Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!

 ISI NKE 8

Ihe Ndị Anyị Ji Ezi Ozi Ọma—Anyị Na-ebipụta Akwụkwọ Ndị Anyị Ji Ezi Ozi Ọma n’Ụwa Niile

Ihe Ndị Anyị Ji Ezi Ozi Ọma—Anyị Na-ebipụta Akwụkwọ Ndị Anyị Ji Ezi Ozi Ọma n’Ụwa Niile

IHE ISIOKWU A NA-EKWU

Jehova na-enye anyị ihe ndị anyị ji akụziri ndị mmadụ Baịbụl ná mba niile, n’ebo niile, nakwa n’asụsụ niile

1, 2. (a) Olee ihe nyeere ndịozi Jizọs aka ikwusa ozi ọma n’obodo dị iche iche ndị Rom na-achị n’oge ahụ? (b) Olee ihe ndị gosiri na Jehova na-akwado ozi anyị na-ejere ya n’oge anyị a? (Gụọ ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “ Izisa Ozi Ọma Alaeze n’Ihe Karịrị Narị Asụsụ Isii na Iri Asaa.”)

E NWERE otu ihe mere n’afọ 33 n’oge ndịozi. Ndị mmadụ si ebe dị iche iche bịa Jeruselem maka ememme ndị Juu a na-akpọ Pentikọst. Ihe mere n’ụbọchị ahụ juru ndị mmadụ anya. Ha nụrụ ka ndịozi Jizọs, bụ́ ndị Galili, ji asụsụ dị iche iche ha na-amaghị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. Ihe ha na-ekwu ruru ndị mmadụ n’obi. Ọ bụ Chineke nyere ndịozi a mmụọ nsọ ya ha asụọ asụsụ dị iche iche. Ihe a merenụ gosiri na Chineke nọnyeere ha. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 2:1-8, 12, 15-17.) Ndịozi Jizọs kwusaara ọtụtụ ndị si ebe dị iche iche ozi ọma n’ụbọchị ahụ. E mechakwara kwusaa ozi ọma n’obodo dị iche iche ndị Rom na-achị n’oge ahụ.—Kọl. 1:23.

2 N’oge anyị a, Chineke anaghị enye anyị mmụọ nsọ ya iji na-asụ asụsụ dị iche iche. Ma, anyị na-asụgharị akwụkwọ ndị anyị ji ezi ozi ọma n’ihe karịrị narị asụsụ isii na iri asaa. Asụsụ ole a karịrị asụsụ ole e kwusara ozi ọma na ya n’oge ndịozi Jizọs. (Ọrụ 2:9-11) Anyị na-ebipụtakwa ọtụtụ akwụkwọ n’asụsụ dị iche iche. Nke a emeekwala ka ndị nọ n’ebe dị iche iche nụ ozi ọma Alaeze Chineke. * Ihe a na-egosikwa na Jehova ji Eze anyị bụ́ Jizọs Kraịst na-eduzi ozi ọma anyị na-ekwusa. (Mat. 28:19, 20) Anyị na-aga ileba anya n’ihe ụfọdụ anyị jirila kwusaa ozi ọma n’ihe karịrị otu narị afọ gara aga. Ihe ọzọ anyị ga-elebakwa anya na ya bụ otú Eze anyị si jiri nwayọọ nwayọọ na-akụziri anyị ka anyị na-ahụ ndị mmadụ n’anya nakwa otú o si agba anyị ume ka anyị na-akụziri ha Okwu Chineke.—2 Tim. 2:2.

Eze Anyị Na-enyere Anyị Aka Ịkụziri Ndị Mmadụ Eziokwu

3. Gịnị mere anyị ji eji ihe dị iche iche ezi ndị mmadụ ozi ọma?

3 Jizọs ji ‘okwu banyere Alaeze Chineke’ tụnyere mkpụrụ a na-agha agha. O jikwa obi mmadụ tụnyere ala a na-agha mkpụrụ na ya. (Mat. 13:18, 19) Onye ọrụ ubi na-eji mma na ọgụ emezi ala tupu ya akọọ ihe na ya. Ndị Jehova na-emekwa ụdị ihe a onye ọrụ ubi na-eme. Ha ejirila akwụkwọ na ihe ndị ọzọ kwadebe obi ọtụtụ nde mmadụ ka ha nwee ike ịnụ ozi ọma Alaeze Chineke. O nwere ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ ha na-anaghị ejizi ezi ozi ọma. Ma, ha ka na-eji akwụkwọ dị iche iche na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. N’isi nke asaa n’akwụkwọ a, anyị kwuru ihe ụfọdụ anyị ji mee ka ndị mmadụ nụ ozi ọma anyị n’oge gara aga. N’oge ahụ,  anyị ejighị ọtụtụ n’ime ha zie ndị mmadụ ozi ọma ihu na ihu. Ma, anyị ejirila ndị nke anyị ga-eleba anya na ha n’isiokwu a zie ndị mmadụ ozi ọma ihu na ihu.—Ọrụ 5:42; 17:2, 3.

Ebe a bụ ebe a na-eme gramafon na ígwè okwu ndị e ji ezi ozi ọma. A na-eme ha na Toronto dị na Kanada

4, 5. Olee otú anyị si jiri gramafon kwusaa ozi ọma n’oge gara aga? Oleekwa ihe gramafon na-anaghị emere ndị mmadụ?

4 Okwu e tinyere na teepụ. N’agbata afọ 1931 na afọ 1949, ụmụnna anyị na-eji okwu ihu ọha ndị e tinyere na teepụ zie ndị mmadụ ozi ọma. Ha na-eji gramafon akpọrọ ya ndị ha na-ezi ozi ọma. Nke ọ bụla n’ime ha anaghị eru nkeji ise ya akpọchaa. Ụfọdụ isiokwu okwu ihu ọha ndị ahụ anaghị adị ogologo. Ụfọdụ isiokwu ndị ahụ bụ, “Atọ n’Ime Otu,” “Pọgatrị,” na “Alaeze.” Olee otú e si akpọ gramafon a? Otu nwanna aha ya bụ Clayton Woodworth, Jr., kwuru otú ha si akpọ ya. E mere nwanna a baptizim n’afọ 1930 n’Amerịka. Nwanna a kwuru, sị: “Ọ na-abụ m chọọ ịga ozi ọma, mụ esere obere gramafon m n’aka gawa. M rute n’ọnụ ụzọ mmadụ, m na-emepe ya, dozichaa ya ka o nwee ike ịkpọ ma onye nwe ụlọ kwe ka m kpọọrọ ya ya. M dozichaa ya, mụ apịa mgbịrịgba dị n’ọnụ ụzọ onye ahụ. Onye ahụ mepee ụzọ ya, mụ asị ya na o nwere ozi dị mkpa m chọrọ ka o gere.” Olee ihe ndị mmadụ na-eme ma a gwa ha ihe a? Nwanna Woodworth kwuru ihe ha na-eme. Ọ sịrị: “Ọtụtụ n’ime ha na-ekwe egere ya. Ma, ụfọdụ n’ime ha na-akwachi ụzọ ha ozugbo. Ụfọdụ n’ime ha chere na m na-ere gramafon.”

Tupu afọ 1940 agwụchaa, anyị etinyela ihe karịrị okwu ihu ọha iri itoolu na teepụ. Anyị mepụtakwara ihe karịrị otu nde rekọd

5 Tupu afọ 1940 agwụchaa, anyị etinyela ihe karịrị okwu ihu ọha iri itoolu na teepụ. Anyị mepụtakwara ihe karịrị otu nde rekọd. Nwanna John E. Barr so ná ndị ji rekọd a zie ozi ọma. Ọ bụ onye ọsụ ụzọ na Briten n’oge ahụ. O mechara bụrụ otu n’ime ndị so n’Òtù Na-achị Isi. Ọ kọrọ uru rekọd ahụ baara ya. Ọ sịrị: “N’agbata afọ 1936 na afọ 1945, ana m ejikarị gramafon aga ozi ọma. Ahụ́ anaghị eru m ala ma mụ ejighị ya. Ọ na-abụ mụ na ndị mmadụ na-egere okwu ihu ọha ndị ahụ Nwanna Rutherford kwuru, obi ana-esikwu m ike, ya adị m ka mụ na ya na-arụ n’ozi  ọma. Ma, e nwere ihe gramafon a na-anaghị e mere ndị mmadụ. Ọ naghị eme ka ozi ọma ruo ndị mmadụ n’obi.”

6, 7. (a) Olee uru kaadị e ji ezi ozi ọma baara anyị? Oleekwa otú ụfọdụ ndị si ele ụmụnna anyị anya ma e nye ha kaadị a? (b) Gịnị mere anyị ga-eji sị na Jehova ‘mere ka anyị jiri ọnụ anyị na-ezi ozi ọma’?

6 Kaadị e ji ezi ozi ọma. N’afọ 1933, a malitere iji kaadị e ji ezi ozi ọma aga ozi ụlọ n’ụlọ. A gwara ụmụnna anyị ka ha na-eji ya aga ozi ọma. Kaadị a dị ihe dị ka sentimita iri na atọ n’ogologo, dịrịkwa ihe dị ka sentimita asatọ n’obosara. E wezụga ozi ọma a na-ede na ya, a na-edekwa aha otu akwụkwọ anyị mmadụ nwere ike ịchọ ịgụ. Ọ na-abụ nwanna ruo n’ụlọ mmadụ, ya enye onye ahụ kaadị ahụ ka ọ gụọ. Nwanna Nwaanyị Lilian Kammerud so ná ndị ji kaadị a zie ozi ọma. O mechara bụrụ onye ozi ala ọzọ na Puweto Riko nakwa n’Ajentina. Ọ sịrị na iji kaadị a aga ozi ọma dị mma n’ihi na ụfọdụ n’ime ha n’oge ahụ amachaghị otú e si ezi ozi ọma. Ọ sịkwara na o nyeere ya aka ịna-agakwuru ndị mmadụ.

Ihe a bụ kaadị e ji ezi ozi ọma (e dere nke a n’asụsụ Ịtalian)

7 Nwanna David Reusch kwuru otú kaadị ahụ si nyere ụmụnna ezigbo aka. E mere nwanna a baptizim n’afọ 1918. Ọ sịrị: “Kaadị a nyeere ụmụnna aka n’ihi na ụfọdụ n’ime ha enweghị ike izi ozi ọma nke ọma.” Ma, o nwere otú ndị mmadụ si ele anyị anya n’oge ahụ. Nwanna David sịrị: “Ụfọdụ ndị anyị na-enye kaadị a na-eche na anyị anaghị ekwu okwu. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ n’ime anyị amaghị otú e si ezi ozi ọma. Ma, Jehova ji ihe ahụ anyị na-eme na-akwadebe anyị ka anyị nwee ike ịna-agakwuru ndị mmadụ zie ha ozi ọma. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-akụziri anyị otú anyị ga-esi jiri ọnụ anyị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma n’ụlọ ha. Ọ malitere ịkụziri anyị ihe a n’afọ 1942. Ọ bụ n’afọ ahụ ka a malitere Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.”—Gụọ Jeremaya 1:6-9.

8. Olee ihe ndị ị ga-eme ka Kraịst kụziere gị otú ị ga-esi na-akụziri ndị mmadụ ihe nke ọma?

8 Akwụkwọ anyị. Kemgbe afọ 1914, Ndịàmà Jehova ebipụtala ihe karịrị otu narị akwụkwọ dị iche iche. A na-eji akwụkwọ ndị a amụ Baịbụl. E ji ụfọdụ akwụkwọ ndị a akụziri ha otú ha ga-esi na-ezi ozi ọma. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Anna Larsen kọrọ uru akwụkwọ ndị a baara ha. Nwanna nwaanyị a bụ onye Denmak. O jeerela Jehova ozi ihe dị ka iri afọ asaa. Ọ sịrị: “Jehova ji Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na ụfọdụ akwụkwọ anyị kụziere anyị otú e si ezi ozi ọma nke ọma. Akwụkwọ mbụ nyeere anyị aka ịma otú e si ezi ozi ọma nke ọma bụ Theocratic Aid to Kingdom Publishers. E bipụtara ya n’afọ 1945. Akwụkwọ nke abụọ bụ “Equipped for Every Good Work.” E bipụtara ya n’afọ 1946. Nke anyị nwere ugbu a bụ Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. E bipụtara ya n’afọ 2001.” O doro anya na Jehova ejirila Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nakwa akwụkwọ anyị ndị e ji eduzi ya ‘mee ka anyị ruo eruo nke ọma ịbụ ndị ozi.’ (2 Kọr. 3:5, 6) Ì denyela aha gị n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke? Ị̀ na-eji akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi abịa ọmụmụ ihe n’ụbọchị ọ bụla unu na-enwe ụlọ akwụkwọ a? Ị̀ na-asapeta akwụkwọ gị mgbe onye nduzi ụlọ akwụkwọ kwuru ebe a ga-asapeta? Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ndị a, ọ pụtara na ị na-ekwe ka Kraịst kụziere gị otú ị ga-esi na-akụziri ndị mmadụ ihe nke ọma.—2 Kọr. 9:6; 2 Tim. 2:15.

9, 10. Olee otú akwụkwọ anyị sirila nyere anyị aka izi ndị mmadụ ozi ọma na ịkụziri ha ihe?

 9 Jehova ejirikwala ụfọdụ akwụkwọ anyị na-enyere anyị aka ịkụziri ndị mmadụ ihe ndị dị mkpa Baịbụl na-akụzi. Otu n’ime akwụkwọ ndị a bụ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi. E bipụtara akwụkwọ a n’afọ 1968. Ozugbo e bipụtara ya, ọtụtụ ndị chọsiri ike iji ya mụọ Baịbụl. Ozi Alaeze Anyị nke Bekee nke November 1968 kwuru, sị: “Imirikitimi mmadụ na-achọsi akwụkwọ Eziokwu ike. Ọ bụ ya mere na n’ọnwa Septemba afọ 1968, isi ụlọ ọrụ anyị dị na Bruklin malitere ibi akwụkwọ a ma n’ụtụtụ ma n’ehihie ma n’abalị.” Ozi Alaeze Anyị ahụ kwukwara na “n’ọnwa Ọgọst, ọ bụrụ na anyị nyechaa ndị mmadụ nke anyị bipụtarala ebipụta, a ka ga-ebipụtakwu ihe karịrị otu nde na narị puku ise a ga-enye ndị chọrọ ya.” Tupu afọ 1982 agwụ, e bipụtala ihe karịrị otu narị nde akwụkwọ ahụ n’asụsụ otu narị na iri na isii. N’agbata afọ 1968 na afọ 1982, e ji akwụkwọ a kụziere ihe karịrị otu nde mmadụ ihe, ha abata n’ọgbakọ. *

10 N’afọ 2005, e bipụtara akwụkwọ ọzọ magburu onwe ya e ji akụziri ndị mmadụ Baịbụl. Aha ya bụ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Kemgbe ahụ, e bipụtala ihe dị ka narị nde abụọ n’asụsụ narị abụọ na iri ise na isii. Akwụkwọ a ọ̀ baarala anyị uru? Ee. Dị ka ihe atụ, n’agbata afọ 2005 na afọ 2012, e ji akwụkwọ a kụziere otu nde mmadụ na narị puku mmadụ abụọ Baịbụl ha aghọọ ndị nkwusa. N’afọ 2005, e ji ya duziere ihe dị ka nde mmadụ isii Baịbụl. Ma, n’afọ 2012, e ji ya duziere ihe karịrị nde mmadụ asatọ na narị puku asaa Baịbụl. O doro anya na Jehova na-agọzi mbọ ndị anyị na-agba ịkụziri ndị mmadụ eziokwu gbasara Alaeze ya.—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 3:6, 7.

11, 12. Olee ndị e bu n’obi bipụta Ụlọ Nche na Teta!? Jiri ihe e kwuru n’amaokwu Baịbụl ndị e depụtara na paragraf ndị a zaa ya.

11 Ụlọ Nche na Teta! Mgbe e bidoro ibipụta Ụlọ Nche, ọ bụ “ìgwè atụrụ nta,” ma ọ bụ “ndị a kpọrọ òkù ịga eluigwe,” ka e kwo na-ebipụta ya. (Luk 12:32; Hib. 3:1) N’abalị mbụ n’ọnwa Ọktoba afọ 1919, nzukọ Jehova malitere ibipụta Teta! Ọ bụ ọhaneze ka e kwo malite ibipụta ya. Aha mbụ a kpọrọ ya bụ The Golden Age. N’afọ 1937, a malitere ịkpọ ya Consolation. Ma, ọ bụ n’afọ 1946 ka a kpọwara ya Teta! Ihe ndị a na-ede na Teta! na-atọ ma Ndị Mmụta Baịbụl ma ọhaneze ụtọ. Ọ bụ ya mere ole a na-ebipụta Teta! bịara karịa nnọọ ole a na-ebipụta Ụlọ Nche ruo ọtụtụ afọ.

12 Kemgbe ọtụtụ afọ e bipụtawara Ụlọ Nche na Teta!, a gbanweela otú ha na-adị nakwa ihe ndị a na-ede na ha. Ma, a gbanwebeghị ihe e bu n’obi na-ede ha. Ihe e bu n’obi na-ede ha bụ ka e jiri ha na-akpọsa Alaeze Chineke nakwa ka ndị mmadụ ghọta na ihe Baịbụl na-ekwu bụ eziokwu. Ụlọ Nche a na-ebipụta taa dị ụzọ abụọ. Otu bụ nke a na-amụ amụ, nke ọzọ abụrụ nke ọhaneze. Ọ bụ ‘ndị ezinụlọ a na-enye nri,’ ya bụ, ma “ìgwè atụrụ nta” ma “atụrụ ọzọ,” ka a na-ebipụtara nke a na-amụ amụ. * (Mat. 24:45; Jọn 10:16) Ndị e bu n’obi na-ebipụta nke ọhaneze bụ ndị na-aghọtabeghị eziokwu dị na Baịbụl ma ha kweere na Chineke, kwerekwa na Baịbụl bụ okwu ya. (Ọrụ 13:16) Ndị e kwo ebipụta Teta! bụ ndị na-amachaghị Baịbụl nakwa ezi Chineke anyị bụ́ Jehova.—Ọrụ 17:22, 23.

13. Olee ihe mere Ụlọ Nche na Teta! ji pụọ iche? (Kwurịtanụ ihe dị na chaatị isiokwu ya bụ “ Akwụkwọ Ụfọdụ A Na-ebipụta n’Ụwa na Ole A Na-ebipụta Ha.”)

 13 Tupu afọ 2014 ebido, a na-ebipụta ihe karịrị nde Teta! iri anọ na anọ kwa ọnwa. A na-ebipụtakwa ihe dị ka nde Ụlọ Nche iri anọ na isii kwa ọnwa. A na-asụgharị Teta! n’ihe dị ka otu narị asụsụ. A na-asụgharịkwa Ụlọ Nche n’ihe karịrị narị asụsụ abụọ. Na magazin niile dị n’ụwa, ọ bụ Ụlọ Nche na Teta! ka a kacha ebipụta, ọ bụkwa ha ka a kacha asụgharị. O kwesịghị iju anyị anya na ọtụtụ ndị na-agụ Ụlọ Nche na Teta! n’ihi na ihe a na-ede na ha bụ ozi ọma Jizọs kwuru na a ga-ekwusa n’ụwa niile.—Mat. 24:14.

14. Olee ihe ụmụnna anyị ji ịnụ ọkụ n’obi mee? Oleekwa ihe mere ha ji mee ya?

14 Baịbụl. N’afọ 1896, Nwanna Russell na ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ gbanwere aha ha ji na-ebipụta akwụkwọ ma mee ka Baịbụl bata n’aha ahụ. Ha kpọwaziri ya Watch Tower Bible and Tract Society. Ihe a ha mere dabara adaba n’ihi na ọ bụ Baịbụl ka e ji ezisa ozi ọma Alaeze Chineke. (Luk 24:27) Iji gosi na aha a ha gbanwere dabara adaba, ụmụnna anyị ji ịnụ ọkụ n’obi kesaara ndị mmadụ Baịbụl ma nyere ọtụtụ ndị aka ịna-agụ Baịbụl. Dị ka ihe atụ, e nwere Baịbụl otu nwoke aha ya bụ Benjamin Wilson sụgharịrị. Aha Baịbụl a bụ The Emphatic Diaglott. Baịbụl a nwere naanị Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Anyị malitere ibipụtakwu Baịbụl a n’afọ 1926. Malite n’afọ 1942, anyị bipụtakwara Baịbụl ọzọ a na-akpọ King James Version. Anyị bipụtara ihe dị ka narị puku asaa ma kesaara ya ọhaneze. Mgbe afọ abụọ gachara, anyị malitere ibipụta Baịbụl a na-akpọ American Standard Version. Na Baịbụl a, ị ga-ahụ aha Chineke bụ́ Jehova ugboro puku isii, narị asatọ na iri abụọ na atọ. Tupu afọ 1950 agwụchaa, anyị ekesaarala ọhaneze ihe karịrị narị puku abụọ na puku iri ise.

15, 16. (a) Gịnị mere Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ji pụọ iche? (Kwurịtanụ ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “ Otú Anyị Si Nwee Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’Ọtụtụ Asụsụ.”) (b) Gịnị ka anyị ga na-eme ka Jehova mee ka Okwu ya ruo anyị n’obi?

15 N’afọ 1950, anyị wepụtara Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. N’afọ 1961, anyị wepụtakwara Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke zuru ezu. Na Baịbụl a, e dere aha Chineke bụ́ Jehova ebe ọ bụla ọ dị na Baịbụl mbụ e ji asụsụ Hibru dee n’oge ochie. E dekwara aha Chineke narị ugboro abụọ na iri atọ na asaa n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ a. E degharịala Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ugboro ugboro. Nke ikpeazụ e degharịrị ya bụ n’afọ 2013. Gịnị mere anyị ji edegharị Baịbụl a? Ọ bụ iji hụ na ya na Baịbụl mbụ e ji asụsụ Hibru na Grik dee na-ekwu otu ihe. Ihe ọzọkwa bụ ka ọ na-ekwe ọgụgụ. Malite mgbe e bidoro ibipụta Baịbụl a ruo afọ 2013, e bipụtala ihe karịrị narị nde abụọ na otu nde. E bipụtara ha n’otu narị asụsụ na iri abụọ na otu. Ihe a niile bụ ma nke zuru ezu ma nke na-ezughị ezu.

16 Olee ihe ụfọdụ ndị kwurula mgbe ha gụchara Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’asụsụ ha? Otu nwoke onye Nipali kwuru, sị: “Ọ na-esiri ọtụtụ ndị obodo anyị ike ịghọta Baịbụl ochie e dere n’asụsụ anyị n’ihi na e ji asụsụ ndị mgbe ochie dee ya. Ma, anyị na-aghọta Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke ọma n’ihi na e dere ya otú anyị si asụ asụsụ anyị ugbu a.” Mgbe otu nwaanyị onye Sentral Afrịkan Ripọblik malitere ịgụ Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ e dere n’asụsụ Sango, o bidoro bewe ákwá ma kwuo, sị: “Ugbu a ka ihe m na-agụ na-eru m n’obi n’ihi na e dere Baịbụl a otú anyị si asụ asụsụ anyị ugbu a.” Otú ọ dị nwaanyị ahụ ka o kwesịrị ịdị anyị. Anyị kwesịrị  ịna-agụ Okwu Chineke kwa ụbọchị ka Jehova mee ka ihe anyị na-agụ ruo anyị n’obi.—Ọma 1:2; Mat. 22:36, 37.

Obi Dị Anyị Ụtọ Maka Ihe Ndị Anyị Ji Ezi Ozi Ọma na Ihe Ndị A Na-akụziri Anyị

17. Gịnị na gịnị ka ị ga-eme iji gosi na obi dị gị ụtọ maka ihe ndị anyị ji ezi ozi ọma na ihe ndị a na-akụziri anyị? Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ndị ahụ, olee uru ha ga-abara anyị?

17 Ị̀ na-egosi na obi dị gị ụtọ maka ihe ndị ahụ Jizọs Kraịst bụ́ Eze anyị nyere anyị anyị ji na-ezi ozi ọma? Ị̀ na-egosikwa na obi dị gị ụtọ maka otú o si jiri nwayọọ nwayọọ na-akụziri anyị ihe? Ị̀ na-ewepụta oge na-agụ akwụkwọ nzukọ Jehova na-ebipụta? Ị̀ na-eji ha akụziri ndị ọzọ ihe? Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ndị a, ị ga-ekweta na ihe otu nwanna nwaanyị e mere baptizim n’abalị anọ n’ọnwa Ọktoba, afọ 1914, kwuru bụ eziokwu. Aha nwanna nwaanyị a bụ Opal Betler. O kwuru, sị: “Mụ na di m [bụ́ Edward] ji gramafon na kaadị e dere ozi ọma na ya zie ozi ọma ọtụtụ afọ. Anyị ji akwụkwọ anyị dị iche iche na Ụlọ Nche na Teta! aga ozi ọma ụlọ n’ụlọ. Anyị gara ozi ọma n’okporo ámá, nyara akwụkwọ ndị e dere ihe na ha na-agagharị. Anyị nyekwara ndị mmadụ mpempe akwụkwọ ndị e dere ozi anyị na ha. E mechara kụziere anyị ime njeghachi azụ na nke ndị nwere mmasị n’ozi anyị ma kụziere ha Baịbụl. [Ihe a na-akpọ ime njeghachi azụ ugbu a bụ nletaghachi.] Anyị ji ozi ọma kpọrọ ihe, obi na-atọkwa anyị ụtọ.” Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya ga na-agha mkpụrụ, na-ewe ihe ubi, ma na-aṅụrị ọṅụ. Ọtụtụ nde ndị ji ozi ọma kpọrọ ihe otú ahụ Nwanna Nwaanyị Opal mere na-enwe ọṅụ otú Jizọs kwuru na ha ga-enwe.—Gụọ Jọn 4:35, 36.

18. Olee ihe ọma Chineke meere anyị, nke na-enweghị ihe ka ya n’oge anyị a?

18 Ọtụtụ ndị na-aghọbeghị ndị na-eso ụzọ Eze anyị bụ́ Jizọs Kraịst nwere ike ịna-ele anyị anya ka ndị “na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị.” (Ọrụ 4:13) Ma, chebagodịrị ihe a echiche! Eze anyị emeela ka anyị bụrụ a kwaa akwụrụ n’ibipụta akwụkwọ dị iche iche. Ụfọdụ n’ime akwụkwọ ndị a bụ ndị a kacha asụgharị na ndị a kacha ekesa n’ụwa niile. Eze anyị na-akụzidịrị anyị otú anyị ga-esi na-eji ihe ndị ahụ anyị ji ekwusa ozi ọma na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma n’ụwa niile. Obi dị anyị ụtọ na anyị na Kraịst so na-akụziri ndị mmadụ eziokwu dị na Baịbụl ma na-enyere ha aka ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst. O nweghị ihe ọma ka ya n’oge anyị a!

^ para. 2 Naanị n’afọ iri gara aga, ndị Jehova bipụtara ihe karịrị ijeri akwụkwọ iri abụọ e ji amụ Baịbụl. Ihe ọzọ bụ na anyị nwere ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet a na-akpọ jw.org. Ihe karịrị ijeri mmadụ abụọ na narị nde asaa ndị na-aga n’Ịntanet n’ụwa niile nwere ike ịga ebe ahụ gụọ akwụkwọ anyị ma ọ bụ lee vidio.

^ para. 9 E nwere akwụkwọ ndị ọzọ anyị bipụtara e ji amụ Baịbụl. Akwụkwọ ndị a enyerela ụmụnna anyị aka ịkụziri ndị mmadụ eziokwu dị na Baịbụl. Akwụkwọ ndị a bụ, The Harp of God (e bipụtara ya n’afọ 1921), “Kwe Ka Chineke Buru Onye-Ezi-Okwu” (e bipụtara ya n’Igbo n’afọ 1950), Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala (e bipụtara ya n’Igbo n’afọ 1983), na Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi (e bipụtara ya n’afọ 1995).

^ para. 12 Gụọ Ụlọ Nche Julaị 15, 2013, peeji nke 23, paragraf nke 13. A kọwara otú anyị sizi ghọta ndị bụ́ ‘ndị ezinụlọ ahụ a na-enye nri’ n’Ụlọ Nche a.

GỤKWUO GBASARA YA

VIDIO NA AKWỤKWỌ NDỊÀMÀ JEHOVA NA-EBIPỤTA

Ndị E Nyere Ọrụ Ịsụgharị “Okwu Dị Nsọ nke Chineke”—Ndị Rom 3:2

Kemgbe ọtụtụ afọ gara aga, Ndịàmà Jehova ejirila Baịbụl dị iche iche zie ndị mmadụ ozi ọma. Ma, gịnị mere ha ji jiri aka ha sụgharịa Baịbụl n’asụsụ Bekee a na-asụ ugbu a?