Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2017

Ebe Ndị Mmụta Baịbụl na-enwe mgbakọ na Takoma, nke dị na Wọshịntịn, dị n’Amerịka

Ihe Ndị Mere n’Otu Narị Afọ Gara Aga, Ya Bụ n’Afọ 1917

Ihe Ndị Mere n’Otu Narị Afọ Gara Aga, Ya Bụ n’Afọ 1917

E NWERE ihe Ụlọ Nche Bekee nke January 1, 1917 kwuru banyere afọ 1917. O kwuru, sị: “Afọ ọhụrụ a ji tigbuo zọgbuo, ezigbo ọgba aghara na mwụfu ọbara malite.” N’eziokwu, a ka na-akwa mgbọ mgbe ahụ n’ike n’ike na Yurop n’Agha Ụwa nke Mbụ, nke a na-akpọkwa Agha Ukwu.

N’agbanyeghị na Ndị Mmụta Baịbụl n’oge ahụ aghọtachabeghị ma ezigbo Ndị Kraịst hà kwesịrị ịlụ agha, ọtụtụ n’ime ha gbara ezigbo mbọ ka ha ghara ịwụfu ọbara. Dị ka ihe atụ, n’Ịngland, otu nwa okorobịa dị afọ iri na itoolu aha ya bụ Stanley Willis kpebisiri ike na ya agaghị alụ agha. N’ihi ya,  a nwụchiri ya ma kpee ya ikpe. Ma, tupu e kpee ya ikpe, o kwuru, sị: “Obi dị m ezigbo ụtọ na m na-aga ịpụta n’ihu ụlọikpe zara ọnụ m. Onyeisi ndị amị gwara m n’ụtụtụ a na a ga-enye m uwe agha ka m yiri, m jụ iyi ya, e kpee m ikpe.”

Mgbe Stanley jụrụ iyi uwe agha ahụ, ha tụrụ ya mkpọrọ ebe ọ ga na-arụgbu onwe ya n’ọrụ. N’agbanyeghị ya, obi ka na-atọ ya ụtọ. Mgbe ọnwa abụọ gachara, o kwuru, sị: “‘Ike’ eziokwu ahụ na-enye, na-enyere mmadụ aka idi nsogbu . . . nwere ike isiri ndị ọzọ ike idi.” O ji oge ahụ ọ nọ na mkpọrọ mee ihe bara ezigbo uru. O kwuru, sị: “Otu n’ime uru nsogbu ndị bịaara m n’oge na-adịbeghị anya baara m bụ na o mere ka m nwee ohere ịnọ ebe dị jụụ kpee ekpere, mụọ ihe ma chebara ya echiche.”

Mgbe obere oge gachara, mba Amerịka sonyeere mba ndị ọzọ n’Agha Ụwa nke Mbụ ahụ. Mgbe Onyeisi ala Amerịka aha ya bụ Woodrow Wilson na-agwa Ụlọ Nzukọ Omeiwu okwu n’abalị abụọ n’ọnwa Eprel, afọ 1917, o kwuru ka ha gaa lụso ndị Jamanị agha. Mgbe abalị anọ gachara, mba Amerịka malitere ịlụso Jamanị agha. O teghị aka, a malite inye ụmụnna anyị nsogbu n’ihi na ha ekweghị aga agha.

Mba Amerịka chọsịrị inweta ndị agha ike. Ọ bụ ya mere na n’ọnwa Mee, ha mere iwu e ji akpọ mmadụ ka ọ banye amị. Iwu a mere ka ha nweta ọtụtụ puku ụmụ nwoke ga-aga agha. Mgbe otu ọnwa gachara, ha mere iwu ọzọ kwuru na onye jụrụ ịba amị dara iwu. Obere oge e mechara iwu ndị a, ndị na-achọghị iji anya ahụ ndị Jehova gbagidere ụkwụ n’iwu a “na-akpa nkata nsogbu” megide ndị na-efe Jehova.​—⁠Ọma 94:⁠20.

Nsogbu agha a kpatara ejughị Ndị Mmụta Baịbụl anya. Kemgbe ọtụtụ afọ, ha nọ na-agwa ndị mmadụ banyere amụma ndị dị na Baịbụl kwuru na ihe ndị ahụ ga-eme. Ma, ọ bịara gbagwojuo ọtụtụ Ndị Mmụta Baịbụl anya na nsogbu malitere n’etiti ndị Jehova ụfọdụ.

 A Nwalere ma Yọchaa Ha

Obere oge Nwanna Charles Taze Russell nwụchara, nsogbu malitere n’etiti ndị Jehova n’Amerịka. Ha malitere ịzọ onye ga na-ahazi ọrụ ndị Jehova. Ọ bụ n’afọ 1884 ka Nwanna Russell debanyere aha ụlọ ọrụ anyị bụ́ Zion’s Watch Tower Tract Society n’akwụkwọ gọọmenti. Ọ bụkwa ya bụ onyeisi oche ya ruo mgbe ọ nwụrụ n’Ọktoba afọ 1916. Mgbe Nwanna Rutherford ghọrọ onyeisi oche Zion’s Watch Tower Tract Society, ụfọdụ ụmụnna a ma ama na mmadụ anọ ha na Nwanna Russell so na-ahazi ụlọ ọrụ a zọwara onye kwesịrị ịnọchi Nwanna Russell.

Mmadụ anọ a ha na Nwanna Russell rụkọrọ ọrụ na ọtụtụ ụmụnna ndị ọzọ enweghị mmasị n’otú Nwanna Rutherford si na-ahazi ọrụ anyị. Otu n’ime ihe ha na-enweghị mmasị na ya bụ ihe o mere Nwanna Paul S. L. Johnson, bụ́ onye pilgrim ma ọ bụ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị.

Obere oge tupu Nwanna Russell anwụọ, o mere Nwanna Johnson onye nnọchianya na-ejegharị ejegharị, meekwa ndokwa ka ọ gaa Ịngland. O ruo, ọ ga na-ekwusa ozi ọma, na-eleta ọgbakọ dị iche iche, ma na-akọrọ isi ụlọ ọrụ anyị otú ọrụ anyị si na-aga n’Ịngland. Mgbe o rutere Ịngland n’ọnwa Nọvemba afọ 1916, ụmụnna nọ ebe ahụ nabatara ya nke ọma. Otú ha si nabata ya mere ka isi buwe ya, ya ekwuo n’obi ya na ọ bụ ya kwesịrị ịnọchi Nwanna Russell.

Nwanna Johnson ji aka ya chụọ ụfọdụ ndị na-arụ na Betel dị n’Ịngland n’ihi na ha akwadoghị ya. Ọ chọwara otú ọ ga-esi eme ka ego nzukọ Jehova nwere n’ụlọ akụ̀ dị na Lọndọn dịrị ya n’aka. Tupu ya emee ya, Nwanna Rutherford gwara ya ka ọ lọghachi Amerịka.

A dọrọ Nwanna Johnson aka ná ntị mgbe ọ laghachiri Bruklin ma ọ nabataghị ya. Kama, ọ gbawara mbọ ka o mee ka Nwanna Rutherford kweta ka ọ laghachi Ịngland rụwakwa ọrụ ya. Ma, Nwanna Rutherford ekwetaghị. N’ihi ya, Johnson gara kọọrọ ya ụmụnna ndị ha na Rutherford so na-ahazi ọrụ anyị ka ha kwado ya, anọ n’ime ha adụnyere ya úkwù.

 Ka ihe a nọ na-eme, Nwanna Rutherford kwụsịrị mmadụ anọ ahụ iso ná ndị na-ahazi ọrụ anyị n’ihi na o chere na ha nwere ike ime ka ego nzukọ Jehova nwere n’ụlọ akụ̀ dị n’Amerịka dịrị ha n’aka, otú ahụ Johnson chọrọ ime n’Ịngland. Dị ka iwu mba Amerịka kwuru, kwa afọ, e kwesịrị ịna-ahọpụta ndị ga na-ahazi ọrụ a na-arụ n’ụlọ ọrụ anyị. E nwere mmadụ asaa na-ahazi ọrụ n’ụlọ ọrụ anyị. Ma, ná nnọkọ ha na-enwe kwa afọ nke e nwere n’abalị isii n’ọnwa Jenụwarị afọ 1917, ọ bụ naanị mmadụ atọ ka a họpụtara. A họpụtara Nwanna Joseph F. Rutherford ka ọ bụrụ onyeisi oche, họpụta Nwanna Andrew N. Pierson ka ọ bụrụ osote ya, họpụtakwanụ Nwanna William E. Van Amburgh ka ọ bụrụ odeakwụkwọ na onye na-ahụ maka ego. Emeghị ntụliaka maka ịhọpụta mmadụ anọ ndị ọzọ ga-eso ha na-arụ ọrụ. N’oge gara aga, ụmụnna ndị ahụ dụnyeere Nwanna Johnson úkwù sobu ná ndị a họpụtara ha na Nwanna Russell so na-ahazi ọrụ anyị. Ụfọdụ ndị chekwara na ha ga-arụgide ọrụ ahụ ruo mgbe ha nwụrụ. Ma, ebe a na-ahọpụtaghị ha ọzọ ná nnọkọ ahụ, ọ pụtara na ha esoghịzi ná ndị ga na-ahazi ọrụ anyị. N’ọnwa Julaị afọ 1917, Nwanna Rutherford, bụ́ onyeisi oche Zion’s Watch Tower Tract Society ji aka ya họpụta ụmụnna anọ kwesịrị ntụkwasị obi ka ha nọchie ha.

Ezigbo iwe were mmadụ anọ mbụ ahụ, ha amalite ịgba mbọ ka e weghachi ha n’ọkwá ha. Ma, mbọ ha kụrụ afọ n’ala. Ụfọdụ Ndị Mmụta Baịbụl dụnyeere ha úkwù, ha agaa hiwe chọọchị nke ha. Ma, ọtụtụ kwụsiri ike ná nzukọ Jehova. Mmadụ anọ ahụ enwetaghị ọkwá ha ọzọ.

Ha Gara n’Ihu n’Agbanyeghị Nsogbu

N’oge a niile, Nwanna Rutherford na ụmụnna ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi akwụsịghị ọrụ ha na-arụ na Betel ka ozi ọma ahụ nwee ike ịna-aga n’ihu. Ndị pilgrim, ya bụ, ndị nlekọta sekit e nwere n’oge ahụ bịara mụbaa, si na iri isii na itoolu ruo iri itoolu na atọ. Ndị kọpọtụa, ya bụ, ndị ọsụ ụzọ oge niile sikwa na narị mmadụ atọ na iri asaa na abụọ ruo narị mmadụ anọ na iri isii na otu. A malitekwara ịhọpụta ndị  kọpọtụa pụrụ iche. Ha dị ka ndị ọsụ inyeaka n’oge a. Ụfọdụ ọgbakọ mgbe ahụ nwechara ihe ruru otu narị ndị ọsụ ụzọ ji ozi ha kpọrọ ihe.

N’abalị iri na asaa n’ọnwa Julaị afọ 1917, e wepụtara akwụkwọ ọhụrụ aha ya bụ The Finished Mystery. Tupu afọ ahụ agwụ, e kesachara ole e bipụtara. A gwaziri ụlọ ọrụ na-ebiri anyị akwụkwọ ka ha bipụtakwuo narị puku asatọ na puku iri ise ọzọ. *

N’afọ 1917, a hazigharịchara otú ọrụ ga-esi na-aga na Betel nke Nwanna Russell malitere ịhazigharị n’afọ 1916. N’ọnwa Disemba afọ ahụ, Ụlọ Nche kwuru, sị: “A hazigharịchaala otú ọrụ . . . ga-esi na-aga. Ọrụ na-agazi otú o kwesiri isi na-aga n’ụlọ ọrụ ọ bụla a haziri nke ọma . . . Ndị na-arụ ọrụ na Betel ugbu a ghọtara na ọ bụ ihe ọma ka e meere ha, ọ bụghị na ọ bụ ihe ruuru ha.”

N’ọnwa Septemba afọ 1917, Ụlọ Nche kwukwara, sị: “Malite n’abalị mbụ n’ọnwa Jenụwarị, ọnụ ọgụgụ akwụkwọ a na-ebipụta n’ọnwa ọ bụla hiri nne ma e jiri ya tụnyere ndị nke e bipụtara n’ọnwa ọ bụla n’afọ 1916 . . . Ihe a gosiri na Onyenwe Anyị na-agọzi ọrụ a anyị nọ na Bruklin ebe a na-arụ.”

Nnwale na Myọcha Agwụbeghị

A zapụla ndị ahụ na-agba ihe a na-eme ná nzukọ Jehova ụkwụ. Ntụliaka ọgbakọ dị iche iche mere, nke gbara n’Ụlọ Nche, gosiri na ọtụtụ ụmụnna kwadoro Nwanna Rutherford na ụmụnna ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi ya na ha so na-ahazi ọrụ na Betel. Ma, a ka nwere ihe ndị ọzọ ga-eme, nke ga-egosi ma ụmụnna ndị a hà kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ bụ eziokwu na ihe malitere nke ọma n’afọ 1918, ma nsogbu ndị Jehova na-enwetụbeghị kemgbe ha malitere n’oge a ga-abịara ha n’afọ ahụ.

^ para. 18 Ọ bụ ụlọ ọrụ na-ebi akwụkwọ na-ebiri anyị akwụkwọ mgbe ahụ ruokwa n’afọ 1920.