Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke Afọ 2014

 SIERA LION NA GINI

‘Ihe Isi Ike Kpụ Ọkụ n’Ọnụ’ n’Afọ 1991 Ruo n’Afọ 2001​—⁠Aịza. 48:10 (Agba nke Mbụ)

‘Ihe Isi Ike Kpụ Ọkụ n’Ọnụ’ n’Afọ 1991 Ruo n’Afọ 2001​—⁠Aịza. 48:10 (Agba nke Mbụ)

 Agha Obodo

N’agbata afọ 1981 na afọ 1989, e nwere ọgba aghara n’obodo dị iche iche dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka. Ihe kpatara ọgba aghara a bụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ihe isi ike, nakwa esemokwu agbụrụ na agbụru. Mgbe a malitere ịlụ agha na Laịberịa, ọtụtụ ndị Laịberịa gbatara ọsọ ndụ na Siera Lion. Alaka ụlọ ọrụ dị na Siera Lion hazikwara ebe ụmụnna anyị gbatara ọsọ ndụ ga-ebi. Ụfọdụ n’ime ha bi n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ndị ọzọ ebiri n’ụlọ ụmụnna. Ụmụnna anyị ndị Siera Lion lekọtakwara ha nke ọma.

Ọ bụ eziokwu na ihe na-esiri ndị ahụ gbara ọsọ ndụ ike, e nwere ihe ụfọdụ na-atọ ọchị merenụ. Nwanna Isolde Lorenz, bụ́ onye ozi ala ọzọ jerela ozi ọtụtụ afọ, kọrọ otu ihe na-atọ ọchị mere mgbe ahụ. Ọ sịrị: “E nwere ụbọchị otu nwoke dunyere nwa ya nwoke ka ọ gaa sitụ nri ha n’ọkụ. A kwanyere ọkụ a n’ugbo dị n’azụ Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’alaka ụlọ ọrụ Siera Lion. Mgbe nwata nwoke a lọghachiri, ọ gwara papa ya na ha agaghị eri nri taa. Papa ya jụrụ ya ihe mere o ji kwuo otú ahụ. Nwa ahụ agwa ya na ọ bụ n’ihi na Jehova napụtara ya n’ọnụ ọdụm. Ị̀ ma ihe mere nwa a ji kwuo ihe a? Ọ bụ n’ihi na mgbe o bu nri ahụ na-alọta, ọ hụrụ otu nnukwu nkịta alaka ụlọ ọrụ n’ụzọ. Aha nkịta a bụ Lobo. Ọ naghị ata mmadụ. Mgbe nkịta a bịarutere nwatakịrị ahụ nso, obi mapụrụ ya. Nwa ahụ matịrị aka ya ka ọ kwapụ nkịta ahụ ka ọ ghara ịta ya. Ebe o bu nri ahụ n’aka matịa aka ya, nkịta ahụ weere ya na ọ na-ebunye ya nri ahụ ka o rie. Ya anara nwa ahụ nri ahụ, bido riwe ya.”

N’abalị iri abụọ na atọ n’ọnwa Mach, afọ 1991, agha ahụ a na-alụ na Laịberịa rutere Siera Lion. Ọgba aghara a kpatara agha a lụrụ afọ iri na otu. Ndị agha nnupụisi malitere ịkwa mgbọ n’obodo Kaịlahun na Koindu. Ọ bụ ya mere ọtụtụ ndị bi n’obodo abụọ a ji gbaga ọsọ ndụ na Gini. Ihe dị ka otu narị ụmụnna na iri abụọ so ná ndị a gbagara ọsọ ndụ na Gini. Ọtụtụ ụmụnna  anyị ndị ọzọ si Laịberịa gbatakwara ọsọ ndụ na Siera Lion ka ndị agha nnupụisi ahụ ghara igbu ha.

Nwanna Billie Cowan, onye na-ahaziri Kọmitii Alaka ọrụ kwuru, sị: “Ụfọdụ ụmụnna si ebe dị iche iche bịa na Betel dị na Fritaụn nọrọ ruo ọnwa ole na ole. Ị hụ ụmụnna ndị a mgbe ha bịara, ha tara ezigbo ahụ́, agụụ ghụkwara ha anya. Ọtụtụ n’ime ha ejirila anya ha hụ arụ dị iche iche ndị mmadụ kpara n’agha a. Agha a mekwara ka ha jiri ahịhịa dị n’ọhịa mere nri, ka agụụ ghara ịgụgbu ha. Ozugbo ha bịarutere, anyị nyere ha nri na uwe, lekọtakwa ma ndị ikwu ha ma ndị nwere mmasị ha na ha so bịa. Ụmụnna anyị ndị Fritaụn kpọbatara ha n’ụlọ ha ma jiri obi ha niile na-enyere ha aka. Ha malitekwara izi ndị mmadụ ozi ọma, si otú ahụ nyere ọtụtụ ọgbakọ ndị dị ebe ahụ aka ịrụzu ókèala ha. Ọtụtụ n’ime ha mechakwara kwaga ebe ọzọ. Ma mgbe anyị na ha nọ, ha mere ka okwukwe anyị sikwuo ike.”

A lụrụ agha na Siera Lion afọ iri na otu

Ịkasi Ndị Gbara Ọsọ Ndụ Obi

E nwere ụmụnna anyị ndị bi n’ogige ndị gbatara ọsọ ndụ dị n’ebe ndịda Gini. Alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Fritaụn bugaara ha ihe oriri, ọgwụ, ihe ndị e ji arụ ụlọ, ngwá ọrụ na arịa ndị e ji esi nri. Alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Frans bugakwaara ha uwe. Otu nwanna nwoke kwuru, sị: “Mgbe e nyere anyị uwe ndị ahụ, ụmụ m bidoro gbawa egwú, bụwa abụ ma na-eto Jehova. Ugbu a, ha enweela uwe ọhụrụ ha ga-eji na-aga ọmụmụ ihe.” Ụmụnna anyị ụfọdụ kwuru na obi dị ha ụtọ maka na uwe ndị ahụ e nyere ha mara mma karịa ndị ha na-eyibu.

Ma, mkpa ụmụnna ndị a abụghị naanị nri na ihe ndị ọzọ ahụ e nyere ha. O nwere ihe Jizọs kwuru nke dịkwa ha mkpa. Ọ sịrị na “ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ, kama ọ bụ okwu niile nke na-esi n’ọnụ Jehova pụta.” (Mat. 4:4) Ọ bụ ya mere alaka ụlọ ọrụ ji bugara ha akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. Ha hazikwara mgbakọ sekit na mgbakọ distrikti ha ga na-aga. E zigakwara ndị ọsụ ụzọ na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị n’ebe ahụ.

 Mgbe otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị aha ya bụ André Baart letara obodo Koundu, nke dị na Gini, ọ hụrụ onye na-elekọta ogige ndị gbara ọsọ ndụ n’ebe ahụ. Onye ahụ na-elekọta ogige ndị gbara ọsọ ndụ gwara ya na ya chọrọ ka ọ gwa ndị bi ebe ahụ okwuchukwu. N’ụbọchị ahụ, Nwanna André gwara ihe dị ka iri mmadụ ise okwu. Isiokwu okwu ọ gwara ha bụ, “Gbaba n’Ime Jehova.” Isiokwu a si n’Abụ Ọma nke iri na asatọ. Mgbe o kwuchara, otu agadi nwaanyi nọ ebe ahụ biliri ọtọ sị ya: “I meela ka obi tọọ anyị ụtọ. Ihe a ị gwara anyị baara anyị uru karịa osikapa a na-enye anyị ebe a. I jirila Baịbụl gbaa anyị ume ịtụkwasị Chineke obi mgbe niile. Anyị ji obi anyị niile na-ekele gị maka otú i si kasie anyị obi.”

Mgbe e zigara Nwanna William Slaughter na nwunye ya Claudia n’obodo Guékédou, nke dị na Gini, ha mere ka ihe karịrị otu narị ndị gbara ọsọ ndụ nọ n’ọgbakọ dị ebe ahụ nụwa ọkụ n’obi n’ozi Jehova. Nwanna William na nwunye ya Claudia, bụ ndị ozi ala ọzọ. (Rom 12:11) Nwanna William kwuru, sị: “Ọtụtụ ụmụ okorobịa nọ n’ọgbakọ ahụ na-agbalị ka ha ruo eruo ije ozi. Ọ bụrụ na e nwere nwanna e nyere ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ma nwanna ahụ abịaghị ọmụmụ ihe, ihe dị ka ụmụ okorobịa iri ma ọ bụ iri na ise na-eweli aka ozugbo ka ha mee ihe omume ahụ. Ọtụtụ n’ime ha na-ejechi ozi ọma anya. Ụfọdụ n’ime ụmụ okorobịa ndị a mechara bụrụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị.”

Ịrụ Alaka Ụlọ Ọrụ n’Oge Agha

Obere oge a malitere ịlụ agha na Fritaụn, ụmụnna anyị zụtara ihe dị ka plọt iri na atọ n’okporo ámá a na-akpọ Wilkịnsịn. Ala a dị nso n’alaka ụlọ ọrụ anyị. Nwanna Alfred Gunn kwuru, sị: “Anyị chọrọ ịrụ alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ n’ala a, ma obi akaghị anyị n’ihi agha ahụ a na-alụ. Ma ebe ọ bụ na Nwanna Lloyd Barry, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi, letara anyị n’oge ahụ, anyị tọgbọọrọ ya okwu a. Nwanna Barry gwara anyị, sị: ‘Ọ bụrụ na  anyị ekworo agha a ghara ịrụ alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ a, ọ dịghị ebe anyị ji azụ aga!’ Okwu a ọ gwara anyị mere ka obi sie anyị ike ịmalite ọrụ a.”

Ọtụtụ narị ụmụnna anyị bịara rụọ ọrụ mgbe a na-ewu alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ a. Ihe karịrị iri ise n’ime ha si ná mba iri na abụọ. Ụmụnna anyị ndị nọ n’ọgbakọ ndị dị n’ebe ahụ sokwa rụọ ọrụ. Ọrụ ahụ biiri ọkụ n’ọnwa Mee n’afọ 1991. Otu Nwanna na-elekọta ọrụ ahụ, onye aha ya bụ Tom Ball, kwuru, sị: “Obi tọrọ ndị obodo ahụ ụtọ mgbe ha hụrụ ụdị blọk anyị na-akpụ ebe ahụ. Ụdị ígwè ndị anyị ji rụọ ụlọ ndị ahụ dị iche ná ndị nke ndị obodo ahụ ji arụ ụlọ ha. Ma ihe ka ju ha anya bụ mgbe ha hụrụ ebe ndị ọcha na ndị isi ojii na-arụkọ ọrụ n’udo, obi a na-atọkwa onye ọ bụla ụtọ.”

N’abalị iri na itoolu n’ọnwa anọ n’afọ 1997, ọtụtụ ụmụnna anyị si mba dị iche iche gbakọtara maka inyefe Jehova alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ a. Mgbe otu ọnwa gachara enyefere Jehova alaka ụlọ ọrụ a, agha suru na Fritaụn. Ndị agha nnupụisi ahụ si n’ime ime obodo ndị ha kwarala mgbọ afọ ise bata na Fritaụn.

Mgbe a ka na-arụ alaka ụlọ ọrụ dị na Fritaụn nakwa otú ọ dị taa

Ha Kwaara Mgbọ Bata Fritaụn

Ọtụtụ puku ndị agha nnupụisi a kwaara mgbọ bata na Fritaụn. Ị hụ ha, ntutu isi ha tụhịchara atụhị, ha kekwara ákwà na-acha ọbara ọbara n’isi. Ha malitere ibukọrọ ngwongwo ndị mmadụ, na-edinakwa ụmụ nwaanyị n’ike. Ha na-egbukwa ndị mmadụ aghara aghara. Nwanna Alfred Gunn kwuru, sị: “Agha ahụ bịara kpụrụ ọkụ n’ọnụ. E mekwara ngwa ngwa kpọpụ ọtụtụ ndị ozi ala ọzọ n’obodo ahụ. Ndị ikpeazụ a kpọpụrụ bụ Nwanna Billie Cowan na Sandra nwunye ya, Nwanna Jimmie Holland na Joyce nwunye ya, na mụ na nwunye m Catherine.”

Nwanna Alfred Gunn kwukwara, sị: “Mgbe anyị chọrọ ịpụ, anyị na ụmụnna ndị obodo ahụ na-eje ozi na Betel nọkọrọ kpee ekpere. Ụmụnna ndị a wepụtara onwe ha ịnọ ebe ahụ. Anyịnwa meziri ngwa ngwa gawa ebe a ga-eburu anyị pụọ. Ka anyị na-aga, ndị agha nnupụisi ruru ihe dị ka mmadụ iri abụọ kwụsịrị anyị. Ha ṅụrọchara anya, anya na-achakwa ha ọbara ọbara. Anyị nyere ha Ụlọ Nche na Teta! nakwa ego tupu ha ekwe ka anyị gafee.  Anyị na ihe karịrị otu puku ndị ọzọ chọrọ isi n’obodo ahụ gbapụ zukọrọ n’ebe ndị agha Amerịka na-eche nche. Ọ bụ ebe ahụ ka anyị si banye helikọpta ndị agha ga-ebuga anyị n’ọdụ ụgbọ mmiri. Ọ bụzi n’ebe ahụ ka anyị ga-esi banye n’ụgbọ mmiri ndị agha Amerịka ga-ebuga anyị mba ọzọ. Mgbe anyị na-aga, otu n’ime ndị na-akwọ ụgbọ mmiri a gwara anyị na kemgbe ndị Amerịka lụchara agha Vietnam, o nwebeghị mgbe ụgbọ mmiri ha butere mmadụ ole hà otú a gbara ọsọ ndụ. Mgbe chi bọrọ, anyị banyere helikọpta bugara anyị Kọnakrị bụ́ isi obodo Gini. Oge anyị rutere na Gini, anyị rụrụ ebe anyị ji mere alaka ụlọ ọrụ.”

Nwanna Alfred Gunn na nwunye ya, Catherine, so na ndị e si na Fritaụn kpọpụ

Ndị ozi ala ọzọ a e bugara Gini chọsiri ike ịnụ otú ihe si kwụrụ na Fritaụn. Ụmụnna nọ na Fritaụn mechara detara ha akwụkwọ ozi. N’akwụkwọ ozi ahụ, ha sịrị: “N’agbanyeghị mgbọ a na-akwa na Fritaụn, anyị ka nọ na-ekesara ndị mmadụ Akụkọ Alaeze Nke 35, ya bụ, ‘Ọ̀ Dị Mgbe Mmadụ Nile Ga-ahụ Ibe Ha n’Anya?’ Ndị mmadụ na-ege anyị ntị. Anyị na ụfọdụ ndị agha nnupụisi na-amụkwa Baịbụl ugbu a. N’ihi ya, anyị ekpebisiela ike na anyị ga na-agachi ozi ọma anya.”

Nwanna Jonathan Mbomah, bụ́ onye nlekọta sekit n’oge ahụ, sịrị: “Anyị nwedịrị mgbakọ pụrụ iche na Fritaụn. Okwu ndị e kwuru ná mgbakọ ahụ mere ka okwukwe anyị sikwuo ike. Ọ bụ ya mere m ji gaa Bo na Kenema haziekwa mgbakọ a pụrụ iche n’obodo abụọ a. Ụmụnna anyị ndị nọ n’ebe ndị a a na-alụ agha kelere Jehova maka ihe ndị magburu onwe ha ọ kụziiri ha ná mgbakọ a.

“Ná ngwụcha afọ 1997, anyị nwere mgbakọ distrikti n’ámá egwuregwu mba Siera Lion dị na Fritaụn. N’ụbọchị anyị na-emechi mgbakọ ahụ, ndị agha nnupụisi ahụ nubatara n’ámá egwuregwu ahụ ma gwa anyị ka anyị mechie ozugbo. Anyị rịọrọ ha ka ha hapụ anyị ka anyị mechaa ihe omume mgbakọ anyị. Anyị rịọgidere ha rịọgide ha, ike agwụ ha, ha emechaa hapụ anyị pụwa. Ihe karịrị otu puku mmadụ bịara mgbakọ ahụ. E mekwara mmadụ iri abụọ na asaa baptizim. Ụfọdụ ụmụnna tara ahụhụ gaa Bo ka ha gere okwu ndị ahụ ọzọ. Mgbakọ ndị ahụ tọrọ anyị ezigbo ụtọ!”