• MBA OLE HA DỊ 47

  • MMADỤ OLE BI NA HA 4,282,178,221

  • NDỊ NKWUSA OLE NỌ NA HA 674,011

  • MMADỤ OLE A MỤỤRỤ BAỊBỤL 672,318

Otú E Si Nyere Otu Nwoke Aka n’Agbanyeghị na O Kpuru Ìsì, Daakwa Ogbi

N’afọ 1999, otu ọgbakọ na-eji asụsụ ndị ogbi amụ ihe na Kobi dị na Japan nụrụ banyere otu nwoke onye ogbi aha ya bụ Hirofumi. Otu nwanna nwoke gara ka ọ hụ ya, ma mama ya ekweghị. Nwanna ahụ gaghachiri ọtụtụ ugboro na-arịọ mama Hirofumi ka o kwe  ka ọ hụ nwa ya nwoke. O mechara kweta, ma kpọpụtara ya Hirofumi. Mgbe nwanna ahụ hụrụ ya, ntụtụ isi ya na afụ ọnụ ya rujuchara eruju, dịrịkwa nkịkara nkịkara. Ọ dị ka onye si n’ime ọhịa gbapụta. Ihu anaghị atọ ya ọchị. Ọ dara ogbi, kpuokwa ìsì. Akpata oyi wụrụ nwanna nwoke ahụ n’ahụ́. Ma, o jidere ya aka, na-emetụ ya aka n’ọbọ aka, jiri ya na-agwa ya okwu. Ma, Hirofumi aghọtaghị ihe ọ na-eme. Hirofumi kpuru ìsì afọ iri gara aga mgbe ọ dị afọ iri atọ na otu. Kemgbe ahụ, a naghị ekwe ka ndị mmadụ na-ahụ ya, o nweghịkwa onye gbalịrịla ikwunyere ya okwu.

Nwanna nwoke ahụ bịaghachiri mgbe abalị abụọ gachara. Ọ tụrụ mama Hirofumi n’anya, n’ihi na o chere na nwanna ahụ agaghịzi abịa ọzọ ebe ọ bụ na ọ hụla otú nwa ya dị. Nwanna nwoke ahụ rịọkwara ya ka ọ kpọpụtatụ Hirofumi ka ya na ya hụ. O kwetara kpọpụta ya. Mgbe nwanna a bịagidere ruo otu ọnwa, ma o nweghị ihe gbanwerenụ, mama Hirofumi gwara ya enyezila onwe ya nsogbu ịna-abịa. Ma, nwanna a nọgidere na-aga. Ọ na-ewegara ha keeki, na-agbalịkwa emere ha ihe ọ bụla o nwere ike imere ha. Ma, mgbe o megidere ihe a ruo ọnwa abụọ, o nweghị ihe gbanwerenụ, o chere na ihe ahụ ya na-eme bụ ịgbasa mmiri n’okwute.

Otu ụbọchị, nwanna a kpebiri na ya ga-aga leta Hirofumi nleta nke ikpeazụ. Tupu ya agawa, ọ rịọrọ Jehova ka o nyere ya aka ịma ma ọ̀ ka ga na-aga eleta Hirofumi. Mgbe o ruru, o jidere Hirofumi n’aka, jiri aka ya meere ya n’asụsụ ndị ogbi na e nwere Chineke aha ya bụ Jehova, na ọ nọ n’eluigwe na-ahụ ya mgbe niile, nakwa na ọ kacha onye ọ bụla ọzọ mara otú ihe si dịrị ya. Ọ gwakwara ya  na ọnọdụ ya na-ewute Chineke, nakwa na ọ na-agụ Chineke agụụ ịgwọ ya, na ọ bụ ya mere o ji zitere ya otu n’ime Ndịàmà ya. Ná mbido, Hirofumi emeghị ka ò nwere ihe ọ na-aghọta; ma o mechara kwesie nwanna ahụ aka ike, anya mmiri agbawa ya. Ihe a metụrụ nwanna a n’ahụ́; anya mmiri agbawakwa yanwa. O bidoziri mụwara ya Baịbụl.

Hirofumi bidoro iso otu ọgbakọ na-eji asụsụ ndị ogbi amụ ihe n’agbanyeghị na ebe ọgbakọ ahụ dị dị anya. Ma, mgbe a mụụrụ ya ihe ruo afọ iri na otu, o bidoro sowe ọgbakọ nke dị ya nso na-amụ ihe. O nweghị onye ma asụsụ ndị ogbi n’ọgbakọ a. Ma, mgbe ọ na-erula otu afọ na ọnwa isii Hirofumi bịara, ụmụnna iri abụọ na abụọ amụtala asụsụ ndị ogbi ka ha nwee ike inyere ya aka. Na Jenụwarị  2012, Hirofumi mere ihe omume mbụ ya n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Otú o si mee ya bụ ya jiri asụsụ ndị ogbi na-eme ihe omume, nwanna ọzọ ana-akọwara ndị na-ege ntị ihe ọ na-ekwu. N’ọnwa Ọktoba afọ ahụ, Hirofumi ghọrọ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim.

Ya na Ndị Nche Na-amụ Baịbụl

Na Filipinz, otu onye ọsụ ụzọ aha bụ Floren na-akuziri ihe dị ka mmadụ iri abụọ na ise Baịbụl. Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị nche. Ndị nche a na-arụkarị ọrụ ná mgbede, ụfọdụ na-arụgidekwa ọrụ chi efoo. Ihe a mere ka Floren na-ahazigharị oge ọ ga-eji na-aga ahụ ha. Ọ na-aga amụrụ ha ihe n’oge ha na-ezurutụ ike ma ọ bụkwanụ n’oge ndị ọzọ ha na-anaghị arụ ọrụ. Ọ na-amụrụ ụfọdụ n’ime ha ihe n’agbata ekelere anya asaa na elekere anya iri na otu nke abalị, e nwekwara ndị nke ọ na-amụrụ n’agbata elekere anya ise na elekere anya itoolu nke ụtụtụ. Mgbe ụfọdụ, ọ na-abịa mgbe ọ fọrọ obere ka ụfọdụ chechaa nche nke ha, ka ndị ọzọ malite. Otú a ọ na-esi eme ya na-eme ka o nwee ike ịmụrụ onye nke na-aga ibido nche ihe, o mechaakwa, ya amụọrọ onye nke checharalanụ. Floren kwuru, sị: “Ịmụrụ ọtụtụ ndị Baịbụl emeela ka m na-enwe obi ụtọ m na-enwetụbeghị mbụ ná ndụ m.” Ụfọdụ n’ime ndị nche ahụ amalitela ịbịa ọmụmụ ihe. Otu onye n’ime ndị Floren na-amụrụ ihe emeekwala baptizim, bụrụkwa ọsụ ụzọ oge niile ugbu a.

Filipinz: Ebe Floren na-amụrụ mmadụ Baịbụl n’isi ụtụtụ

Ha Gbalịrị Chọta Ndịàmà Jehova

N’Aminia, e nwere otu ụbọchị ụmụnna nwaanyị abụọ nọ n’ozi ọma. Mmiri na-ezotụ ụbọchị ahụ. Ha hụrụ otu nwaanyị na nwa ya nwaanyị n’ụzọ ma nye ha traktị. Aha nwaanyị ahụ bụ Marusya, aha nwa ya nwaanyị abụrụ Yeva. Ha gwara ụmụnna nwaanyị abụọ ahụ na ha nọ ná mmiri a kemgbe awa abụọ na-ele ma hà ga-ahụ Ndịàmà Jehova.  Ihe ahụ ha kwuru tụrụ ụmụnna ndị ahụ n’anya. Olee ihe mere ha ji buru mmiri na-achọ Ndịàmà Jehova? O nwere mgbe nwanne Marusya nọ n’ụlọ mkpọrọ. N’ụlọ mkpọrọ ahụ, o nwekwara ụmụnna a tụrụ mkpọrọ n’ihi na ha ekweghị arụ ọrụ agha. Ụmụnna ahụ kụziiri ya Baịbụl. Marusya chere na nwanne ya nwoke ahụ pụta n’ụlọ mkpọrọ na ọ ga-abụzi isi ekwe ọnwụ na onye iwe ọkụ. Ma, ọ pụtaziri bụrụ ezigbo mmadụ obi ruru ala. Ka ya na Ndịàmà Jehova na-amụkwu Baịbụl, ọ bịara na-akpakwu ezigbo àgwà. Ihe a nọ na-agbagwoju Marusya na nwa ya nwaanyị anya maka na ha anụla ọtụtụ ihe ọjọọ a na-akọ banyere Ndịàmà Jehova na tiivi nakwa n’akwụkwọ ndị a na-amapawa n’okporo ụzọ. Yeva sịrị: ‘Nwanne m mma m bụzi ezigbo mmadụ. Gịnị meziri ndị mmadụ ji na-ekwu ọtụtụ ihe ọjọọ banyere Ndịàmà Jehova?’ Ọ chọrọ ịmata ihe kpatara ya. N’ihi ya, ọ gwara mma ya, sị: “Anyị agaghị amatali nke bụ́ eziokwu ọ gwụkwala ma ànyị gbalịrị chọta Ndịàmà Jehova. Ka anyị gaa ugbu a chọọ Ndịàmà Jehova mata nke bụ́ eziokwu.” Ọ bụ ya ka ha nọ na-eme ụbọchị ahụ ụmụnna nwaanyị abụọ ahụ hụrụ ha. Mgbe abalị abụọ gachara, a malitere mụwara ha Baịbụl. Ha bidoro bịawa ọmụmụ ihe, mechaakwa ghọọ ndị nkwusa a na-emebeghị baptizim.

Ụmụaka Wetara Magazin Dowe n’Ọnụ Ụzọ Ya

Istanbul, dị na Tọki: Ebe nwanna nwoke ji broshọ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke na-ezi ozi ọma n’okporo ụzọ

N’obodo Adana nke dị na Tọki, e nwere otu nwaanyị nsogbu ezinụlọ na nsogbu ndị ọzọ zuru ahụ́. O nwedịrị mgbe ọ chọrọ igbu onwe ya. Ma, otu ụbọchị, ọ hụrụ magazin abụọ n’ọnụ ụzọ ya. O nwere ike ịbụ ụmụaka ndị agbata obi ya tụụtara ha dowe ebe ahụ chee na ọ bụ nke ya. Akụkọ ndị nwaanyị ahụ gụtara na magazin ndị ahụ banyere otú Baịbụl sirila gbanwee ndụ ndị mmadụ tọrọ ya ezigbo ụtọ, nke na ọ dịkwa ya ka Baịbụl gbanwee ndụ nke ya. Ọ kpọrọ akara ekwentị e dere n’azụ otu n’ime magazin  ndị ahụ. O ji ya nweta otu onye ọsụ ụzọ bi nso ebe ahụ. Onye ọsụ ụzọ ahụ bidoro mụwara ya Baịbụl. Obi tọrọ nwaanyị ahụ ụtọ maka ihe ndị ọ na-amụta, o kwukwara na ya chọrọ ịbịawa ọmụmụ ihe. Ọ dabara na ụlọ ya dị nso n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ malitere bịawa ọmụmụ ihe ozugbo, ọ kwụsịbeghịkwa kemgbe ahụ.

Abalị Iri Ọ Nọrọ n’Ụlọ Mkpọrọ Emeghị Ka Ọ Gbanwee Obi Ya

Na Nipọl, e nwere otu onye uwe ojii aha ya bụ Bam, ọ na-agakwa chọọchị. Otu ụbọchị, ka ọ nọ n’okporo ụzọ na-arụ ọrụ ya, ọ hụrụ otu di na nwunye bụ́ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Otú ndị ọsụ ụzọ ahụ si jiri Baịbụl zaa ya ajụjụ niile ọ jụrụ ha masịrị ya. Bam kwere ka a mụwara ya Baịbụl. Obere oge, o bidokwara bịawa ọmụmụ ihe. Ka a na-amụrụ ya ihe, akọnuche ya bidoro nyewe ya nsogbu n’ihi ụdị ọrụ ọ na-arụ. Ọ gakwuziiri ndị isi ha rịọ ha ka ha nye ya ọrụ ọ ga na-arụ n’ọfis nke ga-eme ka ọ ghara ịna-ebu ngwá ọgụ. Ha kwetara nye ya ọrụ ọzọ. Ma, mgbe ọ gachara otu mgbakọ distrikti lọta, akọnuche ya bidokwara nyewe ya nsogbu ọzọ, ya ekpebizie na ya ga-ahapụ ọrụ uwe ojii ahụ kpamkpam.

Obi adịghị nwunye Bam mma maka ihe ahụ di ya mere, n’ihi na ọrụ ahụ na-eme ka a na-akwanyere ha ùgwù, ego dịkwa na ya, a ga na-akwụkwa di ya ezigbo ụgwọ ma ọ laa ezumike nká. Iji mee ka di ya gbanwee obi ya, ọ sịrị ya: “Ọ bụrụ na ị nọgide n’ọrụ uwe ojii, m ga-eso Ndịàmà Jehova mụwa Baịbụl.” Mgbe ọ hụrụ na di ya ekweghị, ọ gaziri gwa onyeisi ndị uwe ojii ka ọ tụọ ya mkpọrọ iji lee ma ọ̀ ga-agbanwe obi ya. Bam nọrọ abalị iri n’ụlọ mkpọrọ, a tọhapụ ya. Ma, ọ ka kpebisiri ike ịchọrọ ọrụ ọzọ. Ọ malitere iji ígwè nwere ụkwụ atọ na-agba ọkada, ọrụ a ga-emezi ka ọ na-anọ n’anwụ ọtụtụ oge. N’agbanyeghị na ọrụ a adịghị mfe, obi na-abụ ya sọ aṅụrị. Ọ nọgidere na-eme nke ọma  n’ọgbakọ ma mechaa bụrụ onye nkwusa. Nwunye ya mechara kwụsị inye ya nsogbu. N’ihi otú ụmụnna anyị si mesoo nwunye ya omume ọma, ọ malitere ịmụ Baịbụl. Bam nọgidere na-elekọta ezinụlọ ya. Ego ọ na-akpata n’ọrụ a ọ na-arụ ugbu a kadị ego ọ na-akpata mgbe ahụ ọ bụ onye uwe ojii. O mere baptizim ná mgbakọ e mere na Febụwarị afọ 2013, nwunye ya na nwa ya na-esokwa ya abịa ọmụmụ ihe ugbu a.

Nipọl: Mgbe Bam hapụrụ ọrụ ọ na-arụbu, chọrọ ọrụ ọzọ, ya na ndị ezinụlọ ya bịara nwee ike ịna-eme nke ọma n’ọgbakọ

Ọ Chọrọ Ịsụ Ụzọ Inyeaka

Na Koria, o nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Myeong-hee. Otu ụkwụ adịghị ya mma n’ihi ọrịa rịara ya mgbe ọ dị afọ abụọ. Ụkwụ a na-adịghị ya mma na-eme ka ike na-agwụkarị ya. Mgbe ụfọdụkwa, ọ na-azọhie ụkwụ daa. Ihe ọzọ bụ na ọgwụ ndị ọ na-aṅụ na-eme ka ahụ́ na-enye ya nsogbu, na-emekwa ka obi na-amapụkarị. Ọ na-esiri ya ike iku ume, ọnọdụ ya a na-emekwa ka obi na-ajọ ya njọ. N’agbanyeghị nsogbu a niile zuru ya ahụ́, ọ chọrọ ịsụ ụzọ inyeaka. Kemgbe afọ abụọ ugbu a, ọ rụọla ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ n’ọnwa niile. Ọ na-ekele Jehova maka otú o si na-enye ya ike o ji na-aga ozi ọma.

“O Ruola Afọ Iri Atọ M Chọwara Ya!”

E nwere otu nwanna nwaanyị na-eje ozi ala ọzọ n’Indonisha. Aha ya bụ Agnes. Ọ na-ezibu otu nwaanyị na-ere akwụkwọ nri n’ahịa obodo ha ozi ọma. Nwaanyị a dị ime mgbe ahụ. Ma, mgbe ọ bụla o nwere ohere, ọ na-agụ magazin anyị, na-enwekwa mmasị ikwurịta gbasara Baịbụl. Otu ụbọchị, Agnes gara n’ahịa ileta ya, ma, ọ hụghị ya. Di nwaanyị a gwara ya na nwunye ya amụọla  nwa. Agnes gawaziri ka ọ hụ ya. O ji ihe fụchie Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible ọ ga-enye ya. O juru nwaanyị ahụ anya na Agnes bịawara ịhụ ya na nwa ya. Ihe kacha tụọ ya n’anya bụ na Agnes wetaara ya onyinye. Mgbe ọ tọpere ihe e ji fụchie akwụkwọ ahụ, ihe ọ hụrụ enyeghị ya ọnụ okwu, ya asị Agnes: “Olee ebe ị hụrụ akwụkwọ a? O ruola afọ iri atọ m chọwara ya. Achọọla m ya ebe niile a na-ere akwụkwọ, jụọkwa ndị mmadụ gbasara ya. Ma, o nweghị onye nwere ya, o nweghịdị onye ma ya. Akwụkwọ a ka akwụkwọ ndị ọzọ mma okpukpu iri.” Mgbe nwaanyị a dị obere, nwanne mama ya nwere akwụkwọ ahụ, ọ na-atọkwa ya ụtọ ịgụ ya. Ugbu a, ọ gụwakwala ya ọzọ, ada ya nwaanyị na-enwekwa mmasị ịgụ ya. A malitekwara ịmụrụ ha abụọ Baịbụl.

Indonisha: Ebe Agnes ji akwụkwọ ahụ o nyere nwaanyị ahụ