Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2017

 JỌJIA | 1924-1990

Ọmụmụ Ihe Mere Ka Okwukwe Ha Sikwuo Ike

Ọmụmụ Ihe Mere Ka Okwukwe Ha Sikwuo Ike

Ọmụmụ ihe so n’ihe nyeere ndị batara ọhụrụ n’ọgbakọ aka ka okwukwe ha sikwuo ike. Ma ndị ọhụrụ a ma ndị nọrọla ọtụtụ afọ n’ọgbakọ na-achọ ka a nọrọ n’ụlọ ha na-enwe ọmụmụ ihe. Ha na-eji obi ha niile anabata ndị bịara ọmụmụ ihe, o mekwara ka ha hụkwuo ibe ha n’anya.

Mgbe ọtụtụ ndị a na-amụrụ Baịbụl ruru eru ka e mee ha baptizim, a na-ahazi ka e nwee nnọkọ pụrụ iche na nzuzo. A ga-anọ ná nnọkọ a mee ha baptizim. N’ọnwa Ọgọst afọ 1973, ụmụnna haziri ka e nwee ụdị nnọkọ a n’ebe na-abụghị Sokumi. Ebe ahụ dị nso n’akụkụ Osimiri Ojii. E nwere mmadụ iri atọ na ise a ga-eme baptizim ná nnọkọ a. Ma, e mezighị ha baptizim n’ihi na tupu e mechie, ndị uwe ojii bịara kwụsị nnọkọ ahụ ma nwụchie ụfọdụ ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị. Nwanna Vladimir Gladyuk so ná ndị a nwụchiri.

 Ngwa ngwa a tọhapụrụ Vladimir na ụmụnna ndị ọzọ, ha kpọrọ ndị ahụ chọrọ ime baptizim ka ha bịa ka e mee ha baptizim. Mgbe abalị abụọ gachara e nwere nnọkọ mbụ ahụ, e mere ha niile baptizim. Nwanna Vladimir kwuru, sị: “O doro anyị anya na Jehova kwụ anyị n’azụ. Mgbe e mechara ụmụnna ndị ahụ baptizim, anyị niile bịakọtara ọnụ kpee ekpere, kelee Jehova maka otú o si nyere anyị aka.”

Nsogbu Ndị Ọchịchị Na-enye Ụmụnna Mere Ka Ọtụtụ Ndị Nụ Ozi Ọma

Abalị abụọ e mechara ụmụnna ndị ahụ baptizim, a nwụchiri Vladimir Gladyuk ọzọ. E mechakwara tụọ ya na Nwanna Itta Sudarenko, na Nwanna Natela Chargeishvili mkpọrọ ọtụtụ afọ. Ọ bụ eziokwu na ihe a wutere ụmụnna ndị ọzọ, ha kpebisiri ike na ha agaghị akwụsị izi ozi ọma, kama, na ha ga na-akpachapụkwu anya.

E nwere otú ụmụnna anyị si ezi ozi ọma n’oge ahụ ka ndị ọchịchị ghara ịkpara ha aka. Ha na-ahapụ obodo ha, gaa obodo ọzọ kwusaa ozi ọma. Ọ bụ otú a ka nsogbu ahụ ndị ọchịchị na-enye ha si mee ka e kwusaa ozi ọma n’ọtụtụ ebe.

N’oge ndị Kọmunist na-achị, ụmụnna ndị bi n’obodo ka mepee emepe na-aga ekwusa ozi ọma n’okporo ámá ndị na-anaghị ekwo ekwo, nakwa n’ogige ndị mmadụ na-aga elegharị anya. Ha na-ahụkarị ndị si obodo ọzọ ma ọ bụ ime ime obodo bịa ileta ndị ikwu ha ma ọ bụkwanụ ndị bịara ahịa. Ọ bụrụ na ndị ha ziri ozi ọma achọọ ka ha na ha mụwa Baịbụl, ha na-anara ha adres ha ma hazie otú ha ga-esi na-amụ ihe.

Nwanna Nwaanyị Babutsa Jejelava so ná ndị gara n’obodo dị iche iche n’ebe ọdịda anyanwụ Jọjia kwusaa  ozi ọma. O kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na m nwere ọtụtụ ndị ikwu bi ebe dị iche iche n’ebe ahụ, o nweghị onye na-ajụ m ihe mere m ji abịakarị ebe ndị ahụ. Mgbe ihe dị ka afọ abụọ gachara, e nwere ihe karịrị mmadụ iri abụọ m na-amụrụ Baịbụl na Zugdidi, nweekwa mmadụ ise n’obodo Chikoroku. E mechakwara mee ha niile baptizim.”

A Chọsiri Akwụkwọ Anyị Ndị E Dere n’Asụsụ Jọjin Ike

Obere oge ụmụnna anyị malitere ikwusa ozi ọma, ha chọpụtara na e kwesịrị inwe akwụkwọ anyị ndị e dere n’asụsụ Jọjin. Ha gaa nletaghachi ma ọ bụ na-amụrụ ndị mmadụ ihe, ha na-achọpụta na ndị ha na-amụrụ ihe ga-aka aghọta ihe ha na-amụ ma ha nwee Baịbụl na akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Baịbụl n’asụsụ ha. *

Nwanna Nwaanyị Babutsa kwuru otú o si esiri ha ike ịmụrụ mmadụ Baịbụl n’ejighị akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’asụsụ Jọjin. O kwuru, sị: “Ọ bụ naanị Baịbụl na akwụkwọ ndị ọzọ e dere n’asụsụ Rọshịan ka m nwere. N’ihi ya, m na-eji aka m asụgharị akwụkwọ ndị m ga-eji amụrụ ndị mmadụ ihe gaa n’asụsụ Jọjin.” Nwanna nwaanyị a ji naanị akwụkwọ ọkọwa okwu na-asụgharị Magazin anyị n’asụsụ Jọjin. Ọ gbalịkwara sụgharịa Akwụkwọ Matiu.

Ụmụnna katara obi jiri ígwè kọpị kọpị na-ebipụta akwụkwọ anyị n’ụlọ ha

Obi na-atọ ndị a na-amụrụ ihe ụtọ inweta akwụkwọ ndị ahụ n’asụsụ ha nke na ha na-eji aka ha edepụtaghachi nke ha ga-agụ. Ebe ọ bụ na inweta Baịbụl e dere n’asụsụ Jọjin na-esi ike, ụfọdụ ndị a na-amụrụ Baịbụl malitere iji aka ha na-edepụtaghachi Baịbụl n’asụsụ Jọjin nke na ha ghọrọ “ndị ọkà n’idepụta” Okwu Chineke.

 “M Na-esi n’Ụtụtụ Degide Ihe Ruo n’Abalị”

Ihe a na-eme n’oge ahụ bụ a sụgharịchaa akwụkwọ anyị n’asụsụ Jọjin enye ya ụmụnna na ndị a na-amụrụ Baịbụl ka ha gụọ, onye gụchaa, ya enye ibe ya. E nye ya mmadụ, a gwa ya abalị ole ma ọ bụ izu ole ọ ga-agụ ya tupu ya enye onye ọzọ. Mgbe e nwetara Akwụkwọ Nsọ Grik e ji asụsụ Jọjin a na-ede n’oge ahụ sụgharịa, e nyere ya otu ezinụlọ ka ha gụọ, ha ejiri ohere ahụ malite idepụtaghachi ya.

Nwanna Raul Karchava dị naanị afọ iri na atọ mgbe ahụ. Mgbe e nyere ezinụlọ ha Akwụkwọ Nsọ Grik ahụ ka ha gụọ, papa ya gwara ya ka o depụtaghachi ya. Nwanna Raul kwuru, sị: “Papa m zụtara ọtụtụ akwụkwọ na ụdị mkpịsị akwụkwọ na pensụl dị iche iche juru igbe. O chere na  obi ga-atọ m ụtọ ma m hụ ha. Ọ bụ eziokwu na o riri m ọnụ mgbe m hụrụ ya, mana m kwetara idepụtaghachi ya. M na-esi n’ụtụtụ degide ihe ruo n’abalị. Mgbe m na-ebili ọtọ bụ ma m chọọ ịgbatị aka.”

Ụlọ Nche na akwụkwọ Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị e ji aka dee n’asụsụ Jọjin

Obi tọrọ ndị ikwu Raul ezigbo ụtọ mgbe ha nụrụ na ụmụnna ekwetala ka Baịbụl a onye ọ bụla chọrọ inweta nọrọ na nke ha ruo izu ole na ole ọzọ ka Raul nwee ike idepụtaghachicha ya. Raul gbara mbọ depụtaghachi akwụkwọ iri abụọ na asaa e nwere n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst naanị n’ọnwa abụọ.

N’agbanyeghị mbọ ụmụnna ndị a gbara n’idepụtaghachi akwụkwọ anyị ndị a sụgharịrị n’asụsụ Jọjin, a ka nwere ọtụtụ ndị a na-amụrụ ihe na-enwetabeghị ha. N’ihi ya, ụfọdụ ụmụnna anyị katara obi nọrọ n’ụlọ ha na-ebipụta  ha ma na-ekesa ha ka ndị chọrọ ha nweta ha, ọ bụ eziokwu na e nwere ike imesi ha ike ma a hụ ha.

N’oge ahụ, e ji nwayọọ nwayọọ na-ekwusa ozi ọma ebe niile n’ebe ọdịda anyanwụ Jọjia. Gịnịkwanụ banyere ebe ọwụwa anyanwụ? È nwere nwanna bi n’isi obodo Jọjia bụ́ Tibilisi ga-enyere ndị chọrọ ịmụta banyere Chineke aka, nyekwara ma Vaso Kveniashvili anyị kwuburu banyere ya?

Ozi Ọma Eruo n’Isi Obodo Jọjia

N’agbata afọ 1971 na afọ 1979, ndị ọchịchị Sọviet Yuniọn gbawara mbọ ime ka ụmụnna anyị kwụsị ikwusa ozi ọma. Ha na-aga n’obodo dị iche iche achụpụ ha n’ụlọ ha. Ọ bụ ihe a ka ha mere Nwanna Oleksii Kurdas na Lydia nwunye ya. Ha bụ ndị Yukren bịara biri na Tibilisi. A tụburu ha mkpọrọ ọtụtụ afọ n’ihi ihe ndị ha kweere.

Onye a bụ Larisa Kessaeva (Gudadze) n’ihe dị ka n’afọ 1973

Nwanna a na nwunye ya ziri Zaur Kessaev na Eteri nwunye ya ozi ọma. Zaur na nwunye ya ejighị chọọchị ha egwu egwu. Nwa ha nwaanyị aha ya bụ Larisa dị afọ iri na ise mgbe ahụ. O kwuru ihe ha mere mgbe mbụ Nwanna Oleksii na nwunye ya ziri ha ozi ọma n’otu mgbede. Ọ sịrị: “Anyị gbara mbọ igosi ha na ọ bụ naanị Chọọchị Ọtọdọks bụ ezigbo chọọchị. Anyị na ha kwugidere okwu anyị amaghịzi ihe anyị ga-ekwu, ma ha gara n’ihu jiri Baịbụl na-egosi anyị na ihe ha na-ekwu bụ eziokwu.”

Larisa kwukwara, sị: “Mgbe ọ bụla anyị gara chọọchị, m na-aga ebe e dowere ihe oyiyi ndị dị n’ahụ́ ájá ma na-agụ Iwu Iri ahụ e dere n’etiti ha. Ma ná mgbede ahụ, mgbe Nwanna Oleksii gụụrụ anyị Ọpụpụ 20:​4, 5, ike gwụrụ m. Ehighị m ụra n’abalị ahụ n’ihi na m nọ na-ajụ onwe m, sị: ‘Ọ̀ bụ eziokwu na isiala anyị na-akpọrọ ihe oyiyi ndị ahụ dị n’ahụ́ ájá bụ ịda iwu Chineke?’”

 N’isi isi ụtụtụ, Larisa gbaara gaa na chọọchị ha ka ọ gụọ iwu iri ahụ ọzọ ka ọ mara ma ọ̀ bụ eziokwu na ha na-ada iwu Chineke. Ọ gụtara na iwu ahụ kwuru, sị: “Emerela onwe gị ihe oyiyi a pịrị apị . . . Akpọrọla ha isiala.” Ụbọchị ahụ bụ nke mbụ ná ndụ ya ọ ghọtara ihe iwu ahụ pụtara. Larisa na ndị mụrụ ya mechara mee baptizim. Ha bụ ndị mbụ ghọrọ Ndịàmà Jehova na Tibilisi.

Ọ Chọtara Ihe ahụ Ọ Na-achọ

O were Vaso Kveniashvili ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ iri abụọ si na mgbe mbụ Onyeàmà Jehova ziri ya ozi ọma tupu ya ahụ onye ọzọ na Tibilisi na-aga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Obi tọrọ Vaso ụtọ na ya mechara hụ Ndịàmà Jehova ọzọ. O teela ọ chọwara ha.

Onye a bụ Vaso Kveniashvili. Si na mgbe mbụ Ndịàmà Jehova ziri ya ozi ọma, o were ya ihe dị ka afọ iri abụọ na anọ tupu ya aghọọ Onyeàmà Jehova

Mgbe mbụ ọ gara ọmụmụ ihe ha, ụmụnna achọghị ka ha na ya mekọwa ihe n’ihi na ha mabu ya ka onye omekome. Ụfọdụ ụmụnna chedịrị na o nwere ike ịbụ onye  sabo na-arụrụ ndị ọchịchị ọrụ. Ọ bụ ya mere ha ekweghị ka o soro ha na-enwe ọmụmụ ihe ruo afọ anọ.

Mgbe o doro ụmụnna anya na Vaso chọrọ ịbụ Onyeàmà Jehova n’eziokwu, ha mechara mee ya baptizim, ya aghọọ Onyeàmà Jehova. N’ikpeazụ, Vaso mechara bịaruo “Chineke nke ikpe ziri ezi” nso, bụ́kwanụ onye ọ nọ na-achọ kemgbe ọ bụ okorobịa. (Aịza. 30:18) O ji obi ya niile fee Jehova ruo mgbe ọ nwụrụ n’afọ 2014.

Mgbe o ruru afọ 1990, ụmụnna eziela ọtụtụ ndị ozi ọma ma n’ebe ọdịda anyanwụ Jọjia ma n’ebe ọwụwa anyanwụ ya. E nweela ihe ruru ụmụnna dị narị itoolu na-amụrụ mmadụ ruru narị itoolu na iri anọ na abụọ Baịbụl. Otú a e si kwusaa ozi ọma ebe niile na Jọjia ga-eme ka ọtụtụ ndị ghọọ Ndịàmà Jehova n’ọdịnihu.

^ para. 12 Ọ na-esi ike inweta Baịbụl n’oge ahụ ndị Kọmunist na-achị obodo Jọjia n’agbanyeghị na e nwere akwụkwọ Baịbụl ụfọdụ a sụgharịrịla n’asụsụ Jọjin n’agbata afọ 401 na afọ 500.​—⁠Gụọ igbe bụ́ “Baịbụl A Sụgharịrị n’Asụsụ Jọjin.”