Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!

 ISI NKE 7

Otú Anyị Si Ezi Ozi Ọma—Anyị Na-esi Ụzọ Dị Iche Iche Ezi Ndị Mmadụ Ozi Ọma

Otú Anyị Si Ezi Ozi Ọma—Anyị Na-esi Ụzọ Dị Iche Iche Ezi Ndị Mmadụ Ozi Ọma

IHE ISIOKWU A NA-EKWU

Ndị Chineke na-esi ụzọ dị iche iche ezisara ọtụtụ ndị ozi ọma

1, 2. (a) Olee ihe Jizọs mere ka o nwee ike izi ìgwè mmadụ ozi ọma? (b) Olee otú anyị sirila mee ihe a Jizọs mere? Oleekwa ihe mere anyị ji eme ya?

E NWERE otu ụbọchị Jizọs nọ n’akụkụ mmiri na-akụziri ụfọdụ ndị ihe, ìgwè mmadụ abịakwa ige ya ntị. Mgbe Jizọs hụrụ ha, ọ banyere n’ụgbọ ma gamitụ na mmiri ahụ. Gịnị mere o ji gamitụ? Ọ bụ n’ihi na ọ ma na ya nọrọ n’elu mmiri ahụ na-ekwu okwu, ọ ga-eme ka olu ya na-adasi ike, ìgwè mmadụ ahụ ga-anụkwa ihe ọ na-ekwu nke ọma.—Gụọ Mak 4:1, 2.

2 Afọ ole na ole tupu Alaeze Chineke amalite ịchị n’eluigwe n’afọ 1914 nakwa si n’afọ 1914 gawa, ezigbo Ndị Kraịst na-esi ụzọ dị iche iche eme ka ndị mmadụ nụ ozi ọma Alaeze Chineke otú ahụ Jizọs mere. Eze Alaeze Chineke na-eduzi ndị Chineke taa, ha ana-agbanwe otú ha si ezi ndị mmadụ ozi ọma. Ha na-agbanwe otú ha si ezi ozi ọma ma e nwee ihe ọhụrụ ndị nkà na ụzụ mepụtara ga-enyere ha aka ma ọ bụkwanụ ma ihe ụfọdụ gbanwee n’ụwa. Anyị chọrọ ime ihe niile anyị nwere ike ime ka mmadụ niile nụ ozi ọma tupu Chineke ebibie ụwa ọjọọ a. (Mat. 24:14) Ka anyị leba anya ugbu a n’ụzọ ụfọdụ anyị sirila zie ndị mmadụ ozi ọma, n’agbanyeghị ebe ha bi. Ka anyị na-eleba ha anya, chee echiche otú i nwere ike isi ṅomie ụmụnna anyị ndị kwusara ozi ọma n’oge ndị gara aga.

Otú E Si Zie Ọtụtụ Ndị Ozi Ọma

3. Olee ihe mere obi ji gbawaa ndị na-achọghị iji ntị anụ eziokwu?

3 Akwụkwọ akụkọ: Nwanna Russell na ụmụnna ndị ọzọ ha na ya rụkọrọ ọrụ malitere ibipụta Ụlọ Nche n’afọ 1879. Ha ji ya na-eme ka ọtụtụ mmadụ nụ ozi ọma Alaeze Chineke. Ma, ọtụtụ afọ tupu 1914, o yiri ka Kraịst ò mekwara ka e si ụzọ ndị ọzọ na-ezikwu ọtụtụ ndị ozi ọma. Ihe ndị merenụ malite n’afọ 1903 ga-eme ka o doo anyị anya. N’afọ ahụ, otu onye na-ekwuchite ọnụ ndị Protestant nọ na Pensụlvenịa, aha ya bụ Dr. E. L. Eaton, mara Nwanna Charles Taze Russell aka, sị na ya chọrọ ka ha rụrịta ụka banyere ihe Baịbụl na-akụzi. Eaton degaara Nwanna Russell akwụkwọ ozi, sị ya: “Ana m eche na ọ ga-aka mma ka anyị pụta n’ihu ọha rụrịta ụka gbasara ihe ụfọdụ Baịbụl na-akụzi mụ na gị na-enweghị otu olu na ha. . . . ọtụtụ ndị ga-achọkwa ịmụta ihe ná mkparịta ụka mụ na gị a.” Mgbe Nwanna Russell na ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ lebachara anya n’akwụkwọ ozi ahụ, ha kpebiri na ha ga-achọ ka ha na Eaton rụrịta ụka n’ihi na ọ ga-abara ọtụ tụ ndị uru. N’ihi ya, Nwanna Russell na ndị òtù ya haziri ịna-ebipụta ma ihe hanwa kweere ma ihe Eaton na ndị òtù ya kweere n’otu akwụkwọ akụkọ a ma ama. Aha akwụkwọ akụkọ ahụ bụ The Pittsburgh Gazette. Ihe ndị a Nwanna Russell na-ede n’akwụkwọ akụkọ a na-atọ ọtụtụ ndị ụtọ. Otú o si eme ka eziokwu ndị dị na Baịbụl doo anya mere ka ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ ahụ kwuo na ha ga na-ebipụtazi ya kwa izu. Ihe a niile were ndị eziokwu na-agba agba ná ntị iwe.

Tupu afọ 1914 agwụchaa, ihe Nwanna Russell ji Baịbụl na-akụzi na-agbazi n’ihe karịrị puku akwụkwọ akụkọ abụọ

4, 5. Olee otu àgwà magburu onwe ya Nwanna Russell kpara? Olee otú ndị na-edu ndú ná nzukọ Jehova ga-esi eṅomi ya?

4 Ka ihe ndị a nọ na-eme, ụlọ ọrụ ndị ọzọ na-ebi akwụkwọ akụkọ kwuru na ha chọrọ ịna-ebipụtakwa eziokwu ndị ahụ Nwanna Russell na-akụzi. N’afọ 1908, e kwuru n’Ụlọ Nche na “ụlọ ọrụ iri na otu na-ebi akwụkwọ akụkọ na-ebipụtazi” okwu ndị ahụ Nwanna Russel kwuru. Ma, e nwere otu ihe ụmụnna ndị ibipụta akwụkwọ akụkọ doro anya gwara Nwanna Russell ka o mee. Ha gwara ya na ọ bụrụ na ha e si na Pitsbọg, bụ́ ebe isi ụlọ ọrụ anyị dị mgbe ahụ, kwaga ebe e nwere ọtụtụ ụlọ ọrụ na-ebipụta akwụkwọ akụkọ, a ga-enwekwu ụlọ ọrụ ndị ga na-ebipụta ihe ndị ahụ o si na Baịbụl na-akụzi n’akwụkwọ akụkọ ha. Mgbe Nwanna Russell chebachaara ihe ndị a na ihe ndị ọzọ gbasara okwu a echiche, ọ kwagara na Bruklin dị na Niu Yọk n’afọ 1909. Ò nwere uru ihe a o mere bara? Ee. Ọnwa ole na ole Nwanna Russell kwagachara Niu Yọk, ihe ọ na-akụzi na-agbazi n’ihe dị ka narị akwụkwọ akụkọ anọ. Ka chi na-eji na-abọ, a na-enwekwu akwụkwọ akụkọ ndị ọzọ na-ebipụta ya. Tupu Alaeze Chineke amalite ịchị n’afọ 1914, ihe Nwanna Russell ji Baịbụl na-akụzi na-agbazi n’ihe karịrị puku akwụkwọ akụkọ abụọ, n’asụsụ anọ.

5 Olee ihe anyị kwesịrị ịmụta n’ihe a? Ndị niile na-edu ndú n’ọgbakọ kwesịrị ịdị umeala n’obi ka Nwanna Russell. Olee otú ha ga-esi eme ya? Mgbe ha na-eme mkpebi ndị dị mkpa, ha kwesịrị ichebara ihe ụmụnna ndị ọzọ gwara ha echiche.—Gụọ Ilu 15:22.

6. Olee otú eziokwu gbasara Alaeze Chineke a na-ede n’akwụkwọ akụkọ si nyere otu nwaanyị aka?

6 Eziokwu gbasara Alaeze Chineke a na-ede n’akwụkwọ akụkọ ndị ahụ nyeere ọtụtụ ndị aka ịbata n’ọgbakọ. (Hib. 4:12) Otu n’ime ndị a bụ Nwanna Nwaanyị Ora Hetzel. E mere ya baptzim n’afọ 1917. O kwuru, sị: “Mgbe mụ na di m gbachara akwụkwọ, m gara ileta mama m n’obodo Rọchesta, dị na Minisota. Mgbe m rutere, m hụrụ mama m ka ọ nọ na-achakapụta ihe ndị gbara n’akwụkwọ akụkọ. Ihe ndị ahụ bụ okwu Nwanna Russell kwuru. Mama m kọọrọ m ihe ndị ọ mụtara na ha.” Mgbe mama ya kọchaara ya ihe ndị ahụ ọ mụtara, o kwetara ihe ndị ahụ mama ya kọọrọ ya ma ghọọ Onyeàmà Jehova. O zisara ozi ọma Alaeze Chineke ihe dị ka afọ iri isii.

7. Gịnị mere ndị na-edu ndú ná nzukọ Jehova ji chewe ma ọ̀ ka kwesịrị ekwesị iji akwụkwọ akụkọ na-ezisa ozi ọma?

7 E nwere ihe abụọ merenụ n’afọ 1916. Ihe abụọ a mere ka ndị na-edu ndú ná nzukọ Jehova chewe ma ọ̀ ka kwesịrị ekwesị iji akwụkwọ akụkọ na-ezisa ozi ọma. Ihe nke mbụ bụ Agha Ụwa nke Mbụ. Agha a mere ka o siere ụlọ ọrụ dị iche iche na-ebipụta akwụkwọ akụkọ ike inweta ihe ndị ha ji na-ebi akwụkwọ. N’otu afọ ahụ, ụmụnna anyị na-ahụ maka ihe ndị anyị na-ede n’akwụkwọ akụkọ  n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Briten kwuru otú ihe si kwụrụ mgbe ahụ. Ha sịrị: “Ka ọ dị ugbu a, ọ bụ naanị ihe dị ka ụlọ ọrụ akwụkwọ akụkọ iri atọ na-ebipụtazi okwu ndị ahụ Nwanna Russell kwuru. O yikwara ka ụfọdụ n’ime ha ga-akwụsị ọrụ n’ihi na ego akwụkwọ akụkọ arịala elu ọjị, ọ bụkwa mmadụ ole na ole na-azụzi ya.” Ihe nke abụọ merenụ n’afọ 1916 bụ na Nwanna Russell nwụrụ n’abalị iri atọ na otu n’ọnwa Ọktoba. Ọ bụ ya mere e ji kwuo n’Ụlọ Nche Bekee nke December 15, 1916, sị: “Ebe ọ bụ na Nwanna Russell anwụọla, anyị agaghịzi na-ebipụta okwu ya [n’akwụkwọ akụkọ].” N’ihi ihe ndị a, a kwụsịrị iji akwụkwọ akụkọ na-ezi ozi ọma. Ma, ụmụnna anyị ka sikwa n’ụzọ ndị ọzọ na-ekwusa ozi ọma. Ha ji “Foto Ihe Nkiri nke Okike” na ihe ndị ọzọ na-enyere ndị mmadụ aka ịmụta eziokwu.

8. Olee ihe o were ụmụnna anyị imepụta “Foto Ihe Nkiri nke Okike”?

8 Ihe nkiri e ji akụzi ihe: O were Nwanna Russell na ụmụnna anyị ndị ọzọ ihe dị ka afọ atọ tupu ha emepụta “Foto Ihe  Nkiri nke Okike.” E wepụtara ya n’afọ 1914. (Ilu 21:5) Ọ na-abụ a kpọnye ihe nkiri a, ya ana-egosi foto ndị mmadụ na anụmanụ. A na-anụtụkwa egwú ma a na-egosi ya. N’ihe nkiri a, ọtụtụ narị ndị e ji mee ya mere ka hà bụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. N’afọ 1913, a kọrọ na “otú e si nweta foto ụmụ anụmanụ ndị e gosiri ha na Noa n’ihe nkiri ahụ bụ na a gara n’otu nnukwu ogige ụmụ anụmanụ seta ha foto.” E ji aka see ọtụtụ narị foto ndị dị n’ihe nkiri ahụ. Ndị sere ha nọ na Lọndọn, Niu Yọk, Paris, na Filadelfịa.

9. Gịnị mere anyị ji wepụta oge, mefuokwa ezigbo ego iji mepụta “Foto Ihe Nkiri nke Okike”?

9 Gịnị mere anyị ji wepụta oge, mefuokwa ezigbo ego iji mepụta “Foto Ihe Nkiri nke Okike”? A kọwara ihe mere anyị ji mee otú ahụ ná mgbakọ anyị nwere n’afọ 1913. Ụmụnna niile bịara mgbakọ ahụ kwekọrịtara, sị: “Ụlọ ọrụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ n’Amerịka ejirila katuun na foto mee ka ọtụtụ mmadụ na-enwe mmasị ịgụ akwụkwọ akụkọ. Ihe ọzọkwa bụ na sinima a na-egosi ndị mmadu n’oge ahụ na-atọ ha ụtọ. Ọ na-akụzikwara ha ọtụtụ ihe. N’ihi ya, anyị kwetasiri ike na ọ bụrụ na anyị ana-egosi ndị mmadụ “Foto Ihe Nkiri nke Okike,” ọ ga-eme ka ọtụtụ ndị chọsiwe ike ịnụ ozi ọma anyị. Ọ bụ ya mere anyị ji na-ekpebi taa na anyị niile ga na-eji ya na-ezisa ozi ọma, na-ejikwa ya akụziri ndị mmadụ Baịbụl.”

Foto nke dị n’elu: Ebe a nọ na-egosi “Foto Ihe Nkiri nke Okike”; foto nke dị n’okpuru: “Foto Ihe Nkiri nke Okike” e sere ese

10. Olee ebe ndị e gosiri “Foto Ihe Nkiri nke Okike”?

10 N’afọ 1914, a na-egosi ndị mmadụ “Foto Ihe Nkiri nke Okike” n’obodo iri asatọ kwa ụbọchị. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde mmadụ asatọ lere ya n’Amerịka nakwa na Kanada. N’afọ ahụkwa, e gosiri ndị mmadụ ihe nkiri a n’Ọstrelia, Briten, Denmak, Finland, Jamanị, Niu Ziland, Nọọwee, Swidin, na Swizaland. E mechara mepụta ya n’ụdị ihe nkiri slaịd. E ji ya gaa n’obodo ndị na-emepechaghị emepe, gosi ha ya. Ihe a kpọrọ ya bụ “Eureka Drama” (ya bụ, “Ihe Nkiri Yureka”). Ọ naghị efu nnukwu ego imepụta ya otú nke ọzọ si efu. Ọ kakwa nke ọzọ dịrị mfe iburu ya si otu ebe gaa ebe ọzọ. Tupu afọ 1916 eruo, e nwere otu n’ime fim abụọ a a sụgharịrị n’asụsụ Aminian, Dano-Nọwijin, French, Jaman, Grik, Ịtalian, Spanish, Polish, na Swidish.

N’afọ 1914, ndị mmadụ na-ekwo ekwo abịa ele “Foto Ihe Nkiri nke Okike” n’ụlọ ezumezu ndị a na-anọ egosi ya

11, 12. Olee uru “Foto Ihe Nkiri nke Okike” baara otu nwa okorobịa mgbe o lechara ya? Oleekwa ihe anyị na-amụta n’ihe o mere?

11 E nwere ihe otu nwa okorobịa dị afọ iri na asatọ kwuru mgbe o lechara “Foto Ihe Nkiri nke Okike” nke dị n’asụsụ French. Aha nwa okorobịa ahụ bụ Charles Rohner. Ọ sịrị: “Elere m ihe nkiri a mgbe e gosiri ya n’obodo anyị bụ́ Kọlma nke dị n’Alsas na Frans. Ozugbo m bidoro lewe ya, m matara na ọ bụ eziokwu dị na Baịbụl.”

12 E mechara mee Charles baptizim. Ọ ghọkwara onye ọsụ ụzọ oge niile n’afọ 1922. Mgbe ọ ghọchara onye ọsụ ụzọ, ihe mbụ a gwara ya mee bụ igosi ndị obodo ya ihe nkiri ahụ. Charles kwuru ihe ndị a gwara ya na-eme n’ebe ọ bụla ọ gara igosi ndị mmadụ ihe nkiri ahụ. Ọ sịrị: “E nwere ihe ụfọdụ a gwara m na-eme. Otu bụ ịkpọ ụbọ, ọzọ bụ ịgụkọ ego e nwetara, ọzọkwa bụ ịhazi  otú a ga-esi na-enye ndị mmadụ akwụkwọ. Ọrụ m ọzọ bụ ịgwa ndị mmadụ ka ha mechie ọnụ ma a chọwa ibido ihe omume. Anyị na-enye ndị mmadụ akwụkwọ ma a gbasaa ihe omume nke ụtụtụ. Otú anyị si eme ya bụ na anyị na-ebunye ụfọdụ ụmụnna akwụkwọ ahụ, ma kenye onye ọ bụla n’ime ha ebe ọ ga-anọ kesaa akwụkwọ nke ya. Ha na-enye onye ọ bụla nọ ebe e kenyere ha akwụkwọ. Anyị dojukwara akwụkwọ n’elu tebụl ndị dị n’ọnụ ụzọ e si abata n’ụlọ ahụ a nọ na-egosi ihe nkiri ahụ.” N’afọ 1925, a kpọrọ Nwanna Charles ka ọ bịa jewe ozi na Betel dị na Bruklin, na Niu Yọk. Mgbe o rutere, a gwara ya ka ọ na-eduzi ndị na-akụ egwú n’ụlọ ọrụ redio anyị e mepere ọhụrụ. Aha mkpirisi ụlọ ọrụ redio a bụ WBBR. O kwesịrị ịbụ anyị cheta ihe a Nwanna Charles mere, onye ọ bụla n’ime anyị ajụọ onwe ya, sị: ‘M̀ ga-ekwe eme ihe ọ bụla a gwara m mee ka e nwee ike na-ezikwu ndị mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke?’—Gụọ Aịzaya 6:8.

13, 14. Olee otú e si jiri redio zisaa ozi ọma? (Gụọ ihe ndị e dere n’igbe isiokwu ha bụ, “ Ihe Ndị A Na-eme na Redio WBBR” na “ Mgbakọ Kpọtụrụ Akpọtụ.”)

13 Redio. N’agbata afọ 1921 na afọ 1929, a kwụsịlatara iji “Foto Ihe Nkiri nke Okike” na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. Ma, e bidoro iji redio na-ezi ozi ọma Alaeze Chineke n’ike n’ike. N’abalị iri na isii n’ọnwa Eprel, afọ 1922, Nwanna Rutherford nọ n’ụlọ ezumeezu a na-akpọ Metropolitan Opera House kwuo okwu na redio. Ụlọ a dị na Filadelfịa nke dị na Pensụlvenịa. Nke a bụ nke mbụ o kwuru okwu na redio. Isiokwu okwu ahụ o kwuru bụ, “Ọtụtụ Nde Ndị Dị Ndụ Ugbu A Agaghị Anwụ Ma Ọlị.” Ihe dị ka iri puku mmadụ ise nọ ebe dị iche iche gere ya. N’afọ 1923, e nwekwara mgbakọ mbụ ndị mmadụ nọ ebe dị iche iche gere na redio. E wezụga iji ụlọ ọrụ redio ndị ọzọ na-ekwusa ozi ọma, ndị na-edu ndú ná nzukọ Jehova n’oge ahụ kpebiri na ọ ga-adị mma ka ha rụọ ụlọ ọrụ redio nke ha. A rụrụ ya na Staten Aịland dị na Niu Yọk. Aha e ji mara ya bụ WBBR. Anyị bidoro iji ya gbasawa ozi n’abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa Febụwarị, afọ 1924.

N’afọ 1922, ihe dị ka puku mmadụ iri ise ji redio ha gee okwu ahụ isiokwu ya bụ “Ọtụtụ Nde Ndị Dị Ndụ Ugbu A Agaghị Anwụ Ma Ọlị”

14 Ụlọ Nche Bekee nke December 1, 1924, kwuru ihe mere anyị ji sị ka anyị rụọ ụlọ ọrụ redio nke anyị. O kwuru, sị: “Anyị chọpụtara na iji redio na-agbasa ozi ọma anaghị efu anyị nnukwu ego. Anyị chọpụtakwara na ọ bụ otú dị mma isi na-agbasa ozi ọma ugbu a.” O kwukwara, sị: “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị chọrọ ka anyị rụkwuo ụlọ ọrụ redio ndị ọzọ anyị ga-eji na-agbasa ozi ya, ọ ga-esi otu ụzọ ma ọ bụ ụzọ ọzọ mee ka anyị nweta ego anyị ga-eji rụọ ha.” (Ọma 127:1) N’agbata afọ 1924 na afọ 1926, anyị rụrụ ụlọ ọrụ redio isii anyị na-anọ na ha agbasa ozi ọma. Anyị rụrụ otu na Niu Yọk, rụọ otu na Chikago. Obodo abụọ a dịcha n’Amerịka. Anyị rụkwara otu n’Albeta, rụọ otu na British Kolumbia, rụọ otu na Ọnterio, rụọkwa otu na Saskachewan. Obodo anọ ndị a dịcha na Kanada.

15, 16. (a) Gịnị ka ndị ụkọchukwu nọ na Kanada mere mgbe ahụ anyị ji redio na-agbasa ozi ọma? (b) Olee otú ozi ọma ndị e si na redio gbasaa si nyere ụmụnna ezigbo aka mgbe ha na-ezi ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ?

15 Obi malitere ịgbawa ndị ụkọchukwu Krisendọm mgbe ha hụrụ na eziokwu Baịbụl anyị na-akụzi na redio na-agbasa ebe niile. Otu nwanna aha ya bụ Albert Hoffman, onye rụrụ ọrụ n’ụlọ ọrụ redio anyị dị na Saskachewan nke dị na Kanada, kwuru ihe merenụ. Ọ sịrị: “Ọtụtụ ndị bịara na-amatakwu ndị Ndị Mmụta  Baịbụl [nke bụ́ aha a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ] bụ. Anyị ji redio kụziere ọtụtụ ndị eziokwu Baịbụl ruo afọ 1928. N’afọ ahụ ka ndị ụkọchukwu gara na-enye ndị ọchịchị nsogbu ka ha napụ Ndị Mmụta Baịbụl ikike inwe ụlọ ọrụ redio na Kanada. Ndị ọchịchị mechara mee ihe ahụ ndị ụkọchukwu gwara ha. Nke a mere ka e mechie ụlọ ọrụ redio niile Ndị Mmụta Baịbụl ji na-agbasa ozi ọma na Kanada.”

16 N’agbanyeghị na e mechiri ụlọ ọrụ redio anyị ndị dị na Kanada, anyị ka na-ejikwa ụlọ ọrụ redio ndị ọzọ dị na Kanada na-agbasa ozi ọma. (Mat. 10:23) E bidoro idepụta aha ụlọ ọrụ redio ndị ahụ n’Ụlọ Nche na Teta! ka ndị nkwusa jiri ha na-agwa ndị mmadụ ebe ha ga-agbanye na redio ha iji gere ozi anyị. Ò nwere uru ihe a e mere bara? À na-ajụkwa ajụ? Ozi Alaeze Anyị nke Bekee nke ọnwa Jenụwarị afọ 1931 kwuru, sị: “Ozi ọma ndị ahụ e si na redio na-ezisa nyeere ụmụnna ezigbo aka mgbe ha na-ezi ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ. Ọtụtụ ụmụnna kọọrọ isi ụlọ ọrụ anyị na e nwere ndị gere okwu ndị ahụ Nwanna Rutherford kwuru na redio. Mgbe ha gechara ya, ha ejiri obi ụtọ nara anyị akwụkwọ ndị anyị nyere ha.” Ozi Alaeze Anyị ahụ kwuru na ozi ọma anyị na-ezi na redio nakwa n’ụlọ n’ụlọ “bụ ụzọ abụọ doro anya nzukọ Onyenwe anyị si eme ka ọhaneze na-anụ ozi ọma.”

17, 18. Na anyị kwụsịrị iji redio agbasa ozi ọma n’ọtụtụ ebe, ọ̀ pụtara na anyị kwụsịchara iji ya agbasa ozi ọma? Olee ihe mere i ji kwuo otú ahụ?

17 N’agbata afọ 1931 na afọ 1939, ndị ihe ọma na-anaghị adị mma bịakwara nyewe nsogbu ka a kwụsị anyị iji ụlọ ọrụ redio ọ bụla na-ezisa ozi ọma. N’ihi ya, ná ngwụcha afọ 1937, anyị kwụsịrị ịgbasa ozi ọma na redio n’ọtụtụ ebe. Anyị bịara jirikwuo ozi ụlọ n’ụlọ kpọrọ ihe. * Ma, anyị ka na-ejikwa redio agbasa ozi ọma n’ime ime obodo ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, si n’afọ 1951 ruo afọ 1991, anyị na-aga n’otu ụlọ ọrụ redio dị na West Belin, dị na Jamanị, agbasa ozi ọma, ka ndị bi na Ist Jamanị nwee ike ịnụ ozi ọma Alaeze Chineke. Malite n’afọ 1961 ruo ihe karịrị iri afọ atọ, otu ụlọ ọrụ redio ndị obodo Surinama na-eji nkeji iri na ise n’izu ọ bụla agbasa ozi ọma anyị na redio ha. Obodo Surinama dị n’Ebe Ndịda Amerịka. Malite n’afọ 1969 ruo n’afọ 1977, anyị tinyere ihe karịrị narị isiokwu atọ na iri ise na teepụ. Isiokwu ha niile bụ “Akwụkwọ Nsọ Dum Bara Uru.” Ụlọ ọrụ redio dị narị abụọ na iri itoolu na otu e nwere na steeti iri anọ na asatọ n’Amerịka kpọọrọ ọhaneze okwu ndị ahụ na redio. N’afọ 1996, otu ụlọ ọrụ redio dị n’Apịa, bụ́ isi obodo Samoa, na-akpọnye okwu isiokwu ya bụ “Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara.” Ha na-akpọnye isiokwu a otu ugboro n’izu.

18 Malite ihe dị ka afọ iri abụọ gara aga, anyị anachakwaghị eji redio agbasa ozi ọma. Ma, o nwere ihe ọhụrụ ndị nkà na ụzụ mepụtara anyị jizi eme ka ọtụtụ mmadụ na-anụ ozi ọma.

19, 20. Olee ihe mere anyị ji nwee jw.org n’Ịntanet? Oleekwa uru ọ barala? (Gụọkwa ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “ JW.ORG.”)

19 Ịntanet. N’afọ 2013, ihe karịrị ijeri mmadụ abụọ na narị nde mmadụ asaa na-aga n’Ịntanet. Otu nchọpụta e mere gosiri na ihe dị ka ijeri mmadụ abụọ na-eji ihe ndị dị ka ekwentị aga n’Ịntanet. Ka chi na-eji, na-abọ, a na-enwekwu ndị ji ekwentị na-aga n’Ịntanet. Ọ bụ n’Afrịka ka ndị mmadụ kacha eji ekwentị aga  n’Ịntanet. Ihe karịrị nde mmadụ iri itoolu n’Afrịka na-eji ekwentị aga n’Ịntanet. Ịntanet bụ ihe ọtụtụ mmadụ jizi na-enweta ozi.

20 Ndịàmà Jehova malitere iji Ịntanet arụ ọrụ n’afọ 1997. Anyị nwere ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet a na-akpọ jw.org. N’afọ 2013, e nwere jw.org a n’ihe dị ka narị asụsụ atọ. E nwekwara ike isi ebe ahụ danloduo ihe n’ihe karịrị narị asụsụ ise na iri abụọ. N’ụbọchị ọ bụla, ihe karịrị narị puku mmadụ asaa na puku iri ise na-aga na ya. N’ọnwa ọ bụla kwa, a na-enwe ndị na-aga na ya ele vidio anyị, nweekwa ndị na-adanlodu ihe karịrị nde akwụkwọ atọ, nakwa Ụlọ Nche na Teta! dị nde anọ. Ha na-agakwa ebe ahụ adanlodu ihe ndị a na-egere egere dị nde iri abụọ na abụọ.

21. Olee ihe ị mụtara n’ihe a kọrọ banyere otu nwoke aha ya bụ Sina?

21 Ịntanet bụ otu n’ime ụzọ anyị sizi na-ezi ozi ọma Alaeze Chineke. Anyị jidị ya na-ezi ozi ọma n’obodo ebe a machiri anyị izi ozi ọma. Dị ka ihe atụ, ná mmalite afọ 2013, otu nwoke aha ya bụ Sina gara na jw.org gụtụ ihe ụfọdụ dị na ya. Mgbe ọ gụchara ya, ọ kpọrọ isi ụlọ ọrụ anyị dị n’Amerịka ka ha nyere ya aka ịghọtakwu Baịbụl. Olee ihe mere ihe a nwoke a mere ji pụọ iche? Otu ihe bụ na nwoke a bụ onye Alakụba. O bikwa n’ime ime obodo dị ná mba a machiri Ndịàmà Jehova izi ozi ọma. Mgbe ọ kpọchara isi ụlọ ọrụ anyị, a gwara otu nwanna nọ n’Amerịka ka ya na nwoke a na-amụ Baịbụl ugboro abụọ n’izu. Nwanna a na nwoke a na-amụ ihe n’Ịntanet, ha na-ahụkwa ibe ha n’Ịntanet mgbe ha na-amụ ihe.

Ịkụziri Ndị Mmadụ Ihe

22, 23. (a) Ụzọ dị iche iche anyị sirila zisaara ìgwè mmadụ ozi ọma, hà anọchiela ozi ụlọ n’ụlọ anyị na-aga? (b) Olee ihe gosiri na Eze Alaeze Chineke agọziela ozi ọma anyị na-ezisa?

22 Anyị ejirila akwụkwọ akụkọ na “Foto Ihe Nkiri nke Okike” zie ọtụtụ ndị ozi ọma. Anyị ejirikwala redio na Ịntanet zie ọtụtụ ndị ozi ọma. Ma o nweghị nke ọ bụla n’ime ha anyị chọrọ iji do chie anya ozi ụlọ n’ụlọ anyị na-aga. Maka gịnị? Maka na anyị na-eme ka Jizọs. Ọ bụ eziokwu na o nwere oge ndị o ziri ìgwè mmadụ ozi ọma, ọ na-akachara ya mma ịkụziri ndị mmadụ ihe n’otu n’otu. (Luk 19:1-5) Jizọs kụzikwaara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-eme otú ahụ. Ọ gwakwara ha ihe ha ga na-ekwusa. (Gụọ Luk 10:1, 8-11.) N’isi isii n’akwụkwọ a, anyị kwuru na kemgbe ụwa, ndị na-edu ndú ná nzukọ Jehova na-agwa Onye Kraịst ọ bụla ka ọ na-agakwuru ndị mmadụ n’otu n’otu na-ezi ha ozi ọma.—Ọrụ 5:42; 20:20.

23 Ihe a bụ otu narị afọ Alaeze Chineke malitere ịchị, e nweekwala ihe karịrị nde ndị nkwusa asaa na narị puku itoolu ndị na-akọrọ ndị ọzọ ihe Chineke zubere maka ụwa na ụmụ mmadụ. O doro anya na Eze Alaeze Chineke agọziela ụzọ niile anyị si na-akpọsa Alaeze Chineke. N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-eleba anya n’otú Eze nke Alaeze Chineke sirila nye anyị ihe ndị anyị ji na-agbasa ozi ọma ná mba niile, n’ebo niile, nakwa n’asụsụ niile.—Mkpu. 14:6.

^ para. 17 N’afọ 1957, ndị na-edu ndú ná nzukọ Jehova mechiri ụlọ ọrụ redio WBBR nke fọrọ afọ na Niu Yọk.

GỤKWUO GBASARA YA

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ)

Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi “Azaghachi Onye Ọ Bụla”?

Ọ bụrụ na mmadụ ajụọ anyị ajụjụ siri ike, olee otú anyị ga-esi mee ka ọ tụgharịa uche n’ihe Baịbụl kwuru? Tụlee ụzọ atọ anyị nwere ike isi zaa onye ahụ ihe ga-eru ya n’obi.