Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke Afọ 2014

 SIERA LION NA GINI

‘Ihe Isi Ike Kpụ Ọkụ n’Ọnụ’ n’Afọ 1991 Ruo n’Afọ 2001​—⁠Aịza. 48:10 (Agba nke Abụọ)

‘Ihe Isi Ike Kpụ Ọkụ n’Ọnụ’ n’Afọ 1991 Ruo n’Afọ 2001​—⁠Aịza. 48:10 (Agba nke Abụọ)

Ndị Agha Nnupụisi Akpaa Arụ na Betel!

N’ọnwa Febụwarị afọ 1998, ndị agha gọọmenti mba Siera Lion na ndị agha ekomọg gbakọtara aka lụso ndị agha nnupụisi ahụ ọgụ kpụ ọkụ n’ọnụ. Mkpa ha bụ ịchụpụ ndị agha nnupụisi a na Fritaụn. Ma otu ihe ọjọọ merenụ bụ na agha a tara isi otu nwanna anyị.

Ihe dị ka otu narị ndị nkwusa na iri ise gbatara ọsọ ndụ n’ụlọ ndị ozi ala ọzọ dị na Kisi nakwa na nke dị na Kọkeril. Nwanna Laddie Sandy, bụ́ otu n’ime ụmụnna ndị na-eche nche abalị na Betel, kọrọ ihe mere n’otu abalị. Ọ sịrị: “Ka mụ na nwanna Philip Turay nọ nche n’otu abalị, anyị hụrụ ndị agha nnupụisi abụọ bịara guzoro n’ọnụ ụzọ e si abata Betel. E ji enyo mee ibo ụzọ ahụ. Ha gwara anyị ka anyị megheere ha ụzọ ozugbo. Ma, mụ na Philip ji nwayọọ si ebe anyị nọ gbapụ. Ha gbara égbè ọtụtụ ugboro n’ugodi ụzọ ahụ ka ha gbakaa ya. Ma, n’agbanyeghị égbè niile ha gbara n’ugodi ahụ, ha agbakalighị ya. Ha echetadịghị ịgbaka ibo ụzọ ahụ e ji enyo mee. Ha nọgidere ebe ahụ, ike agwụ ha, ha alawa.

“Mgbe abalị abụọ gachara, ndị agha nnupụisi ahụ kpọ ihe dị ka mmadụ iri abụọ ndị òtù ha bịaghachi. Ha ji ngwá ọgụ nakwa ihe niile ha ga-eji mepee ụzọ ahụ bịa. Mgbe anyị hụrụ ha, anyị kpọtụụrụ ndị niile na-eje ozi na Betel ka ha gbaba n’otu ụlọ dị n’okpuru ala na Betel. Mmadụ asaa n’ime anyị gara zoo n’azụ nnukwu tankị abụọ. Anyị niile nọ ebe ahụ chị obi n’aka. Ndị agha nnupụisi ahụ gbagidere égbè n’ọnụ ụzọ Betel, gbakaa ya ma bata. Otu n’ime ha ji olu ike gwa ndị òtù ya, sị: ‘Chọwanụ Ndịàmà Jehova ahụ. Unu hụ ha, gbupụnụ ha isi.’ Anyị niile hulatachara ma nọrọ jii. Ha nọ na-achọgharị anyị, na-abọkasị ebe niile ruo awa asaa. Mgbe ha mebisichara ihe otú dị ha mma, werekwa ihe ndị ha chọrọ iwere, ha lawara.

“Anyị weere ihe anyị nwere gbapụ gawa Kọkeril ebe ụlọ ndị ozi ala ọzọ dị. Ka anyị na-aga ebe ahụ, ndị agha nnupụisi ọzọ  kwụsịrị anyị, zuo anyị ohi. Anyị mechara rute n’ụlọ ndị ozi ala ọzọ, ụjọ nọkwa na-atụ anyị. Ma, anyị kelere Chineke na anyị dị ndụ. Mgbe anyị zutụchara ike ụbọchị ole na ole, anyị laghachiri Betel ka anyị nwee ike idozi ihe ndị agha nnupụisi ahụ mebiri.”

Mgbe ọnwa abụọ gachara, ndị ozi ala ọzọ nọ na Gini laghachiwara Siera Lion n’ihi na ndị agha ekomọg achụpụla ndị agha nnupụisi ahụ na Fritaụn. Ma, ndị ozi ala ọzọ ahụ anọteghị aka na Fritaụn.

Igbu Ndị Mmadụ Aghara Aghara

Mgbe ọnwa asatọ gachara, ya bụ, na Disemba afọ 1998, e nwere mgbakọ distrikti n’ámá egwuregwu dị na Fritaụn. Isiokwu mgbakọ ahụ bụ, “Ụzọ Ndụ nke Chineke.” Ka a nọ na-ekwu okwu ná mgbakọ ahụ, ụmụnna nụrụ ụda bọmbụ. Ha elegharịa anya hụ anwụrụ ọkụ na-akwụ n’ebe ugwu. Ọ bụ ndị agha nnupụisi ahụ tụrụ bọmbụ ahụ. Ha abịakwala ọzọ.

Abalị ole na ole ihe a mechara, ihe bịara ka njọ na Fritaụn. Kọmitii Alaka dị na Siera Lion kwụrụ ụgwọ obere ụgbọelu e ji buru ụmụnna ụfọdụ buga Kọnakrị. Mmadụ iri na abụọ n’ime ha bụ ndị ozi ala ọzọ, mmadụ asatọ bụ ndị si mba ọzọ na-eje ozi na Betel, mmadụ ise n’ime ha kwa so ná ndị na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Mgbe abalị atọ gachara, ya bụ, n’abalị isii n’ọnwa Jenụwarị afọ 1999, ndị agha nnupụisi ahụ malitere igbu ndị mmadụ aghara aghara na Fritaụn. Ha gburu ihe dị ka puku ndị nkịtị isii. Ha gbupụrụ ụfọdụ ndị ụkwụ na aka, tọrọ ọtụtụ narị ụmụaka, gbaakwa ọtụtụ puku ụlọ ọkụ.

E nwere otu nwanna anyị nwoke ha gburu jaajaa. Aha nwanna a bụ Edward Toby. Ihe karịrị narị ụmụnna abụọ gbara ọsọ ndụ. Ụfọdụ bịara biri na Betel, ndị ọzọ ebiri n’ụlọ ndị ozi ala ọzọ dị na Kọkeril. Ihe ụmụnna ndị a hụrụla mere ka obi ghara ịna-eru ha ala. Ụmụnna ndị ọzọ zoro n’ụlọ ha. E nwekwara ụmụnna ndị gbatara ọsọ ndụ n’ụlọ ndị ozi ala ọzọ dị na Kisi. Ụfọdụ n’ime ha malitere ịrịa ọrịa ma e nweghị ebe a ga-enweta ọgwụ ha ga-aṅụ. Ma, onye pụtara èzí chọrọ ihe ga-eme ya. Ònye ga-anwakwanụ ya anwa? Ka ụmụnna nọ na Betel nọ na-achọ otú a ga-esi wegara ụmụnna ndị ahụ bi na Kisi ọgwụ, ụmụnna abụọ obi  kara wepụtara onwe ha ozugbo ịga. Ha bụ Nwanna Laddie Sandy na Nwanna Philip Turay na-eche nche abalị na Betel.

Nwanna Philip sịrị: “Ọgba aghara dị ebe niile. Ndị agha nnupụisi chechiri n’ụzọ niile, na-emekpọ ndị mmadụ ọnụ. Ha anaghị ekwe ndị mmadụ pụta èzí malite n’elekere iri na abụọ nke ehihie ruo n’elekere isii nke ụtụtụ echi ya. Ihe a ha na-eme ekweghị anyị ruo ngwa ngwa. O were anyị abalị abụọ tupu anyị eruo n’ụlọ ndị ozi ala ọzọ ahụ dị na Kisi. Mgbe anyị na-erule ebe ahụ, ebelebe egbuola. A gbaala ebe niile ọkụ, ọ dịghịkwa otu mkpụrụ mmadụ anyị hụrụ n’ụlọ ahụ.

“Ma, ka anyị nọ na-achọgharị ụmụnna anyị ebe ahụ, anyị hụrụ Nwanna Andrew Caulker ebe ọ tọgbọ. Ndị agha nnupụisi ahụ ji egbugbu gbukasịa ya ahụ́, kee ya agbụ ụkwụ na aka, hapụ ya ka ọ nọrọ ebe ahụ nwụọ. Mgbe o nwetatụrụ onwe ya, ya ejisie ike si ebe ahụ pụọ. Ozugbo anyị hụrụ ya, anyị eburu ya gawa ụlọ  ọgwụ. Ọ nọzi n’ụlọ ọgwụ jiri nwayọọ nwayọọ gbakee. O mechara bụrụ ọsụ ụzọ oge niile.”

E si n’aka ekpe gụrụ gawa aka nri, onye nke mbụ bụ Laddie Sandy, onye nke abụọ bụ Andrew Caulker, onye nke atọ abụrụ Philip Turay

Ma, e nwere ụmụnna ndị ọkọ na-akọghị mgbe ahụ a na-alụ agha ahụ. Otu nwanna nwoke kọrọ, sị: “Ndị agha nnupụisi ahụ gwara anyị ka anyị kee ákwà ọcha n’isi ma gbara egwú gagharịa n’okporo ámá iji gosi na anyị na-akwado ha. Ha kwuru na ọ bụrụ na anyị ajụ, na ha ga-egbupụ anyị aka ma ọ bụ ụkwụ, ma ọ bụkwanụ gbuo anyị anyị anwụọ pịị. Mgbe ha kwuru ihe a, obi wụnyere mụ na nwunye m n’afọ. Anyị tụgharịtụrụ, jiri nwayọọ rịọ Jehova ka o nyere anyị aka. E nwere otu nwa okorobịa onye agbata obi anyị na-enyere ndị agha nnupụisi a aka. Mgbe ọ hụrụ ihe na-emenụ, ọ gwara onyeisi ha, sị: ‘Onye a bụkwanụ nwanne anyị. O nweghị ihe jikọrọ ya na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Biko, ka anyị gbachitere ya egwú.’ Onyeisi ahụ kwetara ihe o kwuru ma si ebe ahụ pụọ. Anyị lawara n’ụlọ anyị ozugbo.”

Mgbe ala bịara jụtụ oyi na Fritaụn, ụmụnna malitere inwe ọmụmụ ihe na ịga ozi ọma. Ma ha na-akpachapụ anya. Ha na-eyi baajị mgbakọ ka e kwe ha gafee ebe ndị agha na-eche nche. Ọ bụrụ na ha erute ebe ọtụtụ ndị kwụ n’ahịrị na-eche ka ndị agha kwe ha gafee, ha na-eji ohere ahụ zie ha ozi ọma.

Ihe niile e ji enyere ndụ aka bịara dị ụkọ na Fritaụn. Ọ bụ ihe mere alaka ụlọ ọrụ dị na Briten ji gbatara ụmụnna nọ ebe ahụ ọsọ enyemaka. Ha buteere ha narị katọn abụọ juru n’ihe ndị e ji enyere ndụ aka. Mgbe e bubatara ihe ndị a na Kọnakrị, Nwanna Billie Cowan na Nwanna Alan Jones bu ha banye ụgbọelu na-aga Fritaụn. Mgbe ha rutere Fritaụn, ha ejirizie ụgbọala buru ihe ndị ahụ ruo Betel. Ha gafere ọtụtụ ebe ndị agha na-eche nche. Ha rutere Betel tupu oge a sị ndị mmadụ apụtakwala èzí ná mgbede eruo. Nwanna James Koroma na-esi na Fritaụn buru ihe ụfọdụ dị mkpa gaa Kọnakrị. Ya lọtawa, ya ebute akwụkwọ anyị na ihe ndị ọzọ dị mkpa. E bugaara ụmụnna anyị ndị nọ na Bo na Kenema ụfọdụ n’ime akwụkwọ anyị ndị ahụ.

Mgbe e butere ihe ndị e ji gbatara ụmụnna ọsọ enyemaka na Fritaụn

N’abalị itoolu n’ọnwa asatọ, n’afọ 1999, ndị ozi ala ọzọ bi na Kọnakrị malitere ịlọghachi Fritaụn. N’afọ 2000, ndị agha Briten chụpụrụ ndị agha nnupụisi ahụ na Fritaụn. Ma, a ka na-akwatụ mgbọ n’ebe ụfọdụ. N’ọnwa Jenụwarị afọ 2002, agha a a lụrụ afọ  iri na otu biri. Agha a tara isi iri puku mmadụ ise. E gbupụkwara iri puku mmadụ abụọ ụkwụ ma ọ bụ aka, gbaakwa narị puku ụlọ atọ ọkụ. Agha a gbawakwara otu nde mmadụ na narị puku abụọ aka ụlọ.

Olee otú ihe si kwụrụ ná nzukọ Jehova n’oge ahụ? O doro anya na Jehova chebere ndị ya ma gọzie ha. N’oge agha ahụ, e mere ihe dị ka narị mmadụ asaa baptizim. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ narị ụmụnna gbara ọsọ ndụ, ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa nọ na Siera Lion na Gini mụbara. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ndị nkwusa e nwere na Siera Lion tupu alụwa agha ahụ dị otu narị, mmadụ iri ise batakwuru n’ọgbakọ n’oge agha ahụ. Na Gini, ọ bụrụ na ndị nkwusa e nweburu dị iri ise, ihe karịrị otu narị mmadụ na iri ise batakwuru n’ọgbakọ. Ma, ihe ọma ọzọ Jehova mere bụ na o nyeere ụmụnna aka ha akwụsie ike n’ọgbakọ. N’agbanyeghị ihe isi ike kpụ ọkụ n’ọnụ ụmụnna ndị a nwere n’oge agha ahụ, ha ka dị n’otu, na-ahụkwa ibe ha n’anya. Ha ‘akwụsịghịkwa izi ndị mmadụ ozi ọma na ịkụziri ha ihe.’—Aịza. 48:10; Ọrụ 5:42.