Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!

 ISI NKE 17

Otú E Si Azụ Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze Chineke

Otú E Si Azụ Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze Chineke

IHE ISIOKWU A NA-EKWU

Otú e si jiri ụlọ akwụkwọ ndị e nwere ná nzukọ Jehova na-azụ ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze ka ha na-eje ozi ha nke ọma

1-3. Olee otú Jizọs si hazie ka e kwusaa ozi ọma n’obodo ndị ọzọ? Oleekwa ajụjụ ụfọdụ nwere ike ịgbata anyị n’obi?

JIZỌS ji afọ abụọ zie ozi ọma n’ebe niile na Galili. (Gụọ Matiu 9:35-38.) Ọ gara n’obodo ukwu na n’obodo nta dị iche iche zie ndị mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke. Ọ kụzikwaara ndị mmadụ ihe n’ụlọ nzukọ ndị dị ebe ahụ. N’ebe ọ bụla Jizọs gara izi ozi ọma, ìgwè mmadụ na-agbakọta gee ya ntị. Ọ bụ ya mere o ji kwuo na “ihe ubi hiri nne,” nakwa na a chọkwuru ndị ọrụ.

2 Jizọs haziri ka e kwusaa ozi ọma n’obodo ndị ọzọ. Olee otú o si mee ya? O zipụrụ ndịozi ya iri na abụọ “ka ha gaa kwusaa alaeze Chineke.” (Luk 9:1, 2) Ọ ga-abụ na ndịozi Jizọs nọ na-eche otú ha ga-esi kwusaa ozi ọma a Jizọs sị ha kwusawa. Ma, tupu Jizọs ezipụ ha, ọ kụziiri ha otú ha ga-esi mee ya. Otú a Jizọs si kụziere ha ihe ka Jehova sikwa kụziere Jizọs.

3 E nwere ajụjụ ụfọdụ nwere ike ịgbata anyị n’obi ugbu a. Ha bụ: Olee ihe Jehova kụziiri Jizọs? Oleekwa ihe Jizọs kụziiri ndịozi ya? Eze anyị bụ́ Mesaya, ọ̀ na-akụziri anyịnwa ihe taa ka anyị nwee ike ịna-eje ozi anyị nke ọma? Ọ bụrụ na ọ na-akụziri anyị ihe, olee otú o si eme ya?

“M Na-ekwu Ihe Ndị A Dị Nnọọ Ka Nna M Kụziiri M”

4. Olee mgbe Jehova kụziiri Jizọs ihe? Oleekwa ebe Jizọs nọ Jehova akụziere ya ihe ahụ?

4 Jizọs kwuru hoo haa na Nna ya kụziiri ya ihe. N’oge Jizọs nọ n’ụwa, ọ sịrị: “M na-ekwu ihe ndị a dị nnọọ ka Nna m kụziiri m.” (Jọn 8:28) Olee mgbe Jehova kụziiri Jizọs ihe? Oleekwa ebe Jizọs nọ Jehova akụziere ya ihe ahụ? Ọ dị ka ọ̀ bụ ozugbo Chineke kere Jizọs bụ́ Ọkpara ya, ka o bidoro kụziwere ya ihe. (Kọl. 1:15) Ọkpara Chineke na Nna ya nọrọ n’eluigwe ọtụtụ afọ a na-enweghị ike ịgụta ọnụ. O ji oge ahụ na-ege Nna ya, bụ́ “Onye Ozizi Ukwu,” ntị ma na-ahụ otú o si eme ihe. (Aịza. 30:20) Jizọs si otú ahụ mụta àgwà nna ya, ihe ndị nna ya na-eme, na ihe ndị bụ́ nzube nna ya. Ihe ndị a ọ mụtara enweghị atụ.

5. Gịnị ka Jehova kụziiri Ọkpara ya nke ga-enyere ya aka n’ozi ọ ga-eje n’ụwa?

5 Jehova mechakwara kụziere Ọkpara ya otú ọ ga-esi jee ozi ya n’ụwa. Lebagodị anya n’ihe Aịzaya kwuru banyere otú  Onye Ozizi Ukwu ahụ na Ọkpara ya si emekọ ihe. (Gụọ Aịzaya 50:4, 5.) Aịzaya kwuru na Jehova ‘na-akpọte Ọkpara ya kwa ụtụtụ.’ Ihe atụ a dị ka ebe onye nkụzi na-akpọte nwa akwụkwọ ya n’isi ụtụtụ ka ọ kụziere ya ihe. Otu akwụkwọ na-akọwa okwu ndị dị na Baịbụl kwuru, sị: ‘E nwere ike ịsị na Jehova na-akpọrọ Jizọs kụziere ya ihe, otú ahụ onye nkụzi si akụziri nwa akwụkwọ ya ihe n’ụlọ akwụkwọ. Jehova kụziiri Jizọs ihe ọ ga-akụziri ndị mmadụ na otú ọ ga-esi akụziri ha ihe ndị ahụ.’ Mgbe Jehova na-akụziri Jizọs ihe n’eluigwe, ọ kụziiri ya ‘ihe ọ ga-akọ na ihe ọ ga-ekwu.’ (Jọn 12:49) Jehova gwara Ọkpara ya otú ọ ga-esi akụziri ndị mmadụ ihe. * N’oge Jizọs nọ n’ụwa, ihe ndị ahụ Nna ya kụziiri ya nyeere ya aka ije ozi ya nke ọma. O nyekwaara ya aka ịkụziri ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi na-eje ozi ha nke ọma.

6, 7. (a) Olee ihe Jizọs kụziiri ndịozi ya? Oleekwa otú ihe a ọ kụziiri ha si nyere ha aka? (b) Olee ihe Jizọs na-akụziri anyị taa?

6 Ka anyị leba anya ugbu a n’ihe Jizọs kụziiri ndịozi ya. Na Matiu isi iri, Jizọs gwara ha otú ha ga-esi eje ozi ha. Ihe ụfọdụ ọ gwara ha bụ: ebe ha ga-ezi ozi ọma (amaokwu nke 5 na nke 6), ihe ha ga-ezi ndị mmadụ (amaokwu nke 7). Ọ gwakwara ha ka ha tụkwasị Jehova obi (amaokwu nke 9 na nke 10), ihe mbụ ha ga-agwa ndị ha chọrọ izi ozi ọma (amaokwu nke 11 ruo na nke 13), ihe ha ga-eme ma a jụ ige ha ntị (amaokwu nke 14 na nke 15), nakwa ihe ha ga-eme ma a kpagbuwe ha (amaokwu nke 16 ruo na nke 23). * Ihe ndị a Jizọs kụziiri ndịozi ya nyeere ha aka n’oge ahụ ịhazi otú e si ekwusa ozi ọma.

7 N’oge anyị a kwa, Jizọs, bụ́ Eze nke Alaeze Chineke, gwara anyị kwusaa “ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile.” Ozi ọma a ọ gwara anyị na-ekwusa kacha ihe ọ bụla ọzọ mkpa. (Mat. 24:14) Eze anyị a ọ̀ kụzierela anyị otú anyị ga-esi na-ezi ozi ọma a? Ee. Ọ nọ n’eluigwe na-ahụ na a na-akụziri anyị otú anyị ga-esi ezi ndị nọ n’ebe dị iche iche ozi ọma. Ọ na-ahụkwa na a na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-arụ ọrụ anyị n’ọgbakọ.

A Na-akụziri Anyị Otú Anyị Ga-esi Na-ezi Ozi Ọma

8, 9. (a) Olee ihe kacha mkpa mere e ji malite inwe Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke? (b) Olee otú ọmụmụ ihe etiti izu sirila nyere gị aka izi ozi ọma nke ọma?

8 Kemgbe ọtụtụ afọ, nzukọ Jehova na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-ezi ozi ọma. A na-akụziri anyị ihe a ná mgbakọ anyị dị iche iche, nakwa n’ọmụmụ ihe. Nzukọ Ije Ozi so n’ọmụmụ ihe ndị a. Ma, malite n’ihe dị ka afọ 1941, ụmụnna ndị nọ n’isi ụlọ ọrụ anyị na-ahazi ọrụ anyị bidoro ịhazi ụlọ akwụkwọ dị iche iche a na-anọ akụziri anyị ihe.

9 Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. N’isi nke iri na isii n’akwụkwọ a, anyị kwuru na a malitere inwe ụlọ akwụkwọ a n’afọ 1943. Ihe mere e ji malite ya ọ̀ bụ naanị ka a kụziere anyị otú anyị ga-esi na-ekwu okwu nke ọma n’ọgbakọ? Mba. Ihe kacha mkpa mere e ji malite inwe ụlọ akwụkwọ a bụ iji kụziere anyị otú anyị nwere ike isi zie ndị mmadụ ozi  ọma, nke bụ́kwanụ otu ụzọ anyị si eto Jehova. (Ọma 150:6) Ụlọ akwụkwọ a na-enyere ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị nọ na ya aka ka ha na-ekwusa ozi ọma nke ọma.

10, 11. Olee ndị a na-akpọ taa ka ha gaa Ụlọ Akwụkwọ Gilied? Olee ihe mere e ji enwe ya?

10 Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Ụlọ akwụkwọ a malitere n’abalị mbụ nke ọnwa Febụwarị afọ 1943. Ihe e bu n’obi malite ụlọ akwụkwọ a bụ ịzụ ndị ọsụ ụzọ na ndị ọzọ nọ n’ozi oge niile ka ha bụrụ ndị ozi ala ọzọ. Ma, kemgbe Ọktoba afọ 2011, ọ bụ naanị ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na ndị nwunye ha, ndị na-eje ozi na Betel, na ndị ozi ala ọzọ na-agabeghị ụlọ akwụkwọ a ka a na-azụ na ya.

11 Olee ihe e bu n’obi na-akụzi ihe ndị a na-akụzi n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied? Otu nwanna nwoke na-akụzi ihe n’ụlọ akwụkwọ a kemgbe ọtụtụ afọ kwuru, sị: “Ọ bụ iji mee ka ndị bịara ụlọ akwụkwọ a mụọ Okwu Chineke nke ọma ka okwukwe ha sikwuo ike. Ọ bụkwa iji nyere ha aka ịna-akpa àgwà ndị ga-eme ka ha nọsie ike n’ozi ha n’agbanyeghị nsogbu ndị nwere ike ịbịara ha. Ihe ọzọkwa bụ ka e mee ka ikwusa ozi ọma na-agụsi ha agụụ ike.”—Efe. 4:11.

12, 13. Olee ike Ụlọ Akwụkwọ Gilied kparala n’ozi ọma anyị na-ezi n’ụwa niile? Nye ihe atụ.

12 Olee ike Ụlọ Akwụkwọ Gilied kparala n’ozi ọma a anyị na-ezi n’ụwa niile? Kemgbe afọ 1943 e bidoro ụlọ akwụkwọ a, a zụọla ihe karịrị puku mmadụ asatọ na narị mmadụ ise na ya. * Ndị ozi ala ọzọ a zụrụla n’ụlọ akwụkwọ a na-eje ozi n’ihe karịrị otu narị mba na iri asaa. Ndị ozi ala ọzọ na-eme ihe a kụziiri ha n’ụlọ akwụkwọ a. Ha na-ekwusasi ozi ọma ike, na-enyekwara ụmụnna ndị ọzọ aka ka ha na-eme otú ahụ. Ọ bụ ndị ozi ala ọzọ na-ahazi ozi ọma a na-ezi n’ọtụtụ ebe a na-enweghị ndị nkwusa ma ọ bụkwanụ n’ebe e nwere ndị nkwusa ole na ole.

13 Ụdị ihe a mere na Japan mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ. N’oge ahụ, ụmụnna ndị bi n’obodo a kwụsịrị ịga ozi ọma. N’ihe dị ka Ọgọst afọ 1949, ndị nkwusa e nwere na Japan erughị mmadụ iri. Ma tupu afọ ahụ agwụ, e nweela ndị ozi ala ọzọ iri na atọ a zụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied nọ na-ekwusasi ozi ọma ike na Japan. E mechakwara zitekwuo ndị ozi ala ọzọ na Japan. Mgbe ha malitere ozi na Japan, ọ bụ naanị n’obodo ndị mepere emepe ka ha na-ekwusa ozi ọma. Ha mechakwara gawa n’obodo ndị ọzọ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. Ha na-agbasi ndị ha na-amụrụ Baịbụl ume ike ka ha jisie ike banye n’ozi oge niile ma ha mee baptizim. Ha na-agbakwa ụmụnna ha ume ka ha bụrụ ndị ọsụ ụzọ. Mbọ niile a ndị ozi ala ọzọ gbara na Japan efughị ọhịa. Ndị nkwusa e nwere taa na Japan karịrị narị puku abụọ na puku iri na isii. Ihe dị ka ndị nkwusa abụọ n’ime ndị nkwusa ise ọ bụla e nwere na Japan taa bụ ndị ọsụ ụzọ oge niile. *

14. Gịnị ka ụlọ akwụkwọ ndị e nwere ná nzukọ Jehova na-egosi? (Gụọ ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “ Ụlọ Akwụkwọ Ndị E Ji Azụ Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma.”)

14 Ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ e nwere ná nzukọ Jehova. Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ, Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka  Ụmụnna Lụrụ Di na Nwunye, na Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Na-alụbeghị Nwaanyị na-enyere ndị gara ha aka ka ha jiri ofufe Chineke kpọrọ ihe. Ọ na-enyekwara ha aka iji ozi ọma kpọrọ ihe. * Ụlọ akwụkwọ a niile e nwere ná nzukọ Jehova na-egosi na Eze anyị enyela anyị ihe niile ga-enyere anyị aka ije ozi anyị nke ọma.—2 Tim. 4:5.

Otú E Si Azụ Ụmụnna Nwoke Ka Ha Nwee Ike Ịrụ Ọrụ Ndị E Nwere ná Nzukọ Jehova

15. Olee otú ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi ga-esi na-eme ka Jizọs?

15 Ì chetara ihe ahụ Aịzaya kwuru banyere otú Chineke si kụziere Jizọs ihe? Jizọs mụtara ‘otú ọ ga-esi aza onye ike gwụrụ okwu,’ n’oge ahụ Chineke kụziiri ya ihe. (Aịza. 50:4) N’oge Jizọs nọ n’ụwa, o mere ihe a a kụziiri ya. O mere ka ‘ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ na ndị e boro ibu dị arọ’ nweta ume. (Mat. 11:28-30) Ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi kwesịkwara ime ka ahụ́ na-eru ụmụnna ha ala. Ọ bụ ya mere nzukọ Jehova ji hazie ụlọ akwụkwọ dị iche iche ga-enyere ha aka ijere ụmụnna ha ozi nke ọma.

16, 17. Olee ihe mere e ji enwe Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze? (Gụọkwa ihe e dere n’ala ala peeji.)

 16 Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze. Ụlọ akwụkwọ a malitere n’abalị itoolu n’ọnwa Mach afọ 1959. Ebe a nọ nwee klas nke mbụ ya bụ na Saụt Lansịn, dị na Niu Yọk. Ndị gara ya bụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na ndị ohu ọgbakọ. Ụlọ akwụkwọ a na-ewe otu ọnwa n’oge ahụ. Ọ bụ asụsụ Bekee ka e ji kụziere ndị niile bịara ya ihe. Ma, e mechara na-enwe ya n’asụsụ ndị ọzọ. E mechakwara nwewe ya n’ụwa niile. *

Ebe Nwanna Lloyd Barry na-akụzi ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze e nwere na Japan n’afọ 1970

17 Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke afọ 1962 (nke Bekee), kwuru ihe mere e ji enwe Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze. Ọ sịrị: “N’ụwa a ọtụtụ ndị na-anaghị enwe ohere, okenye ọ bụla nọ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova kwesịrị ịbụ onye na-ahazi ihe ndị ọ na-eme ka o nwee ike ilebara ndị niile nọ n’ọgbakọ anya ma na-enyere ha aka. O kwesịkwara ịna-elekọta ezinụlọ ya anya nke ọma n’agbanyeghị ọrụ ndị ọ na-arụ n’ọgbakọ. Ụlọ akwụkwọ a bụ ezigbo ihe ọma e meere ndị ohu ọgbakọ n’ụwa niile. Ha na-amụta otú ha ga-esi na-arụ ọrụ ha nke ọma otú ahụ Baịbụl kwuru ka ha na-arụ ọrụ ha.”—1 Tim. 3:1-7; Taị. 1:5-9.

18. Olee otú Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze si abara ndị Chineke niile uru?

 18 Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze abaarala ndị Chineke niile uru. Olee otú o si baara ha uru? Mgbe ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na-eme ihe a kụziiri ha n’ụlọ akwụkwọ a, ha na-eme ka ụmụnna ha nwee ume otú ahụ Jizọs mere. Obi ọ́ naghị atọ gị ụtọ ma okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi gwa gị okwu ọma, ma gee gị ntị mgbe ị na-akọrọ ya mkpa gị? Obi ọ́ naghịkwa atọ gị ụtọ ma okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi bịa na nke gị ma gbaa gị ume? (1 Tesa. 5:11) O doro anya na ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na-abara ọgbakọ ha uru.

19. Olee ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ Kọmitii Izi Ihe na-ahazi? Oleekwa ihe mere e ji enwe ụlọ akwụkwọ ndị ahụ?

19 Ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ e nwere ná nzukọ Jehova. Kọmitii Izi Ihe nke Òtù Na-achị Isi na-ahụ maka ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ e ji azụ ụmụnna nwoke na-arụ ọrụ dị iche iche n’ọgbakọ Jehova. A malitere ụlọ akwụkwọ ndị a ka e jiri ha zụọ ndị so na Kọmitii Alaka, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, na ndị okenye ọgbakọ ka ha na-arụ ọrụ ha nke ọma. Ihe ndị e ji Baịbụl na-akụziri ha n’ụlọ akwụkwọ ndị a na-enyere ha aka iji ofufe Chineke kpọrọ ihe. Ọ na-enyekwara ha aka ilekọta atụrụ Jehova nke ọma otú ahụ Akwụkwọ Nsọ kwuru. Atụrụ ndị a ha na-elekọta dị oké ọnụ ahịa n’anya Jehova.—1 Pita 5:1-3.

Ihe a bụ klas nke mbụ nke Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi e nwere na Malawi n’afọ 2007

20. Gịnị mere Jizọs ji kwuo na anyị niile bụ “ndị Jehova kụziiri ihe?” Olee ihe i kpebisiri ike ime?

20 O doro anya na Eze anyị bụ́ Mesaya na-ahụ na a na-akụziri anyị ihe nke ọma. Ihe a niile a na-akụziri anyị si n’aka Jehova n’ihi na ọ bụ ya kụziiri Ọkpara ya ihe, Ọkpara ya ana-akụzikwara anyị. Ọ bụ ya mere Jizọs ji sị na anyị niile bụ “ndị Jehova kụziiri ihe.” (Jọn 6:45; Aịza. 54:13) Eze anyị na-akụziri anyị ihe ma n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, ma n’ọmụmụ ihe ndị ọzọ anyị na-enwe n’ọgbakọ, ma n’ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ anyị kwuru okwu ha n’isiokwu a. Ka anyị niile kpebisie ike ịna-eme ihe niile a na-akụziri anyị na ha. Ka anyị cheta na ihe mere e ji na-akụziri anyị ihe ndị a karịchaa bụ ka okwukwe anyị bụrụ a kwaa akwụrụ, nakwa ka anyị nwee ike ije ozi anyị nke ọma.

^ para. 5 Olee otú anyị si mara na Chineke kụziiri Ọkpara ya otú ọ ga-esi akụziri ndị mmadụ ihe? Chebara ihe a echiche: Jizọs ji ọtụtụ ihe atụ kụzie ihe. E buru amụma ọtụtụ narị afọ tupu a mụọ ya na ọ ga-eme ihe a. (Ọma 78:2; Mat. 13:34, 35) O doro anya na Jehova, bụ́ onye amụma ahụ si n’aka, kwuru ọtụtụ narị afọ tupu a mụọ Ọkpara ya na Ọkpara ya ga-eji ihe atụ ma ọ bụ ilu kụziere ndị mmadụ ihe.—2 Tim. 3:16, 17.

^ para. 6 Mgbe ọtụtụ ọnwa gachara, Jizọs “họpụtara mmadụ iri asaa ọzọ ma zipụ ha abụọ abụọ” ka ha gaa kwusaa ozi ọma. Ọ kụzikwaara ha otú ha ga-esi eme ya.—Luk 10:1-16.

^ para. 12 Ụfọdụ ndị a kpọrọ ka ha bịa Ụlọ Akwụkwọ Gilied agaala ya mbụ.

^ para. 13 Ị chọọ ịmatakwu otú ndị ozi ala ọzọ gụrụ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ Gilied sirila kpaa ike n’ozi ọma anyị na-ezi n’ụwa niile, gụọ isi nke 23 n’akwụkwọ anyị a na-akpọ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom.

^ para. 14 Ihe a na-akpọzi Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Lụrụ Di na Nwunye na Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Na-alụbeghị Nwaanyị bụ Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze.

^ para. 16 Ndị okenye niile na-agazi Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze. Abalị ole ụlọ akwụkwọ a na-ewe n’otu oge, nwere ike ịdị iche n’oge ọzọ. Ọ na-abụkwa a nọọ afọ ole na ole, a gaa ya. Ndị ohu na-eje ozi malitere ịga ụlọ akwụkwọ a kemgbe afọ 1984.