Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke Afọ 2014

 SIERA LION NA GINI

1915-​1947 Mgbe A Malitere Ikwusa Ozi Ọma na Siera Lion Nakwa na Gini (Agba nke Atọ)

1915-​1947 Mgbe A Malitere Ikwusa Ozi Ọma na Siera Lion Nakwa na Gini (Agba nke Atọ)

Ikwusa Ozi Ọma n’Ebe Ndị Ọzọ Na-abụghị na Fritaụn

Ọgbakọ Fritaụn ji ife Chineke kpọrọ ihe. Ha malitere “ikwusasi okwu Chineke ike.” (Ọrụ 18:5) Nwanna Joseph kwuru, sị: “Ana m ebukarị otu katọn akwụkwọ e ji amụ Baịbụl n’ọgba tum tum m kwọrọ Nwanna Thomas Sylvester Grant n’azụ na-aga ozi ọma. Anyị na-aga n’ime ime obodo nakwa n’obodo ndị dị na Fritaụn ka anyị na ndị mmadụ rụrịta ụka.”

Malite n’afọ 1923 ruo afọ 1927, ebe a na-agakarị ozi ọma na Fritaụn mgbe ahụ bụ ebe a na-akpọ Dị Kọlọni. Ma malite n’afọ 1928, tupu udu mmiri amalite n’afọ ọ bụla, ọgbakọ na-achọta bọs, kwụọ ụgwọ ya, bọs ahụ eburu ha gaa ebe ndị ha ga-ekwusa ozi ọma. Ndị na-agaghị agali na-enye aka akwụ ụgwọ bọs ahụ. Ọ bụ Nwanna Melbourne Garber na-edu ha aga. Ha na-ekwusa ozi ọma n’ime obodo ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nke obodo Kaịlahun, nakwa n’ebe ndịda nke dị nso n’ókè Siera Lion na Laịberịa. Na Sọnde mbụ n’ọnwa ọ bụla, ha na-agaghachi n’ebe ndị ahụ ha kwusara ozi ọma ka ha kụzikwuoro ndị gere ha ntị Baịbụl.

N’oge ahụ, Nwanna Brown gara West Indiiz ma buru ụgbọala lọta Siera Lion. Ụgbọala a so n’ụgbọala mbụ a gbara na Siera Lion. A rụnyere ọkpọka ígwè okwu n’ụgbọala a ka e jiri ya  na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma. Nwanna Brown na-akwụsị ụgbọala ahụ ebe ọtụtụ mmadụ juru. Tupu ya amalite izi ozi ọma, ọ na-akpọnye egwú dị ụtọ ga-eme ka ndị mmadụ gbakọọ. Ha gbakọchaa, ya ejiri nkeji ole na ole zie ha ozi ọma ma ọ bụkwanụ ya akpọnyere ha okwu ihu ọha e tinyere na teepụ. E mechaa, ya enye ha akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. E mechara kpọwa ụgbọala ya ahụ ụgbọala na-ekwu okwu. Ọ na-abụ ndị mmadụ nụhaala ụda ụgbọala a, ha agbapụta ka ha nụrụ ihe ọ ga-ekwu.

Ebe ụmụnna ji obi ike na-ekwusa ozi ọma

Nwanna Brown mechara gawa obodo ndị ọzọ a na-ekwusabeghị ozi ọma n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka. Ọ bụ obodo ndị nke na-asụ asụsụ Bekee ka ọ gara. N’agbata afọ 1926 na afọ 1929, Nwanna Brown gara kwusaa ozi ọma na Gambia, Gana, Laịberịa, na Naịjirịa. Ọtụtụ mmadụ gere Nwanna Brown ntị n’obodo ndị a. Ma, ọ bụ na Naịjirịa ka a kacha gee ya ntị.  N’afọ 1930, Nwanna Brown kpọọrọ ezinụlọ ya hapụ Fritaụn kwaga Legọs. Ọ bụzi na Legọs ka ọ nọ na-elekọta ozi ọma a na-ekwusa n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka.

Ihe karịrị narị puku Ndịàmà Jehova ise nọ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka

N’afọ 1950, Nwanna Brown laghachiri Jameika n’ihi na ọrịa bịara kpawa ya aka ọjọọ. Anyị agaghị echefu ọrụ ọma niile ọ rụrụ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka. Mgbe ha kwatara n’ebe ahụ, ọ bụ naanị ndị nkwusa abụọ ka e nwere. Ma, n’ihe karịrị iri afọ abụọ na asaa ya na nwunye ya jere ozi n’ebe ahụ, a bịara nwee ihe karịrị puku ndị nkwusa iri na otu. Ha ejirila anya ha hụ ka amụma Aịzaya buru mezuru. Aịzaya sịrị: “Onye nta ga-aghọ otu puku mmadụ, onye kasị nta ga-aghọkwa mba dị ike.” (Aịza. 60:22) Ọ karịala iri afọ isii Nwanna Brown kwusachara ozi ọma n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka. E nwekwara ihe karịrị narị puku Ndịàmà Jehova ise taa n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka.

Ha Akwụsịghị Ikwusa Ozi Ọma n’Agbanyeghị Mkpagbu

Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ biiri ọkụ n’Afrịka, Ndịàmà Jehova nọ na Siera Lion jụrụ ịga agha. (Maị. 4:3; Jọn 18:36) Ndị ọchịchị Briten ghagidere ha ụgha sị na ha na-agba ọchịchị mgba okpuru. Ọ bụ ya mere ha ji bido inyonye anya n’ozi ọma ha na-ekwusa ma mechaa kwuo na ha achọkwaghị iji anya ahụ akwụkwọ anyị n’aka onye ọ bụla. Ndị na-ahụ maka ibubata ngwá ahịa na Fritaụn jichiri akwụkwọ anyị e si mba ọzọ bubata ma mechaa kpọọ ya ọkụ. Ndị gọọmenti kpọchiri ụfọdụ ụmụnna anyị maka na ha hụrụ akwụkwọ anyị n’aka ha. Ma o teghịkwa aka, ha ahapụ ha. *

N’agbanyeghị na ndị ọchịchị achọghị iji anya ahụ onye ọ bụla akwụkwọ anyị n’aka, ụmụnna anyị akwụsịghị ikwusa ozi ọma. Nwanna Nwaanyị Pauline Cole kwuru, sị: “Ọ bụ nwanna nwoke na-arụ ọrụ n’ụgbọ mmiri na-abịakarị Siera Lion na-ewetara anyị Ụlọ Nche. Ọ na-abụ ya wetara anyị Ụlọ Nche,  anyị ejirizie ígwè taịpraịta depụta ndị ụmụnna ga-eji mụọ ihe n’ọmụmụ ihe. Anyị na-ebipụtakwa mpempe akwụkwọ ndị kọwara isiokwu dị iche iche si na Baịbụl, na-ekesakwara ha ọhaneze. Ụmụnna na-ekwukwa okwu ihu ọha n’ime obodo, na-akpọnyekwara ha okwu ihu ọha Nwanna Rutherford kwuru.”

Jehova ekweghị ka mbọ niile a anyị gbara kụọ afọ n’ala. E nwere otu nwanna aha ya bụ James Jarrett. O teela ọ bụ okenye nakwa ọsụ ụzọ pụrụ iche. Nwanna a sịrị: “N’oge a na-alụ agha, m na-arụ ọrụ ịkụwa okwute. Otu ụbọchị, otu nwanna nwaanyị merela agadi bịara nye m otu akwụkwọ a na-akpọ Refugees (ya bụ, Ndị Gbara Ọsọ Ndụ). Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị si n’obodo ha na-agbata ọsọ ndụ na Fritaụn, isiokwu akwụkwọ ahụ mere ka m chọsie ike ịgụ ya. M gụchara akwụkwọ ahụ n’abalị ụbọchị ahụ. Aghọtakwara m nke bụ́ eziokwu ozugbo ahụ. Mgbe chi foro, m chọwara nwanna nwaanyị ahụ ma chọta ya. M natakwuru ya akwụkwọ ahụ maka ụmụnne m ndị nwoke atọ. Mụ na ụmụnne m atọ ahụ mechara bụrụ Ndịàmà Jehova.”

Mgbe agha biri n’afọ 1945, e nweela ndị nkwusa iri atọ na abụọ n’ọgbakọ Fritaụn. Ụmụnna ndị a akwụsịghị irubere Jehova isi, ụkwụ sikwara ha ike n’ọgbakọ. Ha kpebisiri ike iso nzukọ a na-aga ụkwụ na ụkwụ.

Ịkpọ Ndị Mmadụ Ka Ha Bịa Gere Okwu Ihu Ọha

N’abalị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Ọgọst, afọ 1945, ọgbakọ Fritaụn tụlere ihe ọhụrụ e kwuru n’Ozi Alaeze Anyị nke Disemba afọ 1944 (aha Bekee a na-akpọ ya n’oge ahụ bụ Informant). Ọ bụ ụbọchị ahụ ka ọgbakọ ahụ na-enwe Nzukọ Ije Ozi ha. A gwara ọgbakọ ọ bụla ka ha gaa n’obodo ọ bụla ha na-ezi ozi ọma kwuo okwu ihu ọha anọ. Tupu ha ekwuwe okwu ndị ahụ, ha ga-aga kpọọ ndị mmadụ ka ha bịa gere okwu ndị ahụ. Nwanna ga-ekwu okwu nke ọ bụla ga-abụ nwanna nwoke rurula afọ iri na asatọ. Ọ ga-abụkwa nwanna na-ekwu okwu nke ọma n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. A ga-ekwu otu isiokwu n’otu awa. E kwuchaa okwu ihu ọha anọ ahụ, ụmụnna abịa hazie otú a ga-esi na-akụzikwuru ndị ahụ bịaranụ Baịbụl.

Olee otú obi dị ụmụnna anyị n’ihe ọhụrụ a a gwara ha  na-eme? Lee ihe ụmụnna nọ n’ọgbakọ Fritaụn kwuru mgbe ahụ ha nọ ná Nzukọ Ije Ozi na-atụle otú ha ga-esi na-eme ihe ahụ e kwuru:

Onyeisi Oche: “Olee otú unu chere anyị ga-esi mee ihe ọhụrụ a a gwara anyị mee?”

Nwanna nwoke nke Mbụ: “Anyị ekwesịghị iche na ọ ga-adịrị anyị mfe otú ọ ga-esi dịrị ndị Amerịka. Anyị na ha abụghị otu.”

Nwanna nwoke nke Abụọ: “Ihe nwanna a kwuru bụ eziokwu.”

Nwanna nwoke nke Atọ: “Ụmụnna m, ka anyị megodịnụ ihe a.”

Nwanna nwoke nke Anọ: “Ụmụnna m, anyị agaghị emeli ihe a.”

Nwanna nwoke nke Ise: “Ụmụnna m, ma e tere ụgba ma e tere azụ̀, anyị ga-emegodị ihe nzukọ Jehova gwara anyị mee.”

Nwanna nwoke nke Isii: “Echeghị m na ihe a ga-abara anyị uru.”

Nwanna Nwaanyị: “Ụmụnna m, ihe a a gwara anyị mee doro anya. Biko, ka anyị meenụ ya!”

Ha mechara mewe ya. Ha kwuru okwu ihu ọha ndị ahụ na Fritaụn, kwuo ha na Bo, kwuokwa ha na Kabala. Ha nọ ebe dị iche iche kwuo ha, ma n’ụlọ akwụkwọ, ma n’ahịa ma n’ụlọ ndị mmadụ. Ihe a mere ka ụmụnna anyị ndị a jechiwe ozi ọma anya. O mekwara ka ‘okwu Jehova na-eto eto ma na-agbasa.’—Ọrụ 12:24.

Ma, a chọpụtara na e kwesịrị ịkụziri ụmụnna otú e si ezi ozi ọma nke ọma na otú e si eme ihe ụfọdụ n’ọgbakọ. Jehova mechara kụziere ha ihe ndị ahụ.

^ para. 10 N’afọ 1948, gọọmenti kwere ka anyị bubatawakwa akwụkwọ anyị na Siera Lion.