Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2017

Ebe ụmụnna nọ n’akụkụ mmiri dị nso na Sokumi na-enwe ọmụmụ ihe n’afọ 1989

 JỌJIA | 1924-1990

1924-⁠1990​—⁠Ndị Mbụ Chọrọ Ịmụta Eziokwu

1924-⁠1990​—⁠Ndị Mbụ Chọrọ Ịmụta Eziokwu

 KEMGBE ihe dị ka afọ 1921, ndị Mmụta Baịbụl na-agbasi mbọ ike ikwusara ndị chọrọ ịmụta eziokwu na Jọjia ozi ọma. N’afọ 1924, ha mepere ọfis na Beirut dị na Lebanọn ka ha nọrọ ebe ahụ na-ahazi ozi ọma a na-ekwusa na Aminia, Jọjia, Siria, nakwa na Tọki.

N’agbanyeghị na e nwere ike inwe ndị e ziri ozi ọma na Jọjia n’oge ahụ, ozi ọma ahụ agbasaghị ebe niile ná mmalite, ma mee ka ndị mmadụ gbanwee ndụ ha. (Mat. 13:33) Ma, o mechara jiri nwayọọ nwayọọ gbasaa, meekwa ka ọtụtụ ndị na Jọjia gbanwee otú ha si ebi ndụ.

M Chọsiri Ike Ka E Nwee Ikpe Ziri Ezi

Mgbe agha ụwa nke abụọ malitere, Vaso Kveniashvili dị afọ iri na anọ. Ebe ọ bụ na Jọjia so n’obodo ndị dị na  Sọviet Yuniọn, ndị ọchịchị kpụụrụ papa ya ka ọ banye amị. N’oge ahụ, mama ya anwụọla. Vaso nwere ụmụnne atọ ọ tọrọ. O bidoro zuwa ohi ka o nwee ike ịna-akpa afọ ya na ụmụnne ya.

Vaso banyere n’òtù ọjọọ, ya na ha esorozie na-ezu ezigbo ohi. O kwuru, sị: “M kwetara na ndị omekome na-ekpe ikpe ziri ezi karịa ndị ọchịchị ma ọ bụ ndị nkịtị.” Vaso mechara ghọta na mmadụ agaghị emeli ka ikpe na-ezighị ezi kwụsị. Vaso kwuru, sị: “M chọsiri ike ka e nwee ikpe ziri ezi n’ụwa.”

Onye a bụ Vaso Kveniashvili, obere oge a tọhapụrụ ya n’ụlọ mkpọrọ n’afọ 1964

E mechara nwụchie Vaso maka arụ ndị ọ na-akpa ma tụọ ya mkpọrọ na Saịberịa. Ka ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ, ọ hụrụ otu Onyeàmà Jehova a tụrụ mkpọrọ n’ihi ihe ndị o kweere.  Onyeàmà Jehova ahụ malitere kụziwere ya Baịbụl. Vaso kwuru, sị: “Ugbu a, achọtala m ihe m na-achọ. Anyị enweghị akwụkwọ anyị ji amụ Baịbụl, ma m gbalịrị ka m mụta ihe n’ihe ndị ọ na-agwa m.”

Mgbe a tọhapụrụ Vaso n’afọ 1964, ọ laghachiri Jọjia ma chọwa Ndịàmà Jehova ma ọ chọtaghị ha. N’agbanyeghị na ọ chọtaghị ha, ya na nwanna ahụ nọgidere na-ederịta akwụkwọ ozi. Ma, nwanna ahụ mechara nwụọ, o nweghịzi Onyeàmà Jehova ya na ya na-ekwurịta banyere Chineke. O were ya ihe fọrọ obere ka o ruo afọ iri abụọ tupu ya ahụ Ndịàmà Jehova ọzọ. Anyị ga-akọkwu banyere Vaso ma e mechaa.

Mkpọrọ A Tụrụ Ya Mechara Baa Uru

Ebe ụmụnna nọ n’ọhịa na-enwe ọmụmụ ihe

E nwere otu nwa agbọghọ onye Jọjia ndị ọchịchị Nazi tụrụ mkpọrọ. Aha ya bụ Valentina Miminoshvili. Mkpọrọ a a tụrụ ya mechara baara ya ezigbo uru. Ọ bụ n’ụlọ  mkpọrọ ahụ ka ọ hụrụ Ndịàmà Jehova na nke mbụ ya. Ihe kacha masị ya banyere ha bụ otú ha si kwụsie ike n’ihe ha kweere n’agbanyeghị ihe a na-eme ha. Ya na ha malitere ịmụ Baịbụl. Ihe ha na-akụziri ya rukwara ya n’obi.

Mgbe a tọhapụrụ ya, ọ malitere ịkọrọ ndị obodo ha ihe ndị ọ mụtara na Baịbụl. Ma, ihe a ọ na-eme mere ka ndị ọchịchị nwụchie ya ma tụọ ya mkpọrọ afọ iri na Rọshịa. Ọ bụ n’ụlọ mkpọrọ ahụ ka ọ hụrụ Ndịàmà Jehova ọzọ. E mechakwara mee ya baptizim.

Mgbe a tọhapụrụ Valentina n’afọ 1967, ọ kwagara ebe ọdịda anyanwụ Jọjia ma malite iji akọ na-ekwusa ozi ọma. Ọ maghị na n’oge na-adịghị anya na Jehova ga-esi n’aka ya zaa mmadụ ekpere o ji obi ya niile na-ekpe.

Jehova Zara Ekpere Ya

N’afọ 1962, Nwanna Nwaanyị Antonina Gudadze so di ya na-abụghị Onyeàmà Jehova si Saịberịa lọta obodo ya bụ́ Jọjia. Antonina mụtara banyere Jehova n’aka Ndịàmà Jehova a chụgara na Saịberịa bụ́ obodo a mụrụ ya. Antonina na di ya bizi na Kashuri dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Jọjia, ma e nweghị Ndịàmà Jehova ọzọ bi ebe ahụ.

Nwanna Gudadze na ndị ezinụlọ ya n’ihe dị ka afọ 1962

Antonina rịọrọ Jehova ka o mee ka ọ hụ Ndịàmà Jehova ibe ya. O kwuru otú Jehova si zaa ya ekpere. Ọ sịrị: “Otu ụbọchị, enwetara m ihe mama m si Saịberịa zitere m, mụ emepee ya, hụ akwụkwọ anyị o zoro n’ime ya otú onye ọzọ na-agaghị ahụ ya. Otú ahụ ka m sị enweta akwụkwọ m ji na-amụ Baịbụl ruo afọ isii. Mgbe ọ bụla mama m ziteere m akwụkwọ ndị ahụ, m na-ekele Jehova maka otú o si na-akụziri m ihe, na-elekọta m ma na-agba m ume.”

Ma n’oge a niile, Antonina ahụghị Onyeàmà Jehova ọzọ na Kashuri. O kwuru, sị: “M nọgidere na-arịọ Jehova ka o mee ka m hụ ụmụnna m. Otu ụbọchị, ụmụ nwaanyị  abụọ batara n’ebe m na-arụ ọrụ. Ha jụrụ m, sị: ‘Ọ̀ bụ gị bụ Antonina?’ Otú ha si mụmụọ ọnụ ọchị mere ka m mata na ha bụ ụmụnna m. Mụ amakụọ ha, anya mmiri agbawa anyị.”

Otu n’ime ụmụnna nwaanyị ndị ahụ bụ Valentina Miminoshvili. Obi tọrọ Antonina ezigbo ụtọ mgbe ha gwara ya na e nwere ebe a na-amụ ihe n’ebe ọdịda anyanwụ Jọjia. Ọ malitere ịga ọmụmụ ihe ebe ahụ otu ugboro n’ọnwa n’agbanyeghị na isi n’ụlọ ha gawa ebe ahụ dị ihe karịrị narị kilomita atọ.

Ọtụtụ Ndị Abata n’Ọgbakọ n’Ebe Ndịda Jọjia

N’agbata afọ 1961 na afọ 1969, ndị ọchịchị Sọviet Yuniọn nọ na-enye Ndịàmà Jehova nsogbu. N’ihi ya, ụfọdụ ụmụnna ndị bi ná mpaghara ndị Sọviet Yuniọn kacha enye nsogbu kwagara n’obodo ndị ha na-anaghị enyecha ndị Jehova nsogbu. Otu n’ime ụmụnna ndị ahụ bụ Vladimir Gladyuk. Ọ bụ nwanna ume ndụ ka juru n’ahụ́ nke na-ejighịkwa ofufe Chineke egwu egwu. N’afọ 1969, o si na Yukren kwaga n’obodo Zugdidi dị n’ebe ndịda Jọjia.

Nwanna Nwaanyị Lyuba na Vladimir Gladyuk di ya

 Ná mmalite, ụmụnna kwagara Jọjia ji asụsụ Rọshịan na-enwe ọmụmụ ihe. Ma, ka ọtụtụ ndị Jọjia malitere ịbịa ọmụmụ ihe, ụmụnna malitere inwe ọmụmụ ihe n’asụsụ Jọjin. Ọtụtụ ndị malitere ịmụ Baịbụl nke na n’ọnwa Ọgọst afọ 1970, e mere mmadụ iri na abụọ bụ́ ndị Jọjia baptizim.

N’afọ 1972, Nwanna Vladimir na ezinụlọ ya kwagara n’obodo Sokumi nke dị n’akụkụ Oké Osimiri Ojii. Vladimir kwuru, sị: “Obi dị anyị ụtọ maka otú anyị si na-eme nke ọma n’ọgbakọ. Anyị na-ekelekwa Jehova maka otú o si na-agọzi ozi anyị. Ọtụtụ ndị malitere ịbata n’ọgbakọ.” N’afọ ahụ, mgbe anyị nwere Ncheta Ọnwụ Jizọs nke mbụ ya na Sokumi, mmadụ iri anọ na ise bịara.

“Eji M Obi M Niile Gee Ha Ntị”

Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Babutsa Jejelava dị ihe dị ka afọ iri itoolu na abụọ ugbu a bụ otu n’ime ndị mbụ  batara n’ọgbakọ na Sokumi n’afọ 1973. O kwuru, sị: “Otu ụbọchị, ahụrụ m ka ụmụ nwaanyị anọ nọ na-akparịta ụka. Ihe ha nọ na-ekwu tọrọ m ezigbo ụtọ. Abụọ n’ime ha bụ ndị sista, mmadụ abụọ ndị nke ọzọ ka m mechara chọpụta na ha bụ Ndịàmà Jehova.” Otu n’ime ụmụnna nwaanyị ahụ bụ nwunye Nwanna Vladimir Gladyuk, aha ya bụ Lyuba. Onye nke ọzọ bụ Nwanna nwaanyị Itta Sudarenko. Ọ bụ onye Yukren, bụrụkwa ọsụ ụzọ ji ozi ọma kpọrọ ihe.

Nwanna Nwaanyị Babutsa Jejelava n’afọ 1979 nakwa n’afọ 2016

Nwanna Nwaanyị Babutsa kwuru ihe o mere mgbe ọ hụrụ ha ka ha na-akparịta ụka. Ọ sịrị: “Eji m obi m niile gee ha ntị.” Mgbe ọ nụrụ na Chineke nwere aha, ya ajụọ Ndịàmà Jehova ahụ ma hà nwere ike izi ya ebe ọ dị na Baịbụl. Ọ jụrụ ha ọtụtụ ajụjụ nke mere na ha kparịtara ụka awa atọ.

Mgbe ha kwuchara, Nwanna Nwaanyị Babutsa chere na ya agaghị ahụ Ndịàmà ahụ ọzọ. Ọ jụrụ ha, sị: “Ùnu ga-alawa hapụ naanị m ebe a?”

Ụmụnna nwaanyị ahụ sịrị ya: “Mba, anyị agaghị ahapụ gị. Anyị ga-abịaghachi na Satọdee.”

Mgbe o ruru Satọdee, ha bịaghachiri. Obi tọrọ Babutsa ezigbo ụtọ mgbe ọ hụrụ ha. Ha malitere ịmụrụ ya Baịbụl ozugbo. Mgbe ha mụchara ihe n’ụbọchị ahụ, Babutsa nọ na-eche ihe ọ ga-eme ka o nwee ike ịhụ Ndịàmà Jehova ahụ ọzọ. Ọ gwara onwe ya, sị: ‘Ugbu a m hụrụla ndị a, m ga-eme ihe ka mụ na ha nọgide na-ahụ.’

Babutsa chetara ihe ọ ga-eme. Ọ sịrị: “Ebe m ma na Lyuba alụọla di, m jụziri Itta ma yanwa ọ̀ lụọkwala di. Itta sịrị na ya alụbeghị. M gwara ya, sị: ‘Bịanụ ka mụ na gị biri. Enwere m ihe ndina abụọ, nweekwa lampụ n’etiti ha. Anyị nwere ike idowe Baịbụl n’okpuru ya ma jiri ya na-ekwurịta okwu n’abalị.’” Itta kwetara, gaa ya na ya ebiri.

 Babutsa chetara ihe mere mgbe ahụ. Ọ sịrị: “Mgbe ụfọdụ, anaghị m ehi ụra n’abalị ebe m na-eche ihe ndị m mụtara. M chekata ha, e nwee ajụjụ batara m n’uche, mụ akpọtee Itta ma sị ya: ‘Itta, bilie, weta Baịbụl gị, e nwere ajụjụ m chọrọ ịjụ gị.’ Itta bilie, ya ahịọ aka n’anya ma sị m, ‘Nne, ngwa jụwa m?’ M jụọ ya ihe m chọrọ ịjụ ya, ya emeghee Baịbụl zaa m ya.” Naanị abalị atọ Itta kwagara na nke Babutsa, Babutsa bidoro iso ya ekwusa ozi ọma.

Babutsa nwere otu ezigbo enyi aha ya bụ Natela Chargeishvili. Babutsa kwuru, sị: “Echekwa m na ọ gaghị ekwe aghọ Onyeàmà Jehova n’ihi na ha bara ọgaranya. Ma, si n’ụbọchị mbụ anyị ziri ya ozi ọma, o ji obi ya niile nabata ihe anyị gwara ya.” O teghị aka, ha abụọ amalite ịkọrọ ndị enyi ha, ndị ọrụ ha na ndị agbata obi ha, ihe ndị ha na-amụta.