Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!

 ISI NKE 4

Jehova Na-eme Ka E Too Aha Ya

Jehova Na-eme Ka E Too Aha Ya

IHE ISIOKWU A NA-EKWU

Ndị ohu Chineke na-eme ka ndị mmadụ mara aha Chineke

1, 2. Olee otú Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ si mee ka e too aha Chineke?

N’ỤTỤTỤ Tuzdee, abalị abụọ n’ọnwa Disemba afọ 1947, ụmụnna ole na ole n’ime ndị e tere mmanụ bi na Betel dị na Bruklin, nke dị na Niu Yọk, malitere otu ọrụ dị mkpa. Ọrụ a tara akpụ. Ma, ha rụgidere ya ruo afọ iri na abụọ. Gịnị bụ ọrụ a ha malitere ịrụ? Ọ bụ ịsụgharị Baịbụl. Aha Baịbụl a bụ Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ. Ha sụgharịchara nkebi ikpeazụ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru nke Baịbụl a na Sọnde, abalị iri na atọ n’ọnwa Mach afọ 1960. N’abalị iri na asatọ n’ọnwa Jun afọ 1960, Nwanna Nathan Knorr wepụtaara ndị bịara mgbakọ na Manchesta, dị n’Ingland, nkebi ikpeazụ a. Obi tọrọ ndị niile bịara mgbakọ a ụtọ. Nwanna Knorr gwara ndị niile bịara mgbakọ a, sị: ‘Ụbọchị taa bụ ụbọchị Ndịàmà Jehova nọ n’ụwa niile na-aṅụrị ọṅụ.’ Ma, e nwere otu ihe na-eme obi ụtọ dị na Baịbụl a. Ihe ahụ bụ na aha Chineke juru eju na ya.

Ọ bụ ná mgbakọ e nwere n’afọ 1950 ka e wepụtaara ọhaneze Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Isiokwu mgbakọ ahụ bụ Ịba Ụba Ọchịchị Chineke (Foto dị n’aka ekpe: Ihe a bụ Ámá Egwuregwu Yanki, nke dị na Niu Yọk Siti; foto dị n’aka nri: Gana)

2 Ọtụtụ ndị sụgharịrị Baịbụl edenyeghị aha Chineke na Baịbụl. Setan kpara nkata ka ndị mmadụ ghara ịmata aha Chineke. Ma, ndị ohu Jehova e tere mmanụ emeela ka nkata a kụọ afọ n’ala. N’Okwu Mmalite Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ, ndị sụgharịrị ya dere, sị: “Ihe kasị pụta ìhè ná nsụgharị a bụ mweghachi e weghachiri aha Chineke n’ebe o kwesịrị ịdị n’ihe odide Baịbụl.” Na Baịbụl a, e dere aha Chineke bụ́ Jehova ihe karịrị ugboro puku asaa. O doro anya na Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ mere ka e too aha Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova.

3. (a) Olee ihe ụmụnna anyị ghọtara banyere ihe aha Chineke pụtara? (b) Olee otú anyị kwesịrị isi ghọta ihe e dere n’Ọpụpụ 3:13, 14? (Gụọ ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ “ Ihe Aha Chineke Pụtara.”)

3 Mgbe Ndị Mmụta Baịbụl malitere, ha ghọtara na ihe aha Chineke pụtara bụ “Abụ m ihe m bụ.” (Ọpụ. 3:14, Bible Nsọ nke Union Version) Ọ bụ ya mere e ji dee n’Ụlọ Nche Bekee nke January 1, 1926, sị: “Aha Chineke bụ́ Jehova na-eme ka a mata na e keghị ya eke, . . . O nweghị mmalite, o nweghịkwa ọgwụgwụ.” Ma, tupu ndị sụgharịrị Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ amalite ịsụgharị ya, Jehova emeela ka ndị ohu ya ghọta na ihe aha ya pụtara abụghị naanị na o nweghị mmalite na ọgwụgwụ, kama, na ọ bụ Chineke nke nwere ihe o zubere ime  nakwa na ọ na-arụ ọrụ iji mezuo ihe ndị o zubere. Ha mụtara na aha Chineke bụ́ Jehova pụtara “na ọ na-aghọ ihe ọ bụla ọ chọrọ ịghọ iji mezuo nzube ya.” Ọ ghọrọ Onye okike mgbe o kere eluigwe na ụwa, nakwa ndị mmụọ ozi na ụmụ mmadụ. Ọ ka na-arụkwa ọrụ ka o mezuo ihe ndị o zubere. Ma, gịnị mere anyị ji kwesị ito aha Chineke? Oleekwa otú anyị ga-esi eto ya?

Ido Aha Chineke Nsọ

4, 5. (a) Mgbe anyị na-arịọ Chineke ka o mee ka ‘e doo aha ya nsọ,’ gịnị ka anyị na-arịọ ya ka o mee? (b) Olee otú Chineke ga-esi mee ka e doo aha ya nsọ? Oleekwa mgbe ọ ga-eme ka e doo ya nsọ?

4 Jehova chọrọ ka e too aha ya. Ihe mbụ Chineke chọrọ bụ ka e doo aha ya nsọ. Ido aha Chineke nsọ bụ ihe mbụ Jizọs kpere n’ekpere mgbe ọ na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya otú e si ekpe ekpere. Jizọs sịrị: “Ka e doo aha gị nsọ.” (Mat. 6:9) Mgbe anyị na-ekpe ekpere ka e doo aha Chineke nsọ, olee ihe anyị chọrọ ka Chineke mee?

5 N’isi mbụ nke akwụkwọ a, anyị mụtara na ido aha Chineke nsọ bụ otu n’ime ihe atọ Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe n’ekpere. Ihe atọ a gbasara nzube Jehova. Abụọ ndị nke ọzọ bụ: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa.” (Mat. 6:10) N’ihi ya, otú ahụ anyị si na-arịọ Jehova ka o mee ka Alaeze ya bịa, nakwa ka o mee ka uche ya mee, ka anyị sikwa na-arịọ ya ka o mee ka e doo aha ya nsọ. Ihe anyị na-arịọ Chineke bụ ka o mee ka a kwụsị imebi aha ya a nọ na-emebi kemgbe ahụ Adam na Iv nupụchaara ya isi n’Iden. Jehova ọ̀ ga-azanụ ekpere a? Jehova sịrị: “M ga-edokwa aha ukwu m nsọ, nke a nọ na-emetọ n’etiti mba dị iche iche.” (Ezik. 36:23; 38:23) N’agha Amagedọn, Jehova ga-ebibi ndị niile na-eme ihe ọjọọ, si otú ahụ doo aha ya nsọ n’anya ihe niile o kere eke.

6. Olee otú anyị ga-esi edo aha Chineke nsọ?

6 Kemgbe ụwa, Jehova na-eme ka ndị ohu ya soro mee ka e doo aha ya nsọ. Ma, Aha Chineke dị nsọ kemgbe. Anyị enweghị ike ime ka ọ dịkwuo nsọ. Oleekwanụ otú anyị nwere ike isi mee ka e doo aha Chineke nsọ? Aịzaya sịrị: “Jehova nke ụsụụ ndị agha ka unu ga-emeso dị ka onye dị nsọ.” Jehova kwuru banyere ndị ya, sị: “Ha ga-edo aha m nsọ, . . . , ha ga-atụ egwu Chineke Izrel.” (Aịza. 8:13; 29:23) N’ihi ya, otú anyị si edo aha Chineke nsọ bụ ime ka aha ya dịrị iche n’aha niile, nakwa ime ka a mata na aha ya karịrị aha ọzọ niile. Otú ọzọ anyị si eme ka e doo aha Chineke nsọ bụ irubere Chineke isi, na ime ka ndị ọzọ doo aha ya nsọ. Anyị kwesịrị ikwetasi ike na Jehova bụ Eze anyị ma jiri obi anyị niile na-erubere ya isi. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, ọ na-egosi na anyị na-atụ egwu Chineke ma na-asọpụrụ ya.—Ilu 3:1; Mkpu. 4:11.

Ịza Aha Chineke na Ito Ya

7, 8. (a) Olee ihe mere ndị Chineke ji gbuo oge tupu ha azawa aha Chineke? (b) Olee ihe anyị ga-eleba anya na ha ugbu a?

7 Kemgbe ihe dị ka afọ 1871, ndị ohu Chineke nọ na-ede aha Chineke n’akwụkwọ ha. Dị ka ihe atụ, e dere aha Chineke  bụ́ Jehova n’Ụlọ Nche Bekee nke August 1879, nakwa n’akwụkwọ abụ anyị a na-akpọ Songs of the Bride. E bipụtara akwụkwọ abụ a n’afọ 1879. Ma, o yiri ka tupu Jehova ekwe ka ndị ohu ya niile zawa aha ya a dị nsọ, o nwere ihe ndị dị mkpa ọ chọrọ ka ha mụta. Olee otú Jehova si kwadebe ndị mbụ bụ́ Ndị Mmụta Baịbụl ka ha zawa aha ya?

8 N’ihe dị ka n’agbata afọ 1870 na afọ 1930, anyị ghọtara na Jehova mere ka ndị ya ghọtakwuo ihe ndị dị mkpa gbasara aha ya. Ka anyị leba anya n’atọ n’ime ha.

9, 10. (a) Gịnị mere Ndị Mmụta Baịbụl ji kacha dee gbasara Jizọs n’Ụlọ Nche ndị mbụ? (b) Olee ihe Ndị Mmụta Baịbụl malitere ime si n’afọ 1919 gawa? Oleekwa uru ihe ahụ baara ha? (Gụọkwa ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ “ Otú E Si Too Aha Chineke n’Ụlọ Nche.”)

9 Nke mbụ bụ na ndị Jehova bịara ghọta na aha Chineke dị mkpa. Ndị Mmụta Baịbụl weere na ihe Baịbụl kacha kwuo gbasara ya bụ ihe mgbapụta Chineke haziri ka e nwee. Ọ bụ ihe mere Ụlọ Nche ji na-ekwukarị banyere Jizọs n’oge ahụ. Dị ka ihe atụ, n’ime otu afọ e bidoro bipụtawa Ụlọ Nche, ugboro ole e dere aha Jizọs n’ime ya ji okpukpu iri karịa ugboro ole e dere aha Jehova. Ụlọ Nche Bekee nke March 15, 1976, kwuru na Ndị Mmụta Baịbụl kwuru okwu gbasara Jizọs karịa otú o kwesịrị. Ma, Jehova mechara nyere ha aka ha aghọta na aha Chineke juru eju na Baịbụl. Olee ihe Ndị Mmụta Baịbụl mere mgbe ha ghọtara ihe a? Ụlọ Nche ahụ kwuru na malite n’afọ 1919 gawa, Ndị Mmụta Baịbụl a “bidoro kwanyewere Jehova, bụ́ Nna Mesaya, ùgwù karịa Mesaya.” Malite n’afọ 1919 ruo afọ 1929, e dere aha Chineke n’Ụlọ Nche ihe karịrị ugboro puku isii na narị ise.

10 Otú a ụmụnna anyị ndị a sizi na-ede aha Chineke bụ́ Jehova n’akwụkwọ ha ọtụtụ ugboro, gosiri na ha hụrụ aha Chineke n’anya. Ihe a ha mere gosikwara na ha ejikerela ‘ịkpọsa aha Jehova’ otú ahụ Mozis mere n’oge ochie. (Diut. 32:3; Ọma 34:3) Jehova echefughị ihe a ha mere. N’ihi ya, o meere ha amara otú o kwuru na ya ga-emere ndị hụrụ aha ya n’anya.—Ọma 119:132; Hib. 6:10.

11, 12. (a) Obere oge afọ 1919 gachara, olee ihe mere ụmụnna anyị ji gbanwee ihe ndị ha na-edekarị n’akwụkwọ anyị? (b) Olee ihe Jehova nọ na-eme ka ndị ohu ya mata? Ọ̀ bụkwa maka gịnị?

11 Ihe nke abụọ bụ na ezi Ndị Kraịst bịara ghọta otú ha kwesịrị isi na-arụ ọrụ Chineke nyere ha. Obere oge ka afọ 1919 gachara, ụmụnna anyị e tere mmanụ gbawara mbọ ka ha ghọta ihe amụma Aịzaya na-ekwu. N’ihi ya, ha malitere ikwusi okwu ike n’akwụkwọ anyị banyere izi ozi ọma. Gịnị mere a ga-eji sị na ihe a ha mere bụ ‘nri ha nyere n’oge kwesịrị ekwesị’?—Mat. 24:45.

12 Otu n’ime ihe e kwuru n’amụma Aịzaya ha gbara mbọ ka ha ghọta bụ ihe dị n’Aịzaya 43:10-12. (Gụọ ya.) Jehova kwuru ebe ahụ, sị: “Unu bụ ndị àmà m, . . . ọbụna ohu m nke m họọrọ.” Tupu afọ 1919, e nwebeghị ebe a kọwara amaokwu Baịbụl a nke ọma n’Ụlọ Nche. Ma, obere oge afọ 1919 gachara, a malitere ịkọwakwu ya n’akwụkwọ anyị. A kọwara na ebe ahụ na-agwa ndị e tere mmanụ ka ha na-arụ ọrụ Jehova gwara ha rụọ. Ọrụ ahụ bụ na ha ga-agbara ndị ọzọ àmà banyere Jehova.  Malite n’afọ 1925 ruo n’afọ 1931, e nwere ebe iri ise na asaa a kọwara Aịzaya isi iri anọ na atọ n’Ụlọ Nche dị iche iche. E kwuru n’Ụlọ Nche nke ọ bụla na ihe Aịzaya na-ekwu bụ ihe gbasara ezi Ndị Kraịst. O doro anya na n’afọ ndị ahụ, Jehova nọ na-eme ka ndị ohu ya mata na ha kwesịrị ịrụ ọrụ ahụ ọ gwara ha rụọ. Maka gịnị? Ọ bụ ka ‘o buru ụzọ nwalee ha.’ (1 Tim. 3:10) Tupu Ndị Mmụta Baịbụl azawa aha Chineke, Jehova chọrọ ka ha jiri ọrụ a ọ gwara ha rụọ kpọrọ ihe, si otú ahụ gosi na ha bụ ezigbo ndị àmà ya.—Luk 24:47, 48.

13. Olee otú Akwụkwọ Nsọ si mee ka a ghọta ihe kacha mkpa e kwesirị ime?

13 Nke atọ bụ na ndị Jehova bịara ghọta na e kwesịrị ido aha Chineke nsọ. Malite n’afọ 1921 ruo n’afọ 1929, ha ghọtara na ihe kacha mkpa e kwesịrị ime bụ ịkwụsị aha ọjọọ a na-akpọ Chineke, si otú ahụ doo aha ya nsọ. Olee otú Okwu Chineke si mee ka a ghọta na e kwesịrị ido aha Chineke nsọ? Ka anyị leba anya n’ihe abụọ a kọrọ na Baịbụl. Olee otu ihe gbara ọkpụrụkpụ mere Chineke ji napụta ndị Izrel n’aka ndị Ijipt? Jehova kwuru na ọ bụ ‘iji mee ka a kpọsaa aha ya n’ụwa dum.’ (Ọpụ. 9:16) Oleekwa ihe mere Jehova ji meere ndị Izrel ebere mgbe ahụ ha nupụụrụ ya isi? Ihe ọzọ Jehova kwuru mere ka anyị mata ihe mere o ji meere ha ebere. Ọ sịrị: “M wee mee ihe n’ihi aha m ka a ghara imerụ ya n’anya mba dị iche iche.” (Ezik. 20:8-10) Olee ihe Ndị Mmụta Baịbụl mụtara n’ihe ndị a Jehova kwuru ma n’Ọpụpụ ma n’Ezikiel nakwa n’ebe ndị ọzọ na Baịbụl?

14. (a) Gịnị ka ndị Chineke ghọtara n’agbata afọ 1927 na afọ 1929? (b) Gịnị ka ihe ọhụrụ a kụziiri Ndị Mmụta Baịbụl mere ka ha mee gbasara ikwusa ozi ọma? (Gụọkwa ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ “ Ihe Kacha Mkpa Mere Anyị Ji Ekwusa Ọzi Ọma.”)

14 N’agbata afọ 1927 na afọ 1929, ndị Chineke ghọtara ihe Aịzaya kwuru ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ asaa gara aga. Ihe Aịzaya kwuru bụ gbasara Jehova. Ọ sịrị: “Otú a ka i si duru ndị gị iji meere onwe gị aha mara mma.” (Aịza. 63:14) Ndị Mmụta Baịbụl ghọtara na ihe kacha mkpa bụ ka e doo aha Chineke nsọ, ọ bụghị ka a zọpụta ha. (Aịza. 37:20; Ezik. 38:23) E nwere otu eziokwu dị mkpa e kwuru n’otu n’ime akwụkwọ anyị ndị e bipụtara n’afọ 1929. Aha akwụkwọ ahụ bụ Prophecy. E kwuru n’akwụkwọ a, sị: “Aha Jehova bụ ihe kacha mkpa ma n’eluigwe ma n’ụwa.” Ihe ọhụrụ a a kụziiri ndị Jehova mere ka ha gbasiwe àmà ike banyere Jehova, meekwa ka ụfọdụ ndị kwụsị ikwutọ aha Chineke.

15. (a) N’agbata afọ 1931 na afọ 1933, olee ihe ụmụnna anyị ghọtara? (b) Oleekwa ihe oge ya ruru?

15 N’agbata afọ 1931 na afọ 1933, ụmụnna anyị ghọtara n’eziokwu na aha Chineke dị ezigbo mkpa. Ha ghọtakwara ọrụ Chineke gwara ha rụọ, ghọtakwuokwa ihe kacha mkpa e kwesịrị ime n’eluigwe na n’ụwa. Oge Jehova ga-eme ka ndị ohu ya zawa aha ya eruola. Ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ mere n’oge gara aga. Ọ ga-enyere anyị aka ịma otú Jehova si mee ka ndị ohu ya zawa aha ya.

Jehova Wepụtaara “Aha Ya Otu Ndị”

16. (a) Olee otu ihe dị mkpa Jehova mere iji mee ka e too aha ya? (b) Tupu oge Ndị Kraịst, olee ndị ka Chineke họọrọ ka ha nọchite anya ya n’ụwa?

16 Otu ihe dị mkpa Jehova mere iji mee ka e too aha ya bụ ime ka e nwee ndị ga na-aza aha ya n’ụwa. Malite n’afọ 1513  Tupu Oge Ndị Kraịst, Jehova họọrọ mba Izrel ka ha nọchite anya ya n’ụwa. (Aịza. 43:12) Ma, ha mechara nupụrụ Jehova isi, n’agbanyeghị na ha ṅụụrụ ya iyi na ha agaghị enupụrụ ya isi. Ọ bụ ya mere na n’afọ 33, Chineke jụrụ ha, ha akwụsị ịnọchite anya ya. Obere oge Jehova jụchara ha, o ‘chere ihu ya n’ebe ndị mba ọzọ nọ ma si n’etiti ha wepụtara aha ya otu ndị.’ (Ọrụ 15:14) A malitere ịkpọ ndị a Chineke wepụtaara aha ya “Izrel nke Chineke.” Ha bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ. Ha sikwa ná mba dị iche iche.—Gal. 6:16.

17. Gịnị ka Setan mechara mee ka e nwee?

17 N’ihe dị ka n’afọ 44, ‘e si ná nduzi Chineke gụọ ndị na-eso ụzọ Jizọs aha bụ́ Ndị Kraịst.’ (Ọrụ 11:26) N’oge ahụ, ọ bụ naanị ha na-aza aha a, n’ihi na ọ bụ naanị ha bụ ezigbo Ndị  Kraịst. (1 Pita 4:16) Ma, o nwere otu ihe atụ Jizọs ji ọka wit na ata mee nke kwuru na Setan ga-akụ ata n’ebe a kụrụ ọka wit. Setan mechara kụọ ata ahụ. O mere ka e nwee ọtụtụ chọọchị ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst. Ọ bụ ya mere na ruo ọtụtụ narị afọ, a machaghị ndị bụ́ ezigbo Ndị Kraịst. Ma, ihe gbanwere n’oge ‘owuwe ihe ubi’ n’afọ 1914. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na ndị mmụọ ozi malitere ime ka ezigbo Ndị Kraịst nọrọ iche, Ndị Kraịst adịgboroja anọrọkwa iche.—Mat. 13:30, 39-41.

18. Olee ihe nyeere ụmụnna anyị aka ịghọta na ha kwesịrị ịza aha ọhụrụ?

18 Mgbe Jehova họpụtachara ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi n’afọ 1919, Jehova nyeere ndị ya aka ka ha ghọta na ha kwesịrị ịgbasi mbọ ike na-arụ ọrụ ahụ ọ gwara ha rụọ. Ha ghọtara ozugbo na ozi ọma ha na-ekwusa n’ụlọ n’ụlọ mere ka ndị mmadụ mata na ọ bụ naanị hanwa bụ ezigbo Ndị Kraịst. Obere oge ha ghọtachara ihe a, ha bịara ghọta na “Ndị Mmụta Baịbụl” ha na-aza emechaghị ka ha dịrị iche. Ihe bụ mkpa ha abụchaghị naanị ịmụ Baịbụl, kama, ọ bụ ka ha na-agba àmà banyere Chineke nakwa ka ha na-eme ka a na-asọpụrụ Chineke ma na-eto aha ya. Oleezi aha ga-adaba adaba n’ọrụ a ha na-arụ? A zara ajụjụ a n’afọ 1931.

Akwụkwọ usoro ihe omume mgbakọ e nwere n’afọ 1931

19, 20. (a) Gịnị ka Nwanna Joseph Rutherford gụpụtaara ndị bịara mgbakọ e nwere n’afọ 1931? (b) Gịnị ka ụmụnna anyị mere ha ji gosi na ha kwetara n’ihe ahụ a gụpụtaara ha?

19 N’ọnwa asaa n’afọ 1931, Ndị Mmụta Baịbụl nwere mgbakọ na Kolọmbọs, n’Ohayo dị n’Amerịka. Ihe dị ka puku Ndị Mmụta Baịbụl iri na ise bịara ya. Ma, e nwere mkpụrụ akwụkwọ abụọ gbara okpotokpo e dere n’ihu akwụkwọ usoro ihe omume mgbakọ ahụ. Ọtụtụ ndị bịara mgbakọ ahụ nọ na-ekwu ihe ha chere mkpụrụ akwụkwọ abụọ ahụ pụtara. Ma n’ụbọchị Sọnde, abalị iri abụọ na isii n’ọnwa Julaị, Nwanna Joseph Rutherford gụpụtaara ndị bịara mgbakọ ahụ ihe a chọrọ ka ha kwuo ma hà kwetara. Ọ sịrị: “Si taa gawa, anyị chọrọ ka a na-akpọ anyị Ndịàmà Jehova.” Ọ bụ mgbe ahụ ka ndị niile bịara mgbakọ ahụ ghọtara na mkpụrụ akwụkwọ abụọ ahụ pụtara Ndịàmà Jehova. Aha a si n’Aịzaya 43:10.

20 Mgbe Nwanna Rutherford gụpụtachaara ihe ahụ, ndị niile bịara mgbakọ ahụ kwetara ka a kpọwa anyị Ndịàmà Jehova. Otú ha si gosi na ha kwetara bụ na ha kụrụ ezigbo aka, tiekwa mkpu ọṅụ. Ndị nọ ebe dị iche iche n’ụwa na-ege ihe omume mgbakọ a na redio nụrụ aka ahụ ụmụnna a kụrụ, nụkwa olu ha. Nwanna Ernest Barber na nwunye ya Naomi, bụ́ ndị bi n’Ọstrelia, kwuru otú ihe ahụ si kpọtụ akpọtụ n’ebe ahụ. Ha kwuru, sị: “Mgbe ụmụnna anyị nọ n’Amerịka nọ na-akụ aka, ụmụnna nọ na Melbọn wụliwere elu ma na-akụkwa aka nke ha. Anyị enweghị ike ichefu ihe a merenụ echefu!” *

A Malitere Ito Aha Chineke n’Ụwa Niile

21. Olee ihe aha ọhụrụ a mere ka ụmụnna anyị mee gbasara ikwusa ozi ọma?

21 Ugbu a ndị Chineke malitere ịza Ndịàmà Jehova, bụ́ aha si n’Akwụkwọ Nsọ, ha malitere ijikwu ozi ọma kpọrọ ihe. E nwere otu di na nwunye n’Amerịka gara mgbakọ ahụ  e nwere na Kolọmbọs n’afọ 1931. Ha bụ Nwanna Edward Grimes na nwunye ya Jessie. Ha bụ ndị ọsụ ụzọ n’oge ahụ. Ihe a ka ha kwuru: “Tupu anyị agawa mgbakọ ahụ, anyị na-aza Ndị Mmụta Baịbụl. Ma, ugbu a anyị na-alọta, anyị na-azazi Ndịàmà Jehova. Obi dị anyị ụtọ ugbu a na aha a anyị na-aza na-eme ka anyị na-eto aha Chineke anyị.” Mgbe e nwechara mgbakọ ahụ, e nwere ihe ụfọdụ ụmụnna anyị malitere ịna-eme iji na-eto aha Chineke. Ọ na-abụ ha ruo na nke ndị ha chọrọ izi ozi ọma, ha enye ha kaadị ha dere ihe ga-eme ka ha mata ndị ha bụ. Ihe ha dere na kaadị ahụ bụ: “Abụ M Onyeàmà JEHOVA. Ana m ekwusa ozi ọma Alaeze JEHOVA bụ́ Chineke anyị.” O doro anya na obi dị ụmụnna anyị ndị a ụtọ ịza aha Chineke, bụ́ Jehova. Ha jikwa ya na-eme ọnụ, chọsiekwa ike ịkụziri mmadụ niile ihe aha a pụtara.—Aịza. 12:4.

“Tupu anyị agawa mgbakọ ahụ, anyị na-aza Ndị Mmụta Baịbụl. Ma, ugbu a anyị na-alọta, anyị na-azazi Ndịàmà Jehova”

22. Olee ihe gosiri na ndị Jehova dị ezigbo iche?

22 Ọtụtụ afọ agaala kemgbe ahụ Jehova mere ka ụmụnna anyị e tere mmanụ malite ịza aha ya. Ma Setan ò nweela ike ime ka ndị mmadụ ghara ịma ndị na-aza aha Chineke? Ò meela ka a ghara ịhụ ihe dị iche ná Ndịàmà Jehova na chọọchị dị iche iche dị n’ụwa? Mbanụ. Ka chi na-eji na-abọ, aha a anyị na-aza na-emekwu ka ndị mmadụ mara na anyị bụ́ Ndịàmà Jehova dị iche. (Gụọ Maịka 4:5; Malakaị 3:18.) Nke bụ́ eziokwu bụ na aha Chineke dị anyị n’ọnụ nke na ndị mmadụ na-ajụ onye ọ bụla na-akpụkarị ya n’ọnụ ma ọ̀ bụ Onyeàmà Jehova. Ọ bụ eziokwu na okpukpe ụgha e nwere ike iji tụnyere ugwu juru ebe niile, Jehova emeela ka nzukọ ya ‘guzosie ike n’ebe dị elu karịa ugwu ukwu niile.’ (Aịza. 2:2) N’oge anyị a, a na-eto aha Jehova nke dị nsọ, na-etokwa nzukọ ya.

23. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 121:5, gịnị ka obi siri anyị ike na Jehova ga-emere anyị?

23 Obi siri anyị ike na Jehova ga-echebe anyị ka Satan ghara imebi okwukwe anyị ma ugbu a ma n’ọdịnihu. (Ọma 121:5) Anyị kwenyesiri ike na ihe otu ọbụ abụ kwuru bụ eziokwu. O kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị mba nke Jehova bụ Chineke ya, bụ́ ndị ọ họọrọ ịbụ ihe nketa ya.”—Ọma 33:12.

^ para. 20 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu otú e si jiri redio gbasaa ozi ọma n’oge ahụ, gụọ isi nke asaa n’akwụkwọ a, peeji nke 72 ruo nke 74.