Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!

 ISI NKE 12

Ndị A Haziri Ijere “Chineke nke Udo” Ozi

Ndị A Haziri Ijere “Chineke nke Udo” Ozi

IHE ISIOKWU A NA-EKWU

Jehova ji nwayọọ nwayọọ na-ahazi ndị ya

1, 2. Olee mgbanwe e mere n’Ụlọ Nche malite na nke January 1895? Oleekwa otú obi dị ụmụnna mgbe ha hụrụ ya?

E NWERE otu Onye Mmụta Baịbụl aha ya bụ John A. Bohnet. Obi tọrọ ya ụtọ mgbe o nwetara Ụlọ Nche Bekee nke January 1895. Ihe mere obi ji tọọ ya ụtọ bụ ihe ọhụrụ e sere n’ihu Ụlọ Nche a. Ụlọ a e sere toro ogologo, ọkụ na-achakwa n’elu ya. A rụrụ ya na mmiri oké ifufe na-efegharị. Ndị na-akwọ ụgbọ mmiri na-eji ọkụ ahụ ọ na-acha na-ama ebe ha nọ n’abalị. Ihe e dere n’Ụlọ Nche ahụ iji gosi na a gbanweela otú ọ na-adị bụ “Otú Ihu Ụlọ Nche Anyị Ga-adịzi.”

2 N’ihi otú ihe a Nwanna Bohnet hụrụ si tọọ ya ụtọ, o degaara Nwanna Russell akwụkwọ. O dere, sị: “Obi dị m ụtọ na Ụlọ Nche anyị amaala ezigbo mma.” Otu Onye Mmụta Baịbụl n’oge ahụ aha ya bụ John H. Brown detakwara akwụkwọ gbasara otú ihu Ụlọ Nche dịzi. O dere, sị: “Ụlọ a e sere n’ihu ya amaka. Ntọala ụlọ a bụ a kwaa akwụrụ. O nweghị ihe ebili mmiri na oké ifufe na-eme ya.” Ihu Ụlọ Nche a a gbanwere bụ ihe mbụ a gbanwere n’afọ 1895. Ma, e nwere ihe ọzọ gbara ọkpụrụkpụ a gbanwere ná nzukọ Jehova n’ọnwa Nọvemba afọ ahụ. Ihe mere e ji mee mgbanwe a bụ maka otu nsogbu malitere ịkpa ọgbakọ Ndị Kraịst aka ọjọọ. E nwere ike iji nsogbu a tụnyere ebili mmiri.

3, 4. Olee nsogbu e kwuru okwu ya n’Ụlọ Nche Bekee nke November 15, 1895? Oleekwa ihe e kwuru n’Ụlọ Nche ahụ na a ga-ebido mewe iji dozie nsogbu ahụ?

3 Otu isiokwu gbara n’Ụlọ Nche Bekee nke November 15, 1895, gbara nsogbu a n’anwụ. Nsogbu a mere ka Ndị Mmụta Baịbụl ghara ịdị n’otu. Ụmụnna na-esekarị okwu banyere onye ga-abụ onyeisi n’ọgbakọ. E nwere ihe nzukọ a mere iji nyere ụmụnna aka ka ha kwụsị okwu a ha na-ese. N’isiokwu ahụ gbara n’Ụlọ Nche, ha ji nzukọ a tụnyere ụgbọ mmiri. E kwuru hoo haa na ndị na-edu ndú n’ọgbakọ enyebereghị ụmụnna aka ka ha kwụsie ike n’ọgbakọ mgbe nsogbu yiri oké ifufe bịaara ha. Olee otú e nwere ike isi mee ka ụmụnna kwụsie ike?

4 A kọwakwara n’isiokwu ahụ na onyeisi ụgbọ ma ọrụ ya nke ọma na-ahụ na ya na ndị nwere ike ịgụpụta onye mmiri na-eri so. Ọ na-ahụkwa na ndị a ha na ya so ga-enyere ya aka ịhụ na o nweghị ihe ga-eme ndị ha bu n’ụgbọ mmiri ahụ mgbe oké ifufe fewere. Otú ahụkwa ka ndị na-edu ndú n’ọgbakọ dị iche  iche kwesịrị ịna-eme. Ha kwesịrị ịhụ na ha nyeere ụmụnna niile nọ n’ọgbakọ aka ka ha kwụsie ike n’agbanyeghị nsogbu ndị tara akpụ nwere ike ịbịara ha. N’ihi ya, Ụlọ Nche ahụ kwuru ihe ọhụrụ a ga-ebido mewe ozugbo n’ọgbakọ. E kwuru na a ga-amalite “họpụtawa ndị okenye n’ọgbakọ ọ bụla ka ha ‘na-azụ ọgbakọ Chineke dị ka atụrụ.’”Ọrụ 20:28.

5. (a) Olee uru ndị okenye a malitere ịhọpụta n’ọgbakọ baara ọgbakọ? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-eleba anya na ha n’isiokwu a?

5 Ndị okenye a malitere ịhọpụta n’oge ahụ nyeere ụmụnna aka ịkwụsi ike n’ọgbakọ. Ha mere ka okwukwe ụmụnna bụrụ a kwaa akwụrụ mgbe ọnwụnwa bịaara ha n’oge a na-alụ Agha Ụwa Mbụ. Ihe ndị ọzọ a gbanwere ná nzukọ Jehova ka ọtụtụ afọ gachara nyeere ụmụnna anyị aka ife Jehova nke ọma. Olee amụma dị na Baịbụl kwuru banyere mgbanwe a? Kemgbe ị nọ n’ọgbakọ, olee ihe ndị ị hụrụ a gbanwerela? Olee uru ihe ndị ahụ a gbanwere baara gị?

“M Ga-eme Ka Udo Bụrụ Onye Nlekọta Gị”

6, 7. (a) Gịnị ka ihe e kwuru n’Aịzaya 60:17 pụtara? (b) Gịnị ka Jehova bu n’obi mgbe o kwuru banyere “onye nlekọta gị” na “onye na-ekenye gị ọrụ”?

6 N’isi nke itoolu n’akwụkwọ a, anyị kwuru na Aịzaya buru amụma na Jehova ga-eme ka ndị ya dị ọtụtụ. (Aịza. 60:22) Ma, Jehova kwedịrị nkwa na ya ga-eme ihe karịrị nke ahụ. N’amụma ahụ Aịzaya buru, Jehova kwuru, sị: “M ga-eweta ọlaedo jiri ya dochie ọla kọpa, m ga-ewetakwa ọlaọcha jiri ya dochie ígwè, were ọla kọpa dochie osisi, werekwa ígwè dochie nkume; m ga-eme ka udo bụrụ onye nlekọta gị, meekwa ka ezi omume bụrụ onye na-ekenye gị ọrụ.” (Aịza. 60:17) Gịnị ka ihe a Jehova kwuru pụtara? Olee otú o si gbasa anyị taa?

Ihe Jehova ga-eme abụghị iji ihe dị mma dochie ihe dị njọ, kama, ọ bụ ime ka ihe dị mma kakwuo mma

7 N’amụma a Aịzaya buru, Jehova kwuru na ya ga-eji otu ihe dochie ibe ya. Ma, ị̀ chọpụtara na ihe Jehova ga-eme abụghị iji ihe dị mma dochie ihe dị njọ, kama, ọ bụ ime ka ihe dị mma kakwuo mma? Dị ka ihe atụ, o kwuru na ya ga-eji ọlaedo dochie ọla kọpa. Ọla kọpa a dị mma, ma ọlaedo ka ya mma. Ọ bụ ya mere e ji jiri ọlaedo dochie ọla kọpa. Jehova ji ihe atụ a gosi na a ga-eji nwayọọ nwayọọ na-eme ka ihe kakwuo mma ná nzukọ ya. N’amụma ahụ Aịzaya buru, olee ihe Jehova bu n’obi ime ka ọ ka mma? Jehova kwuru banyere “onye nlekọta gị” na “onye na-ekenye gị ọrụ.” Ihe Jehova na-ekwu bụ na a ga-eji nwayọọ nwayọọ mee ka otú e si elekọta ndị ya na otú e si ahazi ha ka mma.

8. (a) Ònye mere ka ihe na-aka mma ná nzukọ Jehova? (b) Olee uru ihe ndị ahụ e mere ka ha na-aka mma na-abara anyị? (Gụọkwa ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “ Ọ Nabatara Ndụmọdụ E Nyere Ya n’Ihi Na Ọ Dị Umeala n’Obi.”)

8 Ònye ga-eme ka ihe ka mma ná nzukọ Jehova? Jehova kwuru, sị: “M ga-eweta ọlaedo,” “m ga-ewetakwa ọlaọcha.” O kwukwara, sị: “M ga-eme ka udo bụrụ onye nlekọta gị.” O doro anya na ọ bụ Jehova n’onwe ya na-eme ka ihe na-aka mma ná nzukọ ya, ọ bụghị mmadụ nkịtị. Kemgbe e chichara Jizọs Eze, Jehova si n’aka ya na-emezikwu ihe ná nzukọ ya. Olee uru ihe ndị a a gbanwere baara anyị? E kwuru n’amaokwu Baịbụl ahụ na ihe ndị a a gbanwere ga-eme ka e nwee “udo” na “ezi omume.” Udo na-adị n’etiti anyị ma ọ bụrụ na anyị ekwe ka Chineke na-eduzi anyị, anyị ana-agbanwekwa otú  anyị si akpa àgwà. Ọ bụrụkwa na anyị na-eme ezi omume, anyị ga na-efe Jehova, onye Pọl onyeozi kpọrọ “Chineke nke udo.”Fil. 4:9.

9. Gịnị bụ isi sekpụ ntị na-eme ka ọgbakọ dịrị n’otu, ihe niile a na-agakwa otú o kwesịrị? Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

9 Pọl dekwara banyere Jehova, sị: “Chineke abụghị Chineke nke aghara, kama nke udo.” (1 Kọr. 14:33) Ị̀ chọpụtara na Pọl ekwughị ebe a na Chineke bụ Chineke na-ahazi ihe ahazi, kama ọ kpọrọ ya Chineke nke udo? Gịnị mere o ji ghara ịkpọ ya Chineke na-ahazi ihe ahazi? Otu ihe bụ na ọ bụghị ebe niile a haziri ihe ahazi ka udo na-adị. Dị ka ihe atụ, a na-ahazi ndị agha ahazi mgbe ha na-aga agha. Ha na-akwụ n’ahịrị na-aga. Ma, ihe mere e ji ahazi ha bụ maka agha, ọ bụghị maka udo. N’ihi ya, o nwere ihe anyịnwa bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị iburu n’obi mgbe niile. Ihe ọ bụla a haziri ahazi nke na-abụghị maka udo ga-emecha ghasasịa. Ma, ihe ọ bụla Chineke haziri iji mee ka udo dịrị emekataghị ghasasịa. N’ihi ya, obi dị anyị ụtọ na ọ bụ “Chineke onye na-enye udo” na-eduzi nzukọ a anyị nọ n’ime ya, na-emekwa ka ọ na-aka mma. (Rom 15:33) Ọ bụ udo Chineke na-enye anyị na-eme ka ihe ndị a na-ahazi ná nzukọ ya na-aga nke ọma, ọ bụkwa ya na-eme ka anyị dịrị n’otu n’ụwa niile.Ọma 29:11.

10. (a) Olee ihe ndị a gbanwerela ná nzukọ Jehova n’oge ndị gara aga? (Gụọ ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “ Otú E Si Mee Ka A Na-elekọta Ọgbakọ nke Ọma.”) (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-eleba anya na ha ugbu a?

10 N’igbe isiokwu ya bụ “ Otú E Si Mee Ka A Na-elekọta Ọgbakọ nke Ọma,” e kwuru ihe ndị a gbanwerela ná nzukọ a n’oge ndị gara aga nakwa uru ndị ha baarala anyị. Ma, gịnị na gịnị ka Jehova si n’aka Eze anyị gbanwee ná nso nso a, nke e nwere ike iji tụnyere ‘iji ọlaedo dochie ọla kọpa’? Olee otú ihe ndị a a gbanwerela n’otú e si elekọta ọgbakọ si mee ka udo na-achị ná nzukọ Jehova, anyị adịrịkwa n’otu? Oleekwa otú ihe ndị a si nyere gị aka ịna-efe “Chineke nke udo”?

Otú Kraịst Si Edu Ọgbakọ Ya

11. (a) Olee ihe a gbanwere mgbe òtù na-achị isi lebachara anya na Baịbụl? (b) Olee ihe òtù na-achị isi kpebisiri ike ime?

11 E nwere ihe òtù na-achị isi mere n’agbata afọ 1964 na afọ 1971. Ha sara anya na mmiri mụọ Baịbụl iji chọpụta otú e si hazie ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge ndịozi. * Ha chọpụtara na n’ọgbakọ dị iche iche n’oge ahụ, e nwere ndị okenye na-elekọta ya, ọ bụghị naanị otu okenye. (Gụọ Ndị Filipaị 1:1; 1 Timoti 4:14.) Mgbe ha ghọtachara ihe a, ha ghọtakwara na Jizọs bụ́ Eze anyị chọrọ ka ha gbanwee otú e si na-elekọta ọgbakọ ndị Chineke. Ha kpebisikwara ike irubere Eze anyị isi. N’ihi ya, ha bidoro ozugbo ịhọpụta ndị okenye n’ọgbakọ dị iche iche ka ha na-elekọta ọgbakọ otú Akwụkwọ Nsọ kwuru ka e si na-eme ya. Ma, olee ihe ụfọdụ a gbanwere n’agbata afọ 1971 na afọ 1975?

12. (a) Olee mgbanwe e mere gbasara òtù na-achị isi? (b) Kwuo otú e si hazie Òtù Na-achị Isi ugbu a. (Gụọ ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “ Otú Òtù Na-achị Isi Si Na-elekọta Ihe Niile Gbasara Ndị Chineke n’Ụwa.”)

12 Ihe nke mbụ a gbanwere gbasara òtù na-achị isi. Tupu afọ 1971, ọ bụ ụmụnna asaa e tere mmanụ na-eduzi ụlọ ọrụ anyị bụ́ Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania. Ma, n’afọ 1971, ihe gbanwere. A họpụtakwuru mmadụ anọ ka ha soro n’òtù na-achị isi, ha adịrịzie mmadụ iri n’otu. Ọ bụkwa  n’afọ ahụ ka e mere ka a mara ihe dị iche ná ndị na-eduzi ụlọ ọrụ anyị na òtù na-achị isi. Ndị so n’òtù na-achị isi weere na o nweghị onye n’ime ha ka ibe ya. N’ihi ya, ha malitere ịgbanwe onyeisi oche ha kwa afọ. A na-eji usoro mkpụrụ akwụkwọ A, B, CH ahọpụta onye ga-ebu ụzọ abụ onyeisi oche. Dị ka ihe atụ, onye mkpụrụ akwụkwọ aha nna ya malitere na A na-ebu onye nke ya malitere na B ụzọ bụrụ onyeisi oche.

13. (a) Olee otú e si lekọta ọgbakọ n’agbata afọ 1932 na afọ 1972? (b) Gịnị ka Òtù Na-achị Isi mere n’afọ 1972?

13 Ihe nke abụọ a gbanwere gbasara ọgbakọ ọ bụla. Olee otú o si gbasa ọgbakọ ọ bụla? N’agbata afọ 1932 na afọ 1972, ọ bụ naanị otu nwanna nwoke na-ekwu ọtụtụ ihe a na-eme n’ọgbakọ. Ihe a na-akpọ nwanna a ruo n’afọ 1936 bụ onye nduzi ije ozi. E mechakwara kpọwa ya ohu ọgbakọ. Mechazie kpọwa ya onye nlekọta ọgbakọ. Ụmụnna ndị a ji obi ha niile lekọta ọgbakọ Chineke nke ọma. Ọ bụ onye nlekọta ọgbakọ na-ekpebikarị ihe a ga-eme n’ọgbakọ. Ọ naghị ebu ụzọ ajụta ndị okenye ndị ọzọ ha na ya nọ n’ọgbakọ ihe ha chere a ga-eme. Ma, n’afọ 1972, e nwere ihe a na-agaghị echefu echefu Òtù Na-achị Isi gbanwere. Gịnị ka ọ bụ?

14. (a) Olee ihe a malitere ime n’abalị mbụ n’ọnwa iri n’afọ 1972? (b) Olee otú onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ si eme ihe e kwuru ná Ndị Filipaị 2:3?

14 Ọ bụ n’afọ ahụ ka a malitere ịhọpụta ụmụnna nwoke ndị ọzọ ka ha na-elekọta ọgbakọ. Ha ga-eru eru otú Akwụkwọ Nsọ kwuru tupu a họpụta ha. Ọ bụghịzi otu nwanna nwoke na-abụ onye nlekọta ọgbakọ. Kama, ndị okenye niile nọ n’otu ọgbakọ  ga na-elekọta ọgbakọ ha. A malitere ime ihe a n’abalị mbụ n’ọnwa iri n’afọ 1972. N’ọgbakọ ọ bụla, e nwere onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ. Nwanna a anaghị ewere onwe ya na ya ka ndị okenye ndị ọzọ. Kama, ọ na-ewere onwe ya “ka onye ka nta.” (Luk 9:48) O doro anya na ụmụnna ndị a na-abara anyị ezigbo uru n’ihi na ha dị umeala n’obi.Fil. 2:3.

O doro anya na Eze anyị ma ihe. O meela ka ndị ya nwee ndị okenye na-elekọta ha nke ọma mgbe ọ bụla

15. (a) Olee uru inwe ndị okenye na-elekọta ọgbakọ ọ bụla bara? (b) Olee ihe na-egosi na Eze anyị ma ihe?

15 Otú a e si nwee ndị okenye na-elekọta ọgbakọ ọ bụla baara ndị Chineke ezigbo uru. Lee uru atọ ọ baara anyị. Nke mbụ bụ na o mere ka ndị okenye niile mata na Jizọs bụ onyeisi ọgbakọ. (Efe. 5:23) Nke abụọ gbasara ihe e kwuru n’Ilu 11:14. Ọ sịrị: “Ọtụtụ ndị ndụmọdụ na-eme ka e nwee nzọpụta (ma ọ bụ ka ihe gaa nke ọma).” Mgbe ọ bụla e nwere okwu gbasara otú a ga-esi mee ka ọgbakọ na-efe Chineke nke ọma, ndị okenye na-ezukọ. Ha na-eleba anya n’ihe onye ọ bụla n’ime ha chere a ga-eme ka ihe ka mma. Ihe a ha na-eme na-enyere ha aka ime mkpebi dabara n’ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru. (Ilu 27:17) Jehova na-eme ka ihe ndị ahụ ha kpebiri ime gaa nke ọma. Uru nke atọ inwe ọtụtụ ndị okenye bara bụ na ọ na-eme ka ha na-elebara onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ ha anya nke ọma. (Aịza. 60:3-5) Olee otú anyị si mara na e kwesịrị inwe ọtụtụ ndị okenye n’ọgbakọ? Ọ bụ n’ihi otú ọtụtụ ndị si na-abata n’ọgbakọ n’ike n’ike. Dị ka ihe atụ, ọgbakọ e nwere n’ụwa niile n’afọ 1971  karịrị puku iri abụọ na asaa. Ma, n’afọ 2013, ọ dịzi ihe dị ka otu narị puku na puku iri na atọ. O doro anya na Eze anyị ma ihe. O meela ka ndị ya nwee ndị okenye na-elekọta ha nke ọma mgbe ọ bụla.Maị. 5:5.

“Ghọọrọnụ Ìgwè Atụrụ ahụ Ihe Nlereanya”

16. (a) Gịnị bụ ọrụ e nyere ndị okenye? (b) Jizọs gwara Pita, sị: “Na-azụ ụmụ atụrụ m.” Olee otú Ndị Mmụta Baịbụl si were ihe a Jizọs gwara Pita?

16 Ọ dịla anya ndị okenye ma na ha kwesịrị ịna-enyere ụmụnna ha aka ka ha na-efe Chineke nke ọma. (Gụọ Ndị Galeshia 6:10.) Dị ka ihe atụ, otu isiokwu gbara n’Ụlọ Nche n’afọ 1908 lebara anya n’otu ihe Jizọs gwara Pita ka o mee. Ọ gwara ya, sị: “Na-azụ ụmụ atụrụ m.” (Jọn 21:15-17) N’isiokwu ahụ, a gwara ndị okenye, sị: “Anyị kwesịrị iji ọrụ a Nna anyị ukwu nyere anyị kpọrọ ihe, ya bụ, ịzụ atụrụ ya na ilekọta ha nke ọma. Anyị kwesịrị iwere na ọrụ a bụ ùgwù Onyenwe anyị kwanyeere anyị.” Ihe e dere n’Ụlọ Nche n’afọ 1925 mere ka o doo ndị okenye anya na ọrụ a e nyere ha dị ezigbo mkpa. E dere, sị: “Ọ bụ Chineke nwe chọọchị unu na-elekọta, . . . unu ga-aza ya ajụjụ banyere otú unu si lekọta ụmụnna unu.”

17. Olee otú e si nyere ndị okenye aka ịna-elekọta atụrụ Chineke nke ọma?

17 Olee otú nzukọ Jehova si nyere ndị okenye aka ka ha na-azụ atụrụ Jehova nke ọma, nke na e nwere ike ịsị na ọ dị ka iji ‘ọlaọcha dochie ígwè’? Otú ha si mee ya bụ ịkụziri ha ihe. N’afọ 1959, a malitere inwe Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze maka ndị okenye. Otu n’ime ihe a kụziiri ha bụ otú ha ga-esi na-elebara ụmụnna ha anya n’otu n’otu. A gwara ndị okenye ka ha hazie otú ha ga-esi na-aga n’ụlọ ụmụnna agba ha ume. N’ụlọ akwụkwọ ahụ, a gwakwara ha ọtụtụ ụzọ ha ga-esi enyere ụmụnna aka ma ha gaa n’ụlọ ha. N’afọ 1966, e nwere ihe ọhụrụ a malitere ịkụziri ndị okenye n’ụlọ akwụkwọ ha. N’ụlọ akwụkwọ a, e mere ka ha ghọta na ịzụ atụrụ Chineke dị ezigbo mkpa. Olee ihe gbara ọkpụrụkpụ a kụziiri ndị okenye n’ụlọ akwụkwọ a?  Ọ bụ na ha kwesịrị ịhụ atụrụ Chineke n’anya ma na-elekọta ha nke ọma. Ihe ọzọ bụ na ha kwesịrị ịna-elekọta ezinụlọ ha nke ọma ma jiri ịga ozi ọma kpọrọ ihe. Kemgbe afọ ole na ole ugbu a, ndị okenye agaala ụlọ akwụkwọ ha ugboro ugboro. Olee uru ụlọ akwụkwọ ndị a nzukọ Jehova ji na-akụziri ndị okenye ihe baarala ndị Chineke? O meela ka e nwee ọtụtụ puku ndị okenye na-azụ atụrụ Chineke nke ọma.

Ihe a bụ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze e nwere na Filipinz, n’afọ 1966

18. (a) Olee ọrụ gbara ọkpụrụkpụ e nyere ndị okenye? (b) Gịnị mere Jehova na Jizọs ji hụ ndị okenye na-arụsi ọrụ ike n’anya?

18 Jehova si n’aka Eze anyị bụ́ Jizọs họpụta ndị okenye ka ha na-arụrụ ya otu ọrụ gbara ọkpụrụkpụ. Gịnị bụ ọrụ ahụ? Ọ bụ ka ha na-enyere atụrụ Chineke aka ịbụ a kwaa akwụrụ n’oge anyị a kacha taa akpụ. (Efe. 4:11, 12; 2 Tim. 3:1) Jehova na Jizọs hụrụ ndị okenye na-arụsi ọrụ ike n’anya, n’ihi na ndị okenye a na-eme otu ihe Akwụkwọ Nsọ gwara ha. A gwara ha, sị: “Na-azụnụ ìgwè atụrụ Chineke nke unu na-elekọta, . . . jirinụ obi unu na-azụ ha . . . , n’ịnụ ọkụ n’obi . . . , ghọọrọnụ ìgwè atụrụ ahụ ihe nlereanya.” (1 Pita 5:2, 3) E nwere ọtụtụ ụzọ ndị okenye si aghọrọ ìgwè atụrụ ahụ ihe nlereanya nke na-eme ka udo dịrị n’ọgbakọ, na-emekwa ka obi na-atọ ụmụnna ụtọ. Ka anyị leba anya n’abụọ n’ime ha.

Otú Ndị Okenye Si Azụ Atụrụ Chineke n’Oge Anyị A

19. Olee otú obi na-adị anyị ma anyị na ndị okenye rụọ n’ozi ọma?

19 Nke mbụ bụ na ndị okenye na-eso ndị nọ n’ọgbakọ emekọ ihe. E nwere otu ihe Luk dere banyere otú Jizọs si jee ozi ya. O dere, sị: “Ọ nọ na-aga site n’obodo ukwu ruo n’obodo ukwu, sitekwa n’obodo nta ruo n’obodo nta, na-ekwusa ma na-ezisa ozi ọma alaeze Chineke. Mmadụ iri na abụọ ahụ sokwa ya.” (Luk 8:1) Ndị okenye ndị ji ọrụ ha kpọrọ ihe na ụmụnna ha na-eso aga ozi ọma, otú ahụ Jizọs na ndịozi ya sokwa gaa ozi ọma. Ndị okenye ma na ime otú a na-eme ka ọgbakọ dịrị n’otu. Olee otú obi na-adị ụmụnna ma ha na ndị okenye na-eso aga ozi  ọma? Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Jeannine kwuru otú obi na-adị ya. Nwanna nwaanyị a dị ihe dị ka afọ iri asatọ na itoolu. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na mụ na onye okenye arụọ n’ozi ọma, ọ na-eme ka mụ na ya kwurịta okwu nke ọma, meekwa ka m matakwuo ya.” Nwanna ọzọ aha ya bụ Steven kwukwara otú obi na-adị ya. Ọ dị ihe dị ka afọ iri atọ na ise. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na mụ na onye okenye arụọ n’ozi ọma, m na ewere ya na ọ chọrọ inyere m aka. Obi na-atọ m ụtọ ma mụ na ya rụchaa.”

Ndị okenye na-agbasi mbọ ike ka ha chọta ndị kpafuru akpafu ma nyere ha aka ịlọghachi n’ọgbakọ, otú ahụ ndị ọzụzụ atụrụ si eme ma atụrụ ha fuo

20, 21. Olee otú ndị okenye nwere ike isi ṅomie onye ọzụzụ atụrụ ahụ Jizọs ji mee ihe atụ? Kwuo otú ndị okenye si mee ihe a onye ọzụzụ atụrụ ahụ mere. (Gụọkwa ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “ Ọgịga Ọ Na-aga na nke Ha Kwa Izu Nyeere Ha Aka.”)

20 Ihe nke abụọ bụ na nzukọ Jehova azụọla ndị okenye ka ihe banyere ndị kpafuru akpafu na-emetụ ha n’obi. (Hib. 12:12) Gịnị mere ndị okenye ga-eji nyere ndị a aka? Oleekwa otú ndị okenye ga-esi nyere ha aka? Ihe atụ Jizọs ji onye ọzụzụ atụrụ na atụrụ furu efu mee ga-enyere anyị aka n’okwu a. (Gụọ Luk 15:4-7.) Jizọs kwuru na mgbe onye ọzụzụ atụrụ ahụ chọpụtara na otu atụrụ ya efuola, ọ chọwara ya ka à ga-asị na ọ bụ naanị ya ka o nwere. Olee otú ndị okenye anyị ga-esi eme ihe a onye ọzụzụ atụrụ a mere? Ihe ga-enyere ha aka bụ iwere ndị a kpafuru akpafu otú onye ọzụzụ atụrụ ahụ si were atụrụ ahụ furu efu. Onye ọzụzụ atụrụ ahụ weere atụrụ ahụ ka ihe ka dị oké ọnụ ahịa. Ndị okenye kwesịkwara iwere ndị kpafuru akpafu ka ndị ka dị oké ọnụ ahịa. Ndị okenye ekwesịghị iwere na ịga chọwa ha bụ igbu oge. Ihe ọzọkwa onye ọzụzụ atụrụ ahụ mere bụ na ọ gara ‘chọwa atụrụ ahụ furu efu ruo mgbe ọ chọtara ya.’ Ihe a ka ndị okenye kwesịkwara ime. Ha kwesịrị ịga chọọ ndị ahụ kpafuru akpafu ma nyere ha aka ka ha lọghachi n’ọgbakọ.

21 Olee ihe onye ọzụzụ atụrụ ahụ mere mgbe ọ chọtara atụrụ ahụ furu efu? O ji nwayọọ kuru ya, ‘kukwasị ya n’ubu ya,’ ma gawa ebe atụrụ ndị ọzọ nọ. Ihe a ka ndị okenye kwesịkwara ịna-eme. Ọ bụrụ na ha agwa ndị ahụ kpafuru akpafu okwu ga-eru ha n’obi na okwu gosiri na ha hụrụ ha n’anya, o nwere ike ime ka obi ruo ndị a kpafuru akpafu ala, nyekwara ha aka ịlọghachi n’ọgbakọ. Ụdị ihe a mere otu nwanna onye Afrịka aha ya bụ Victor. O nwere mgbe nwanna a kwụsịrị ịbịa ọmụmụ ihe. O kwuru, sị: “A kwụsịrị m ịbịa ọmụmụ ihe na ịga ozi ọma ruo afọ asatọ. N’oge a niile, ndị okenye nọ na-abịa enyere m aka.” Ị̀ ma ihe kacha ruo nwanna a n’obi? O kwuru, sị: “E nwere otu okenye mụ na ya gakọrọ Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ. Aha ya bụ John. Otu ụbọchị, ọ bịara n’ụlọ m. Mgbe mụ na ya nọ na-ekwurịta, o gosiri m foto ndị mụ na ya sere n’ụlọ akwụkwọ ahụ. Mgbe m lechara ha, ha chetaara m ọtụtụ ihe ndị m chefuru echefu. O mere ka m chọwa otú m ga-esi nwee ụdị obi ụtọ m na-enwe mgbe m ka na-efe Jehova.” Obere oge Nwanna John bịachara na nke Victor, Victor lọghachiri n’ọgbakọ. Nwanna Victor mechakwara bụrụ onye ọsụ ụzọ ọzọ. O doro anya na ndị okenye ndị na-elekọta anyị otú Jehova chọrọ, na-eme ka obi na-atọ anyị ụtọ.2 Kọr. 1:24. *

 Ilekọta Ụmụnna nke Ọma Na-eme Ka Ọgbakọ Dịrị n’Otu

22. Olee otú ezi omume na udo si mee ka Ndị Kraịst na-adị n’otu n’ọgbakọ ha? (Gụọkwa ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “ Ihe A Merenụ Juru Anyị Anya.”)

22 Ná mmalite isiokwu a, anyị kwuru na Jehova sị na ya ga-eji nwayọọ nwayọọ mee ka ndị ya nwee udo ma na-eme ezi omume. (Aịza. 60:17) Ma udo ma ezi omume na-eme ka ọgbakọ dịrị nnọọ n’otu. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? A bịa n’ihe gbasara ezi omume, Baịbụl kwuru na “Chineke anyị bụ otu Jehova.” (Diut. 6:4) Iwu ya bụ otu ebe niile. Iwu o nyere otu ọgbakọ, ka ọ na-enyekwa ọgbakọ ọzọ. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ihe ọ kpọrọ ihe ọma na ihe ọ kpọrọ ihe ọjọọ. “N’ọgbakọ niile nke ndị nsọ,” ihe ọma bụ ihe ọma, ihe ọjọọ bụkwa ihe ọjọọ. (1 Kọr. 14:33) Ọ bụrụ na ọgbakọ ana-eme ihe Chineke sịrị ka anyị na-eme, ọgbakọ ahụ ga na-eme nke ọma. A bịakwa n’ihe gbasara udo, Eze anyị chọrọ ka udo dịrị n’ọgbakọ anyị, chọọkwa ka anyị “na-eme udo.” (Mat. 5:9) N’ihi ya, anyị kwesịrị ‘ịna-achụso ihe ndị na-eweta udo.’ Mgbe ọ bụla anyị na ụmụnna anyị sere okwu, anyị kwesịrị ime ka anyị na ha kpezie. (Rom 14:19) Anyị na-eme otú ahụ, anyị so na-eme ka udo na-adị n’ọgbakọ anyị, sorokwa na-eme ka ọgbakọ anyị dịrị n’otu.Aịza. 60:18.

23. Olee uru anyị na-erite taa n’ọgbakọ?

23 Ọ bụ n’Ụlọ Nche Bekee nke November 1895 ka e bu ụzọ kwuo gbasara ịna-ahọpụta ndị okenye n’ọgbakọ. Ụmụnna ndị na-ahazi ọrụ anyị n’oge ahụ kwuru ihe bụ mkpa ha. Ị̀ ma ihe ọ bụ? Ha nọ na-arịọ Jehova ka o mee ka otú a e sizi na-ahọpụta ndị okenye ka ha na-elekọta ọgbakọ nyere ndị Chineke aka ozugbo ka ha “dịrị n’otu ná nzukọ Jehova.” Kemgbe ọtụtụ afọ, Jehova ji nwayọọ nwayọọ si n’aka Eze anyị na-eme ka a na-elekọta ọgbakọ ya otú ọ chọrọ. Anyị na-ekele ya n’ihi na ihe a o mere emeela ka anyị dịrịkwuo n’otu. (Ọma 99:4) Ọ bụ ya mere ndị Jehova niile taa ji jiri ọṅụ na-ejegharị “n’otu mmụọ ahụ,” “na-ejegharịghịkwa n’otu nzọụkwụ ahụ,” ‘jirikwa otu obi na-efe’ “Chineke nke udo.”2 Kọr. 12:18; gụọ Zefanaya 3:9.

^ para. 11 E bipụtara ihe ndị ahụ ha chọpụtara n’akwụkwọ anyị a na-akpọ Aid to Bible Understanding.

^ para. 21 Gụọ ihe e dere n’isiokwu bụ́ “Ndị Okenye Ọgbakọ Bụ ‘Ndị Ọrụ Ibe Anyị Maka Ọṅụ Anyị.’” Ọ dị n’Ụlọ Nche Jenụwarị 15, 2013.

GỤKWUO GBASARA YA

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ)

Jehova Na-ahazi Ihe Ya Ahazi

Olee otú ihe Baịbụl kọrọ gbasara ụmụ Izrel na Ndị Kraịst oge mbụ si gosi na Jehova ga-ahazi ndị ohu ya n’ụwa taa ahazi?

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ)

Na-erubere Ndị Na-azụ Atụrụ Jehova Isi

Ọ bụ mmụọ nsọ họpụtara ndị okenye ka ha na-azụ ọgbakọ Chineke. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-ege ha ntị?

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ)

Anyị Kwesịrị Ịna-emekọ Ihe Ọnụ Ka Ọgwụgwụ Ụwa A Na-eru Nso

Ụfọdụ ndị Baịbụl kọrọ akụkọ ha ga-eme ka anyị ghọta na anyị kwesịrị ịdị n’otu nakwa ihe mere ịdị n’otu ga-eji dịkwuo mkpa n’ọdịnihu.