Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2017

 JỌJIA

“N’ebe Chineke Nọ, Ihe Niile Kwere Omume”

Natela Grigoriadis

“N’ebe Chineke Nọ, Ihe Niile Kwere Omume”
  • A MỤRỤ YA N’AFỌ 1960

  • E MERE YA BAPTIZIM N’AFỌ 1987

  • ONYE Ọ BỤ Ọ bụbu onyeisi n’otu ụlọ ọrụ na-ere ngwá ahịa. Obere oge e mechara ya baptizim, o ji ihe ndị ọ mụtara n’ụlọ ọrụ ha nye aka mgbe anyị na-ebi akwụkwọ anyị na nzuzo. Ndị ọ matara n’oge ahụ nyekwaara ya aka.

N’AGBATA afọ 1987 na afọ 1989, ọ na-abụ anyị mụwa Ụlọ Nche n’ọmụmụ ihe, ọ bụ naanị nwanna na-eduzi ya na-enwe Ụlọ Nche ahụ. Ọ na-abụkarị nke e ji aka dee. Otu ụbọchị, m gakwuuru otu n’ime ndị okenye anyị aha ya bụ Genadi Gudadze ma gwa ya na ọ ga-adị mma ka anyị jiri aka anyị biwa Ụlọ Nche.

Tupu mgbe ahụ, ụmụnna anyị na-eji ígwè kọpị kọpị ha mere n’onwe ha na-ebipụta akwụkwọ anyị ụfọdụ, ma nke ha na-ebipụta ebughị ibu. Ka e nwee ike ịna-ebipụta ha mgbe niile, e kwesịrị inwe ígwè kọpị kọpị na-arụ ọrụ nke ọma, taịpraịta, onye ma otú e si eji taịpraịta ede ihe nke ọma, nakwa ịna-enweta akwụkwọ e ji ebi akwụkwọ mgbe niile. Ma, ihe niile e ji ebi akwụkwọ dị gọọmenti n’aka, ọ bụkwa ndị uwe ojii pụrụ iche na-ahụ maka ya.

Esi m n’aka otu onye mụ na ya na-azụkọ ahịa zụta taịpraịta ndị gọọmenti na-anaghị ejizi arụ ọrụ. Nwanne m nwaanyị ma otú e si eji taịpraịta ede ihe nke ọma, o nwekwara ike inyere  anyị aka. Ụmụnna anyị rụrụ ígwè kọpị kọpị ọhụrụ, chọtakwa ebe anyị ga na-azụta ihe ndị e ji ebi akwụkwọ. Mgbe anyị nwetachara ihe niile anyị chọrọ, o gbughị oge anyị ebipụta Ụlọ Nche mbụ n’asụsụ Jọjin.

Ma, e nwere nsogbu anyị bịara nwee. Otu ụbọchị, Nwanna Genadi gwara m, sị, “Anyị kwesịrị ịchọ ebe ọzọ anyị ga na-azụta ihe ndị anyị ga-eji na-ebi akwụkwọ.” Ọ hụrụ ihe ndị e ji ebi akwụkwọ n’ọfis gọọmenti, ma o nweghị ike ịzụta ha ebe ọ bụ na a na-enyo ya enyo. Oleekwanụ otú anyị ga-esi zụta ha? M gwara Nwanna Genadi na ihe a agaghị ekwe omume. Ya agwa m, sị: “Ekwuzila na ọ gaghị ekwe omume. ‘N’ebe Chineke nọ, ihe niile kwere omume.’”​—⁠Mat. 19:⁠26.

N’echi ya, m ji ụjọ gawa n’ọfis gọọmenti ahụ, na-eche ihe ahụ ọ gwara m. Jehova mere ka m hụ otu nwaanyị na-eji taịpraịta edere ha ihe. Ọ bụ ezigbo mmadụ. O nyeere m aka gwa onyeisi ha na m chọrọ ịna-azụ ihe ndị e ji ebi akwụkwọ n’aka ha. Onyeisi ha ahụ bụ di ya. O kwetakwara. Ọ bụzi ebe ahụ ka m na-abịa azụta ihe ndị anyị ji ebi akwụkwọ. Si mgbe ahụ gawa, inweta ihe ndị e ji ebi akwụkwọ enyeghịzi anyị nsogbu.