Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke Afọ 2014

 SIERA LION NA GINI

1915-​1947 Mgbe A Malitere Ikwusa Ozi Ọma na Siera Lion Nakwa na Gini (Agba nke Mbụ)

1915-​1947 Mgbe A Malitere Ikwusa Ozi Ọma na Siera Lion Nakwa na Gini (Agba nke Mbụ)

 Mgbe A Malitere Ikwusa Ozi Ọma na Siera Lion

Ọ bụ n’afọ 1915 ka a malitere ikwusa ozi ọma na Siera Lion. Ndị malitere ya bụ ndị obodo ahụ si Ingland lọta. Ha ji akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl lọta. N’ihe dị ka n’ọnwa asaa n’afọ ahụ, otu Onyeàmà Jehova bịara biri na Fritaụn. Ọ bụ ya bụ Onyeàmà Jehova mbụ bịara ebe ahụ. Aha ya bụ Alfred Joseph. Ọ dị iri afọ atọ na otu mgbe ahụ. Ọ bụkwa onye Gayana, nke dị n’Ebe Ndịda Amerịka. Ọ bụ ná mmalite afọ 1915 ka e mere ya baptizim na Babedọs, dị na West Indiiz. Ọ bụ injinia na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ okporo ígwè dị na Fritaụn. Nwanna Alfred bi n’ebe ndị ọrụ ụlọ ọrụ a na-ebi, n’obodo a na-akpọ Klaịn Taụn. Isi ebe ahụ o bi gaa ebe Osisi Apụ ahụ e nwere na Fritaụn dị dị ihe karịtụrụ kilomita atọ. Ozugbo o bidoro ọrụ, ọ malitere izi ndị ya na ha na-arụ ọrụ ozi ọma.

N’afọ 1916, Nwanna Leonard Blackman, onye ya na Nwanna Alfred rụkọrọ ọrụ mgbe ha bi na Babedọs, bịara Siera Lion inyere Alfred aka ikwusa ozi ọma. Ọ bụ mama Leonard, ya bụ, Elvira Hewitt, mụụrụ Alfred Baịbụl. Leonard na Alfred bi n’otu ụlọ. Ha abụọ na-ezukọkwa mgbe niile amụ Baịbụl. Ha na-agakwa enye ndị enyi ha na ndị ọzọ nwere mmasị akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl.

Nwanna Alfred na Nwanna Leonard chọpụtara na obodo Fritaụn “achaala maka owuwe ihe ubi.” (Jọn 4:35) N’afọ 1923, Nwanna Alfred degaara isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Niu Yọk akwụkwọ. O dere, sị: “Ọtụtụ ndị Siera Lion nwere mmasị ịmụ Baịbụl. Biko, zitenụ onye nwere ike ịkụziri ha Baịbụl nakwa onye nwere ike ịga na-ezi ozi ọma ebe niile n’obodo a?” Ụmụnna anyị nọ n’isi ụlọ ọrụ anyị zaghachiri ya, sị: “Anyị ga-ezite mmadụ!”

Nwanna William “Bible” Brown na nwunye ya Antonia

Nwanna Alfred kwuru, sị: “Mgbe ọnwa ole na ole gachara, otu onye kpọrọ m na fon n’ime abalị otu ụbọchị Satọdee.”

 “Onye ahụ jụrụ m, sị: ‘Ọ̀ bụ gị bụ onye ahụ degaara Watch Tower Society akwụkwọ ma gwa ha ka ha zite ndị na-ekwusa ozi ọma?’

“M zara ya na ‘Ọ bụ m.’

“Ọ gwara m na ‘ọ bụ ya ka ha zitere.’

“Onye ahụ mụ na ya nọ na-akparịta ụka bụ William R. Brown. Ya na nwunye ya, Antonia, na obere nwa ha nwaanyị ka batara Siera Lion n’ụbọchị ahụ. Ha bi na họtel a na-akpọ Gainford Hotel.

“N’ụtụtụ echi ya, mgbe mụ na Leonard nọ na-amụ Baịbụl anyị na-amụ kwa izu, anyị hụrụ otu nwoke gbara dimkpa n’ọnụ ụzọ anyị. Nwoke ahụ bụ William R. Brown. Nwanna Brown ji ofufe Chineke kpọrọ ihe. Ọ chọkwara ikwu okwu ihu ọha n’echi ya. Anyị gara ozugbo nweta otu ụlọ ezumezu kacha mma na Fritaụn ebe ọ ga-anọ ekwu okwu ihu ọha ahụ. Aha ụlọ ezumezu ahụ bụ Wilberforce Memorial Hall. Nwanna Brown ga-ekwu okwu ihu ọha anọ ebe ahụ. Anyị haziri ka o kwuo nke mbụ ná mgbede Tọzdee.

“Anyị malitere ịkpọsa okwu ihu ọha ahụ n’akwụkwọ akụkọ.  Anyị kesakwaara ndị mmadụ akwụkwọ anyị ji kpọọ ha ka ha bịa gere okwu ihu ọha ahụ. Anyị gwakwara ha n’ọnụ ka ha bịa gere ya. Anyị nọ na-eche ma ndị mmadụ hà ga-abịakwa. Ma, ọtụtụ ndị bịara. Ihe dị ka narị mmadụ ise bịara gere okwu ihu ọha ahụ. Ọtụtụ ndị ụkọchukwu nọ na Fritaụn sokwa bịa. Obi tọrọ anyị ụtọ nke ukwuu!”

Mgbe Nwanna Brown na-ekwu okwu ihu ọha ya, ọ gụrụ ọtụtụ ebe na Baịbụl. O jikwa ihe e ji egosi ihe nkiri slaịd mee ka ndị mmadụ na-ahụ amaokwu Baịbụl ndị ahụ. Nwanna Brown gwara ha ọtụtụ ugboro na ‘ọ bụghị yanwa kwuru, kama, ọ bụ Baịbụl kwuru.’ Ihe a ọ na-akụziri ha na-atụ ha n’anya. Ha na-akụkwara ya aka n’ihe ọ bụla o kwuru. Ọ bụ eziokwu na Nwanna Brown ma otú e si ekwu okwu, ihe mere ndị mmadụ ji nwee mmasị n’ihe ọ na-ekwu bụ na o ji Baịbụl gosi ha na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu. Otu nwa okorobịa nọ ebe ahụ kwuru, sị: “Maazị Brown ma Baịbụl nke ọma!”

Afọ 1924

Okwu ihu ọha ndị Nwanna Brown kwuru kpọtụrụ akpọtụ. Ndị mmadụ na-abịakwa egere okwu ya. Na Sọnde ọzọ, ọtụtụ mmadụ bịakwara gere okwu ihu ọha ọzọ o kwuru. Isiokwu ya bụ, “Ịga Hel Ma Lọghachi—Ole Ndị Nọ n’Ebe Ahụ?” Ihe Nwanna Brown si na Baịbụl gwa ndị mmadụ n’abalị ahụ mere ka ụfọdụ ndị a ma ama na chọọchị kwụsị ịga chọọchị.

Nwanna Brown kwuru okwu ihu ọha nke anọ, ya bụ, nke ikpeazụ n’ime okwu ihu ọha anọ ahụ a haziri ka o kwuo. Isiokwu ya bụ, “Ọtụtụ Nde Ndị Dị Ndụ Ugbu A Agaghị Anwụ Anwụ.” Ọtụtụ mmadụ bịakwara gere okwu ihu ọha a. Otu onye nọ na Fritaụn mechara dee gbasara ya, sị: “Chọọchị niile kwuru na agaghị enwe ụka mgbede n’ụbọchị ahụ n’ihi na ndị òtù ha niile chọrọ ịga gere okwu Nwanna Brown.”

Ndị mmadụ kpọwara Nwanna Brown “Bible” Brown. Ihe mere ha ji akpọ ya aha a bụ na ọ na-esikarị na Baịbụl ekwu ihe ọ bụla ọ na-ekwu. Ọ bụ aha a ka ndị mmadụ na-akpọ Nwanna Brown n’ebe niile ọ gara kwusaa ozi ọma n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka. Aha a na-atọ Nwanna Brown ụtọ. Ọ zagidere ya ruo mgbe o jechara ozi ya n’ụwa.