Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke Afọ 2014

 SIERA LION NA GINI

‘Ime Ka Ọtụtụ Mmadụ Bụrụ Ndị Ezi Omume’ n’Afọ 1945 Ruo n’Afọ 1990​—⁠Dan. 12:⁠3. (Agba nke Atọ)

‘Ime Ka Ọtụtụ Mmadụ Bụrụ Ndị Ezi Omume’ n’Afọ 1945 Ruo n’Afọ 1990​—⁠Dan. 12:⁠3. (Agba nke Atọ)

Otú Anyị Si Merie Òtù Nzuzo A Na-akpọ Poro

Ebe mbụ a malitere inye Ndịàmà Jehova nsogbu bụ n’otu ime obodo dị nso na Koindu. N’obodo ahụ, e nwere ụmụ nwoke ole na ole ha na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl, ha na-agachikwa ọmụmụ ihe anya. Ma, ha nọ n’òtù nzuzo a na-akpọ Poro. Ọtụtụ ụmụ nwoke ndị Kisi na-anọ n’òtù nzuzo a. Ndị òtù a kpọrọ akpọ n’ịgwọ ọgwụ. E nwere ihe otu nwanna aha ya bụ James Mensah kọrọ merenụ. Nwanna a gara ụlọ akwụkwọ Gilied, jeekwa ozi na Siera Lion. Ọ kọrọ, sị: “Mgbe ndị a na-amụ Baịbụl kwuru na o nwekwaghị ihe jikọrọ ha na òtù nzuzo a ha nọ na ya, obi gbawara onyeisi ha. Onyeisi ha a na ndị òtù ya fọrọnụ kụrụ ụmụnna ndị ahụ isi aba okpu, kwakọrọ ngwongwo ha, kpọọkwa ụlọ ha ọkụ. Ha kere ha eriri ụkwụ na aka ma hapụ ha n’ime ọhịa ka ha nọrọ ebe ahụ nwụọ. Eze obodo ahụ gwara ha gawa n’ihu na ya kwụ ha n’azụ. N’agbanyeghị ọnụ a a na-emekpọ ndị a ha na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl, ha kwụsiri ike.”

Mgbe ụmụnna anyị nọ na Koindu kọọrọ ndị uwe ojii ihe na-emenụ, ha gara kpọchie ma onyeisi ndị òtù nzuzo a, ma  ndị òtù ya, ma eze obodo ahụ. E kpere ha ikpe, baakwara ha ezigbo mba. A chụturu eze obodo ahụ. Ọ bụkwaghị eze ruo ihe fọrọ obere ka o ruo otu afọ. Akụkọ ihe a e mere ha gbasara ebe niile. Ihe a mere ka obi kaa ọtụtụ ndị a na-amụrụ Baịbụl ha abịawa ọmụmụ ihe. Eze obodo ahụ mechara lewe anyị anya ọma, kwetakwa ka anyị mụwara ya Baịbụl. Mgbe e nwere mgbakọ sekit n’obodo ya, o kwere ka ụfọdụ ụmụnna biri n’ụlọ ya. O nyedịrị anyị otu nnukwu ehi.

Ụfọdụ ndị isi òtù nzuzo ahụ bịaziri jiri ‘iwu na-akpa nkata inye anyị nsogbu.’ (Ọma 94:20) Mgbe Ndị Omeiwu nwere nnọkọ, ndị òtù Poro so ná Ndị Omeiwu kwuru ka a machie Ndịàmà Jehova ịna-ekwusa ozi ọma. Nwanna Charles Chappell kwuru, sị: “Ma, eze obodo ahụ kwuchitere ọnụ anyị. Ọ gwara ha na ya na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl kemgbe afọ abụọ. Ọ gwakwara ha na Ndịàmà Jehova anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa na ha na-akụziri ndị mmadụ otú e si agụ na otú e si ede, na-enyekwara ha aka ịna-akpa àgwà ọma. Ọ gwadịrị ha na ya nwere ike ịbụ Onyeàmà Jehova otu ụbọchị. Otu Onye Omeiwu ya na Ndịàmà Jehova mụrụla Baịbụl kwukwara na ihe niile eze ahụ kwuru bụ eziokwu. Otú a ka okwu ahụ si nyụọ ka ọkụ.”

Ọ na-abụ ha jụ inye ya nri, ha asị ya, “Gazie ka Chineke nye gị nri!”

Ihe adịrịghị ụmụnna ndị ahụ hapụrụ òtù nzuzo ahụ mfe. Ndị ezinụlọ ha chiri ha ọnụ n’ala. Otu n’ime ha bụ otu nwa okorobịa aha ya bụ Jonathan Sellu. Ọ bụ onye Koindu. Ndị nna nna Jonathan ji isi arụsị obodo ha. A malitere ịkụziri Jonathan ihe ndị ọ ga-eme ma ọ ghọọ onyeisi arụsị a. Mgbe ya na Ndịàmà Jehova bidoro ịmụ Baịbụl, ọ tụfuru ihe niile o ji agba afa. Ndị ụlọ ha kwụsịrị ịzụ ya n’akwụkwọ, kwụsịkwa inye ya nri n’ụbọchị ọ bụla ọ gara ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Ọ na-abụ ha jụ inye ya nri, ha asị ya, “Gazie ka Chineke nye gị nri!” Ma, Jonathan akwụsịghị ịna-aga ọmụmụ ihe. O nweghịkwa mgbe ọ gbara ọnụ. Ọ mụtakwara otú e si agụ na otú e si ede, mechaakwa bụrụ onye ọsụ ụzọ oge niile. Obi tọkwara ya ụtọ mgbe mama ya mechara ghọọ Onyeàmà Jehova.

 Ebe Ndị Ọzọ E Hiwere Ọgbakọ

N’afọ 1960, e hiwere ọgbakọ n’obodo dị iche iche, nweekwa ìgwè ndị nọ n’ebe ụfọdụ ọgbakọ na-adịghị. Obodo ndị ahụ bụ Bo, Fritaụn, Kisi, Koindu, Lunsa, Magburaka, Makeni, Moyamba, Pọt Loko, Wọtaluu, nakwa Kabala. N’afọ ahụ, ndị nkwusa e nwere bịara hiekwuo nne. Ha dịbu otu narị mmadụ na iri mmadụ asatọ na abụọ, ma mechaa ruo narị mmadụ abụọ na iri asatọ na abụọ n’otu afọ ahụ. Ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche si Gana na Naịjirịa bịa ka ha nyekwuoro ọgbakọ ndị ahụ aka ịkwụsi ike.

Ọtụtụ n’ime ndị nkwusa ọhụrụ a bụ ndị Krio na ndị Kisi. Ndị Krio bi na Fritaụn nakwa n’obodo ndị dị nso na Fritaụn. Ndị Kisi bikwanụ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Siera Lion. Ụmụnna anyị kwusakwaara ndị Kuranko, ndị Limba, ndị Temne, ndị Mende, nakwa ndị ọzọ ozi ọma. Ụfọdụ ndị bi n’obodo ndị a bidoro batawa n’ọgbakọ.

N’afọ 1961, ọgbakọ Fritaụn Ist nyefere Chineke Ụlọ Nzukọ Alaeze ha. Ọgbakọ Koindu nyefekwara Chineke Ụlọ Nzukọ Alaeze ha ji brik rụọ. Ụlọ Nzukọ Alaeze a ga-aba narị mmadụ atọ, a ga-anọkwa na ya na-enwe mgbakọ. Obere oge e nyefechara ya Chineke, ndị okenye iri anọ nọ na ya nwee Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze. Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze a bụ nke mbụ a na-enwe na Siera Lion. Ihe ọzọ magburu onwe ya ụmụnna mere n’afọ ahụ bụ na ha kesaara ọhaneze Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ.

Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze e nwere n’afọ 1961 na Siera Lion. William Nushy (nọ n’etiti ndị guzo n’azụ azụ). Charles Chappell (so ná ndị guzo n’etiti. Ọ bụ onye nke abụọ ma e si n’aka nri gụrụ gawa). Reva Chappell (so ná ndị nọ ọdụ n’ihu. Ọ bụ onye nke atọ ma e si n’aka nri gụrụ gawa)

O doro onye ọ bụla anya na Jehova na-eme ka ọrụ ndị ohu ya na-arụ na-aga nke ọma. N’abalị iri abụọ na asatọ n’ọnwa asaa, n’afọ 1962, gọọmenti Siera Lion debara aha e ji mara Ndịàmà Jehova n’ọtụtụ obodo n’akwụkwọ ha. Aha ahụ bụ Òtù Ndị Mmụta Bible nke Mba Niile.

Ozi Ọma Ebiri Ọkụ na Gini

Ugbu a, ka anyị lebazie anya n’otú e si kwusaa ozi ọma n’obodo Gini n’oge ahụ. Ihe a na-akpọ Gini n’oge ahụ bụ  French Gini. Tupu afọ 1958, ụmụnna ole na ole kwusatụụrụ ụfọdụ ndị bi n’obodo ndị ha si na ha na-agafe ozi ọma. Ma, ndị French na-achị Gini achọghị iji anya ahụ Ndịàmà Jehova ebe ha na-ekwusa ozi ọma. E nwekwara otu ihe mere n’afọ 1958. N’afọ ahụ ka ndị Gini malitere ịchị onwe ha. Ihe a merenụ mere ka ozi ọma biri ọkụ na Gini.

Ná ngwụcha afọ 1958, Nwanna Manuel Diogo si Dahomi, nke a na-akpọ Bene Rịpọblik ugbu a, kwaga n’obodo Fria, dị na Gini. Isi n’obodo Fria gaa Kọnakrị, bụ́ isi obodo Gini, dị kilomita iri asatọ. Nwanna Manuel bidoro ịrụ ọrụ n’ebe a na-egwute ihe e ji eme alụminiọn na Fria. Ọ dị ihe dị ka afọ iri atọ na atọ. Ọ na-asụkwa asụsụ French. Ọ chọsiri ike ikwusara ndị Fria ozi ọma n’ihi na e zitụbeghị ozi ọma ebe ahụ.  Nwanna Manuel degaara alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Frans akwụkwọ ka ha butere ya akwụkwọ, nakwa ka ha zite ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ga-enyere ya aka. Ihe ikpeazụ o dere n’akwụkwọ ozi ya ahụ bụ: “Ana m arịọ Jehova ka ọ gọzie ozi ọma a ga-ekwusa n’obodo a maka na ọtụtụ ndị chọrọ ịmụ Baịbụl.”

Alaka ụlọ ọrụ ahụ dị na Frans degaara Nwanna Manuel akwụkwọ ozi. N’akwụkwọ ozi ahụ, ha jara ya mma ma gwa ya ka ọ nọtụkwuo na Gini. Ha zigakwara onye ọsụ ụzọ pụrụ iche ka ọ kụziere ya otú e si ekwusa ozi ọma. Ihe ahụ ha gwara Nwanna Manuel gbara ya ume. O mekwara ka o jechie ozi ọma anya n’obodo Fria ruo mgbe ọ nwụrụ n’afọ 1968.

N’afọ 1960, Nwanna Wilfred Gooch, bụ́ onye nlekọta zoonu, bịara na Kọnakrị. Mgbe o rutere, ọ chọpụtara na e nwere ụmụnna abụọ ọzọ bụ́ ndị Afrịka nọ na-ekwusa ozi ọma ebe ahụ. Mgbe ọ laghachiri, ọ tụụrụ Òtù Na-achị Isi aro ka ọ bụrụzie alaka ụlọ ọrụ dị na Siera Lion ga na-elekọta ozi ọma a na-ekwusa na Gini, kama ịbụ Frans. N’abalị mbụ n’ọnwa Mach, n’afọ 1961, alaka ụlọ ọrụ dị na Siera Lion malitere ilekọta ozi ọma a na-ekwusa na Gini. N’ọnwa Eprel afọ ahụkwa, e hiwere otu ọgbakọ na Kọnakrị.

E Hiwere Ọgbakọ n’Ime Ime Obodo Gini

E bidokwara ikwusasi ozi ọma ike n’ebe ndịda Gini. E nwere otu nwoke aha ya bụ Falla Gbondo. Ọ bụ onye Kisi ma o bi na Laịberịa. O si Laịberịa lọghachite obodo ya bụ́ Fodédou. Isi n’obodo ya gaa Guékédou dị ihe dị ka kilomita iri na atọ. O ji akwụkwọ anyị a na-akpọ From Paradise Lost to Paradise Regained lọta. Nwoke a amaghị otú e si agụ ihe. Ma, o ji ihe ndị e sere n’akwụkwọ ahụ kụziere ndị obodo ya ihe. Ọ sịrị: “Eji m akwụkwọ ahụ kụziere ọtụtụ ndị ihe. Ndị mmadụ malitere ịkpọ akwụkwọ ahụ akwụkwọ Adam na Iv.”

Falla mechara laghachi Laịberịa. E mere ya baptizim, ya emechaa bụrụ onye ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ọ na-aga obodo ya bụ́ Fodédou ugboro abụọ n’ọnwa ka ọ kụziere ihe dị ka iri mmadụ atọ Baịbụl. Obere oge, Nwanna Borbor Seysey, bụ́kwa  onye Kisi si Laịberịa, bịara soro ya kụziwere ha Baịbụl. Nwanna Seysey bụkwa ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ha abụọ malitere ịkụziri ndị ọzọ bụ́ ndị Guékédou ihe. Ndị ahụ a na-amụrụ ihe na Fodédou ghọrọ ọgbakọ, ndị nke a na-amụrụ ihe na Guékédou aghọọkwa ọgbakọ.

Ka ọtụtụ ndị Kisi na-aghọkwu Ndịàmà Jehova, ndị eze ha chọpụtara na ha na-akpazi àgwà ọma. Ha chọpụtakwara na ha na-arụsi ọrụ ike, na-ekwu eziokwu, na-emekwa udo n’obodo ha. Ọ bụ ya mere mgbe ụmụnna chọrọ ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na Fodédou, ndị eze ha nyere ha ala ruru plọt iri asaa na abụọ. A rụchara Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ ná mbido afọ 1964. Ọ bụ ya bụ Ụlọ Nzukọ Alaeze mbụ a rụrụ na Gini.

Mgbe E Nwere Ọgba Aghara na Kọnakrị

Ka ihe niile a na-eme, a malitere inwe ọgba aghara na Kọnakrị. Ọgba aghara a mere ka gọọmenti malite ile ndị mba ọzọ bi na Gini anya ọjọọ. Gọọmenti mba Gini jụwara isi na ha agaghị enye ụmụnna anyị anọ bụ́ ndị ozi ala ọzọ ikike ibigide na Gini. Ha mechadịrị gbaara ha ụgbọ nwa mkpi. E boro ụmụnna anyị abụọ ndị Gana ebubo ụgha ma kpọchie ha. E mechakwara tụọ ha mkpọrọ ihe fọrọ obere ka o ruo ọnwa abụọ.

Obere oge ụmụnna abụọ ahụ si na mkpọrọ pụta, a kpọchiri otu n’ime ha ọzọ. Ọ bụ Nwanna Emmanuel Awusu-Ansah ka a kpọchiri. E tinyere ya n’ụlọ mkpọrọ na-asọ oyi. Nwanna a si n’ụlọ mkpọrọ a dee, sị: “Ahapụbeghị m Jehova, n’agbanyeghị na ahụ́ ọkụ ekweghị ahapụ m aka. M ka na-ezi ozi ọma. N’ọnwa gara aga, arụtara m awa iri isi na asaa. Mmadụ abụọ ndị m na-amụrụ Baịbụl malitere izi ozi ọma.” Otu n’ime ndị ọ na-amụrụ Baịbụl ghọrọ Onyeàmà Jehova. A tọhapụrụ Nwanna Awusu-Ansah mgbe ọ nọchara ọnwa ise na mkpọrọ. E mechakwara chụlaa ya Siera Lion, ya afọdụzie otu onye nkwusa na Kọnakrị.

N’afọ 1969, ala bịara jụtụ oyi na Kọnakrị. Ọ bụ ya mere e ji zite ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche n’ebe ahụ. Mgbe ha malitere ozi, ndị gọọmenti nyere ha ikike ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ma gwunye  saịn bọọdụ n’ihu ya. Obere oge ha rụchara ya, ihe dị ka iri mmadụ atọ malitere ịbịachi ọmụmụ ihe anya.

Ụmụnna ndị ahụ jewe ozi ọma, ha na-akpachapụ anya ka aka ndị ọchịchị ghara ịkpara ha. Ma, ka ha na-akata obi, ha na-ekwusakwuru ọtụtụ ndị ozi ọma. N’afọ 1973, ndị nkwusa ole na ole ahụ e nwere n’ọgbakọ nyefere ndị mmadụ puku traktị isii. Ha mechakwara na-aga n’ọfis dị iche iche, nakwa n’ebe ndị mmadụ na-azụ ahịa na-enye ha Ụlọ Nche na Teta! Ndị ọchịchị na ọhaneze ji nwayọọ nwayọọ ghọtawa na ozi ọma anyị na-ekwusa bara uru. Ha bidokwara ikwu okwu ọma gbasara ya. N’abalị iri na ise n’ọnwa Disemba afọ 1993, gọọmenti debara aha e ji mara Ndịàmà Jehova na Gini n’akwụkwọ ha. Aha ahụ bụ, “Christian Association of Jehovah’s Witnesses of Guinea.” Ihe a niile gosiri na mbọ niile ụmụnna anyị gbara ikwusara ndị mmadụ ozi ọma efughị ọhịa.