Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke Afọ 2014

 SIERA LION NA GINI

1915-​1947 Mgbe A Malitere Ikwusa Ozi Ọma na Siera Lion Nakwa na Gini (Agba nke Abụọ)

1915-​1947 Mgbe A Malitere Ikwusa Ozi Ọma na Siera Lion Nakwa na Gini (Agba nke Abụọ)

Otú Anyị Si Merie Ndị Na-achọghị Ka Anyị Kwusaa Ozi Ọma

Mgbe ndị ụkọchukwu nọ na Fritaụn hụrụ na okwu ihu ọha Nwanna Brown na-ekwu na-atọ ndị chọọchị ha ụtọ, obi gbawara ha. Ụlọ Nche December 15, 1923, sịrị: “Ndị ụkọchukwu amalitela ịgba eziokwu dị na Baịbụl ụkwụ n’akwụkwọ akụkọ. Ọ na-abụ ha ghagide anyị ụgha n’akwụkwọ akụkọ, Nwanna Brown edeekwa nke bụ́ eziokwu n’akwụkwọ akụkọ. Nwanna Brown mere otú ahụ ọtụtụ ugboro.” Ndị ụkọchụkwu mechara kwụsị inye anyị nsogbu. Ihe mere ha ji kwụsị ya bụ na anyị gbara ozizi ụgha ha n’anwụ. Anyị kwusaara ndị mmadụ eziokwu dị na Baịbụl n’ebe niile na Fritaụn. O mekwara ka ọtụtụ ndị na-agụ akwụkwọ akụkọ kwuo ka anyị mụwara ha Baịbụl. Ndị ụkọchukwu kpara nkata ka ha mechie ndị Chineke ọnụ, ma Jehova ‘ji ọdachi nke ha laa ha n’iyi.’—Ọma 94:21-23.

Otu òtù ndị na-eto eto e nwere na chọọchị malitere inyere ndị ụkọchukwu aka. Ha gwara ndị mmadụ ka ha bịa nnọkọ ha ga-enwe. Ihe mere ha ji kpọọ nnọkọ a bụ ka ha mechie ndị ha kpọrọ ndị òtù Russell ọnụ. Ọ bụ aha a ka ha na-akpọ ụmụnna anyị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’oge ahụ. Nwanna Brown gwara ha ọtụtụ ugboro ka ya na ha kwurịta okwu n’ihu ọha ka ọhaneze mara onye na-akụzi ihe Baịbụl kwuru. Òtù ndị na-eto eto ahụ ekweghị abịa. Ha gara baara onyeisi ụlọ ọrụ na-ebipụta akwụkwọ akụkọ mba maka na ọ na-ekwe ebipụta ihe Nwanna Brown dere o ji gbaa ụgha ha na-agha n’anwụ. Ha gwara Nwanna Brown na ya anwakwala anwa abịa nnọkọ ndị ahụ ha ga-enwe. Ọ bụzi Nwanna Alfred Joseph gara nnọkọ ndị ahụ ha nwere.

E nwere nnọkọ ndị ahụ n’ụlọ chọọchị ndị Metọdist a na-akpọ Buxton Memorial Chapel. Chọọchị a na-ewu ewu na Fritaụn. Nwanna Alfred kwuru ihe e mere ná nnọkọ ndị ahụ. Ọ sịrị: “Mgbe e nyere ohere ka onye nwere ajụjụ jụọ, m jụrụ ha ajụjụ gbasara ihe chọọchị Anglịkan na-akụziri ndị mmadụ. M jụkwara ha gbasara Atọ n’Ime Otu nakwa ozizi ụgha ndị ọzọ. Onyeisi oche nnọkọ ahụ mechara kwụsị ndị mmadụ ịjụ ajụjụ.”

 Otu nwa okorobịa aha ya bụ Melbourne Garber bịara nnọkọ ahụ. O so ná ndị na-eto eto ahụ na-emegide ụmụnna anyị. Tupu nnọkọ ahụ, o nweela mgbe ọ gara gee okwu ihu ọha Nwanna “Bible” Brown kwuru. Ọ bụkwa ya bụ nwa okorobịa ahụ kwuru na “Maazị Brown ma Baịbụl nke ọma!” Mgbe Garber chebachaara ihe Nwanna Brown kụziri echiche, ọ bịara doo ya anya na ya ahụla chọọchị na-akụzi eziokwu. Ọ bụ ya mere o ji gwa Nwanna Brown ka ọ mụwara ya Baịbụl. Nwanna Brown gwara ya ka ọ na-abịa n’ụlọ ya maka Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ha na-enwe kwa izu. Mgbe Garber malitere ịga ọmụmụ ihe ahụ, ndị ezinụlọ ya jụrụ ya. Ma, Garber ji ọmụmụ ihe ahụ kpọrọ ihe. Obere oge ọ mụwara ihe, e mere ya na ndị ọzọ baptizim.

Mbọ niile Setan gbara ka a kwụsị ozi ọma a malitere ikwusa na Fritaụn kụrụ afọ n’ala. Onye na-achị Fritaụn n’oge ahụ gwara òtù ndị na-eto eto ahụ, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ nwe ọrụ a, a ga-akwụsị ịrụ ya. Ma ọ bụrụ na ọ bụ Chineke nwe ya, unu emekataghị kwụsị ya.”—Ọrụ 5:38, 39.

Chọọchị Brown

Ná mbido ọnwa Mee, n’afọ 1923, Nwanna Brown zigaara alaka ụlọ ọrụ dị na Lọndọn ozi ka ha butekwuoro ha akwụkwọ. Obere oge o zigachara ozi a, alaka ụlọ ọrụ ahụ buteere ha puku akwụkwọ ise. Ha mechakwara butekwuoro ha akwụkwọ. Nwanna Brown nọgidere na-ekwu okwu ihu ọha, ọtụtụ puku mmadụ na-abịakwa ege ya.

Ná ngwụcha afọ 1923, e kwuru n’Ụlọ Nche, sị: “Ọtụtụ ndị na-anabata ozi ọma anyị na-ekwusa na [Siera Lion]. Ọ bụ ya mere Nwanna Brown ji kwuo ka a kpọta onye ga-enyere ya aka. A gwara Nwanna Claude Brown ka ọ gaa nyere ya aka. Nwanna a bụ onye Winipeg nke dịbu na West Indiiz.”

Nwanna Claude Brown kwusara ozi ọma ọtụtụ afọ n’agbanyeghị ahụhụ a tara ya. N’oge Agha Ụwa nke Mbụ, e mekpọrọ ya ọnụ n’ụlọ mkpọrọ dị na Kanada nakwa na Briten n’ihi na o kweghị aga agha. O jere ozi na Siera Lion afọ anọ. O nyekwaara ụmụnna ezigbo aka ịkwụsi ike n’ọgbakọ.

Otu Nwanna nwaanyị aha ya bụ Pauline Cole chetara otú  Nwanna Claude si nyere ha aka ịkwụsi ike n’ọgbakọ. Ọ sịrị: “Tupu e mee m baptizim n’afọ 1925, Nwanna Claude medara obi jụọ m ọtụtụ ajụjụ.

“Ọ jụrụ m, sị: ‘Nwanna Nwaanyị Cole, ị̀ ghọtara ihe ndị a kụziiri gị n’akwụkwọ anyị bụ́ Studies in the Scriptures? Ihe m kwo na-ajụ gị bụ na anyị achọghị ka ị pụọ n’ọgbakọ maka na ị ghọtaghị ihe a kụziiri gị na Baịbụl.’

“M gwara ya, sị: ‘Nwanna Claude, agụọla m akwụkwọ ahụ ọtụtụ ugboro. Ekpebiela m ife Chineke!’”

Nwanna nwaanyị Pauline Cole

Nwanna Nwaanyị Cole fere Jehova ihe karịrị iri afọ isii. Ọ bụ ọsụ ụzọ pụrụ iche ruo ọtụtụ afọ. O jechara ozi ya n’ụwa n’afọ 1988.

Nwanna William “Bible” Brown nyekwaara ụmụnna ndị ọzọ aka ịna-eme nke ọma n’ọgbakọ. Nwanna Alfred Joseph kwuru, sị: “Ọ na-abụ chi bọọ n’ụtụtụ ọ bụla, mụ na Nwanna Brown hụ, ya asị m: ‘Nwanna Joe, ị̀ saala chi? Olee ebe ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa si?’ Ọ bụrụ na mụ echetaghị ebe o si, ọ na-agwa m ka m jisie ike na-ama ebe ihe mmụta dịịrị ụbọchị  nke ụbọchị ọ bụla si. Aha akwụkwọ anyị ji eme ihe mmụta dịịrị ụbọchị n’oge ahụ bụ Daily Manna. [Ihe a na-akpọ akwụkwọ a ugbu a bụ Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị.] Ihe m na-emezi n’isi ụtụtụ ọ bụla bụ ịgụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị, ka m nwee ike ịma ihe m ga-aza Nwanna Brown ma ọ jụọ m ebe nke ụbọchị ahụ si. Na mbụ, ihe a ọ na-ajụ m anachaghị adị m mma n’obi. Ma, o mechara baara m ezigbo uru.”

Ihe ndị ahụ Nwanna Bible Brown na-eme nyeere ụmụnna aka. N’afọ 1923, e hiwere otu ọgbakọ na Fritaụn, meekwa mmadụ iri na anọ baptizim. Aha otu n’ime ụmụnna ndị ahụ bụ Nwanna George Brown. Ọ bụ ya bụ onye nke atọ n’ime ndị na-aza Brown n’ọgbakọ ahụ. Ndị a niile na-aza Brown na-ejechi ozi ọma anya na Fritaụn. Ọ bụ ya mere ọtụtụ ndị ebe ahụ ji asị na Ndị Mmụta Baịbụl na-ekpe chọọchị Brown.