Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!

 ISI NKE 5

Eze Alaeze Chineke Emeela Ka A Ghọtakwuo Ihe Gbasara Alaeze Ahụ

Eze Alaeze Chineke Emeela Ka A Ghọtakwuo Ihe Gbasara Alaeze Ahụ

IHE ISIOKWU A NA-EKWU

Ndị Chineke bịara ghọtakwuo ihe Baịbụl kwuru banyere Alaeze Chineke, ndị ga-achị na ya, ndị ọ ga-achị na otú ha ga-esi na-akwado Alaeze Chineke

1, 2. Olee otú Jizọs si bụrụ onye ndú ma ihe?

KA E were ya na gị na ndị enyi gị chọrọ ịga otu obodo mara ezigbo mma, ma unu amaghị obodo ahụ. Ma, e nwere otu nwoke ma obodo ahụ nke ọma kwetara idu unu gaa. Ka o du unu na-aga, unu ga na-ekwere ihe ọ bụla ọ gwara unu. Mgbe ụfọdụ, gị na ndị enyi gị nwere ike ịna-ekwurịta otú unu chere obodo ahụ dị. Ka unu nọ na-ekwurịta ihe ndị ahụ, unu ajụọ onye ahụ du unu ajụjụ, ya asị unu cheregodị. Ma, mgbe unu ruwara obodo ahụ ma hụwa ihe ụfọdụ dị na ya, ya amalite ịkọrọ unu gbasara ihe ụfọdụ ahụ unu hụrụ. Ka o du unu na-aga, ọ bịara dokwuo unu anya na nwoke a ma ihe n’ihi na mgbe ọ na-akọwara unu ihe bụ mgbe ọ ma na unu ga-aghọta ya.

2 E nwere ike iji ezi Ndị Kraịst tụnyere gị na ndị enyi gị ahụ na-aga obodo unu na-amaghị. Ndị Kraịst na-atụ anya otu obodo mara ezigbo mma. Obodo ahụ “nwere ezi ntọala.” Ọ bụ Alaeze Chineke. (Hib. 11:10) Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ bụ ya bụ onye ndú ndị na-eso ụzọ ya. O mere ka ha ghọtakwuo ihe gbasara Alaeze Chineke. Ọ̀ zara ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ niile ha jụrụ ya ma gwa ha ihe niile banyere Alaeze Chineke n’otu mgbe? Mbanụ. Ọ gwara ha, sị: “M ka nwere ọtụtụ ihe m ga-agwa unu, ma unu apụghị ịghọta ha ugbu a.” (Jọn 16:12) Jizọs ma ihe karịa ndị niile ọzọ na-edu ndú n’ụwa a. Ọ gwaghị ndị na-eso ụzọ ya ihe ọ ma na ha agaghị aghọtali mgbe ahụ.

3, 4. (a) Olee otú Jizọs si na-akụziri ezigbo ndị na-eso ụzọ ya ihe gbasara Alaeze Chineke? (b) Olee ihe ndị anyị ga-eleba anya na ha n’isiokwu a?

3 Jizọs kwuru ihe ahụ e dere na Jọn 16:12 n’abalị ikpeazụ tupu e gbuo ya. Mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ, olee otú ọ ga-esi na-akụziri ezigbo ndị na-eso ụzọ ya ihe banyere Alaeze Chineke? Ọ gwara ndịozi ya, sị: “Mmụọ nke eziokwu ahụ . . . ga-eduzi unu wee nyere unu aka ịghọta eziokwu niile.” * (Jọn 16:13) Anyị nwere ike ikwu na mmụọ nsọ bụ ihe Jizọs ji na-ezi anyị ihe nwayọọ nwayọọ. O ji ya na-akụziri anyị ihe ọ bụla anyị kwesịrị ịma gbasara Alaeze Chineke. Ọ na-akụziri anyị ihe ndị ahụ mgbe ọ ma na anyị ga-aghọtali ha.

4 Ka anyị leba anya n’otú Jehova sirila jiri mmụọ nsọ ya na-edu ezigbo Ndị Kraịst ka ha nwee ike ịghọtakwu ihe banyere  Alaeze Chineke. Ihe mbụ anyị ga-eleba anya na ya bụ ihe anyị ghọtara banyere mgbe Alaeze Chineke malitere ịchị. Ihe ọzọ anyị ga-eleba anya na ya bụ ndị ga-achị n’Alaeze Chineke na ndị ọ ga-achị. Anyị ga-elebakwa anya n’ihe ndị na-eso ụzọ Kraịst ghọtakwuru gbasara ihe ha ga-eme iji na-akwado Alaeze Chineke.

Ịghọta Afọ Ihe Dị Oké Mkpa Mere

5, 6. (a) Olee ihe Ndị Mmụta Baịbụl ghọtahiere gbasara mgbe Alaeze Chineke malitere ịchị na mgbe owuwe ihe ubi ahụ malitere? (b) Gịnị mere anyị ga-eji kwuo na ihe ndị ahụ ha ghọtahiere ekwesịghị ime ka obi ghara isi anyị ike na Jizọs na-edu ha?

5 N’isiokwu nke 2 n’akwụkwọ a, anyị kwuru na ọtụtụ afọ tupu afọ 1914, Ndị Mmụta Baịbụl nọ na-ekwu na afọ ahụ ga-apụ iche n’ihi na amụma ụfọdụ e buru na Baịbụl ga-emezu n’afọ ahụ. Ma tupu afọ 1914, ha kweere na ọnụnọ Kraịst malitere n’afọ 1874, nakwa na Kraịst malitere ịchị n’eluigwe n’afọ 1878. Ha kwekwaara na Alaeze Chineke ga-amalite ịchị ebe niile n’Ọktoba 1914. Ihe ọzọ ha kweere bụ na owuwe ihe ubi Baịbụl kwuru okwu ya ga-agbatịkwu si n’afọ 1874 ruo afọ 1914, nakwa na ọ ga-akwụsị mgbe Ndị Kraịst niile e tere mmanụ lachara eluigwe. Ihe ndị a niile ha ghọtahiere, ọ̀ na-eme ka obi ghara isi anyị ike na Jizọs ji mmụọ nsọ Chineke duo ụmụnna anyị ndị ahụ n’oge ahụ?

6 Mbanụ. Cheta ihe atụ ahụ anyị mere ná mmalite. Mgbe ahụ ndị njem ahụ nọ na-ekwurịta otú ha chere obodo ahụ dị ma jụọ nwoke ahụ du ha ka ọ kọọrọ ha, ya asị ha cheregodị, ọ̀ ga-eme ka anyị sị na nwoke ahụ amaghị otú obodo ahụ dị? Anyị agaghị ekwu otú ahụ. A bịakwa n’ihe gbasara ndị Chineke, ọ bụ eziokwu na mgbe ụfọdụ, ha na-achọ ịghọta nzube Chineke mgbe oge na-erubeghị ka Jehova jiri mmụọ nsọ ya mee ka ha ghọta ya, o doro anya na Jizọs na-edu ha. Ọ bụrụ na Jehova emee ka ha ghọta nke bụ́ eziokwu, ha na-eji obi ha niile nabata ya n’ihi na ha dị umeala n’obi.—Jems 4:6.

7. Olee ihe ụfọdụ e kwuru na Baịbụl Chineke mere ka ndị ohu ya ghọtakwuo?

7 Mgbe afọ 1919 gachara, Chineke mere ka ndị ya ghọtakwuo ihe ụfọdụ e kwuru na Baịbụl. (Gụọ Abụ Ọma 97:11.) N’afọ 1925, e nwere otu isiokwu gbara ọkpụrụkpụ nke gbara n’Ụlọ Nche. Isiokwu ahụ bụ “Ọmụmụ nke Mba Ahụ.” Isiokwu ahụ mere ka o doo anya na ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru gosiri na Alaeze Mesaya malitere ịchị n’afọ 1914. Ọ bụ n’afọ ahụ ka e mezuru ihe Baịbụl kwuru ná Mkpughe isi iri na abụọ. Ebe ahụ kwuru na nwaanyị Chineke nke dị n’eluigwe mụrụ nwa nwoke. * Isiokwu ahụ kọwakwara na mkpagbu a kpagburu ndị Jehova n’oge Agha Ụwa Mbụ gosiri na e sila n’eluigwe chụdata Setan n’ụwa. Ọ “na-ewe oké iwe, ebe ọ maara na o nwere oge dị mkpirikpi.”—Mkpu. 12:12.

8, 9. (a) Olee otú e si mee ka ndị Chineke ghọta na Alaeze Chineke dị ezigbo mkpa? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-eleba anya na ha?

8 Olee ihe mere Alaeze Chineke ji dị ezigbo mkpa? N’afọ 1928, a malitere ikwu n’Ụlọ Nche na Alaeze Chineke ka mkpa karịa nzọpụta a ga-azọpụta anyị n’ihi àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ. O doro anya na Jehova ga-eji Alaeze Mesaya mee ka aha ya dị nsọ, meekwa ka a mata na ọ bụ ya kwesịrị ịchị ma eluigwe ma  ụwa. Ọ bụkwa ya ka Jehova ga-eji meere ụmụ mmadụ ihe niile o zubere imere ha.

9 Ole ndị ga-eso Kraịst achị n’Alaeze ahụ? Ole ndị Alaeze ahụ ga-achị n’ụwa? Oleekwa ọrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst kwesịrị ịna-arụsi ike?

Ịchịkọta Ndị E Tere Mmanụ

10. Gịnị ka ezigbo Ndị Kraịst ghọtara kemgbe gbasara otu narị puku na iri puku anọ na puku anọ?

10 Ọtụtụ afọ tupu afọ 1914, ezigbo Ndị Kraịst aghọtala na ọ bụghị ha niile ga-eso Kraịst chịa n’eluigwe, kama, ọ bụ naanị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ. * Ha ghọtara na ọnụ ọgụgụ a bụ ọnụ ọgụgụ nkịtị. Ha ghọtakwara na ọ bụ n’oge ndịozi Jizọs ka a malitere ịkpọ ndị so n’ọnụ ọgụgụ a.

11. Olee otú ndị ahụ ha na Kraịst ga-eso achị si ghọtakwuo ọrụ Chineke sịrị ha rụọ n’ụwa?

11 Ma, olee ihe a gwara ndị a ga-eso Kraịst chịa ka ha na-eme n’ụwa tupu ha agaa eluigwe? Ha ma na Jizọs kwusiri okwu ike gbasara ikwusa ozi ọma, nakwa na o ji ya tụnyere oge owuwe ihe ubi. (Mat. 9:37; Jọn 4:35) N’isiokwu nke abụọ n’akwụkwọ a, anyị kwuru na Ndị Mmụta Baịbụl ghọtara na oge owuwe ihe ubi ahụ ga-ewe iri afọ anọ, nakwa na ọ ga-akwụsị mgbe ndị e tere mmanụ lachara eluigwe. Ma, ebe ọ bụ na e weela ihe ubi ahụ karịa iri afọ anọ, e nwere ihe ndị ha kwesịrị ịghọtakwu banyere owuwe ihe ubi a. Anyị aghọtala ugbu a na owuwe ihe ubi ahụ malitere n’afọ 1914. Ọ bụ oge a ga-achịkọta ata iche, chịkọtakwa ọka iche. Ọka a bụ ezigbo Ndị Kraịst, ebe ata ahụ bụ Ndị Kraịst adịgboroja. Oge ezuola ka a chịkọta ndị fọrọ afọ n’ime ndị ahụ ha na Kraịst ga-eso achị n’eluigwe.

N’afọ 1914 ka a malitere owuwe ihe ubi ahụ Jizọs kwuru okwu ya (A kọwara ya na paragraf nke 11)

12, 13. Jizọs ji talent na ụmụ agbọghọ iri na-amaghị nwoke mee ihe atụ. Olee ihe ihe atụ ndị a pụtara n’oge ikpeazụ a?

12 Malite n’afọ 1919 gawa, Kraịst nọ na-eme ka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, na-ekwusi okwu ike gbasara izisa ozi ọma. Tupu Jizọs alaghachi eluigwe, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ezi ozi ọma. (Mat. 28:19, 20) Ọ gwakwara ha ihe ha kwesịrị ịna-eme ka ha nwee ike ikwusa ozi ọma a ọ sị ha na-ekwusa. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Mgbe Jizọs ji ụmụ agbọghọ iri na-amaghị nwoke meere ndị na-eso ụzọ ya ihe atụ, o mere ka o doo ha anya na ha kwesịrị ịmụrụ anya, ma jiri ozi Chineke kpọrọ ihe, ka ha nwee ike iso n’oriri  agbamakwụkwọ Baịbụl kwuru na ha na Jizọs ga-enwe n’eluigwe, ya bụ, mgbe a ga-ejikọta Jizọs Kraịst na otu narị puku na iri puku anọ na puku anọ ahụ. Baịbụl kpọrọ ha ‘nwaanyị Kraịst na-alụ ọhụrụ.’ (Mkpu. 21:2) Mgbe Jizọs jikwa talent mee ihe atụ, o gosiri na ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ ga-eji ikwusa ozi ọma kpọrọ ihe.—Mat. 25:1-30.

13 Kemgbe ihe karịrị otu narị afọ ugbu a, ndị e tere mmanụ mụ anya, ma jiri ikwusa ozi ọma kpọrọ ihe. O doro anya na Chineke ga-agọzi mbọ a ha na-agba. Ma, ọ̀ bụ naanị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ha na Kraịst ga-eso achị ka a ga-achịkọta n’owuwe ihe ubi a?

Ịchịkọta Ndị Alaeze Chineke Ga-achị n’Ụwa

14, 15. Olee ụzọ ndị abụọ e kwuru n’akwụkwọ anyị a na-akpọ The Finished Mystery na ha ga-aga eluigwe? Oleekwa ụzọ ndị abụọ e kwuru n’akwụkwọ ahụ na ha ga-ebi n’ụwa?

14 Ọ dịla anya ndị Chineke chọsiri ike ịma ihe gbasara “oké ìgwè mmadụ” e kwuru okwu ya ná Mkpughe 7:9-14. Tupu Kraịst emee ka a ghọta ndị oké ìgwè mmadụ a bụ, ọtụtụ ihe Ndị Mmụta Baịbụl kwuru gbasara ha dị iche n’ihe ndị bụ́ eziokwu anyị maara ugbu a gbasara ha.

15 N’afọ 1917, akwụkwọ anyị a na-akpọ The Finished Mystery kwuru na “e nwere ụzọ mmadụ abụọ ga-aga eluigwe, nweekwa ụzọ mmadụ abụọ ga-ebi n’ụwa.” Ole ndị so ná ndị a ga-aga eluigwe na ndị a ga-ebi n’ụwa? Ndị nke mbụ n’ụzọ mmadụ abụọ ahụ ga-aga eluigwe bụ otu narị puku na iri puku anọ na puku anọ ha na Kraịst ga-eso achị. Ndị nke abụọ n’ime ha bụ oké ìgwè mmadụ. N’oge ahụ, a ghọtara na oké ìgwè mmadụ a bụ ndị nọ na chọọchị dị iche iche dị na Krisendọm. Ha kweere na Chineke, ma ha anaghị erubechara ya isi. N’ihi ya, a ga-enye ha ọkwá dị ala n’eluigwe. Ma, ole ndị bụ ndị mbụ n’ụzọ mmadụ abụọ ahụ ga-ebi n’ụwa? Ndị Mmụta Baịbụl n’oge ahụ kwuru na ha bụ ndị oge ochie fere Jehova, dị ka Ebreham, Mozis na ndị ọzọ. Ha kwukwara na ọ bụ ndị a ga-achị ndị nke abụọ n’ime ndị ahụ ga-ebi n’ụwa. Ndị nke abụọ n’ime ndị ahụ ha sị ga-ebi n’ụwa bụ ụmụ mmadụ ndị ọzọ nọ n’ụwa.

16. Olee otú mmụọ nsọ si duo ezi Ndị Kraịst n’afọ 1923, ha aghọta nke bụ́ eziokwu banyere ndị ga-aga eluigwe na ndị ga-ebi n’ụwa? Oleekwa otú mmụọ nsọ si duo ha n’afọ 1932, ha aghọtakwuo nke bụ́ eziokwu n’okwu a?

16 Olee otú Chineke si jiri mmụọ nsọ ya mee ka Ndị Kraịst ghọta ndị ga-ebi n’ụwa? O ji nwayọọ nwayọọ mee ya. N’afọ 1923, e kwuru n’Ụlọ Nche na e nwere ndị ga-ebi n’ụwa Kraịst ga-achị. Ha agaghị aga eluigwe. N’afọ 1932, e kwuru n’Ụlọ Nche gbasara Jọnadab (ma ọ bụ Jehọnadab), onye kwadoro Jihu mgbe ọ na-ekpochapụ ofufe ụgha n’Izrel. Jihu bụ eze Izrel Chineke tere mmanụ. (2 Eze 10:15-17) Ụlọ Nche ahụ kwukwara na e nwere ndị yiri Jọnadab n’oge anyị a, nakwa na Jehova ga-eme ka ha ghara ịnwụ n’Amagedọn. Ha ga-ebi n’ụwa a.

17. (a) Olee eziokwu Chineke mere ka ndị ohu ya ghọtakwuo n’afọ 1935? (b) Mgbe e mere ka ndị Chineke mata na oké ìgwè mmadụ ahụ ga-ebi n’ụwa, olee uru ọ baara ha? (Gụọ ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “ O Mere Ka Ndị Chineke Mara Ebe Ha Kwụ.”)

17 N’afọ 1935, e nwere otu eziokwu Chineke mere ka ndị ohu ya ghọtakwuo. Ná mgbakọ e nwere na Wọshịntịn Diisi, a kọwara na oké ìgwè mmadụ ahụ bụ ndị ga-ebi n’ụwa. Ọ bụ ha bụ atụrụ ahụ Jizọs kwuru okwu ya mgbe o ji atụrụ na ewu mee ihe atụ. (Mat. 25:33-40) Oké ìgwè mmadụ ahụ ga-eso “n’atụrụ  ọzọ” ahụ Jizọs kwuru okwu ya. Jizọs kwuru gbasara ha, sị: “M ga-akpọtakwa ha.” (Jọn 10:16) Mgbe Nwanna J. F. Rutherford na-ekwu okwu ná mgbakọ ahụ, o kwuru, sị: “Biko, ka ndị niile nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa a bilie ọtọ.” Mgbe o kwuchara ihe a, ihe karịrị ọkara ndị bịara mgbakọ ahụ biliri ọtọ. O kwuziri, sị: “Leenụ oké ìgwè mmadụ ahụ!” Ihe a o kwuru ruru ndị mmadụ n’obi n’ihi na o mere ka ha mara ebe ha kwụ.

18. Olee ihe ezigbo Ndị Kraịst gbasiri mbọ ike na-eme? Oleekwa otú Jehova sirila gọzie ha?

18 Kemgbe ahụ, Kraịst na-eduzi ndị na-eso ụzọ ya ka ha gbasie mbọ ike na-achịkọta ndị ga-eso n’oké ìgwè mmadụ ahụ na-agaghị anwụ n’oké mkpagbu. Mgbe ha malitere, mmadụ ole a chịkọtara adịghị ọtụtụ otú ha chere na ha ga-adị. Ọ bụ ya mere Nwanna Rutherford ji kwuo, sị: “O yiri ka oké ìgwè mmadụ ahụ agaghị adị ọtụtụ.” Ma, anyị ahụla taa na Jehova agọziela ozi ọma ndị ohu ya na-ekwusa kemgbe ahụ. Jehova ejirila Jizọs na mmụọ nsọ mee ka ndị e tere mmanụ na “atụrụ ọzọ” ahụ bụrụ otu otú ahụ Jizọs kwuru. Ha abụrụla “otu ìgwè atụrụ,” nweekwa “otu onye ọzụzụ atụrụ.”

Nwanna Rutherford amaghị otú oké ìgwè mmadụ ahụ ga-aharu (I si n’aka ekpe gụrụ gawa aka nri, onye mbụ bụ Nathan H. Knorr, onye nke abụọ bụ Joseph F. Rutherford, onye nke atọ bụ Hayden C. Covington)

19. Olee otú anyị ga-esi soro na-achịkọta atụrụ ọzọ Kraịst kwuru okwu ya?

19 Ọtụtụ ndị ohu Chineke ga-ebi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi mgbe ụwa ga-aghọ paradaịs. Ọ bụ Kraịst na otu narị puku na puku iri anọ, na puku anọ ga-achị ha. Obi dị anyị ụtọ na Kraịst emeela ka ndị ohu Chineke mata ihe Baịbụl kwuru gbasara ụzọ ebe abụọ ndị ohu ya ga-anọ. Anyị kwesịrị ịna-akọrọ ndị ọzọ ihe ndị a Chineke mere ka anyị ghọta. Ka anyị jiri ike anyị niile na-ekwusa ozi ọma ka ọtụtụ ndị nwee ike soro n’oké ìgwè mmadụ ahụ Baịbụl kwuru okwu ya. Nke a ga-eme ka e nwekwuo ndị ga na-eto aha Chineke bụ́ Jehova.—Gụọ Luk 10:2.

Oké ìgwè mmadụ ahụ na-ehi nne n’ike n’ike

Otú Anyị Ga-esi Na-akwadosi Alaeze Chineke Ike

20. Ole ndị so ná nzukọ Setan? Oleekwa otú Ndị Kraịst si egosi na ha dị iche n’ụwa Setan?

20 Ka ndị Chineke nọ na-amụ banyere Alaeze Chineke, ha kwesịkwara ịghọtakwu otú ha ga-esi na-akwado Alaeze ahụ. Ọ bụ ya mere e ji kwuo n’Ụlọ Nche n’afọ 1922, na e nwere nzukọ abụọ dịnụ, ha bụ, nzukọ Jehova na nzukọ Setan. Ndị so ná nzukọ Setan bụ ndị azụmahịa ụwa, ndị okpukpe ụgha, na ndị ọchịchị ụwa. Ndị niile na-akwadosi Alaeze Chineke ike ekwesịghị itinye aka n’ihe ọ bụla na-adịghị ọcha n’ụwa Setan. (2 Kọr. 6:17) Gịnị bụ ihe ndị ahụ ha na-agaghị etinye aka na ha?

21. (a) Olee ihe ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi gwara ndị Chineke banyere ịchụ ego? (b) N’afọ 1963, gịnị ka e kwuru n’Ụlọ Nche banyere “Babilọn Ukwu Ahụ”?

21 Kemgbe ụwa, ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-agwa anyị banyere aka ndị azụmahịa ụwa na-arụrụ. Ha na-agwakwa anyị ka anyị ghara ịchụ ego ọnwụ ọnwụ. (Mat. 6:24) N’akwụkwọ anyị dị iche iche, ha na-agwakwa anyị gbasara okpukpe ndị so ná nzukọ Setan. Ha kwuru hoo haa n’Ụlọ Nche, n’afọ 1963, na Krisendọm na okpukpe ụgha ndị ọzọ niile so na “Babịlọn Ukwu ahụ” e kwuru okwu ya na Baịbụl. N’ihi ya, n’isi iri nke akwụkwọ a, anyị ga-amụtakwu otú e si nyere ndị Chineke nọ n’ebe dị iche iche aka ‘isi n’ime ya pụta.’ Anyị ga-amụtakwa otú  ndị Chineke si wepụ aka n’ihe ọ bụla okpukpe ụgha na-eme.—Mkpu. 18:2, 4.

22. Mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Mbụ, olee otú ọtụtụ ndị Chineke si ghọta ihe e kwuru n’akwụkwọ Ndị Rom 13:1?

22 Ma, olee otú e si nyere ezigbo Ndị Kraịst aka ka ha ghara itinye aka n’ọchịchị ụwa Setan? Aka ha ò kwesịrị ịdị n’ihe ọ bụla gbasara agha na esemokwu mba na mba? N’oge Agha Ụwa nke Mbụ, Ndị Mmụta Baịbụl niile ghọtara na ezigbo Ndị Kraịst ekwesịghị igbu mmadụ ibe ha. (Mat. 26:52) Ma, e nwere otú ọtụtụ n’ime ha si ghọta ihe Baịbụl kwuru ná Ndị Rom 13:1. Ebe ahụ kwuru ka onye ọ bụla rubere “ndị ọchịchị” isi. Ọtụtụ n’ime ha ghọtara na ebe a na-ekwu na ezigbo Ndị Kraịst kwesịrị ịbụ ndị agha, jiri ejiji ndị agha, burukwa égbè gaa agha. Ma, e ruo n’ihu agha, á sị ha gbagbuo ndị iro ha, ha kwesịrị ịna-agba égbè ha n’elu.

23, 24. Mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ, gịnị ka anyị ghọtara Ndị Rom 13:1 na-ekwu? Olee otú mmụọ nsọ si mee ka anyị ghọtakwuo amaokwu ahụ?

23 E nwere ihe a kọwakwuuru ụmụnna anyị n’Ụlọ Nche n’afọ 1939 tupu Agha Ụwa nke Abụọ amalite n’afọ ahụ. A kọwakwuuru ha otú ha ga-esi dịrị iche n’ụwa Setan. Ụlọ Nche ahụ kwuru hoo haa na aka ezigbo Ndị Kraịst ekwesịghị ịdị n’ihe ọ bụla gbasara agha na esemokwu mba na mba. Ihe a a kọwakwuuru ụmụnna anyị nyeere ha ezigbo aka. O mere ka ikpe ọbara ghara ịma ha otú ọ mara ọtụtụ mmadụ n’agha ahụ tara isi ọtụtụ ndị. Ma, ná mbido afọ 1929, e kwuru n’akwụkwọ anyị na ndị ọchịchị e kwuru okwu ha ná Ndị Rom 13:1 bụ Jehova na Jizọs, ọ bụghị ndị ọchịchị ụwa. N’ihi ya, e kwesịrị ime ka ihe amaokwu a na-ekwu dokwuo ezigbo Ndị Kraịst anya.

 24 Mmụọ nsọ nyeere ezigbo Ndị Kraịst aka n’afọ 1962 ha aghọta ihe amaokwu Baịbụl ahụ na-ekwu. N’Ụlọ Nche Bekee nke November 15 na nke December 1 n’afọ ahụ, a kọwara Ndị Rom 13:1-7. Ọ bụ n’Ụlọ Nche abụọ a ka ndị Chineke ghọtara otu ihe Jizọs kwuru nke ọtụtụ ndị ma nke ọma taa. Jizọs sịrị: “Hụnụ na unu kwụrụ Siza ihe Siza, ma kwụọnụ Chineke ihe Chineke.” (Luk 20:25) Ezigbo Ndị Kraịst aghọtala ugbu a na ndị ọchịchị ahụ e kwuru okwu ya ná Ndị Rom 13:1 bụ ndị ọchịchị ụwa. Ha aghọtakwala na ha kwesịrị ịna-erubere ha isi. Ma, ọ bụrụ na ndị ọchịchị ụwa asị ha mee ihe Jehova Chineke sị ha emela, ha agaghị eme ya. Ha ga-ekwu ihe ndịozi Jizọs kwuru mgbe a gwara ha mee otú ahụ. Ha ga-ekwu, sị: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.” (Ọrụ 5:29) N’isi iri na atọ na nke iri na anọ n’akwụkwọ a, anyị ga-amụtakwu ihe ndị ọzọ ezigbo Ndị Kraịst mere iji gosi na ha dị iche n’ụwa Setan.

Ịkụziri ndị ọzọ gbasara ndụ ebighị ebi e kwuru okwu ya na Baịbụl bụ amara Chineke meere anyị

25. Olee otú obi dị gị maka otú a mmụọ nsọ si eme ka anyị ghọta ihe gbasara Alaeze Chineke?

25 Kemgbe ihe karịrị otu narị afọ ugbu a, a kụzierela ezigbo Ndị Kraịst ọtụtụ ihe banyere Alaeze Chineke. Anyị amatala mgbe Alaeze Chineke malitere ịchị n’eluigwe. Anyị amatakwala otú Alaeze ahụ si dịrị anyị mkpa. Anyị amụtala na ụfọdụ ndị Chineke ga-aga eluigwe, ọtụtụ ebiri n’ụwa. Anyị amụtakwala otú anyị ga-esi na-akwado Alaeze Chineke ma na-erubere ndị ọchịchị isi ma ọ bụrụhaala na ihe ha sị anyị mee abụghị ihe Chineke sị anyị emela. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị, ‘M̀ gaara amụta ihe ndị a dị ezigbo mkpa ma á sị na Jizọs Kraịst enyereghị ndị ohu ya nọ n’ụwa aka ịghọta ihe ndị ahụ ma kụziere anyị ha?’ Anyị na-ekele Jehova na o ji mmụọ nsọ ya na Jizọs Kraịst na-eduzi anyị.

^ para. 3 Otu akwụkwọ e ji eme nchọnchọ kwuru na okwu Grik a kpọrọ “ga-eduzi” n’amaokwu a pụtara “igosi mmadụ ụzọ.”

^ para. 7 Tupu oge ahụ, e chere na ọhụụ ahụ na-ekwu gbasara agha ndị ọgọ mmụọ Rom na ndị chọọchị Katọlik lụrụ.

^ para. 10 Na Jun afọ 1880, e kwuru n’Ụlọ Nche na otu narị puku na iri puku anọ na puku anọ Baịbụl kwuru okwu ha ga-abụ ndị Izrel ghọrọ Ndị Kraịst tupu afọ 1914. Ma, ná ngwụcha afọ ahụ, e bipụtara Ụlọ Nche kọwara ihe na-adịchaghị iche n’ihe anyị ma ugbu a gbasara ndị ga-eso n’otu narị puku na iri puku anọ na puku anọ ahụ.