Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2017

Wọwik, Niu Yọk: Isi Ụlọ Ọrụ Anyị

Ihe Ndị E Mere n’Afọ Gara Aga

Ihe Ndị E Mere n’Afọ Gara Aga

 KA IHE na-akakwu njọ n’ụwa Setan a, ndị na-efe Jehova ‘na-enwe ọtụtụ ihe ha na-arụ n’ọrụ Onyenwe anyị.’ (1 Kọr. 15:58) Ihe ndị anyị na-aga ịkọ ugbu a na-egosi otú Ndịàmà Jehova n’ụwa niile si na-agba mbọ ‘atụkwasị Jehova obi . . . , na-eme ihe ọma . . . , ma na-eme ihe n’ikwesị ntụkwasị obi.’​—⁠Ọma 37:⁠3.

Ibufe Isi Ụlọ Ọrụ Anyị na Alaka Ụlọ Ọrụ Dị n’Amerịka Ebe Ọzọ

A rụchara ụlọ ndị anyị na-arụnyekwu n’ụlọ ọrụ anyị dị na Wọlkil nke dị na Niu Yọk, n’abalị mbụ n’ọnwa Febụwarị, afọ 2016. N’ihi ya, Kọmitii Alaka nke alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Amerịka, Ngalaba Ije Ozi na ngalaba ndị ọzọ dị na ya kwafere ebe ahụ. Ebe ọ bụkwa na a rụchawala isi ụlọ ọrụ ọhụrụ anyị a na-arụ na Wọwik, ndị ezinụlọ Betel dị na Bruklin si na Niu Yọk Siti na-akwafe Wọwik.

Na Mọnde, abalị atọ n’ọnwa Eprel afọ 2017, a ga-amalite ịnabata ndị mmadụ ịbịa legharịa  anya n’isi ụlọ ọrụ anyị dị na Wọwik. E nwere ebe atọ mmadụ ga-eji aka ya gaa legharịa anya, nweekwa ebe mmadụ ga-akpọgharị ndị bịara ilegharị anya. Ihe a kpọrọ ebe ndị ahụ ndị mmadụ ga-eji aka ha gaa legharịa anya bụ:

  1. “Baịbụl na Aha Chineke” N’ebe a, ị ga-ahụ Baịbụl ndị merela ochie ọtụtụ ndị na-enweghị, hụkwa na aha Chineke dị na ha.

  2. “Ndị Jehova Kpọkwasịrị Aha Ya” N’ebe a, ị ga-ahụ foto dị iche iche, hụkwa ụfọdụ ihe ochie Ndịàmà Jehova jirila zie ozi ọma. Ihe ndị a na-akọwa otú Jehova sirila na-eduzi ndị ya, na-akụziri ha ihe ma hazie ha ka ha na-eme uche ya.

  3. “Ọrụ Òtù Na-achị Isi Na-arụ” N’ebe a, ị ga-ahụ ebe ndị a kọwachara ihe ngalaba dị iche iche nke Òtù Na-achị Isi na-eme iji nyere ndị Jehova aka ịna-ezukọta ọnụ maka ife Chineke, ịna-ekwusa ozi ọma, ịna-enweta ihe ndị e ji amụ Baịbụl, nakwa ịna-ahụ ibe ha n’anya.

Ndị mmadụ nwere ike ịga n’ebe ndị a legharịa anya n’onwe ha malite n’elekere asatọ nke ụtụtụ ruo n’elekere anọ nke ehihie si na Mọnde ruo Fraịdee. A ga-enwekwa nke mmadụ ga-akpọgharị ndị bịara ilegharị anya, ma gosi ha Ọfis ụfọdụ, nakwa gburugburu Betel. Nke a ga-ewe nkeji iri abụọ. Na nke a, a ga na-akpọgharịkwa ndị mmadụ malite na Mọnde ruo Fraịdee. A ga na-amalite n’elekere asatọ nke ụtụtụ ma kwụsị n’elekere iri na otu nke ụtụtụ, malite ọzọ n’elekere mbụ nke ehihie ma kwụsị n’elekere anọ nke ehihie.

Tupu gị akwadowa ịbịa legharịa anya ebe a, biko gaa na jw.org pịa ebe e dere ABOUT US pịzie OFFICES & TOURS ma họrọ United States.

IN THIS SECTION

Ilekwasị Anya n’Ikwusa Ozi Ọma n’Ụwa Niile

Olee ihe ndị jeburu ozi na Betel na-eme n’ebe e zipụrụ ha?

“Ahụtụbeghị M Ndị Agbata Obi Dị Ka Unu”

Na Mee 7 na 8 2016, ụfọdụ bịara legharịa anya n’ebe anyị dowere Baịbụl dị iche iche na Bruklin. O mere ka ọtụtụ ndị bi nso na Betel nụ ozi ọma.

Ọmụmụ Ihe Ọhụrụ A Na-akpọ Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ

N’ọnwa Jenụwarị afọ 2016, a gbanwere ọmụmụ ihe ndị anyị na-enwe n’ime izu n’ụwa niile

Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova ‘Na-agba Anyị Ume’

A malitere ime Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova n’afọ 2014. Ugbu a, a na-eme ya n’ihe karịrị asụsụ iri itoolu. Olee ihe ọtụtụ ndị na-ele ya kwurula?

Alaka Ụlọ Ọrụ Anyị Ndị E Nyefere Jehova

Obi tọrọ Ndịàmà Jehova nọ n’Aminia na Kegịstan ezigbo ụtọ mgbe a na-enyefe Jehova alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’obodo ha.

Ikpe Gbasara Ndịàmà Jehova nke Afọ 2016

Olee ikpe Ndịàmà Jehova kpere n’ụlọikpe dị iche iche n’afọ 2016?

Ihe Ndị Mere n’Ebe Dị Iche Iche n’Ụwa

Ihe ọhụrụ Ndịàmà Jehova nọ na Jamanị, Beliiz, Burundi, Nepal, Ịtali, Ajentina,Yuganda, Kongo (Kinshasa) na Papụa Niu Gini rụzuru.