Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke Afọ 2014

 SIERA LION NA GINI

Otú Ihe Si Kwụrụ Malite n’Afọ 2002 Ruo n’Afọ 2013 (Agba nke Mbụ)

Otú Ihe Si Kwụrụ Malite n’Afọ 2002 Ruo n’Afọ 2013 (Agba nke Mbụ)

 “Jehova, I Meela!”

Mgbe ala datụrụ jii na Siera Lion, ụmụnna anyị malitere ịlọghachi n’ụlọ ha dakasịrị adakasị. Ọgbakọ ndị mechiri emechi n’oge agha ahụ malitekwara ịmụ ihe, nke ka nke, ọgbakọ ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Siera Lion. Ọ bụ ebe ahụ ka a kacha kwaa mgbọ. Ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na-eje ozi n’otu obodo dị ebe ahụ kọrọ ihe merenụ. Ha sịrị: “N’ụbọchị mbụ anyị mụrụ ihe, anyị dị mmadụ iri na isii. N’ụbọchị nke abụọ, anyị dị mmadụ iri atọ na isii. N’ụbọchị nke atọ ya, anyị dị mmadụ iri ise na isii. N’ụbọchị Ncheta Ọnwụ Jizọs, mmadụ iri asaa na asaa bịara. Obi tọrọ anyị ezigbo ụtọ.” E hiwere ọgbakọ itoolu ọzọ. Ọgbakọ niile e nwere ebe ahụ dịzi iri abụọ na anọ. E zitekwuru ụmụnna iri bụ́ ndị ozi ala ọzọ. Ha mere ka ọrụ ikwusa ozi ọma biri ọkụ. Ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs n’afọ 2004 dị puku asaa, narị ise na iri itoolu na anọ. Ndị a bịaranụ ji okpukpu ise karịa mmadụ ole bụ́ ndị nkwusa. Ọtụtụ mmadụ batakwara n’ọgbakọ na Gini otú ahụ ha si bata na Siera Lion.

Òtù Na-achị Isi nyeere ụmụnna ndị ahụ aka ozugbo ha lọtara. Ha nyere ha ego ha ji malitekwa ndụ. (Jems 2:15, 16) Ụmụnna anyị ndị wepụtara onwe ha ịgbatara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka gara na Koindu rụzigharịa ụfọdụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, rụọkwa ndị ọhụrụ. Ma ndị nke a rụzigharịrị, ma ndị nke a rụrụ ọhụrụ, dị iri na abụọ. Ha rụzigharịkwara otu Ụlọ Mgbakọ na Koindu. Ha rụkwaara ụmụnna ndị ụlọ ha mebiri n’oge agha ụlọ ọhụrụ iri anọ na abụọ. E nwere otu nwanna nwaanyị di ya nwụrụ a rụụrụ ụlọ ọhụrụ. Nwanna nwaanyị a akarịala afọ iri asaa. Mgbe a rụchaara ya ụlọ a, ọ bịara guzoro otu ebe na-ele ya. Ka ọ na-ele ya, ọṅụ juru ya obi, anya mmiri amalite ịgba ya. Ya asị: “Jehova, I meela. Jehova, I meela. Ụmụnna m, unu emeela!”

Alaka ụlọ ọrụ dị na Siera Lion malitere ịrụrụ ọgbakọ dị iche  iche Ụlọ Nzukọ Alaeze na Siera Lion. Ọ bụ n’ego e ji na-arụrụ ọgbakọ ndị nọ n’obodo ndị na-enwechaghị ego Ụlọ Nzukọ Alaeze, ka ha ji malite ịrụ ya. Nwanna Saidu Juanah, bụ́ okenye n’ọgbakọ Bo West, kọrọ otu ihe merenụ. Ọ sịrị: “Otu nwanna nwaanyị sịrị m: ‘Ụbọchị ọ bụla a mara ọkwa na a na-aga ịrụrụ anyị Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ, m ga-akụ aka, wụlie elu, gbaa egwú.’ Otu ụbọchị anyị bịara ọmụmụ ihe, m mara ọkwa na a na-aga ịrụrụ anyị Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ. Ozugbo m mara ọkwa ahụ, nwanna nwaanyị ahụ esi n’oche ya malie, bido kụwa aka, wụliwe elu, na-agba egwú otú ahụ o kwuru na ya ga-eme.”

N’afọ 2010, ọgbakọ Wọtaluu nyefere Chineke Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ ha rụrụ. A ga-ejikwa ya na-enwe mgbakọ. Ọ ga-aba narị mmadụ asatọ. Ụbọchị ọgbakọ Wọtaluu bịara ịkwụ ụgwọ ala Ụlọ Nzukọ Alaeze a, e nwere onye ọzọ bịakwara ịzụ ya. Ego ole onye a kwere ịkwụ n’ala ahụ karịrị ego ole onye nwe ala ahụ gwara ọgbakọ kwụọ ya. Ma onye nwe ala ahụ kwuru, sị, “Ọ kaara m mma ka ndị ga-anọ n’ala m na-amụ Okwu Chineke zụọ ya karịa ndị ga-anọ na ya na-achụ ego.”

Kemgbe ahụ e bidoro ịrụrụ ụmụnna ndị nọ n’obodo ndị na-enwechaghị ego Ụlọ Nzukọ Alaeze, a rụọla Ụlọ Nzukọ Alaeze iri na asaa na Siera Lion, rụọkwa isii na Gini. Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị a mara mma, ha ebughịkwa oké ibu. Ha emeekwala ka ọtụtụ ndị bịawa ọmụmụ ihe.

Ịchọta Atụrụ Jehova Ndị Furu Efu

Mgbe ụmụnna malitekwara ijechi ozi ọma anya, alaka ụlọ ọrụ wepụtara ọnwa abụọ ka ọgbakọ dị iche iche gaa kwusaa ozi ọma n’obodo ndị a na-anaghị ezikarị ozi ọma na ha. Ụmụnna ndị garanụ nyere ndị mmadụ ihe dị ka puku akwụkwọ iri na ise. Ha kọkwara akụkọ ọma gbasara ihe ndị mere n’ebe ndị ahụ. Ụfọdụ ndị jụrụ ma Ndịàmà Jehova hà ga-enwe ọgbakọ n’ime obodo ndị ahụ. Ihe a ha jụrụ mere ka e hiwe ọgbakọ ọhụrụ abụọ n’ebe ahụ. Mgbe ụmụnna na-ekwusa ozi ọma n’otu n’ime obodo ndị ahụ, ha hụrụ ụmụnna nwaanyị abụọ gbatara ọsọ ndụ n’obodo ahụ. Ụmụnna nwaanyị ndị a amakwaghị nke a na-akọ n’ọgbakọ n’ihi na o nweghị ọgbakọ dị ebe  ahụ ha bi. Ụmụnna ndị gara ozi ọma ebe ahụ mere ngwa ngwa malite inwe ọmụmụ ihe ebe ahụ. Ha malitekwara ịkụziri ọtụtụ ndị Baịbụl.

N’afọ 2009, alaka ụlọ ọrụ nụrụ na e nwere ndị bi n’otu ime ime obodo dị na Gini. Ụfọdụ n’ime ha na-ekwu na ha bụ Ndịàmà Jehova. Alaka ụlọ ọrụ zigara ụfọdụ ụmụnna ebe ahụ ka ha chọpụta ma ọ̀ bụ eziokwu. Mgbe ụmụnna ndị a ruru, ndị obodo ahụ gwara ha na e nwere otu agadi nwoke onye obodo ahụ bụ Onyeàmà Jehova tupu ya anwụọ. Ha sị na Nwanna a lọtara ezumike nká. Ya na ụfọdụ ndị obodo ahụ mụrụ Baịbụl tupu ya anwụọ. Otu n’ime ndị ya na ha mụrụ Baịbụl mechara fewe Jehova ma malite ịkụziri ndị ọzọ Baịbụl. Ya na ha na-enwekwa ọmụmụ ihe. Nwoke a na-eji akwụkwọ nwanna nwoke ahụ nwụrụ anwụ akụziri ha ihe n’ọmụmụ ihe. Ya na ndị ahụ ọ na-amụrụ Baịbụl efeela Jehova afọ iri abụọ tupu otu nwanna amata na ha nọ ebe ahụ. Mgbe alaka ụlọ ọrụ nụrụ ihe a, ha zigara otu nwanna ozugbo ka ọ gaa kụzikwuoro ha banyere Jehova. N’afọ 2012, otu narị mmadụ na iri mmadụ asaa na mmadụ abụọ bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs n’obodo ahụ.

Kemgbe afọ ole na ole gara aga, a chọtala ọtụtụ ‘atụrụ furu efu.’ Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị ji aka ha hapụ ọgbakọ, ndị nke ọzọ bụ ndị a chụrụ achụ. Ọtụtụ n’ime ha ahapụla àgwà ọjọọ ha na-akpa ma bataghachi n’ọgbakọ. Ụmụnna anyị ji obi ha niile nabata ha.—Luk 15:11-24.

Ụfọdụ Ndị Alakụba Batara n’Ọgbakọ

Mgbe Pọl na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma, ‘ọ ghọrọ ihe niile n’ebe ụdị mmadụ niile nọ.’ (1 Kọr. 9:22, 23) Ihe ahụ o mere ka ụmụnna nọ na Siera Lion na Gini na-emekwa. Otú ha si ezi otu ndị ozi ọma na-adị iche n’otú ha si ezi ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị Siera Lion na ndị Gini bụ ndị Alakụba. Ugbu a, ka anyị leba anya n’otú ụmụnna anyị ụfọdụ si na-ezi ndị Alakụba ozi ọma.

Nwanna Saidu Juanah kwuru otú ọ na-esi ezi ndị Alakụba ozi ọma. Nwanna a bụbu onye Alakụba. O kwuru, sị: “Ndị Alakụba kweere na e si n’ájá kee Adam. Ha kwekwaara na  Adam bu ụzọ biri na paradaịs dị n’eluigwe tupu ya amalite ibi n’ụwa. Otú m si agwa ha okwu ka ha nwee ike ịghọta nke bụ́ eziokwu bụ ịjụ ha sị, ‘Olee ebe ájá dị, ọ̀ bụ n’eluigwe ka ọ̀ bụ n’ụwa?’

“Ha asị: ‘Ọ bụ n’ụwa.’

“Mụ ajụzie ha sị: ‘Oleezi ebe unu chere e kere Adam?’

“Ha asịzie na ‘ọ bụ n’ụwa.’

“M na-agụziri ha Jenesis 1:27, 28 ka ha nwee ike ịghọta ihe m na-ekwu. M gụchaa mụ ajụọ ha sị, ‘Ndị bi n’eluigwe hà na-amụ ụmụ?’

“Ha asị: ‘Mba, na ndị mmụọ ozi enweghị nke bụ́ nwoke ma ọ bụ nwaanyị.’

“M na-ajụzi ha sị: ‘Olee ebe unu chere Adam na Iv nọ mgbe Chineke gwara ha ka ha mụọ ụmụ?’

“Ha na-asị na ‘ọ bụ n’ụwa.’

“Mụ ajụọ ha sị: ‘Oleezi ebe unu chere Paradaịs ga-adị ma Chineke weghachi ya?’

“Ha asị na ‘ọ bụ n’ụwa.’”

Nwanna Saidu kwuziri, sị: “Otú a m si ezi ndị Alakụba ozi ọma na-eme ka ọtụtụ n’ime ha chọrọ ịma nke bụ́ eziokwu na-ege ntị ma na-anata m akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl.”

E nwere otu onye Alakụba mechara bụrụ Onyeàmà Jehova. Aha ya bụ Momoh. Ọ na-ere ahịa. Otu n’ime ihe ndị ọ na-ere bụ sịga. Ọ chọrọ ịghọ Imam, ya bụ, onye ndú ndị Alakụba. Otu ụbọchị ya na otu onye ozi ala ọzọ kwurịtara ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ, ọ bịara chọkwuo ịma nke bụ́ eziokwu. Mgbe a gwara ya gbasara mgbakọ sekit a ga-enwe, ọ bịara ma nọtụ laa. Ihe ọ nụrụ ná mgbakọ ahụ tọrọ ya ụtọ. Mgbe ụbọchị anọ gachara, ya na nwunye ya Ramatu na ụmụ ya ise bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs. Mgbe ha lọtara, Momoh na Ndịàmà Jehova maliteziri ịmụchi Baịbụl anya. Mgbe ya na ha mụrụ Baịbụl ọtụtụ ugboro, ọ kwụsịrị ire sịga. Ọ gwara ndị ahịa ya na sịga na-akpata ọrịa. Ọ gwakwara ha na onye na-efe Chineke ekwesịghị ịṅụ sịga. Ọ malitekwara ịkụziri nwunye ya na ụmụ ya ihe n’ebe ọ na-ere ahịa. Ọ bụrụ na ndị mmadụ abịa ịzụ ihe mgbe ya na ndị ezinụlọ  ya na-amụ Baịbụl, ọ na-agwa ha ka ha chere ka ha mụchaa ma ọ bụkwanụ ha esoro ha mụọ ihe. Ọ na-agwakwa ha na ọmụmụ ihe ahụ dị ya na ezinụlọ ya ezigbo mkpa. Mgbe ya na nwunye ya lụrụ otú iwu kwuru, obi gbawara ndị ikwu ha. Momoh na Ramatu nwunye ya katara obi na-ekwusara ndị ikwu ha ozi ọma n’agbanyeghị na obi adịghị ha mma. Ma, ha mechara kwuwe okwu ọma gbasara Momoh na nwunye ya n’ihi àgwà ọma ha. E mere Momoh baptizim n’afọ 2008, meekwa nwunye ya n’afọ 2011.

Irube Isi n’Iwu Chineke Nyere Banyere Ọbara

Ndịàmà Jehova na-akata obi erubere Chineke isi n’ihe niile. Ha anaghị eri ọbara, ha anaghịkwa ekwe ka a mịnye ha ọbara. (Ọrụ 15:29) Ọ bụ ya mere ọtụtụ ndị dọkịta nọ na Siera Lion na Gini anaghị esi ọnwụ na a ga-amịnye ha ọbara.

Ebe ụmụnna na-akasi nwanna nwaanyị obi n’ụlọ ọgwụ

N’afọ 1978, ụmụnna anyị kesaara ndị dọkịta, ndị nọọsụ, ndị  isi ụlọ ọgwụ, ndị ọkàiwu na ndị ọkàikpe niile nọ na Siera Lion otu akwụkwọ anyị kwuru gbasara mmịnye ọbara. Aha akwụkwọ a bụ Jehovah’s Witnesses and the Question of Blood. O teghị aka ha kesachara akwụkwọ a, ime emewe otu nwanna nwaanyị, ọbara ana-agbakwa ya n’ime afọ. Mgbe e bugara ya ụlọ ọgwụ, ndị dọkịta kwuru na ha agaghị agwọ ya n’amịnyeghị ya ọbara. Ka ihe a na-eme, otu dọkịta kwetara ịgwọ ya n’amịnyeghị ya ọbara n’ihi na ọ mụtara ọtụtụ ihe baara ya uru n’akwụkwọ ahụ e kesaara ha. Nwanna nwaanyị ahụ mechara mụọ agadaga nwa nwoke, mechaakwa gbakee.

N’ihe dị ka afọ 1991, otu dọkịta aha ya bụ Bashiru Koroma gụrụ akwụkwọ anyị bụ́ How Can Blood Save Your Life? Dọkịta a na-awa ahụ́ n’ụlọ ọgwụ dị na Kenema. Ihe ọ gụtara n’akwụkwọ a tọrọ ya ụtọ. Ya na Ndịàmà Jehova mụwara Baịbụl, ọ malitekwara bịawa ọmụmụ ihe. Mgbe otu nwata nwoke Onyeàmà Jehova dị afọ itoolu nwere ihe mberede, merụọ ezigbo ahụ́ n’afọ, e bugara ya ụlọ ọgwụ. Ndị dọkịta kwuru na ha agaghị agwọ ya n’amịnyeghị ya ọbara. Ha gwara nne na nna nwa a ka ha kpọrọ ya lawa ka ọ nọrọ n’ụlọ ha nwụọrọ onwe ya. Nne na nna nwa a buuru ya gakwuru Koroma, ya agwọọ ya n’amịnyeghị ya ọbara.

Koroma mechara ghọọ nwanna. Ọ na-agwa ndị ọzọ hoo haa na ọ kacha mma ịgwọ onye ọrịa n’amịnyeghị ya ọbara. Ndị dọkịta ibe ya na-akatọ ya n’ihi ihe a ọ na-agwa ha. N’agbanyeghị okwu ọjọọ ha na-agwa ya, ọ na-agwọ ndị ọrịa na-amịnyeghị ha ọbara. Ndị ahụ niile ọ na-agwọ na-agbakekwa. Ụfọdụ ndị dọkịta ibe ya mechara bịakwutewe ya ma na-agwa ya ka ọ kụziere ha otú e si awa mmadụ ahụ́ n’amịnyeghị onye ahụ ọbara.

Kemgbe afọ 1994, n’alaka ụlọ ọrụ dị na Fritaụn, Ngalaba Na-enyere Ụmụnna Aka n’Okwu Gbasara Mmịnye Ọbara ehiwela Kọmitii Ndị Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ n’ọtụtụ ebe na Siera Lion nakwa na Gini. Ụmụnna ndị so na kọmitii a enyerela ọtụtụ ụmụnna anyị na-arịa ọrịa aka. Ha emeekwala ka ọtụtụ ndị dọkịta gwọọ ụmụnna anyị n’amịnyeghị ha ọbara.