Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke Afọ 2014

SIERA LION NA GINI

‘Ime Ka Ọtụtụ Mmadụ Bụrụ Ndị Ezi Omume’ n’Afọ 1945 Ruo n’Afọ 1990​—⁠Dan. 12:⁠3. (Agba nke Abụọ)

‘Ime Ka Ọtụtụ Mmadụ Bụrụ Ndị Ezi Omume’ n’Afọ 1945 Ruo n’Afọ 1990​—⁠Dan. 12:⁠3. (Agba nke Abụọ)

Nwoke na Nwaanyị Ịlụ Otú Chineke Chọrọ

Mgbe Nwanna William Nushy malitere ozi ya n’alaka ụlọ ọrụ, ọ chọpụtara na ụfọdụ ndị nkwusa bụ́ di na nwunye alụbeghị otú Jehova chọrọ. Ha edejupụtabeghị akwụkwọ na gọọmenti iji gosi na ha alụọla. Ndị ọzọ na-ebi ruo mgbe nwaanyị ha tụụrụ ime tupu ha alụọ. Ihe mere ha ji eme otú ahụ bụ na ha chọrọ ịmata ma nwaanyị ahụ ọ̀ ga-amụkwa nwa.

Ọ bụ ihe ndị ahụ mere alaka ụlọ ọrụ ji degara ọgbakọ niile akwụkwọ ozi n’ọnwa Mee afọ 1953. N’akwụkwọ ozi ahụ, ha kọwara ihe Baịbụl kwuru nwoke na nwaanyị ga-eme tupu ha abụrụ di na nwunye. (Jen. 2:24; Rom 13:1; Hib. 13:4) E nyere ndị okwu a gbasara oge ka ha deba alụmdi na nwunye ha n’akwụkwọ gọọmenti. Oge ahụ gafee, a ga-achụpụ onye ọ bụla jụrụ ime otú ahụ n’ọgbakọ.—1 Kọr. 5:11, 13.

Obi tọrọ ọtụtụ ndị nkwusa ụtọ maka ihe a a gwara ha mee. Ma, ụfọdụ achọghị iji ntị anụ ihe ahụ a gwara ha. Ihe karịrị ọkara ndị nkwusa n’ọgbakọ abụọ hapụrụ ọgbakọ. Ma, ndị nke nọsiri ike wepụtakwuru oge na-eje ozi ọma. Ihe a ha mere gosiri na Jehova gọziri ozi ha na-ejere ya.

Ụmụnna anyị gbara ezigbo mbọ ka ndị ọchịchị kwe ka ha nọrọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị na Fritaụn na-agba akwụkwọ. Ndị ọchịchị mechakwara kwe. N’abalị atọ n’ọnwa itoolu, n’afọ 1954, ụmụnna anyị nọ ebe ahụ gbaa akwụkwọ. Nke ahụ bụ nke mbụ ụmụnna lụrụ otú iwu kwuru. N’obodo asaa dị na Siera Lion, gọọmenti mechara nye ụfọdụ ụmụnna akwụkwọ  e ji edeba aha ndị lụrụ di na nwunye n’akwụkwọ otú iwu kwuru. Ihe a mere ka ọtụtụ ndị di na nwunye ha na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl lụọ otú iwu kwuru. Ha malitekwara ije ozi ọma.

Di na nwunye a nọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze a gbaa akwụkwọ

E nwekwara ọtụtụ ndị Siera Lion ha na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl. Ndị a lụrụ ihe karịrị otu nwaanyị. Ma, ha mechara chụpụ ndị nwunye ha ndị ọzọ ma lụwa naanị  otu nwaanyị otú Jehova kwuru. Nwanna Samuel Cooper, onye bi na Bọnte ugbu a, kwuru, sị: “N’afọ 1957, mụ na ndị nwunye m abụọ malitere ije ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Obere oge, mụ amalite ime ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Otu ụbọchị, e nyere m ihe omume kwuru gbasara otú Ndị Kraịst kwesịrị isi alụ di na nwunye. Mgbe m na-akwadebe ihe omume ahụ, achọpụtara m na ekwesịrị m ịchụ nwunye m nke abụọ. Mgbe m gwara ya ndị ikwu m, ha wesara m iwe. Otu ihe kpatara ya bụ na nwunye m nke abụọ amụtarala m otu nwa, ma nwunye m nke mbụ amụtabereghị m nwa. Ma, ekpebiri m na mee elu, mee ala, m ga-eme ihe Baịbụl kwuru. E nwere otu ihe merenụ nke tụrụ m n’anya. Mgbe nwunye m nke abụọ lara, nwunye m nke mbụ malitere ịmụ nwa. Ugbu a, nwunye m a amụtarala m ụmụ ise.”

Onye ọzọ ya na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl bụ Honoré Kamano. O bi n’ókè Siera Lion na Gini. Ọ lụrụ ụmụ nwaanyị atọ. Ma, o mechara chụọ nwunye ya nke abụọ na nke atọ. Mgbe ọ chụchara ha, obi tọrọ nwunye ya nke mbụ ụtọ, ya ejirizie ofufe Chineke kpọrọ ihe. Obi adịghị otu n’ime ndị nwunye ya ahụ ọ chụrụ achụ mma. Ma, o mechara ghọta na ihe di ya mere bụ ihe Baịbụl kwuru. Ọ bụ ya mere o ji gwazie Ndịàmà Jehova ka ha mụwara ya Baịbụl. O mechakwara nyefee Jehova onwe ya.

Ndị di na nwunye bụ́ Ndịàmà Jehova anaghị agba n’èzí

Ndị Siera Lion na ndị Gini ma na ndị di na nwunye bụ́ Ndịàmà Jehova anaghị agba n’èzí. O so n’ihe mere ụfọdụ n’ime ha ji enwe mmasị n’Okwu Chineke Ndịàmà Jehova na-akụziri ha. Ọ na-emekwa ka ndị mmadụ na-eto Chineke, n’ihi na ọ bụ ya malitere alụmdi na nwunye.—Mat. 19:4-6; Taị. 2:10.

Ndị Kwe Ndị Ekweghị n’Ọgbakọ Fritaụn

N’afọ 1956, Nwanna Charles Chappell na nwunye ya bụ́ Reva kwatara na Fritaụn. Ha bụ ndị ozi ala ọzọ. Mgbe ha na-aga n’ụlọ ndị ozi ala ọzọ dị n’obodo ahụ, ha hụrụ otu nnukwu  saịn bọọdụ e ji akpọ ndị mmadụ ka ha bịa gere okwu ihu ọha a ga-ekwu n’ụlọ ezumezu Wilberforce Memorial Hall. Nwanna Charles sịrị: “Onye a sị ga-ekwu okwu ahụ bụ C.N.D. Jones bụ́ onye nnọchiteanya nke òtù a na-akpọ ‘Òtù Ndịàmà Jehova.’”

Jones sị na ya so ná ndị e tere mmanụ ha na Jizọs ga-eso achị n’eluigwe. Ọ bụ ya bụ onyeisi Òtù Ndịàmà Jehova ahụ kewapụrụ onwe ha n’ọgbakọ afọ ole na ole gara aga na Fritaụn. Ndị òtù ya kwuru na ọ bụ hanwa bụ ezigbo Ndịàmà Jehova. Ha na-akpọ ndị ozi ala ọzọ ahụ na ụmụnna ndị ọzọ “ndị ihu abụọ” na “ụmụaka Gilied.”

Ihe kara njọ n’ọgbakọ mgbe a mara ọkwa na a chụọla Jones na ụfọdụ ndị òtù ya. Nwanna Chappel, sịrị: “Mgbe a machara ọkwa a, o wutere ụfọdụ ụmụnna ndị chere na e kwesịghị ịchụ ha n’ọgbakọ. Ha na-akpaghasị ọmụmụ ihe. Ọ na-abụ ụmụnna pụta ozi ọma, ha etinye ọgba aghara. Ha bịa ọmụmụ ihe, ha niile na-aga nọrọ n’ebe a na-asị na ọ bụ maka ndị na-akpa aghara. Ọtụtụ n’ime ha mechara pụọ n’ọgbakọ. Ma, ụfọdụ mechara ghọta onwe ha, lọghachi n’ọgbakọ, mewekwa nke ọma.”

Obi dị ọtụtụ ụmụnna mma na a chụrụ ndị ahụ na-akpa aghara n’ọgbakọ. O mere ka mmụọ Chineke na-eduzi ụmụnna nọ n’ọgbakọ, ihe a na-agakwa nke ọma. Mgbe Nwanna Harry Arnott, bụ́ onye nlekọta zoonu, bịara Fritaụn n’afọ 1957, o kwuru, sị: “Kemgbe afọ ole na ole gara aga, ọtụtụ mmadụ abatabeghị n’ọgbakọ otú ha batara n’oge a na Siera Lion. Ọ bụ ya mere obi ji sie ụmụnna ike na ọtụtụ ndị ka ga-abata n’ọgbakọ.”

Ịkụziri Ndị Kisi Baịbụl

Mgbe Nwanna Arnott letachara alaka ụlọ ọrụ dị na Siera Lion, otu nwanna nọ na Laịberịa detaara Nwanna Charles Chappell akwụkwọ ozi. Laịberịa dị nso na Siera Lion. Nwanna ahụ gwara Nwanna Chappell na ya chọrọ ikwusara ndị agbụrụ ya nọ na Siera Lion ozi ọma. Nwanna a bụ onye Kisi. Ndị Kisi bi n’ugwu na ndagwurugwu ndị dị n’ókè Siera  Lion, Laịberịa na Gini. O yiri ka ọtụtụ ndị Kisi hà chọrọ ịmụ Baịbụl.

Ma, e nwere nsogbu dịnụ. Nsogbu ahụ bụ na ọtụtụ n’ime ha amaghị akwụkwọ. N’ihi ya, ụmụnna gbara mbọ malitere ha klas a na-amụ otú e si agụ na otú e si ede na Koindu. Klas a ga-eme ka ha na-aghọta ihe a na-akụziri ha na Baịbụl. Ọtụtụ narị mmadụ na-abịa klas a. Nwanna Charles kwuru, sị: “Obere oge a malitere klas a, mmadụ ise ghọrọ ndị nkwusa. Ha mechara si na mmadụ ise ruo mmadụ iri, sikwa na mmadụ iri ruo mmadụ iri na ise. Ha mechakwara si na mmadụ iri na ise ruo mmadụ iri abụọ. Ọtụtụ ndị nubatara n’ọgbakọ. O mere ka m chewe na ọtụtụ n’ime ha ejighị obi ha bata n’ọgbakọ. Ma ihe ahụ m chere abụghị otú ọ dị. Ọtụtụ n’ime ha bịara bụrụ a kwaa akwụrụ n’ọgbakọ ma na-ejesi ozi ọma ike.”

Ndị nkwusa ọhụrụ a gara obodo Koindu na obodo ndị ọzọ kwusaa ozi ọma. Ha mechakwara gaa kwusaa ozi ọma n’obodo ndị dị nso na Gini. Ha ji ụkwụ gaa ọtụtụ awa tupu ha eruo. Ha gafekwara ọtụtụ ugwu. Ha kwusaara ma ndị ọrụ ugbo ma ndị nọ n’ime obodo ozi ọma. Otu onye nlekọta sekit n’oge ahụ, aha ya bụ Eleazar Onwudiwe, sịrị: “Anyị anaghị anụ ụda ọgba tum tum ruo ọtụtụ izu, mgbe ụfọdụkwa, ruo ọtụtụ ọnwa.”

Ka ụmụnna ndị Kisi na-ezi ndị mmadụ ozi ọma ma na-akụziri ha Baịbụl, Jehova mere ka ọtụtụ ndị bata n’ọgbakọ. (1 Kọr. 3:7) E nwere otu nwa okorobịa kpuru ìsì e ziri ozi ọma, ya emechaa bata n’ọgbakọ. Ọ gbara mbọ butechaa ihe niile dị n’akwụkwọ “This Good News of the Kingdom” n’isi. Akwụkwọ a dị peeji iri atọ na abụọ. Mgbe ọ malitere ikwusara ndị mmadụ ozi ọma, ọ na-eji ihe dị na paragraf ọ bụla ọ chọrọ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma, ọ na-ejikwa ya akụziri ha Baịbụl. Otú Nwanna a si butechaa ihe niile ahụ n’isi juru ndị mmadụ anya. E nwekwara otu nwaanyị onye ogbi e ziri ozi ọma, ya emechaa bata n’ọgbakọ. Otú o si kwụsị ihe ndị na-adịghị mma ọ na-emebu mere ka nwanne di ya bido bịawa ọmụmụ ihe. Ọ na-eji ụkwụ si n’ụlọ ya gaa ihe karịrị kilomita iri tupu ya erute ebe a na-amụ ihe.

 Obere oge e bidoro izi ndị Kisi ozi ọma, ọtụtụ n’ime ha ghọrọ Ndịàmà Jehova. Ka a na-eme ka a na-eme, e kewapụta ọgbakọ ọzọ. E mechaakwa kewapụta ọzọ. Ihe dị ka ndị nkwusa iri atọ ghọrọ ndị ọsụ ụzọ oge niile. Eze ndị Koindu na Ndịàmà Jehova mechara mụwa Baịbụl, ya enye ha ala ya ka e jiri ya rụọ Ụlọ Nzụkọ Alaeze. Mgbe e nwere mgbakọ sekit na Kaịlahun, ihe karịrị narị mmadụ ise bịara. A nọkwa ná mgbakọ ahụ hiwe otu ọgbakọ. Obere oge, ndị Kisi bụ́ Ndịàmà Jehova na Siera Lion bịara hie nne nke na, a gụkọtachaa Ndịàmà Jehova niile nọ na Siera Lion, ọkara ha bụ ndị Kisi. Ma, e kee ndị niile nọ na Siera Lion ụzọ iri ise, ihe na-erughị otu ụzọ bụ ndị Kisi.

Ọ bụghị mmadụ niile ka obi dị mma otú a ọtụtụ ndị Kisi si na-abata n’ọgbakọ. Ndị obi kacha agbawa bụ ndị isi chọọchị nọ na Kisi. Ha fooro ntutu taa na ha ga-ememila Ndịàmà Jehova nọ ebe ahụ. Ma ihe bụ́ isiokwu bụ, olee otú ha ga-esi eme ya, oleekwa mgbe ha ga-ebido?