Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2017

Ngwongwo ụmụnna anyị a gbara ọkụ emeghị ka ha kwụsị ife Jehova

 JỌJIA | 1998-2006

Nsogbu A Na-enye Ha Emeghị Ka Ha Kwụsị Ife Jehova

Nsogbu A Na-enye Ha Emeghị Ka Ha Kwụsị Ife Jehova

Ihe a na-eme ụmụnna anyị emeghị ka ụjọ na-atụ ha, ha akwụsịghịkwa ịna-enwe ọmụmụ ihe. Ndị okenye mere ihe iji mee ka a ghara imerụ ụmụnna anyị ahụ́. Nwanna André Carbonneau, bụ́ onye ọkàiwu si Kanada kpechitere ọnụ ụmụnna anyị n’ụlọikpe n’oge ahụ. O kwuru, sị: “A na-agwa otu nwanna ji ekwentị ka ọ gaa nọrọ n’ebe dị nso n’ebe ụmụnna nọ na-enwe ọmụmụ ihe. Ọ hụ ndị na-enye anyị nsogbu ka ha na-abịa, ya akpọọ ndị okenye ozugbo n’ekwentị.”

Foto a dị n’aka ekpe bụ ụlọ Nwanna Shamoyan, nke aka nri abụrụ ebe anyị na-ebusa akwụkwọ. A gbara ha ọkụ

Mgbe ọ bụla ha bịara wakpo ụmụnna anyị, alaka ụlọ ọrụ anyị na-eziga ụmụnna abụọ ka ha gaa gbaa ụmụnna anyị ume. Nwanna André kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla ndị si alaka ụlọ ọrụ bịara ịkasi ụmụnna anyị obi ọ na-eju ha anya ịhụ ụmụnna obi dị ezigbo ụtọ, ka ha zukọrọ.”

Ndị na-emegide ụmụnna anyị na-enye ha nsogbu ma n’ụlọikpe ma mgbe ha pụtara

 Ụmụnna ndị a na-enweghị ihe e mere ha na ndị a na-amụrụ Baịbụl na-abịakwa nnọkọ ndị ahụ. Nwanna André chetara ihe otu nwaanyị chọrọ ịghọ onye nkwusa gwara ya mgbe ya na ya na-ekwurịta okwu. Ọ sịrị ya: “Mgbe ọ bụla m hụrụ ihe a na-eme ụmụnna anyị na tiivi, m na-achọpụta na e nwere ihe dị iche n’ezigbo Ndị Kraịst na Ndị Kraịst adịgboroja. M chọrọ ịbụ ezigbo Onye Kraịst.”

Ha Katara Obi Kpechite Ọnụ Ụmụnna Ha n’Ụlọikpe

N’oge ndị ahụ a na-emekpọ ụmụnna anyị ọnụ, ha gosiri na ha nwere ezigbo okwukwe n’ihi na ha katara obi na-ekwusa  ozi ọma. Ụmụnna ndị kpechitere ọnụ ụmụnna anyị n’ụlọikpe gosikwara na ha nwere ezigbo okwukwe.

Ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-agwakarị ọhaneze ihe na-abụghị eziokwu banyere Ndịàmà Jehova. Ha kwuru na ha na-ekewa ezinụlọ, na-agba gọọmenti mgba okpuru, ha anaghịkwa ekwe ka a gwọọ ha. Ndị ọkàiwu ahụ kpechitere ọnụ ụmụnna anyị katara obi mee ya n’agbanyeghị na o nwere ike ịkpa ọrụ ha aka ọjọọ ma ọ bụ mee ka a kpọwa ha aha ọjọọ.

Ndị a bụ ụmụnna anyị si na Ngalaba Okwu Iwu nke dị n’isi ụlọ ọrụ anyị n’Amerịka. Ha katara obi kpechite ọnụ ụmụnna anyị n’ụlọikpe

Nwanna John Burns, bụ́ ọkàiwu si n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Kanada, na-enyere ụmụnna anyị aka n’oge ahụ.  O kwuru, sị: “Ụmụnna anyị ndị Jọjia bụ́ ndị ọkàiwu wepụtara onwe ha inyere ụmụnna ha aka. Ha katara obi gaa n’ụlọikpe kwuo na ha bụ Ndịàmà Jehova, n’agbanyeghị na o nwere ike ịkpa ọrụ ha aka ọjọọ.” Ụmụnna ndị a ụjọ na-anaghị atụ nyere aka “n’ịkwado ozi ọma na n’iji iwu mee ka o guzosie ike.”​—⁠Fil. 1:⁠7.

Ndị Jọjia Akatọọ Ihe A Na-eme Ụmụnna Anyị

Ka ọ dịgodị, ndị mmadụ akwụsịbeghị ọnụ ahụ ha na-emekpọ ụmụnna anyị. N’ihi ya, malite n’abalị asatọ n’ọnwa Jenụwarị afọ 2001, Ndịàmà Jehova dere akwụkwọ ha ji mee mkpesa ka a kwụsị ọnụ a na-emekpọ ha, nakwa ka e kpee ndị ahụ na-emekpọ ha ọnụ ikpe n’ụlọikpe. Ha kesaara ọhaneze akwụkwọ ahụ ka ha bịanye aka na ya.

Nwanna Burns kwuru ihe mere ha ji dee akwụkwọ ahụ ha ji mee mkpesa. O kwuru, sị: “Ihe mere anyị ji dee ya bụ iji gosi na ihe a a na-eme Ndịàmà Jehova adịghị ọtụtụ  ndị Jọjia mma, nakwa na ọ bụ ndị Jọjia ole na ole okpukpe ha na-agba ara na-akpa arụ a.”

N’ime izu abụọ, ndị Jọjia si ebe dị iche iche bịanyere aka n’akwụkwọ ahụ. Ha dị otu narị puku na puku iri atọ na atọ, narị atọ na iri asaa na ise. Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị Ọtọdọks. Ọ bụ eziokwu na e nyere Onyeisi ala aha ya bụ Shevardnadze akwụkwọ ahụ, ma nsogbu ahụ akwụsịghị. Ndị ahụ okpukpe ha na-agba ara nọgidere na-emesi ụmụnna anyị ike.

Ihe a bụ akwụkwọ ahụ ọtụtụ puku ndị Jọjia bịanyere aka na ya. Ha katọrọ ọnụ a na-emekpọ ụmụnna anyị

Jehova nọgidere na-agọzi ụmụnna anyị n’agbanyeghị ihe a na-eme ha. Ka ha nọ na-enye ụmụnna anyị nsogbu, Jehova nọ na-akpọpụta ọtụtụ ndị nọ n’okpukpe ụgha ji obi ha niile chọọ ife ya.

Ọ Hapụrụ Okpukpe Ụgha

E nwere otu nwaanyị aha ya bụ Babilina Kharatishvili kpere Chọọchị Ọtọdọks nke Jọjia ọtụtụ afọ. O jighị chọọchị a egwu egwu. Mgbe ọ dị ihe dị ka afọ iri atọ na atọ, ọ na-aga n’obodo dị iche iche, nakwa n’ime ime obodo na-akụziri ndị mmadụ gbasara otú ndị nsọ si bie ndụ ka ha nwee ike ibi ndụ ha otú ahụ.

Babilina chọrọ ịmatakwu Chineke. N’ihi ya, ọ gara ka a kụzikwuoro ya gbasara Chineke n’ụlọ akwụkwọ seminarị na Chọọchị Ọtọdọks nke Jọjia. Otu ụbọchị, otu ụkọchukwu na-akụziri ha ihe gosiri ha akwụkwọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, ma gwa ha gaa ka Ndịàmà Jehova nye ha ya. Ọ gwara ha, sị: “Akwụkwọ a ga-akụziri unu ọtụtụ ihe gbasara Baịbụl.”

Ihe a ụkọchukwu ahụ gwara ha juru Babilina anya. Ọ nọ na-agbara Ndịàmà Jehova ọsọ, ma ugbu a, ụkọchukwu ha gwara ha gụọ akwụkwọ ha. Babilina gwara onwe ya, sị, ‘Ọ bụrụ na ọ bụ n’aka Ndịàmà Jehova ka  m ga-esi mụta gbasara Chineke, oleezi ihe m nọ ebe a na-eme?’ Ọ gakwuuru Ndịàmà Jehova nọ n’obodo Poti ozugbo, ya na ha amalite ịmụ Baịbụl.

Ka Babilina na-amụ Baịbụl, ọ gbanwere ndụ ya. O kwuru, sị: “Mgbe m gụtara na Baịbụl na ọ dịghị mma iji ihe a kpụrụ akpụ efe Chineke, m kwụsịrị ikpere arụsị n’ụdị ya ọ bụla. O doro m anya na ihe a m mere bụ ihe m kwesịrị ime.” Mgbe ọ gbara ihe dị ka afọ iri asaa na asatọ, o kpebiri na ya ga-aghọ Onyeàmà Jehova.

Onye a bụ Babilina. Ọ kụziiri nwa nwa ya aha ya bụ Izabela Baịbụl

Ọ dị mwute na n’afọ 2001, Babilina dara ọrịa ma nwụọ, e mezighị ya baptizim. Ma, e mechara mee nwa nwa ya aha ya bụ Izabela baptizim. Ugbu a, Izabela ji obi ya niile na-ejere Jehova ozi.

Ọ Chọrọ Ịbụ Sista

E nwere otu nwaanyị aha ya bụ Eliso Dzidzishvili. Mgbe ọ dị afọ iri abụọ na asatọ, o kpebiri ịbụ sista. N’afọ 2001, ọ gara biri na Tibilisi n’ihi na enweghị ụlọ ndị  sista n’ebe dị nso n’obodo ha bụ́ Tikibuli. Ka ọ nọ na-eche ka a na-abata ya ka ọ bụrụ sista, ọ malitere ịkụzi ihe nwa oge. Otu n’ime ụmụ akwụkwọ ya bụ nwa otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Nunu.

Eliso kwuru, sị: “Mụ na Nunu na-ekwukarị gbasara Baịbụl. Anyị kwuwa ihe Chọọchị Ọtọdọks anyị na-akụzi, m na-eji iwe agbachitere ya. Ma Nunu na-emeda obi egosi m amaokwu Baịbụl dị iche iche na-egosi na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu. Otu ụbọchị anyị na-ekwurịta okwu, ọ gụụrụ m akwụkwọ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? Ka anyị na-agụ paragraf ndị dị na ya, na-agụkwa amaokwu Baịbụl ndị e dere na ha, ọ bịara doo m anya na onye na-efe ihe a kpụrụ akpụ na-ada iwu Chineke.”

Eliso mechara gaa na chọọchị ha ma jụọ ụkọchukwu ha ajụjụ ụfọdụ. Ihe ọ zara ya mere ka ọ ghọta na chọọchị ha na-akụzi ihe na-adịghị na Baịbụl. (Mak 7:​7, 8) Ọ bịara doo ya anya na ya achọtala eziokwu. Nke a mere ka ya  na Ndịàmà Jehova malite ịmụ Baịbụl ozugbo. O teghịkwa aka, e mee ya baptizim.

Foto aka ekpe bụ Nwanna Nwaanyị Eliso Dzidzishvili. Ọ chọburu ịbụ sista. Foto nke aka nri bụ Nwanna Nwaanyị Nunu Kopaliani

Ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze n’Agbanyeghị Nsogbu

N’afọ 2001, a bịara nwee ọtụtụ ọgbakọ na-enweghị Ụlọ Nzukọ Alaeze. Otu nchọpụta e mere gosiri na a chọrọ ihe dị ka Ụlọ Nzukọ Alaeze iri asaa. N’ihi ya, a haziri otú a ga-esi arụ ha n’agbanyeghị nsogbu a na-enye ụmụnna anyị na Jọjia niile.​—⁠Ezra 3:⁠3.

Obere oge, ụmụnna na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze malitere ịrụgharị ụlọ ọtụtụ ọgbakọ ndị nọ na Tibilisi na-anọ na ya amụ ihe. Ozugbo a rụgharịchara ya, a rụrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ abụọ, otu na Tibilisi, nke ọzọ na Chiatura, dị n’ebe ọdịda anyanwụ Jọjia.

Foto aka ekpe bụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ochie dị na Tibilisi. Nke dị n’aka nri bụ nke ọhụrụ a na-anọzi na ya amụ ihe

Nwanna Tamazi Khutsishvili, bụ́ onye so rụọ Ụlọ Nzukọ Alaeze na Chiatura, kwuru ihe mere mgbe ahụ. Ọ sịrị: “Mmadụ iri na ise n’ime anyị rụrụ ọrụ ebe ahụ kwa ụbọchị. Obere oge anyị bidoro, mmadụ niile matara na anyị na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ. Mgbe ụfọdụ, anyị na-anụ kepu kepu na ndị na-enye anyị nsogbu chọrọ ịbịa kụtuo ya.”

 Ebe ọ bụ na a na-enye anyị nsogbu, anyị nọ na-eche ma ànyị ga-arụchakwa Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ. Nwanna Tamazi kwuru ihe ha mere. Ọ sịrị: “Anyị nọgidere na-arụ ya, ma rụchaa ya n’ọnwa atọ. N’agbanyeghị na anyị na-anụ na ndị na-enye anyị nsogbu ga-abịa, ha abịaghị.” *

Ụmụnna Anyị Enwere Onwe Ha n’Ikpeazụ

Ihe a bụ mgbe a kpọchiri ụfọdụ ndị Chọọchị Ọtọdọks okpukpe ha na-agba ara na onyeisi ha aha ya bụ Vasili Mkalavishvili. Ọ bụ ha mekpọrọ ụmụnna anyị ọnụ

N’ọnwa Ọktoba afọ 2003, a malitere ịrụ otu Ụlọ Nzukọ Alaeze na Samtredịa. Mgbe anyị na-arụ ya, ndị ahụ na-enye anyị nsogbu kwukwara na ha ga-akwatu ya. Obere oge anyị dochara blọk ya, ha bịara kwatuo ya otú ahụ ha kwuru.

 Ma, n’ọnwa Nọvemba afọ 2003, a gbanwere ọchịchị Jọjia. Nke a mere ka ahụ́ ruo ụmụnna anyị ala, meekwa ka a kwụsị nsogbu a na-enye ndị mmadụ n’ihi okpukpe ha. Ọ bụ ya mere e ji kpọchie ọtụtụ n’ime ndị ahụ na-enye Ndịàmà Jehova nsogbu.

Otú Jehova Si Gọzie Ndị Ya

Obere oge a kwụsịrị nsogbu ahụ a na-enye Ndịàmà Jehova na Jọjia, Jehova gọziri ha. Ná mgbakọ e nwere n’afọ 2004, e wepụtara Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’asụsụ Jọjin.

E nwere ihe ọzọ ụmụnna anyị na-agaghị echefu echefu mere ná mgbakọ ha nwere n’afọ 2006. Isiokwu mgbakọ  ahụ bụ “Nnapụta Dị Nso.” Obi tọrọ ha ezigbo ụtọ mgbe ha nụrụ na Nwanna Geoffrey Jackson, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi, ga-agwa ha okwu. Mgbe ọ na-agwa ha okwu, o juru ha anya mgbe o wepụtaara ha Baịbụl Nsọ​—⁠Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ zuru ezu n’asụsụ Jọjin.

Mgbe a na-ewepụtara ụmụnna anyị Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’asụsụ Jọjin n’afọ 2006

Obi ụtọ mere ka anya mmiri gbaa ndị bịara mgbakọ a. Otu nwanna nwaanyị kwuru, sị: “Obi bụ m sọ aṅụrị maka Baịbụl a zuru ezu anyị nwetara n’asụsụ Jọjin. . . . Agaghị m echefu mgbakọ a echefu.” Ihe karịrị puku mmadụ iri na asaa bịara ya. Nke a bụ nke mbụ a na-enwe ụdị mgbakọ a na Jọjia.

^ para. 29 A rụrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze asaa na Jọjia malite n’afọ 2001 ruo afọ 2003.