Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!

 ISI NKE 19

Ịrụ Ụlọ Ndị E Ji Na-eto Jehova

Ịrụ Ụlọ Ndị E Ji Na-eto Jehova

IHE ISIOKWU A NA-EKWU

Ụlọ ndị anyị na-arụ n’ụwa niile bụ maka ihe ndị gbasara Alaeze Chineke

1, 2. (a) Olee ihe ndị ohu Jehova na-eme kemgbe ụwa? (b) Olee ihe kacha eme Jehova obi ụtọ?

KEMGBE ụwa, ndị Jehova na-arụ ụlọ ndị e ji na-eto aha Chineke. Dị ka ihe atụ, ụmụ Izrel ji obi ha niile rụọ ụlọikwuu. Ha wetakwara ihe ndị e ji rụọ ya.—Ọpụ. 35:30-35; 36:1, 4-7.

2 Ihe kacha mee Jehova obi ụtọ abụghị ihe ndị ahụ e ji rụọ ụlọikwuu ahụ. Ihe ndị ahụ abụghịkwa ihe kacha ya mkpa. (Mat. 23:16, 17) Ihe kacha eme Jehova obi ụtọ bụ ofufe ndị ohu ya na-efe ya, ya bụ, otú ha si eji obi ha dum ewepụta onwe ha na otú ha si arụsi ọrụ ya ike. (Ọpụ. 35:21; Mak 12:41-44; 1 Tim. 6:17-19) Gịnị mere ihe ndị a ji bụrụ ihe kacha Jehova mkpa? Ọ bụ n’ihi na ụlọ anaghị adịru ebighị ebi. Dị ka ihe atụ, ma ụlọikwuu ahụ ma ụlọ nsọ ahụ ụmụ Izrel rụrụ n’oge ahụ adịkwaghị. Ọ bụ eziokwu na ha adịkwaghị, Jehova echefubeghị otú ụmụ Izrel si jiri obi ha nye ihe ndị e ji rụọ ha. O chefubeghịkwa otú ha si rụsie ọrụ ike mgbe a na-arụ ha.—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:58; Ndị Hibru 6:10.

3. Olee ihe ndị anyị ga-eleba anya na ha n’isiokwu a?

3 Ndị Jehova n’oge anyị a na-agbasikwa mbọ ike ịrụ ebe ha na-anọ efe Chineke. Eze anyị bụ́ Jizọs Kraịst enyerela anyị aka ịrụ ọtụtụ ebe anyị na-anọ efe Chineke. O doro anya na Jehova na-agọzi mbọ niile anyị na-agba na-arụ ebe ndị ahụ. (Ọma 127:1) N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ụlọ ụfọdụ ndị anyị rụrụ nakwa otú ha si mee ka e too Jehova. Anyị ga-elebakwa anya n’ihe ụfọdụ ndị so rụọ ha kwuru.

Ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze

4. (a) Gịnị mere anyị ji achọkwu ebe ndị anyị ga-anọ efe Chineke? (b) Gịnị mere e ji bukọta alaka ụlọ ọrụ ụfọdụ ọnụ? (Gụọkwa ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ “ Ihe Mere Anyị Ji Malite Ịrụ Alaka Ụlọ Ọrụ.”)

4 N’isi nke iri na isii, anyị kwuru na Jehova chọrọ ka anyị na-ezukọta efe ya. (Hib. 10:25) Ọmụmụ ihe ndị anyị na-enwe na-eme ka okwukwe anyị na-esikwu ike. Ha na-emekwa ka anyị na-ekwusasi ozi ọma ike. Ka ọgwụgwụ ụwa ọjọọ a na-eru nso, Jehova na-eme ka a rụọ ọrụ a ngwa ngwa. Nke a na-eme ka ọtụtụ narị puku mmadụ na-abata ná nzukọ ya kwa afọ. (Aịza. 60:22) Otú a ọtụtụ mmadụ si abata n’ọgbakọ na-eme ka a chọkwuo ebe ndị a ga-anọ na-ebi akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. Ọ na-emekwa ka a chọkwuo ebe ndị anyị ga-anọ na-efe Chineke.

5. Gịnị mere aha bụ́ “Ụlọ Nzukọ Alaeze” ji daba adaba? (Gụọ ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ “ Chọọchị Wetara Ìhè Ọhụrụ.”)

 5 Mgbe Ndị Mmụta Baịbụl malitere ọhụrụ, ha chọpụtara na ha kwesịrị ịrụ ebe ndị ha ga-anọ na-efe Chineke. Ọ dị ka ebe mbụ ha rụrụ ha ga-anọ na-efe Chineke bụ na West Vejinia, nke dị n’Amerịka. Ha rụrụ ya n’afọ 1890. N’agbata afọ 1931 na afọ 1939, ndị Jehova arụọla ọtụtụ ụlọ ndị ha na-anọ efe Chineke, e nwekwara ndị ha rụzigharịrị. Ma, o nwebeghị aha ha na-akpọ ụlọ ndị ahụ ha na-anọ efe Chineke. N’afọ 1935, Nwanna Rutherford gara Hawaii ka ọ hụ alaka ụlọ ọrụ anyị a rụrụ ọhụrụ nakwa otu ụlọ nzukọ a rụrụ na ya. Mgbe ụmụnna jụrụ Nwanna Rutherford ihe a ga-akpọ ụlọ ahụ, ọ gwara ha, sị: “Ùnu chere na ọ dịghị mma ka anyị kpọọ ya ‘Ụlọ Nzukọ Alaeze,’ ebe ọ bụkwanụ na anyị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke?” (Mat. 24:14) Aha a a kpọrọ ụlọ a dabara adaba. Ọ bụkwa aha a ka e mechara kpọwa ọtụtụ ebe Ndịàmà Jehova n’ụwa niile na-anọ enwe ọmụmụ ihe ha.

6, 7. Olee uru Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ahụ a rụrụ n’ime abalị ole na ole bara?

6 N’agbata afọ 1971 na 1979, a bịara chọsiwe Ụlọ Nzukọ Alaeze ike. N’ihi ya, ụmụnna anyị nọ n’Amerịka chọpụtara ụzọ  kacha mma e nwere ike isi jiri mkpụrụ ụbọchị ole na ole rụọ ọtụtụ ọmarịcha Ụlọ Nzukọ Alaeze. Tupu afọ 1983 agwụchaa, a rụọla ihe dị ka narị Ụlọ Nzukọ Alaeze abụọ n’Amerịka nakwa na Kanada. Ihe ụmụnna mere ka e nwee ike ịrụ ọrụ a ngwa ngwa bụ na ha hiwere kọmitii ndị na-ahụ maka iwu ihe owuwu n’ógbè. Ihe a ha mere nyere ezigbo aka. Ọ bụ ya mere Òtù Na-achị Isi ji kwado ya n’afọ 1986. Tupu afọ 1987 agwụchaa, e nweela kọmitii a iri isii n’Amerịka. * Tupu afọ 1992 agwụchaa, e nweekwala kọmitii a n’Ajentina, Ọstrelia, Frans, Jamanị, Japan, Meksiko, Saụt Afrịka, na Spen. N’eziokwu, anyị kwesịrị inyere ụmụnna ndị a na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ aka n’ihi na ọrụ a ha na-arụ so n’ozi anyị na-ejere Chineke.

7 Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị a a na-arụ ngwa ngwa na-eme ka ụfọdụ ndị obodo ebe a rụrụ ha chọwa ịma nke bụ́ eziokwu. Dị ka ihe atụ, e nwere isiokwu gbara n’otu akwụkwọ akụkọ na Spen. Isiokwu ahụ kwuru banyere otu Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị rụrụ n’obodo Matọs. Isiokwu ahụ bụ, “Okwukwe Na-ebupụ Ugwu.” Akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru, sị: “Olee otú o si kwe omume n’ụwa a onye ọ bụla na-achọ ihe ga-abara naanị ya uru, na ndị bi ebe dị iche iche [na Spen] wepụtara onwe ha gaa n’obodo Matọs iji rụọ otu ụlọ? A bịa n’otú e si rụọ ya ngwa ngwa na otú e si hazie ihe niile gbasara ya, nakwa otú e si rụọ ya nke ọma, ọ dịghị ụlọ e nwere ike iji tụnyere ya n’ụwa niile.” Akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru ihe otu n’ime ndị ahụ wepụtara onwe ha rụọ ụlọ ahụ kwuru na ọ bụ ya mere ha ji wepụta  onwe ha gaa rụọ ụlọ ahụ. Ọ sịrị: “Ọ bụ n’ihi na Jehova na-ezi anyị ihe.”

Ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ná Mba Ndị Na-abaghị Ọgaranya

8. Olee ihe Òtù Na-achị Isi kwadoro ka a malite ime n’afọ 1999? Oleekwa ihe mere ha ji kwado ya?

8 Malite n’ihe dị ka afọ 1990, ọtụtụ ndị batara n’ọgbakọ Jehova ná mba ndị na-abaghị ọgaranya. Ọgbakọ ndị dị ná mba ndị a gbara mbọ rụọ ebe ndị ha na-anọ amụ ihe. Ma n’ebe ụfọdụ, a na-achị ụmụnna anyị ọchị, na-eledakwa ha anya n’ihi otú Ụlọ Nzukọ Alaeze ha si jọọ njọ. O nweghị ihe Ụlọ Nzukọ Alaeze ha bụ ma e jiri ha tụnyere ụlọ chọọchị ndị dị ebe ahụ. Ma e nwere otu ihe magburu onwe ya Òtù Na-achị Isi malitere n’afọ 1999. Ha kwadoro ka a malite ịrụrụ ụmụnna ndị nọ ná mba ndị a na-enwechaghị ego Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ka e nwee “ịha nhata,” a na-eji ego ụmụnna ndị nọ ná mba ndị nwere ego nyere n’onyinye arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ahụ. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 8:13-15.) Ụmụnna ndị si n’ebe dị iche iche na-abịa enye aka mgbe a na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ahụ.

9. A bịa n’ihe gbasara ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, gịnị mere o ji yie ka e nweghị ebe anyị ji azụ aga? Ma, olee otú ihe si kwụrụ kemgbe ahụ?

9 Mgbe a malitere ọrụ a, o yiri ka e nweghị ebe anyị ji azụ aga. N’afọ 2001, a chọpụtara na a chọrọ ihe karịrị puku Ụlọ Nzukọ Alaeze iri na asatọ na narị atọ ná mba iri asatọ na asatọ. Ma, ebe ọ bụ na Jehova ji mmụọ ya na-akwado anyị, Eze anyị bụ́ Jizọs Kraịst ana-akwadokwa anyị, o nweghị ihe anyị chọrọ ime anyị na-agaghị emeli. (Mat. 19:26) Malite n’afọ 1999 ruo afọ 2013, anyị arụọla puku Ụlọ Nzukọ Alaeze iri abụọ na puku isii, na narị asatọ na iri anọ na itoolu ná mba ndị ahụ na-abaghị ọgaranya. * Jehova na-agọzi ozi ọma anyị na-ezi n’ụwa niile.  Ọ bụ ya mere n’afọ 2013, anyị chọkwuru ihe dị ka puku Ụlọ Nzukọ Alaeze isii na narị ise ná mba ndị ahụ. A ka chọkwara ọtụtụ narị Ụlọ Nzukọ Alaeze kwa afọ.

Ọ naghị adị mfe ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ná mba ndị na-abaghị ọgaranya

10-12. Olee otú Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị anyị na-arụ si eme ka a na-eto aha Jehova?

10 Olee otú Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ ndị ahụ sirila mee ka e too aha Jehova? E nwere otu ihe alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Zimbabwe kọrọ gbasara ya. Ha kọrọ, sị: “N’ime otu ọnwa a rụchara otu Ụlọ Nzukọ Alaeze, ndị na-abịa ọmụmụ ihe na-eji okpukpu abụọ akarị ndị na-abịabu ya.” N’ọtụtụ mba, ọ dị ka ndị mmadụ anaghị achọ ịbịa ọmụmụ ihe anyị ruo mgbe anyị rụrụ ebe dị mma anyị ga-anọ na-efe Chineke. Ọ bụ ya mere a rụchaa otu Ụlọ Nzukọ Alaeze taa, obere oge, ọ naghị abazi ndị mmadụ, a chọwakwa ebe ọzọ a ga-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ma, ọ bụghị naanị otú ụlọ ahụ si maa mma mere ndị mmadụ ji na-abata n’ọgbakọ. Ihe ọzọ so eme ya bụ otú ụmụnna anyị na-arụ ụlọ ndị a si na-ahụ ibe ha n’anya. Ka anyị leba anya n’ihe mere mgbe a na-arụ ụlọ ndị a n’obodo ụfọdụ.

11 Indonisha. E nwere otu nwoke nọ na-ele otu Ụlọ Nzukọ Alaeze ụmụnna anyị nọ na-arụ. E nwere ihe ọ gwara ụmụnna anyị na-arụ ụlọ a mgbe ọ chọpụtara na a naghị akwụ ha ụgwọ. Ọ gwara ha, sị: “Unu dị egwu o! M nọ na-ele otú obi si na-atọ unu ụtọ na otú onye ọ bụla n’ime unu si jiri obi ya niile na-arụ ọrụ a, n’agbanyeghị na a naghị akwụ unu ụgwọ. Ọ dịghị chọọchị dị ka nke unu.”

12 Yukren. E nwere otu nwaanyị na-agafe kwa ụbọchị ebe ụmụnna anyị na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. Nwaanyị a kwuru n’obi ya na ndị na-arụ ụlọ a ga-abụrịrị Ndịàmà Jehova, nakwa na ụlọ a ha na-arụ ga-abụrịrị Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ gwara ụmụnna, sị: “Otu nwanne m nwaanyị bụ Onyeàmà Jehova. Ọ kọọrọla m ọtụtụ ihe banyere Ndịàmà Jehova. Mgbe m nọ na-ahụ otú unu si na-arụ ụlọ a, ekpebiri m na m ga-abụkwa Onyeàmà Jehova. Achọpụtara m na unu hụrụ ibe unu n’anya.” Nwaanyị a na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl. E mekwara ya baptizim n’afọ 2010.

13, 14. (a) Gịnị ka ị na-amụta n’ihe otu di na nwunye mere mgbe ha hụchara otú ụmụnna si eme mgbe ha na-arụ otu Ụlọ Nzukọ Alaeze? (b) Olee ihe i nwere ike ime ka ebe unu na-anọ amụ ihe na-eme ka a na-eto aha Jehova?

13 Ajentina. E nwere otu ụbọchị otu di na nwunye bịara ebe ụmụnna anyị na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. Nke nwoke gwara nwanna na-elekọta ọrụ ahụ, sị, “Anyị nọ na-ele unu kemgbe unu malitere ịrụ ụlọ a, . . . anyị ekpebiekwala na anyị ga na-abịa n’ụlọ a amụ banyere Chineke.” Ọ jụrụ nwanna ahụ, sị, “Olee ihe anyị ga-eme ka anyị na-eso unu amụ ihe ebe a?” Ka ha nọ na-akparịta, a gwara di na nwunye ahụ ka ha na Ndịàmà Jehova mụwa Baịbụl. Ha sịrị na nsogbu adịghị ma ọ bụrụhaala na a ga-ekwe ka ndị ezinụlọ ha niile soro na-amụ ihe ahụ. Ihe a ha kwuru tọrọ ụmụnna ahụ ụtọ, ha ekwetakwa ka ezinụlọ ha niile soro.

14 O nwere ike ịbụ na i soghị rụọ Ụlọ Nzukọ Alaeze ị na-aga ọmụmụ ihe na ya ugbu a. Ma, o nwere ọtụtụ ihe ị ka nwere ike ime ka a na-eto Jehova n’ihi Ụlọ Nzukọ Alaeze unu. Dị ka ihe  atụ, i nwere ike iji obi gị niile na-agwa ndị ị na-amụrụ Baịbụl, ndị ị na-agara nletaghachi, nakwa ndị ọzọ ka ha bịa ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze unu. Ihe ọzọ i nwekwara ike ime bụ iso na-eme ka ọ na-adị ọcha. I nwekwara ike ikpebi ego ole ị ga na-enye kwa izu ma ọ bụ kwa ọnwa, ka e jiri ya na-elekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze unu ma ọ bụ ka e jiri ya rụọ Ụlọ Nzukọ Alaeze ebe ndị ọzọ n’ụwa. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 16:2.) Ihe ndị a niile na-eme ka a na-eto aha Jehova.

Ndị Na-arụ Ha ‘Na-eji Obi Ha Ewepụta Onwe Ha’

15-17. (a) Ole ndị na-arụ ọtụtụ ihe a na-arụ n’ụlọ ndị anyị na-arụ? (b) Olee ihe ị mụtara n’ihe ndị ahụ ndị di na nwunye kwuru?

15 Ọ bụ ụmụnna ndị a na-arụrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, Ụlọ Mgbakọ, na alaka ụlọ ọrụ na-arụ ọtụtụ ihe a na-arụ n’ụlọ ndị a. Ma, ụmụnna anyị ndị si mba ọzọ na-abịakarị enyere ha aka. Ụmụnna ndị a ma nke a na-akọ n’ihe gbasara ịrụ ụlọ. Ụfọdụ n’ime ha na-ahazi ihe ndị ha na-eme ka ha nwee ike ịga mba ọzọ rụọ ọrụ ọtụtụ izu. Ụfọdụkwa na-anọ ọtụtụ afọ tupu ha alaghachi obodo ha. Ha rụchaa ọrụ otu ebe, e zigakwa ha ebe ọzọ ha ga-arụ ọrụ.

Nwanna Timo Lappalainen na Lina nwunye ya (E kwuru gbasara ha na paragraf nke 16)

16 Ọ dịghị mfe mmadụ ịhapụ mba ya gaa mba ọzọ ịrụ ọrụ. Ma, e nwere ọtụtụ uru ọ na-abara ndị na-ewepụta onwe ha eme ya. Dị ka ihe atụ, Nwanna Timo na Lina nwunye ya agaala mba ndị dị n’Eshia, Yurop, nakwa Ebe Ndịda Amerịka, nye aka rụọ Ụlọ Nzukọ Alaeze, Ụlọ Mgbakọ, nakwa alaka ụlọ ọrụ dị iche iche. Nwanna Timo kwuru, sị, “Kemgbe iri afọ atọ ugbu a, a na-ezigakarị m mba ọzọ n’afọ abụọ ọ bụla.” Nwanna Nwaayị Lina na di ya alụọla kemgbe iri afọ abụọ na ise ugbu a. Nwanna nwaanyị a kwuru, sị: “Kemgbe anyị lụrụ, mụ na di m agaala mba iri rụọ ọrụ. Ọ na-ewe ezigbo oge tupu obodo ndị ahụ amara anyị ahụ́. Ọ na-ewekwa oge tupu anyị eriwe nri ha, mụta  asụsụ ha, mụta izi ozi ọma nke ọma ebe ahụ na imeta ndị enyi ọhụrụ.” * Ò nwere uru mbọ niile a anyị na-agba baara anyị? Nwanna Nwaanyị Lina kwuru, sị: “N’agbanyeghị nsogbu ndị anyị na-edi n’ebe ndị ahụ, Jehova agọziela anyị nke ọma. Ụmụnna anyị emeerela anyị ọtụtụ ihe ndị gosiri na ha hụrụ anyị n’anya. Jehova na-elekọtakwa anyị nke ọma. Anyị ahụkwala otú ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na Mak 10:29, 30 si na-emezu. Anyị enweela ụmụnne ndị nwoke na ụmụnne ndị nwaanyị, nakwa ndị nne okpukpu otu narị.” Nwanna Timo kwuru, sị, “Obi na-atọ anyị ezigbo ụtọ na anyị na-eji aka ọrụ anyị eme ihe kacha mkpa, ya bụ, iso na-arụrụ Eze anyị ụlọ n’ebe dị iche iche.”

17 Nwanna Darren na Sarah nwunye ya agaala rụọ ọrụ ná mba ndị dị n’Afrịka, Ebe Ndịda Amerịka, Ebe Ndịda Pasifik, Etiti Kọntinent Amerịka, Eshia, na Yurop. Ha kwuru na uru ha ritere kemgbe ha malitere ọrụ a karịrị ihe ọrụ a furula ha. Nwanna Darren kwuru uru ya ritere n’agbanyeghị nsogbu ndị ha na-enwe. Ọ sịrị: “O nweghị ihe karịrị iso ụmụnna m ndị si ebe dị iche iche n’ụwa rụọ ọrụ. Ahụla m na n’agbanyeghị ebe anyị nọ n’ụwa, anyị niile hụrụ Jehova n’anya. Ọ bụ ịhụanya a jikọtara anyị niile.” Nwanna Nwaanyị Sarah kwuru, sị: “Amụtala m ọtụtụ ihe n’aka ụmụnna anyị si ebe dị iche iche, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị. Ọ na-abụ m hụ otú ụmụnna ndị a si ahapụ ọrụ ha ka ha nwee ike ijere Jehova ozi, mụ ana-agbasi mbọ ike iji ike m niile na-ejere Jehova ozi.”

18. Olee otú ihe e kwuru n’Abụ Ọma nke 110:1-3 si na-emezu?

18 Eze Devid kwuru na n’agbanyeghị na ụmụ amaala Alaeze Chineke ga-enwe nsogbu, ha ‘ga-ewepụta onwe ha’ ije ozi maka ihe ndị gbasara Alaeze Chineke. (Gụọ Abụ Ọma 110:1-3.) Ndị niile na-arụ ọrụ gbasara Alaeze Chineke so na-eme ihe a Devid kwuru. (1 Kọr. 3:9) Ọtụtụ alaka ụlọ ọrụ na ọtụtụ narị Ụlọ Mgbakọ, nakwa ọtụtụ iri puku Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị anyị rụrụla n’ụwa niile, na-egosi n’eziokwu na Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị adị, nakwa na ọ malitela ịchị. Nke bụ́ eziokwu bụ na o nweghị ihe ọma karịrị ozi a anyị na-ejere Eze anyị bụ́ Jizọs Kraịst. O nweghịkwa ihe ọma karịrị ọrụ a anyị na-arụ nke na-eme ka e too Jehova otú e kwesịrị isi na-eto ya.

^ para. 6 N’Amerịka, Kọmitii Na-ahụ Maka Iwu Ihe Owuwu n’Ógbè dị otu narị na iri atọ na abụọ. N’afọ 2013, ihe karịrị narị puku ụmụnna abụọ na puku iri atọ wepụtara onwe ha iso kọmitii ndị ahụ rụọ ọrụ. A na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze iri asaa na ise kwa afọ n’Amerịka. A na-arụzigharịkwa ihe dị ka narị itoolu kwa afọ. Ọ bụ kọmitii ndị ahụ haziri ọrụ ahụ niile.

^ para. 9 Ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị a na-arụ n’obodo ndị bara ọgaranya esoghị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ole a a rụrụ ná mba ndị na-abaghị ọgaranya.

^ para. 16 Ụmụnna ndị na-ewepụta onwe ha aga mba ọzọ arụ ụlọ ụmụnna anyị na-anọ efe Jehova na-aka eji oge ha arụ ụlọ ndị ahụ ha gara ịrụ. Ma, ha na-esokwa ọgbakọ ha eje ozi ọma ná mgbede ma ọ bụ ná ngwụcha izu.

GỤKWUO GBASARA YA

Ndịàmà Jehova Na-eji Otu Obi Arụ Ọrụ

Ndị Jehova na-eji otu obi arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na ụlọ ndị ọzọ ha nwe n’agbanyeghị obodo ha si, omenala ha, na asụsụ ha. Ọ na-ewetakwara Jehova otuto.