadụ ga-esi “n’ebe dị anya” na-abata n’ọgbakọ ya. E nwere ihe Jehova gwara otu “nwaanyị” e kwuru okwu ya na Baịbụl. Nwaanyị a abụghị nwaanyị nkịtị. N’oge anyị a, nwaanyị a nọchiri anya ndị e tere mmanụ nọ n’ụwa. Jehova gwara nwaanyị a, sị: “Ị ga-ahụ ya,  ihu gị ewee na-egbuke egbuke, obi ga-atọ gị ụtọ, aṅụrị ga-ejukwa gị obi, n’ihi na akụnụba nke oké osimiri ga-abịara gị; akụ̀ nke mba dị iche iche ga-abịara gị.” (Aịza. 60:1, 4, 5, 9) Ihe a Jehova kwuru emezuola. N’oge anyị a, obi dị ọtụtụ ndị jerela Jehova ozi ọtụtụ afọ ụtọ. Ihe mere obi ji na-atọ ha ụtọ bụ na mgbe ha malitere ijere Jehova ozi, ha dị mmadụ ole na ole, ma ugbu a, e nweela ọtụtụ puku ndị na-ejere Jehova ozi n’obodo ha.

Ihe Mere Ndị Niile Na-ejere Jehova Ozi Kwesịrị Iji Na-enwe Obi Ụtọ

16, 17. Gịnị bụ otu ihe mere ‘onye na-agha mkpụrụ na onye na-ewe ihe ubi ji na-aṅụrịkọ ọṅụ’? (Gụọkwa ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “ Otú Traktị Anyị Abụọ Si Ruo n’Obi Mmadụ Abụọ n’Amazọn.”)

16 Ì chetara ihe ahụ Jizọs gwara ndịozi ya otu ụbọchị? Ọ gwara ha, sị: “Onye na-ewe ihe ubi . . . na-ekpokọta mkpụrụ maka ndụ ebighị ebi, ka onye na-agha mkpụrụ na onye na-ewe ihe ubi wee ṅụrịkọọ ọṅụ.” (Jọn 4:36) Olee otú anyị si ‘aṅụrịkọ ọṅụ’ n’ozi ọma a anyị na-ezi n’ụwa niile? E nwere ụzọ dị iche iche anyị si aṅụrị ọṅụ. Ka anyị leba anya n’atọ n’ime ha.

17 Nke mbụ bụ na anyị na-aṅụrị ọṅụ n’ihi na Jehova na-akwado ozi anyị na-ejere ya. Ọ bụrụ na anyi ekwusaara ndị mmadụ ozi ọma, e nwere ike ịsị na anyị akụọla mkpụrụ. (Mat. 13:18, 19) Ọ bụrụkwa na anyị enyere mmadụ aka ya abata n’ọgbakọ, anyị nwere ike ikwu na anyị ewerela ihe ubi. Obi na-atọ anyị ụtọ n’ihi otú Jehova si na-eme ka ozi ọma Alaeze ya anyị na-ekwusa na-eto. E nwere ike iji ya tụnyere otú ahụ mkpụrụ si ‘epulite ma too ogologo.’ (Mak 4:27, 28) Ụfọdụ mkpụrụ anyị kụrụ n’ebe dị iche iche nwere ike ipulite, e mechaa, ndị ọzọ ewere ha. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ozi ọma anyị na-ezi ndị mmadụ. Ụfọdụ ndị anyị ziri ozi ọma nwere ike gaa ebe ọzọ, ụmụnna anyị nọ ebe ahụ ha gara amụwara ha ihe, ha emechaa bata n’ọgbakọ. È nweela onye i ziri ozi ọma, ya agaa ebe ọzọ, ndị ọzọ amụọrọ ya ihe, ya emechaakwa bata n’ọgbakọ? Ụdị ihe a emeela otu nwanna nwanyị aha ya bụ Joan. Ọ bụ onye Briten. E mere ya baptizim afọ iri isii gara aga. Nwanna nwaanyị a sịrị: “E nweela ụmụnna ndị hụrụ m ma gwa m na m ziri ha ozi ọma ọtụtụ afọ gara aga, ya eruo ha n’obi. Amaghị m na ha na ụmụnna ndị ọzọ mechara mụọ Baịbụl, ụmụnna ndị a enyere ha aka ha aghọọ ndị Jehova. Obi dị m ụtọ na ozi ọma ahụ m ziri ha mechara baara ha uru, ndị ọzọ enyekwara ha aka, ha abata n’ọgbakọ.”—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 3:6, 7.

18. Olee ihe e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 3:8 mere anyị ji kwesị ịna-enwe ọṅụ?

18 Ihe nke abụọ na-eme ka anyị na-aṅụrị ọṅụ bụ ma anyị cheta otu ihe Pọl kwuru. O kwuru sị: “Onye ọ bụla ga-anata ụgwọ ọrụ nke ya dị ka ndọgbu ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ si dị.” (1 Kọr. 3:8) Chineke na-akwụ anyị ụgwọ n’ihi ozi anyị jeere ya, ọ bụghị n’ihi mmadụ ole anyị nyeere aka ha abata n’ọgbakọ. E nwere ụmụnna anyị ndị na-ezi ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anaghị anabatacha ozi anyị. Ihe a kwesịrị ịgba ha ume ma mee ka obi na-atọ ha ụtọ. N’ihi ya, Onyeàmà Jehova ọ bụla, nke ji obi ya niile na-ezi ozi ọma, “na-amị mkpụrụ dị ukwuu” n’anya Chineke. Ọ bụ ya mere onye ahụ kwesịrị iji na-aṅụrị ọṅụ.—Jọn 15:8; Mat. 13:23.

19. (a) Olee otú ihe Jizọs kwuru na Matiu 24:14 si gbasa ọṅụ anyị na-enwe? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi ma ọ bụrụgodị na o nweghị onye anyị mụụrụ ihe ya abata n’ọgbakọ?

19 Ihe nke atọ bụ na ozi ọma anyị na-ezi na-emezu otu amụma e buru na Baịbụl. E nwere ihe Jizọs gwara ndi na-eso ụzọ ya mgbe  ha jụrụ ya, sị: “Olee mgbe ihe ndị a ga-eme, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị na nke ọgwụgwụ usoro ihe a?” Jizọs gwara ha na ozi ọma a ga-ezi n’ụwa niile so n’otu n’ime ihe ndị a ga-eji amata mgbe Chineke ga-ebibi ụwa ọjọọ a. Ihe Jizọs na-ekwu ebe a ọ̀ bụ ime ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya? Mba. Ihe ọ na-ekwu bụ na “a ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile.” (Mat. 24:3, 14) N’ihi ya, ozi ọma Alaeze Chineke anyị na-ezisa so n’otu n’ime ihe ndị a ga-eji ama mgbe Chineke ga-ebibi ụwa ọjọọ a. Ọ bụ ya mere anyị kwesịrị iji buru ihe a n’obi: Na ọ bụrụgodị na o nweghị onye anyị nyeere aka ya abata n’ọgbakọ, ozi ọma anyị ziri ndị mmadụ bụụrụ ha “àmà.” * Nke bụ́ eziokwu bụ na ma ndị mmadụ hà nabatara ozi ọma anyị na-ezi ha ma ọ bụ na ha anabataghị ya, anyị so na-emezu amụma ahụ Jizọs buru. Ọ bụkwa nnukwu ihe na anyị na “Chineke na-arụkọ ọrụ.” (1 Kọr. 3:9) Nke a kwesịrị ime ka anyị na-aṅụrị ọṅụ.

“Malite n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ruo n’Ebe Ọdịda Ya”

20, 21. (a) Olee otú ihe e kwuru na Malakaị 1:11 si mezuo? (b) A bịa n’ihe gbasara ọrụ owuwe ihe ubi anyị na-arụ, gịnị ka i kpebisiri ike ime? Gịnịkwa mere ị ga-eji mee otú ahụ?

20 N’oge Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya na-eje ozi n’ụwa, Jizọs nyeere ha aka ịghọta na e kwesịrị iwe ihe ubi ahụ ngwa ngwa. Malite n’afọ 1919 ruo ugbu a, Jizọs enyerela anyị aka ịghọta ihe a ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya. Ọ bụ ya mere anyị ji ekwusasi ozi ọma ike. O doro anya na e nweghị ihe nwere ike ime ka anyị kwụsị ikwusa ya. Anyị na-ekwusa ozi ọma taa “malite n’ebe ọwụwa anyanwụ ruo n’ebe ọdịda ya,” otú ahụ Malakaị buru n’amụma. (Mal. 1:11) Nke bụ́ eziokwu bụ na n’agbanyeghị ebe anyị nọ na-ekwusa ozi ọma a, anyị niile na-arụkọ ọrụ ma na-aṅụrịkọ ọṅụ. Anyị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma n’ebe niile, si n’ụtụtụ ruo ná mgbede, n’ihi na anyị ma na oge agwụla agwụ.

21 E nwere otu ihe na-eme anyị ‘obi ụtọ’ ma anyị cheta ya. Ihe ahụ bụ na ụmụnna anyị ndị kwusara ozi ọma ihe karịrị otu narị afọ gara aga dị mmadụ ole na ole. Ma, taa, ha aghọọla “mba dị ike.” (Aịza. 60:5, 22) Jehova bụ “Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ.” Ebe ọ bụ na obi na-atọ anyị ụtọ n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya ma na-ejere ya ozi, ka onye ọ bụla n’ime anyị gbasie mbọ ike na-enye aka ná nnukwu ọrụ owuwe ihe ubi a anyị na-arụ taa ruo mgbe a ga-arụcha ya.—Luk 10:2.

^ para. 9 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ndị mere n’afọ ahụ nakwa ihe ndị mere ọtụtụ afọ mgbe ọ gachara, gụọ akwụkwọ anyị a na-akpọ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom, peeji nke 425 ruo na nke 520. Akwụkwọ a kọrọ otú e si mee ka ndị mmadụ bata n’ọgbakọ malite n’afọ 1919 ruo n’afọ 1992.

^ para. 15 Ị chọọ ịmatakwu banyere ihe ahụ Jehova si n’aka Aịzaya kwuo gbasara ebe anyị ga-eziru ozi ọma anyị, gụọ akwụkwọ anyị bụ́ Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ, Mpịakọta nke II, peeji nke 303 ruo na nke 320.

^ para. 19 Ndị Mmụta Baịbụl ghọtara ihe a e kwuru nke ọma. Ọ bụ ya mere Ụlọ Nche Bekee nke November 15, 1895, ji kwuo, sị: “Ọ bụrụ na anyị nwere ike ịchịkọta obere ọka n’ubi, anyị nwekwara ike, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ịgbasi àmà ike banyere eziokwu ahụ. . . . Anyị niile nwere ike ikwusa ozi ọma.”