Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke Afọ 2014

 IHE NDỊ E MERE N’AFỌ GARA AGA

Obi Dị Ha Ụtọ Maka Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N’ỊNTANET

Obi Dị Ha Ụtọ Maka Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N’ỊNTANET

N’abalị iri abụọ na asatọ n’ọnwa Jun afọ 2013, a mara ọkwa na jw.org na e nwere ike ịchọta ihe n’Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N’ỊNTANET n’otu narị asụsụ. Mmadụ nwere ike ịchọta ihe na ya otú ahụ e si achọta ihe na Watchtower Library nke dị na CD-ROM. E nwere ike iji kọmputa, ekwentị ma ọ bụ ihe ndị e ji aga Ịntanet gaa n’ebe ahụ. Ọ bụ ihe ndị e dere n’akwụkwọ anyị malite n’afọ 2000 gbagowe ka e tinyere na ya. N’ọtụtụ asụsụ, e tinyekwara ya Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nakwa akwụkwọ Insight. I nwekwara ike jiri ya chọta otu mkpụrụ okwu  ma ọ bụ karịa, otú ahụ e si eji Watchtower Library achọta ihe. Ọ bụrụ na e nwere amaokwu Baịbụl ma ọ bụ isiokwu ị chọrọ ịgụ, i nwere ike ịchọ ya n’ọ́bá akwụkwọ a. Ị chọọkwa, ya emepere gị ya n’asụsụ ọzọ. Ọtụtụ mmadụ edetarala anyị akwụkwọ ozi ekele. Lee ụfọdụ n’ime ha:

“Unu emeela maka inye anyị ọ́bá akwụkwọ a. Obi tọrọ m ezigbo ụtọ mgbe m hụrụ ihe ọhụrụ a e ji amụ ihe. Amaghị m anya kọmputa ma ọ bụ Ịntanet, ma ama m na otú unu si rụọ ya enweghị atụ. O gosiri na unu hụrụ ma Jehova ma ndị agbata obi unu ma ụmụnna unu n’anya. E nweghị onyinye ka onyinye a Jehova nyere anyị. Jidenụ ka unu ji.”—A., Ajentina.

“Ọ tụrụ m n’anya mgbe m bara n’Ịntanet n’ehihie a hụ na asụsụ Heshan Kriol bụ otu n’ime asụsụ ọhụrụ e tinyere n’Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N’ỊNTANET. Amaghị m na ụdị ihe a nwere ike ime eme. Amaghị m otú m ga-esi kelee unu. Ka Jehova gọzie mbọ niile unu na-agba, ka mmụọ nsọ ya nọgidekwa na-edu unu.”—D.C., Amerịka.